Mgbakọ Distrikti Na-enyere Anyị Aka Ịghọtakwu Eziokwu Dị na Baịbụl
1. Olee ihe ụmụ Izrel na-echebara echiche ma na-ekwurịta ma ha gaa mgbakọ ndị ahụ ha na-enwe kwa afọ?
1 N’oge ochie, ụmụ Izrel na-agbakọ ugboro atọ n’afọ. Ihe ha kwo agbakọ bụ ka ha mee ememme ndị ha na-eme kwa afọ. N’agbanyeghị na ọ bụ naanị ụmụ nwoke ka a chọrọ ka ha na-aga ememme ndị ahụ, ọtụtụ mgbe, mmadụ niile nọ n’ezinụlọ na-aga Jeruselem ime ememme ndị ahụ. Ememme ndị ahụ na-eme ha obi ụtọ. (Diut. 16:15, 16) Ha na-eme ka ha chebara ihe ndị gbasara ofufe Chineke echiche. Ha na ibe ha na-ejikwa oge ahụ ekwurịta ihe ndị ga-eme ka ha na Chineke dịkwuo ná mma. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ ha na-echebara echiche ma na-ekwurịta? Otu n’ime ha bụ na Jehova bụ Nna hụrụ ụmụ ya n’anya ma na-enye ha ihe ndị na-akpa ha. (Diut. 15:4, 5) Ihe ọzọ bụ na ọ na-edu ha ma na-echebe ha. (Diut. 32:9, 10) Ụmụ Izrel na-echetakwa na a kpọkwasịrị ha aha Jehova, n’ihi ya, ha kwesịrị ịna-ebi ndụ dị mma. (Diut. 7:6, 11) Mgbakọ distrikti anyị na-enwe kwa afọ na-abara anyị uru otú ahụ mgbakọ ndị ahụ ụmụ Izrel na-enwe si baara ha uru.
2. Olee ihe ndị a ga-eme ná mgbakọ distrikti na-abịanụ bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ịghọtakwu eziokwu Baịbụl?
2 Ọ Na-enyere Anyị Aka Ịghọtakwu Baịbụl: Ná mgbakọ distrikti, a na-ekwu okwu ndị sitere na Baịbụl, na-emekwa ihe nkiri na ihe ngosi. A na-agbakwa ụmụnna anyị ajụjụ ọnụ. Ihe ndị a na-enyere anyị aka ịghọtakwu Baịbụl na ime ihe anyị mụtara. (Jọn 17:17) Nzukọ Jehova ahaziela ọtụtụ ihe ga-enyere anyị aka irite uru ná mgbakọ a na-abịanụ. Ha ahụla otú ihe si kwụrụ n’ụwa niile ma kwadebe mgbakọ a ka o nyere anyị aka ịma ihe anyị kwesịrị ime. (Mat. 24:45-47) Ọ̀ na-agụsi gị ike ịbịa mgbakọ ahụ nụrụ ihe a ga-ekwu?
3. Olee ihe ndị anyị ga-eme ka anyị nwee ike irite uru ná mgbakọ ahụ?
3 Mgbakọ ahụ ga-aka abara anyị uru ma ọ bụrụ na anyị agachaa abalị atọ ahụ a ga-enwe ya ma gee ntị nke ọma. Ọ bụrụ na ị gwabeghị onye ị na-arụrụ ọrụ, ugbu a ka i kwesịrị ịgwa ya ka o kwe gị gaa. I ruo ná mgbakọ, gbalịa hie ụra nke ọma n’abalị ọ bụla. Ọ ga-eme ka ị mụrụ anya mgbe a na-eme ihe omume. Ihe ọtụtụ ndị na-eme ka uche ha nwee ike ịdị n’ihe a na-ekwu bụ ile ọkà okwu anya na idetu ihe ụfọdụ a na-ekwu. Pịnye ekwentị gị ma ọ bụ ihe yiri ya otú ọ na-agaghị adapụta ụda ka ọ ghara ịdọpụ gị na ndị ọzọ uche. Anyị ekwesịghị ikwu okwu mgbe ihe omume na-aga n’ihu, ma ọ bụkwanụ jiri ekwentị na-ezigara ndị mmadụ ozi. Anyị ekwesịghịkwa ịna-eri nri ma ihe omume na-aga n’ihu.
4. Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi nyere ụmụ ha aka ka ha rite uru ná mgbakọ na-abịanụ?
4 N’oge ochie, ụmụ Izrel na-agbakọ afọ asaa ọ bụla ime Ememme Ụlọ Ndò. N’ememme ahụ, a na-agụpụta Iwu Jehova. Ha na-akpọ “ụmụntakịrị” ha aga ‘ka ha wee gee ntị, mụtakwa ihe.’ (Diut. 31:12) Obi na-adị anyị ụtọ ma anyị hụ ebe ezinụlọ nọkọrọ ọnụ na-ege ihe a na-ekwu ná mgbakọ, ụmụaka amụrụkwa anya na-ege ntị nke ọma. N’abalị ọ bụla, ọ ga-adị mma ma unu jiri ihe ndị unu deturu kwurịta ihe unu mụtara n’ụbọchị ahụ. Baịbụl kwuru na “nzuzu ka e kekọtara ya na obi nwata,” n’ihi ya, ndị nne na nna kwesịrị ịma ihe ụmụ ha na-eme, ma mgbe a gbasara ihe omume nke ụtụtụ ma mgbe ha nọ n’ebe e nyere ha ụlọ. Ha ekwesịghị ịhapụ ụmụ ha ka ha na-eme otú masịrị ha.—Ilu 22:15; 29:15.
5. Olee otú àgwà ọma anyị na-akpa n’ebe e nyere anyị ụlọ si achọ eziokwu dị na Baịbụl mma?
5 Àgwà Ọma Anyị Na-achọ Eziokwu Dị na Baịbụl Mma: Àgwà ọma anyị na-akpa ma anyị gaa mgbakọ na-achọ eziokwu dị na Baịbụl mma. (Taị. 2:10) Ndị nyere anyị ụlọ na-ama mgbe anyị rubeere ha isi. Obi na-adịkwa ha ụtọ ma anyị nweere ha ndidi ma na-agwa ha okwu ọma. (Kọl. 4:6) Mgbe ụmụnna anyị gara ịchọ ụlọ n’otu họtel n’afọ gara aga, onye na-elekọta họtel ahụ gwara ha, sị: “Ọ na-amasị anyị ma ndị òtù unu bịa nọrọ na họtel anyị n’ihi na ha bụ ndị ezigbo mmadụ. Ha na-akpa àgwà ọma, dị obiọma ma na-akwanyere ndị ọrụ anyị ùgwù. Ha anaghịkwa emetọ họtel anyị.”
6. Olee otú ejiji anyị ga-esi chọọ eziokwu Baịbụl mma ma anyị gaa mgbakọ?
6 Ọ bụrụ na anyị eyiri baajị anyị, ụmụnna anyị ga-ama ndị anyị bụ, ndị mmadụ ga-amatakwa banyere mgbakọ ahụ. Anyị ga-ejikwa ya gbaara ha àmà. Ndị bi n’obodo ebe anyị gara mgbakọ na-ahụ na ndị a yi baajị ji ejiji dị mma n’anya. Ha adịghịkwa nkịrịka ma ọ bụkwanụ yiri efe tapaara ha n’ahụ́ otú ndị mmadụ si eyi. (1 Tim. 2:9, 10) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịkpachara anya n’ụdị efe anyị na-eyi mgbe anyị na-aga mgbakọ ma ọ bụ mgbe anyị nọ n’obodo ebe anyị gara mgbakọ. Anyị ekwesịghị iyi nịka ma ọ bụ polo mgbe anyị na-aga mgbakọ. Ọ bụrụgodị na ọ bụ n’Ụlọ Mgbakọ ma ọ bụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze e ji eme mgbakọ ka anyị gara mgbakọ, anyị kwesịrị iji ejiji dị mma n’anya. Ọ bụrụ na anyị achọọ ịga zụrụ ihe ná mgbede, anyị kwesịrị iji ejiji dị mma n’ihi na ọ bụ mgbakọ ka anyị bịara.
7. Olee ihe ga-enyere anyị aka ka anyị na ụmụnna anyị nwee ike ịkparịta ụka ná mgbakọ?
7 Ụmụ Izrel gaa ememme ndị ahụ ha na-eme kwa afọ, ha na ibe ha ndị si ebo dị iche iche na ndị ọzọ si ná mba dị iche iche na-anọkọ kwurịta okwu. Nke a na-emekwa ka ha dị n’otu. (Ọrụ 2:1, 5) Anyị gaa mgbakọ distrikti, ọtụtụ ndị na-ahụ otú anyị na ụmụnna anyị si anọ n’udo. Nke a na-amasị ndị na-ahụ ihe na-emenụ. (Ọma 133:1) Kama ịgawa ebe a na-ere nri gaa zụrụ nri ehihie, sie nri na-agaghị anyị gị arọ n’ahụ́ ma buru ya bịa. Nke a ga-eme ka gị na ụmụnna jiri oge ahụ kparịta ụka.
8. Gịnị mere anyị ji kwesị iwepụta onwe anyị rụọ ọrụ ná mgbakọ ma ọ bụrụ na anyị ga-emeli ya?
8 Otú ihe niile si aga n’usoro ma anyị bịa mgbakọ na-amasị ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova, nke ka nke, ma ha chọpụta na ndị na-arụ ọrụ ná mgbakọ wepụtara onwe ha na-arụ ọrụ ndị ahụ. Ị̀ ‘ga-eji obi gị wepụta onwe gị’ ịrụ ọrụ ná mgbakọ a? (Ọma 110:3) N’ezinụlọ ụfọdụ, ndị nne na nna na ụmụ ha na-ewepụta onwe ha rụọ ọrụ ná mgbakọ. Ihe mere ha ji eme ya bụ ka ha kụziere ụmụ ha na ha kwesịrị ịna-ewepụta onwe ha. Ọ bụrụ na ị bụ onye ihere, ịrụ ọrụ ná mgbakọ ga-eme ka ị mata ụmụnna ndị ọzọ. Otu nwanna nwaanyị kwuru, sị: “Naanị ndị m ma bụ ndị ezinụlọ m na ndị enyi m ole na ole. Ma, amatara m ọtụtụ ụmụnna mgbe m wepụtara onwe m rụọ ọrụ na ngalaba na-edowe ụlọ mgbakọ ọcha. Nke a mere ka m nwee obi ụtọ.” Anyị wepụta onwe anyị rụọ ọrụ ná mgbakọ, anyị ga-enwekwu ndị enyi. Ọ ga-emekwa ka anyị nwee obi ụtọ. (2 Kọr. 6:12, 13) Ọ bụrụ na ị rụtụbeghị ọrụ ná mgbakọ, jụọ ndị okenye ọgbakọ unu ihe ị ga-eme ka i ruo eruo.
9. Gịnị ka anyị ga-ekwu ma anyị chọọ inye mmadụ akwụkwọ ịkpọ òkù?
9 Kpọọ Ndị Ọzọ Ka Ha Bịa Nụ Eziokwu Dị na Baịbụl: Mgbe ọ fọrọ izu atọ ka anyị gaa mgbakọ a, anyị ga-eme mkpọsa pụrụ iche otú anyị na-eme kwa afọ. Anyị ga-aga kpọọ ndị ọzọ ka ha soro anyị gaa mgbakọ a. Ọgbakọ ọ bụla kwesịrị ịgba mbọ kesaa akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ n’ókèala ha niile ma ọ bụrụ na ha ga-emeli ya. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ́, “Ihe Anyị Ga-ekwu ma Anyị Chọọ Inye Mmadụ Akwụkwọ Ịkpọ Òkù”) Ọ bụrụ na e nwere akwụkwọ ịkpọ òkù unu kefọrọ, jirinụ ya gaa mgbakọ ahụ. Unu ga-eji ya kpọọ ndị unu ga-agbara àmà n’ala mgbakọ ahụ òkù.
10. Kọọ ihe gosiri na ndị anyị nyere akwụkwọ ịkpọ òkù na-abịa mgbakọ anyị.
10 Ndị mmadụ hà na-abịa mgbakọ anyị ma anyị kpọọ ha? N’otu mgbakọ anyị gara, onye atendantị nyeere otu di na nwunye aka ha enweta oche. Ha gwara ya na mgbe ha nwetara akwụkwọ ịkpọ òkù, ha ma na ihe a ga-eme ná mgbakọ ahụ ga-adị ụtọ. N’agbanyeghị na ebe ha bi dị ezigbo anya n’ebe e nwere mgbakọ ahụ, ha gbara mbọ gaa ya. E nwekwara nwoke bịara mgbakọ anyị. Ọ bụ otu nwanna nwaanyị nyere ya akwụkwọ ịkpọ òkù mgbe ọ nọ n’ozi. Nwoke ahụ chọrọ ka ọ kọkwuoro ya gbasara mgbakọ ahụ, n’ihi ya, nwanna nwaanyị ahụ medara obi kọọrọ ya banyere ya. Mgbe nwanna nwaanyị ahụ ruru ná mgbakọ ahụ, ọ hụrụ nwoke ahụ na otu enyi ya ebe ha ji otu n’ime akwụkwọ ndị e wepụtara ná mgbakọ ahụ.
11. Gịnị mere anyị kwesịrị iji gaa mgbakọ distrikti anyị na-enwe kwa afọ?
11 Jehova gwara ụmụ Izrel ka ha na-eme ememme ndị ahụ ha na-eme kwa afọ. Ihe mere o ji gwa ha ka ha na-eme ha bụ na ọ hụrụ ha n’anya. Ọ ma na ọ ga-enyere ha aka ‘ife ya n’ụzọ na-enweghị ntụpọ nakwa n’eziokwu.’ (Jọsh. 24:14) Mgbakọ distrikti ndị anyị na-enwe kwa afọ na-abakwara anyị uru. Ha na-enyere anyị aka ‘ịna-eje ije n’eziokwu ahụ.’ Ha dịkwa mkpa n’ofufe anyị na-efe Chineke. (3 Jọn 3) Ekpere anyị bụ ka Jehova gọzie ndị niile hụrụ eziokwu dị na Baịbụl n’anya ka ha na-agba mbọ ịga mgbakọ a ma rite uru na ya.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 2]
Àgwà ọma anyị na-akpa ma anyị gaa mgbakọ na-achọ eziokwu dị na Baịbụl mma
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]
Mgbe ọ fọrọ izu atọ ka anyị gaa mgbakọ a, anyị ga-eme mkpọsa pụrụ iche iji kpọọ ndị ọzọ ka ha soro anyị gaa ya
[Igbe dị na peeji nke 2-4]
Ihe Ndị A ga-eburu N’uche Banyere Mgbakọ Distrikti Nke Afọ 2012
◼ Oge Ihe Omume: N’ụbọchị atọ ahụ dum, ihe omume ga na-amalite ma o jiri nkeji iri abụọ gafee elekere itoolu nke ụtụtụ. Mgbe a mara ọkwa na a na-aga ịmalite ịkpọ abụ olu ụtọ, anyị niile kwesịrị ịnọdụ ala ka e nwee ike ịmalite ihe omume a n’ụzọ dị ùgwù. Ihe omume nke ụbọchị Fraịdee na Satọdee ga-emechi mgbe ọ fọrọ nkeji ise ka ọ kụọ elekere ise nke uhuruchi, ebe nke ụbọchị Sọnde ga-emechi mgbe ọ fọrọ nkeji iri abụọ ka ọ kụọ elekere anọ nke uhuruchi.
◼ Ịdọba Ụgbọala: N’ebe niile a ga-enwe mgbakọ, ndị atendantị ga-egosi ndị mmadụ ebe ha ga-adọba ụgbọala ha. Biko mee ihe ha gwara gị.—1 Kọr. 13:4, 5.
◼ Ịchọtara Ndị Ọzọ Oche: Ndị i nwere ike ịchọtara oche bụ naanị ndị gị na ha so n’otu ụgbọala ma ọ bụ ndị gị na ha bi n’otu ụlọ, nakwa ndị ị na-amụrụ Baịbụl bịara mgbakọ ahụ.—1 Kọr. 13:5.
◼ Nri Ehihie: Biko, buru nri ehihie gị bịa n’ụlọ mgbakọ kama ịga zụwa nri mgbe a gbasara ihe omume nke ụtụtụ. I nwere ike jiri obere igbe nri ga-abali n’okpuru oche buru nri gị bịa. A chọghị ka e bubata igbe nri ndị buru oké ibu, ihe ndị na-akụwa akụwa, na mmanya na-aba n’anya n’ụlọ mgbakọ.
◼ Onyinye: Anyị nwere ike inye onyinye si anyị n’obi ma anyị gaa mgbakọ distrikti iji gosi na obi dị anyị ụtọ maka mgbakọ ahụ. E nwee onye chọrọ iji akwụkwọ ndọrọ ego nye onyinye ná mgbakọ, o kwesịrị ide okwu atọ bụ́ “Watch Tower Society” n’ebe a na-ede aha onye ga-adọrọ ego ahụ.
◼ Ihe Ọghọm na Ihe Mberede: Ọ bụrụ na ihe gbata gbata emee onye nọ n’Ụlọ Mgbakọ, biko, gwa onye atendantị nọ nso. Onye atendantị ahụ ga-akpọga ya n’ebe a na-anara ọgwụ ozugbo, ka ndị nlekọta ahụ́ ike ruru eru anyị nwere ná ngalaba ahụ lebara onye ahụ anya ma nyere ya aka.
◼ Ọgwụ: Ọ bụrụ na o nwere ọgwụ dọkịta kwuru ka ị na-aṅụ, biko, jiri nke ga-ezuru gị bịa mgbakọ ahụ n’ihi na ị gaghị enweta ya n’Ụlọ Mgbakọ. E kwesịrị itinye ihe ndị e ji gbaa mmadụ ọgwụ n’ebe e wepụtara maka ha. E kwesịghị itinye ha n’ihe ndị ahụ e wepụtara e ji awụnye ahịhịa n’ụlọ mgbakọ ma ọ bụ n’ebe e nyere unu ụlọ.
◼ Akpụkpọ Ụkwụ: Ọ ga-adị mma ma i yiri akpụkpọ ụkwụ na-agaghị enye gị nsogbu ma ị na-aga ije, nke na-agaghịkwa emerụ gị ahụ́ n’ụkwụ.
◼ Sent: Anyị ga-egosi na anyị na-echebara ndị ọzọ echiche ma ọ bụrụ na anyị eselatatụ aka n’otú anyị si agba sent. N’ihi na e nwere ndị ísì sent na-enye nsogbu n’ahụ́.—1 Kọr. 10:24.
◼ Fọm Please Follow Up (S-43): Onye nkwusa ọ bụla kwesịrị iji otu fọm Please Follow Up ma ọ bụ abụọ gaa mgbakọ ahụ. Dejupụta ya ma ọ bụrụ na o nwere onye i ziri ozi ọma ná mgbakọ ahụ, ya enwee mmasị. I dejupụtachaa ya, i nwere ike inye ya ndị nọ n’ebe a na-enye akwụkwọ ná mgbakọ unu ma ọ bụkwanụ gị enye ya odeakwụkwọ ọgbakọ unu ma ị laruo.—Gụọ Ozi Alaeze Anyị nke Mee 2011, peeji nke 3.
◼ Ebe A Na-ere Nri/Ndị Na-ere Ihe ná Mpụga Ụlọ Mgbakọ: Ị gaa ebe a na-ere nri, kpaa ezi àgwà iji sọpụrụ aha Jehova. Ọ gaghị adị mma ịga riwe nri ma ọ bụ zụwa ihe mgbe ihe omume na-aga n’ihu.
◼ Ụlọ Obibi: Ma è nyere anyị ụlọ n’Ụlọ Mgbakọ ma o bụ n’ebe ọzọ, anyị kwesịrị ịna-akpa àgwà otú gosiri na mmụọ nsọ na-achị anyị mgbe ndị na-enye ụlọ n’Ụlọ Mgbakọ ma ọ bụkwanụ ndị na-arụ na họtel gwara anyị ihe anyị ga-eme. (Gal. 5:22, 23) Ha na-arụ nnukwu ọrụ. Obi ga-adị ha ụtọ ma anyị jiri obi ọma na-agwa ha okwu, nweekwara ha ndidi. Anyị kwesịkwara igosi na anyị ghọtara na ọrụ ha na-arụ dị mkpa. Ka anyị lee ihe ụfọdụ anyị ga-eme ya abụrụ na anyị na-echebara ha echiche:
(1) Ị gaa ka e nye gị ụlọ, anarala ọnụ ụlọ ole ị ma na ị gaghị ebicha na ha. Ekwela ka ndị gị na ha ga-anọ n’ụlọ e nyere gị karịa ole e kwuru ga-anọ na ya.
(2) Agwala onye i nwetara ụlọ na nke ya na ị gaghị ebizi n’ụlọ ya, ọ gwụkwala ma ọ bụ n’ihi ihe ụfọdụ ị na-amaghị otú ị ga-esi eme ya. Gbalịa gwa ya n’oge ma ụdị ihe a mee.—Mat. 5:37.
(3) Esila nri n’ebe a na-achọghị ka a nọrọ sie nri. Esila nri mgbe ihe omume na-aga n’ihu n’ihi na nke ahụ anaghị egosi na i ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe.—Luk 10:38-42.
(4) Ndị nne na nna kwesịrị ịma ihe ọ bụla ụmụ ha na-eme ma mgbe ihe omume na-aga n’ihu ma mgbe ha nọ n’ebe e nyere ha ụlọ.
(5) Anọla n’ụlọ ọ bụla ndị na-enye ụlọ na-enyeghị gị. Nọrọ naanị n’ụlọ e nyere gị. Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwoke, anọtela aka n’abalị n’ụlọ e nyere ụmụnna nwaanyị ma ọ bụ hie ebe ahụ. Ụmụnna nwaanyị ekwesịghịkwa ịnọte aka n’ụlọ ụmụnna nwoke ma ọ bụkwanụ hie ebe ahụ.
(6) Ọ bụrụ na e nwee nsogbu n’ebe e nyere gị ụlọ, hụ na ị gwara ndị na-ahụ maka ụlọ ozugbo.
◼ Ozi Afọ Ofufo: Onye ọ bụla chọrọ inye aka kwesịrị ịga na ngalaba na-ahụ maka ozi afọ ofufo n’Ụlọ Mgbakọ ahụ. Ụmụaka ndị na-erubeghị afọ iri na isii nwekwara ike inye aka. Ha kwesịrị ịrụ ọrụ ebe onye ọzọ ga-elebara ha anya, o nwere ike ịbụ nne ha ma ọ bụ nna ha ma ọ bụkwanụ onye ọzọ toro eto nne ha ma ọ bụ nna ha kwetara ka o lebara ha anya.
[Igbe dị na peeji nke 4]
Ihe Anyị Ga-ekwu ma Anyị Chọọ Inye Mmadụ Akwụkwọ Ịkpọ Òkù
Iji hụ na anyị kesara akwụkwọ ịkpọ òkù n’ókèala anyị niile, anyị ekwesịghị ikwuwe oké okwu. I kelechaa onye nwe ụlọ, i nwere ike ikwu, sị: “Anyị na-enye ndị mmadụ akwụkwọ a iji kpọọ ha ka ha soro anyị gaa mgbakọ anyị ga-enwe n’afọ a. Were nke gị. Ị gụọ ya, ị ga-ama ihe ndị ọzọ e kwuru gbasara ya.” Jiri ịnụ ọkụ n’obi kwuo okwu. I nyewe mmadụ akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ ná ngwụcha izu, i kwesịrị inyekọta ya na magazin anyị ma ọ bụrụ na onye nwe ụlọ gosiri mmasị.