Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na n’Ọgọst 13
IZU NA-AMALITE N’ỌGỌST 13
Abụ nke 63 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 25 ¶1-7, igbe dị na p. 199-200 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ezikiel 28-31 (Nkeji 10)
Nke 1: Ezikiel 28:17-26 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Olee Ụgha Ndị A Na-agha Banyere Jizọs Kraịst, Oleekwa nke Bụ́ Eziokwu Banyere Ya? (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Ga-eme Ka Mmadụ Ruo Eru Ikwusa Ozi Ọma—td 37B (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Mee Ka Onye Nwe Ụlọ Tụwa Anya Ka Ị Bịaghachi. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jụọ ndị na-ege ntị ajụjụ ndị a: (1) Anyị zichaa mmadụ ozi ọma, gịnị mere o ji dị mma ka anyị mee ka ọ tụwa anya ka anyị bịaghachi? Oleekwa otú anyị ga-esi eme ya? (2) Anyị chọọ ịjụ onye nwe ụlọ ajụjụ anyị ga-abịaghachi zaa, gịnị ga-enyere anyị aka ịma ajụjụ ga-amasị ya? (3) Olee ihe mere o ji dị mma ka anyị na onye nwe ụlọ yie mgbe anyị ga-abịaghachi? Oleekwa ihe mere o ji dị mma ka anyị nara ya nọmba ekwentị ya ma ọ bụ adres iimel ya ma ọ bụrụ na o nwere nke ọ bụla n’ime ha? (4) Gịnị mere o ji dị mma ka anyị ghara igbu oge tupu anyị agaghachi na nke onye ahụ? (5) Olee ihe ụfọdụ anyị nwere ike idetu gbasara onye ahụ ma anyị zichaa ya ozi ọma?
Nkeji 20: “Mgbakọ Distrikti Na-enyere Anyị Aka Ịghọtakwu Eziokwu Dị na Baịbụl.” Ajụjụ na azịza. Tụleenụ ihe ụfọdụ dị n’isiokwu bụ́: “Ihe Ndị A Ga-eburu n’Uche Banyere Mgbakọ Distrikti nke Afọ 2012.” Mgbe unu na-atụle paragraf nke 9, gwa onye nlekọta ije ozi ka o kwuo otú a ga-esi ekesa akwụkwọ a ga-eji kpọọ ndị mmadụ ka ha bịa mgbakọ a.
Abụ nke 119 na Ekpere