Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/11 p. 1-4
  • Ụbọchị Atọ A Ga-eji Wusie Okwukwe Anyị Ike

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụbọchị Atọ A Ga-eji Wusie Okwukwe Anyị Ike
  • Ozi Alaeze Anyi—2011
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mgbakọ Distrikti Na-enyere Anyị Aka Ịghọtakwu Eziokwu Dị na Baịbụl
    Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Àgwà Na-ewetara Chineke Otuto
    Ozi Alaeze Anyi—2013
  • “Na-emenụ Omume Dị Mma Na-etiti Ndị Mba Ọzọ”
    Ozi Alaeze Anyi—2014
  • Mgbakọ Distrikti Bụ Oge Anyị Na-eji Ọṅụ Efe Chineke
    Ozi Alaeze Anyi—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2011
km 8/11 p. 1-4

Ụbọchị Atọ A Ga-eji Wusie Okwukwe Anyị Ike

1. Gịnị ka anyị na-atụ anya inweta ná mgbakọ distrikti nke afọ a?

1 N’ụwa Setan a nri ime mmụọ kọrọ otú ahụ mmiri si akọ n’ala kpọrọ nkụ, Jehova na-enyeju ndị ya afọ. (Aịza. 58:11) Otu n’ime ụzọ Jehova si enyeju anyị afọ bụ mgbakọ distrikti anyị na-enwe kwa afọ. Ebe ọ bụ na mgbakọ distrikti nke afọ a eruwela, gịnị ka anyị kwesịrị ime iji hụ na anyị jikeere ejike iri nri ime mmụọ a ga-enye anyị? Oleekwa otú anyị ga-esi mee ka ndị ọzọ rite uru ná mgbakọ ahụ?—Ilu 21:5.

2. Olee ihe ndị anyị kwesịrị ime tupu ụbọchị mgbakọ ahụ eruo?

2 Ị̀ haziela ihe ndị ị na-eme iji hụ na ị bịazuru ụbọchị atọ ahụ a ga-enwe mgbakọ a? Ọ bụrụ na i mebeghị otú ahụ, hụ na i mere ya ozugbo. Ì cheela echiche otú ebe ọgbakọ unu ga-aga mgbakọ dịruru n’anya iji mara mgbe i kwesịrị ịhapụ ụlọ gị gawa, ka i nwee ike ruo n’oge, chọta ebe ị ga-anọ tupu ihe omume ebido? E nweghị onye n’ime anyị kwesịrị ikwe ka otu n’ime ihe ndị a ga-ekwu ná mgbakọ ahụ kwaa ya, n’ihi na ọ bụ Jehova mere ndokwa maka ha niile. (Aịza. 65:13, 14) Ì mechaala ndokwa niile i kwesịrị ime maka ebe ị ga-ebi na otú ị ga-esi aga?

3. Olee ihe ndị anyị nwere ike ime ka anyị na ezinụlọ anyị nwee ike irite uru buru ibu ná mgbakọ a?

3 Olee ihe ị ga-eme ka uche gị dịrị n’ihe ọkà okwu na-ekwu? Ọ ga-adị mma ma i zuo ike nke ọma n’abalị ọ bụla. Legide ọkà okwu anya n’ihu mgbe ọ na-ekwu okwu. Hụ na ị sapetara amaokwu Baịbụl ọ bụla a kpọrọ. Na-edetu obere ihe n’akwụkwọ. Ọ ga-adị mma ma ezinụlọ nọkọta ọnụ, ka ndị nne na nna nwee ike inyere ụmụ ha aka ige ntị. (Ilu 29:15) Ezinụlọ unu nwere ike tụlee ihe ndị e kwuru ma a lọta n’ụbọchị nke ọ bụla. Unu nwewe Ofufe Ezinụlọ mgbe unu lọtara mgbakọ ahụ, unu nwere ike ịtụle ihe ndị e kwuru, bụ́ ndị ga-abara ezinụlọ unu uru.

4. Gịnị ka anyị nwere ike ime iji hụ na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ anyị so rie nri ime mmụọ ahụ?

4 Nyere Ndị Ọzọ Aka Ka Ha Rite Uru ná Nri Ime Mmụọ Ahụ: Anyị agaghị achọ ka nri ime mmụọ ahụ kwaa ndị ọzọ. È nwere ndị agadi nọ n’ọgbakọ unu ma ọ bụkwanụ ndị ọzọ ga-achọ ka e nyere ha aka ka ha gaa mgbakọ a? Ì nwere ike inyere ha aka? (1 Jọn 3:17, 18) Ndị okenye, nke ka nke ndị nlekọta ìgwè, kwesịrị ịhụ na e nyeere ụdị ndị a aka.

5. Olee otú anyị ga-esi ekesa akwụkwọ a ga-eji akpọ ndị mmadụ òkù ka ha bịa mgbakọ ahụ? (Kwuokwa ihe e kwuru n’igbe dị na peeji a.)

5 Mgbe ọ fọrọ izu atọ ka anyị gaa mgbakọ a, anyị ga-eme mkpọsa pụrụ iche otú anyị na-eme kwa afọ. Anyị ga-aga kpọọ ndị ọzọ ka ha soro anyị gaa mgbakọ a. Ọgbakọ ọ bụla kwesịrị ịgba mbọ hụ na ha kesachara akwụkwọ ịkpọ òkù e nyere ha. Ha kwesịkwara ịgba mbọ gazuo ókèala ha. Ọ bụrụ na e nwere akwụkwọ ịkpọ òkù ndị ezinụlọ unu kefọrọ, unu jiri ya gaa mgbakọ ahụ. Unu ga-eji ya kpọọ ndị unu ga-agbara àmà n’ala mgbakọ ahụ òkù. A ga-agwakwu anyị ihe gbasara nke a n’otu n’ime ihe omume ndị a ga-eme na Fraịdee. Ọ bụrụ na e nwere akwụkwọ ịkpọ òkù ndị ezinụlọ unu na-agaghị ekesali n’ala mgbakọ ahụ, ha kwesịrị iji ya bịa, nye ya otu n’ime ndị atendantị. Biko, jide otu akwụkwọ ịkpọ òkù, e nwere ihe a ga-ekwu gbasara ya n’okwu ikpeazụ a ga-ekwu na Sọnde.

6. Anyị gaa mgbakọ, olee otú anyị ga-esi egosi na anyị na-akpa àgwà ọma?

6 Àgwà Ọma Anyị Na-atọ Ụmụnna Anyị Ụtọ: N’ụwa taa, ndị mmadụ “hụrụ naanị onwe ha n’anya,” ha anaghịkwa achọ ịma ma àgwà ha na-akpa ọ̀ na-ewute ndị ọzọ. Ma, obi na-adị anyị ụtọ ma anyị na ụmụnna anyị nọrọ n’ihi na ha na-agba mbọ ịkpa ezigbo àgwà. (2 Tim. 3:2) Ọ bụrụ na anyị ejiri nnọọ nwayọọ banye n’Ụlọ Mgbakọ ma anyị bịa, jirikwa nnọọ nwayọọ pụọ ma anyị lawa, ọ na-egosi na anyị na-akpa àgwà ọma. Ọ bụrụkwa na ndị anyị ga-achọtara oche bụ naanị ndị anyị na ha bi, ndị anyị na ha ji otu ụgbọala bịa ma ọ bụ ndị anyị na-amụrụ Baịbụl, ọ na-egosi na anyị na-akpa ezigbo àgwà. Àgwà ọma anyị ga-emekwa ka anyị gaa nọrọ n’oche anyị, gere abụ olu ụtọ mgbe ọ bụla onyeisi oche gwara anyị mee otú ahụ. Ọ bụrụ na anyị ji ekwe ntị ma ọ bụ ihe yiri ya ma pịnye ya otú ọ na-agaghị adapụta ụda, ọ na-egosi na anyị na-akpa àgwà ọma. Anyị na-egosikwa na anyị na-akpa àgwà ọma ma ọ bụrụ na anyị aghara ịkpa nkata mgbe ọkà okwu na-ekwu okwu. Anyị ekwesịghịkwa ịna-eri nri, na-agagharị ma ọ bụkwanụ jiri ekwe ntị anyị na-ezigara mmadụ ozi mgbe okwu na-aga n’ihu.

7. Gịnị ka anyị nwere ike ime ka anyị na ụmụnna anyị nwee ike ịkparịta nke ọma?

7 Mkparịta Ụka nke Na-eme Obi Ụtọ: Oge mgbakọ distrikti na-abụ oge anyị na ụmụnna anyị na-eji anọrị n’ihi na anyị na ha dị n’otu. (Ọma 133:1-3) Í cheghị na ọ ga-adị mma ma ị gakwuru ụmụnna ndị si ọgbakọ ọzọ bịa mgbakọ ahụ ka gị na ha mata? (2 Kọr. 6:13) I nwere ike gwa onwe gị na o nweghị ụbọchị ọ bụla ị na-agaghị amata otu nwanna ma ọ bụkwanụ otu ezinụlọ ị na-amabughị. Oge e ji eri nri ehihie bụ oge mara ezigbo mma ị ga-eji na-amata ndị mmadụ. N’ihi ya, kama ịgawa ebe a na-ere nri gaa zụrụ nri ehihie rie, sie nri na-agaghị anyị arọ n’ahụ́ ma buru ya bịa, kpọọkwa ndị ọzọ ka ha soro gị rie ya. Gị na ha jiri oge ahụ kparịta ụka. Unu nwere ike isi otú ahụ ghọọ ezigbo enyi.

8. Gịnị mere o ji dị mma ka anyị wepụta onwe anyị rụọ ọrụ ná mgbakọ, oleekwa otú anyị ga-esi eme ya?

8 Iso ụmụnna anyị rụọ ọrụ ndị e ji eto Chineke na-eme obi ụtọ! Ì nwere ike iwepụta onwe gị, soro otu ngalaba ma ọ bụkwanụ ọgbakọ unu rụọ ọrụ iji hụ na e dewere Ụlọ Mgbakọ ọcha? (Ọma 110:3) Ọ bụrụ na e nweghị ọrụ e kenyere gị ka ị na-arụ ná mgbakọ, gbalịanụ gakwuru ngalaba na-enye ọrụ ná mgbakọ ka ha gwa gị ebe i nwere ike inye aka. Ị manụ na a dị ọtụtụ na-arụ ọrụ, ọ na-atọ ụtọ, na-emekwa ka ọrụ ahụ ghara ibu ndị na-arụ ya aka.

9. Anyị gaa mgbakọ a, olee ihe mere anyị ga-eji kpachara anya n’otú anyị si akpa àgwà nakwa n’otú anyị si eji ejiji?

9 Àgwà Ọma Anyị Na-amasị Ndị Na-abụghị Ndịàmà: N’ụbọchị atọ ahụ a ga-enwe mgbakọ a, anyị kwesịrị ịna-akpa ezigbo àgwà n’ebe ọ bụla anyị nọ. Àgwà anyị kwesịrị ime ka ndị bi n’ebe ahụ a ga-enwe mgbakọ hụ na Ndịàmà Jehova dị iche. (1 Pita 2:12) Uwe anyị na ejiji anyị kwesịrị iwetara Jehova otuto mgbe niile, ma mgbe anyị bịara n’Ụlọ Mgbakọ ma mgbe anyị nọ ebe anyị bi ma mgbe anyị gara iri nri n’ebe a na-ere nri. (1 Tim. 2:9, 10) Ọ bụrụ na anyị eyiri baajị anyị mgbe niile, ndị mmadụ ga-ama na anyị bụ Ndịàmà Jehova. Nke a nwere ike ime ka ha jụọ anyị ajụjụ, anyị ejirikwa ohere ahụ gwa ha gbasara mgbakọ ahụ ma zie ha ozi ọma.

10. Anyị gaa mgbakọ, gịnị ka anyị kwesịrị ime ka anyị ghara ịkpasu ndị nwe ebe e nyere anyị ụlọ iwe ma ọ bụkwanụ kpasuo ndị na-arụ n’ebe a na-ere nri iwe?

10 Gịnị ka anyị kwesịrị ime ka anyị ghara ịkpasu ndị nwe ebe e nyere anyị ụlọ iwe ma ọ bụkwanụ kpasuo ndị na-arụ n’ebe a na-ere nri iwe? Anyị ekwesịghị ịgwa onye nwe ụlọ na anyị chọrọ ihe dị ka ọnụ ụlọ abụọ, e mechaa ya abụrụ otu ọnụ ụlọ ka anyị weere. Anyị mee otú ahụ, o nwere ike ime ka ụmụnna anyị ghara inweta ebe ha ga-ebi, nweekwa ike ime ka ụsụ ahịa sụọ onye nwe ụlọ ahụ. Ọ bụrụ na e nwere ọtụtụ ndị bịara iwere ụlọ n’ebe ahụ anyị bịara ịchọ ụlọ, anyị kwesịrị inwere onye nwe ụlọ ahụ ndidi. Otú ahụkwa ka anyị kwesịrị ime ma anyị weghachiwere ya mkpịsị ugodi mgbe anyị na-ala. (Kọl. 4:6) Ọ bụrụ na ndị na-arụ n’ebe a na-ere nri ebutere anyị nri, anyị kwesịrị ikele ha. Anyị kwesịkwara ikele ndị mmadụ ma ha nyere anyị aka bute akpa anyị ma ọ bụ meere anyị ihe ọ bụla ọzọ mgbe anyị na-akwaba n’ebe e nyere anyị ụlọ.

11. Olee ihe ndị gosiri na àgwà ọma anyị na-agbara ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova àmà?

11 Ọ bụrụ na anyị ana-akpa àgwà ọma ma anyị gaa mgbakọ, olee otú ndị na-abụghị Ndịàmà ga-esi ele anyị anya? N’otu akwụkwọ akụkọ, otu manịja na-elekọta otu ebe anyị nọ mee mgbakọ kwuru, sị: “Àgwà Ndịàmà Jehova enweghị atụ. Ha na-anọ ebe a enwe mgbakọ ha n’afọ ọ bụla, obi na-atọkwa anyị ụtọ ma ha bịa.” N’afọ gara aga, otu nwoke na-abụghị Onyeàmà tụfuru wọlet ya na họtel ebe ụmụnna anyị ndị bịara mgbakọ bi. Mgbe otu nwanna hụrụ wọlet ahụ ma wegara ya manịja họtel ahụ n’enweghị otu ihe furu n’ime ya, manịja ahụ gwara onye nwe wọlet ahụ, sị: “Ihe mere i ji hụ wọlet gị a bụ na Ndịàmà Jehova nwere mgbakọ ha na nso ebe a, ọtụtụ n’ime ha bikwa na họtel a. A sị na ọ bụghị ya, o nwere ike ị garaghị ahụ ya.”

12. Ka mgbakọ nke afọ a ji ọsọ na-abịa, gịnị ka anyị kwesịrị ịgbalịsi ike mee, ọ bụkwa maka gịnị?

12 Mgbakọ distrikti nke afọ a ji ọsọ na-abịa. Nzukọ Jehova agbaala mbọ dị egwu iji kwadebe mgbakọ a ma hụ na ebe ndị a ga-anọ eme ya ga-adị anyị mma n’ahụ́. Gbalịa hụ na ị bịazuru ụbọchị atọ ahụ a ga-enwe mgbakọ a, hụkwa na i gere ntị n’ihe niile Jehova ga-akụziri anyị. Kpaa ezigbo àgwà ka ndị ọzọ nwee ike ịnụ ụtọ mgbakọ ahụ, gbalịakwa ka gị na ụmụnna gị kparịta nkata. I mee otú ahụ, mgbakọ a ga-atọ ma gịnwa ma ndị ọzọ bịara ya ụtọ. O nwekwara ike ime ka unu kwuo ihe a otu onye gara mgbakọ n’afọ gara aga kwuru, bụ́ onye sịrị: “Echeghị m na e nwere ihe ọzọ tọrọla m ụtọ ka mgbakọ ahụ.”

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 1]

Mgbe ọ fọrọ izu atọ ka anyị gaa mgbakọ a, anyị ga-eme mkpọsa pụrụ iche otú anyị na-eme kwa afọ

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]

Uwe anyị na ejiji anyị kwesịrị iwetara Jehova otuto mgbe niile, ma mgbe anyị bịara n’Ụlọ Mgbakọ ma mgbe anyị nọ ebe anyị bi ma mgbe anyị gara iri nri n’ebe a na-ere nri

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]

Kpaa ezigbo àgwà ka ndị ọzọ nwee ike ịnụ ụtọ mgbakọ ahụ, gbalịakwa ka gị na ụmụnna gị kparịta nkata

[Igbe dị na peeji nke 2-4]

Ihe Ndị A Ga-eburu n’Uche Banyere Mgbakọ Distrikti Afọ 2011

◼ Oge Ihe Omume: N’ụbọchị atọ ahụ dum, ihe omume ga na-amalite ma o jiri nkeji iri abụọ gafee elekere itoolu nke ụtụtụ. Mgbe a mara ọkwa na a na-aga ịmalite ịkpọ abụ olu ụtọ, anyị niile kwesịrị ịnọdụ ala ka e nwee ike ịmalite ihe omume a n’ụzọ dị ùgwù. Ihe omume nke ụbọchị Fraịdee na Satọdee ga-emechi mgbe ọ fọrọ nkeji ise ka ọ kụọ elekere ise nke uhuruchi, ebe nke ụbọchị Sọnde ga-emechi mgbe ọ fọrọ nkeji iri abụọ ka ọ kụọ elekere anọ nke uhuruchi.

◼ Ịdọba Ụgbọala: N’ebe niile a ga-eme mgbakọ, ndị atendantị ga-egosi ndị mmadụ ebe ha ga-adọba ụgbọala ha. Biko soro ntụziaka ha.—1 Kọr. 14:40.

◼ Ịchọtara Ndị Ọzọ Oche: Ndị i nwere ike ịchọtara oche bụ naanị ndị gị na ha so n’otu ụgbọala ma ọ bụ ndị gị na ha bi n’otu ụlọ, nakwa ndị ị na-amụrụ Baịbụl bịara mgbakọ ahụ.—1 Kọr. 13:5.

◼ Nri Ehihie: Biko, buru nri ehihie gị bịa n’ụlọ mgbakọ kama ịga zụwa nri mgbe a gbasara ihe omume nke ụtụtụ. I nwere ike jiri obere igbe nri ga-abali n’okpuru oche buru nri gị bịa. A chọghị ka e bubata igbe nri ndị buru oké ibu, ihe ndị na-akụwa akụwa, na mmanya na-aba n’anya n’ụlọ mgbakọ.

◼ Onyinye: Anyị nwere ike inye onyinye afọ ofufo ma anyị gaa mgbakọ distrikti iji gosi na obi dị anyị ụtọ maka mgbakọ ahụ. E nwee onye chọrọ iji akwụkwọ ndọrọ ego nye onyinye ná mgbakọ, o kwesịrị ide okwu abụọ bụ́ “Watch Tower” n’ebe a na-ede aha onye ga-adọrọ ego ahụ.

◼ Ihe Ọghọm na Ihe Mberede: Ọ bụrụ na ihe gbata gbata emee onye nọ n’ala mgbakọ, biko, gwa onye atendantị nọ nso. Onye atendantị ahụ ga-akpọga ya n’Ebe A Na-anara Ọgwụ ozugbo, ka ndị nlekọta ahụ́ ike ruru eru anyị nwere ná ngalaba ahụ lebara onye ahụ ahụ́ na-adịghị anya ma nyere ya aka.

◼ Ọgwụ: Ọ bụrụ na o nwere ọgwụ dọkịta kwuru ka ị na-aṅụ, biko, jiri nke ga-ezuru gị bịa mgbakọ ahụ n’ihi na ị gaghị enweta ya n’ala mgbakọ.

◼ Akpụkpọ Ụkwụ: Ọ ga-adị mma ma i yiri akpụkpọ ụkwụ na-agaghị enye gị nsogbu ma ị na-aga ije, nke na-agaghịkwa emerụ gị ahụ́ n’ụkwụ.

◼ Oche E Ji Akwagharị Nwa Ọhụrụ: E kwesịghị ibubata oche e ji akwagharị nwa ọhụrụ n’ụlọ mgbakọ. Ma e nwere ike bubata oche e ji ejide ụmụaka ka ha ghara ịda, dewe ya n’ebe ndị mụrụ ha nọ.

◼ Ihe Nkiri: Ọ gaghị adị mma ka ụmụnna nwaanyị fụrụ ịchafụ ndị buru ibu n’ehihie Sọnde mgbe a na-eme ihe nkiri, n’ihi na ọ ga-eme ka ndị nọ ha n’azụ ghara ịhụ ihe a na-eme. Ha ekwesịghị ime otú ahụ, nke ka nke, n’ihi otú e si arụ Ụlọ Mgbakọ ugbu a.—Fil. 2:4.

◼ Sent: Anyị ga-egosi na anyị na-echebara ndị ọzọ echiche ma ọ bụrụ na anyị eselatatụ aka n’otú anyị si agba sent. Nke a bụ n’ihi ndị ísì sent na-enye nsogbu n’ahụ́.—1 Kọr. 10:24.

◼ Fọm Please Follow Up (S-43): Onye nkwusa ọ bụla kwesịrị iji otu fọm Please Follow Up ma ọ bụ abụọ bịa mgbakọ ahụ. Dejupụta otu ma ọ bụrụ na o nwere onye i ziri ozi ọma ná mgbakọ ahụ, ya enwee mmasị. I dejupụtachaa ya, i nwere ike inye ya ndị nọ n’ebe a na-enye akwụkwọ ná mgbakọ unu ma ọ bụkwanụ gị enye ya odeakwụkwọ ọgbakọ unu ma ị laruo.—Gụọ Ozi Alaeze Anyị nke November 2009, peeji nke 4.

◼ Ebe A Na-ere Nri/Ndị Na-ere Ihe ná Mpụga Ụlọ Mgbakọ: Ị gaa ebe a na-ere nri, kpaa ezi àgwà iji sọpụrụ aha Jehova. Ọ gaghị adị mma ịga riwe nri ma ọ bụ zụwa ihe mgbe ihe omume na-aga n’ihu. Ọ bụrụ na e nwere ihe ị chọrọ ịzụ, ọ ga-akacha mma ịzụ ya tupu ihe omume amalite ma ọ bụ mgbe a gbasara.

◼ Ụlọ Obibi: (1) Ị gaa ka e nye gị ụlọ n’ebe a na-enwe mgbakọ, gosi na i nwere àgwà e ji mara onye mmụọ Chineke na-edu. (2) Anọla n’ụlọ obibi ndị dị n’ala mgbakọ ma ọ bụrụ na ọ bụghị Ndị Na-enye Ụlọ n’Ala Mgbakọ nyere gị ya. Nọrọ naanị n’ebe ha nyere gị ụlọ. (3) Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwoke, anọtela aka n’abalị n’ụlọ e nyere ụmụnna nwaanyị ma ọ bụ hie ebe ahụ. Ụmụnna nwaanyị ekwesịghịkwa ịnọte aka n’ụlọ ụmụnna nwoke ma ọ bụkwanụ hie ebe ahụ. (4) Ọ bụrụ na e nwee nsogbu n’ebe e nyere gị ụlọ, hụ na ị gwara ndị na-ahụ maka ụlọ ozugbo. (5) Ọ bụrụ na e nyere gị ụlọ na họtel, mee ihe otú ndị họtel ahụ chọrọ ka e si na-eme. (6) Esila nri n’ebe a na-achọghị ka a nọrọ sie nri. (7) Esila nri mgbe ihe omume na-aga n’ihu n’ihi na nke ahụ anaghị egosi na i ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe.—Luk 10:38-42.

◼ Ozi Afọ Ofufo: Anyị ga-enwekwu obi ụtọ ma anyị gaa mgbakọ ma ọ bụrụ na anyị ewepụta onwe anyị gaa nye aka rụọ ọrụ ndị dị mkpa ka a rụọ n’ala mgbakọ. (Ọrụ 20:35) Onye ọ bụla chọrọ inye aka kwesịrị ịga ná Ngalaba Na-ahụ Maka Ozi Afọ Ofufo n’ala mgbakọ ahụ. Ụmụaka ndị na-erubeghị afọ iri na isii nwekwara ike inye aka. Ha kwesịrị ịrụ ọrụ ebe onye ọzọ ga-elebara ha anya, o nwere ike ịbụ nne ha ma ọ bụ nna ha ma ọ bụkwanụ onye ọzọ toro eto nne ha ma ọ bụ nna ha kwetara ka o lebara ha anya.

[Igbe dị na peeji nke 2]

Olee Otú Anyị Ga-esi Ekesa Akwụkwọ Ịkpọ Òkù Ahụ?

Iji hụ na anyị gazuru ókèala anyị, anyị ekwesịghị ikwuwe oké okwu. Anyị nwere ike ikwu ihe dị ka: “Ndeewo. Anyị na-enye ndị mmadụ akwụkwọ a iji kpọọ ha ka ha soro anyị gaa mgbakọ anyị ga-enwe n’afọ a. Were nke gị. Ị gụọ ihe e dere na ya, ị ga-ama ihe ndị ọzọ gbasara ya.” E nwere ihe e sere n’ihu akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ, bụ́ nke anya onye ọ bụla ga-aga. N’ihi ya, i nyewe ya mmadụ, nye ya onye ahụ otú ọ ga-ahụ ihe ahụ e sere n’ihu ya. Emela ọnụ mmiri mmiri. I nyewe mmadụ akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ ná ngwụcha izu, i kwesịrị inyekọta ya na magazin anyị ma ọ bụrụ na onye nwe ụlọ gosiri mmasị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya