◼ Oge Ihe Omume: N’ụbọchị atọ ahụ dum, ihe omume ga na-amalite ma o jiri nkeji iri abụọ gafee elekere asatọ nke ụtụtụ. A maa ọkwa na a na-aga ịmalite ịkpọ abụ olu ụtọ, anyị niile kwesịrị ịnọdụ ala ka ebe niile ghara ịdị ghaa ghaa ghaa tupu a malite ihe omume. Ihe omume nke ụbọchị Fraịdee na Satọdee ga-emechi mgbe ọ fọrọ nkeji ise ka ọ kụọ elekere anọ nke uhuruchi, ebe nke ụbọchị Sọnde ga-emechi mgbe ọ fọrọ nkeji iri ka ọ kụọ elekere atọ nke uhuruchi.
◼ Mgbakọ Mba Niile: E nwere ebe ndị a ga-enwe mgbakọ mba niile. Cheta na a gụrụ ma oche ma ọnụ ụlọ ma ebe a na-adọsa ụgbọala ọnụ iji mara ọgbakọ ole na mmadụ ole ga-aga mgbakọ ndị ahụ. Ọ bụrụ na onye ọ bụla agaa mgbakọ mba niile nke a na-asịghị ya gaa, o nwere ike ime ka oche ghara izu ndị mmadụ. Ọ bụrụ na e nwere ihe mere na ị gaghị aga mgbakọ nke unu, gị achọọ ịga mgbakọ ọzọ, agakwala mgbakọ mba niile.
◼ Ịdọba Ụgbọala: N’ebe niile a ga-enwe mgbakọ, ndị atendantị ga-egosi ndị mmadụ ebe ha ga-adọba ụgbọala ha. Biko mee ihe ọ bụla ha gwara gị.—1 Kọr. 13:4, 5.
◼ Inwetara Ndị Ọzọ Oche: Ndị i nwere ike inwetara oche bụ naanị ndị gị na ha so n’otu ụgbọala ma ọ bụ ndị gị na ha bi n’otu ụlọ, nakwa ndị ị na-amụrụ Baịbụl bịara mgbakọ ahụ. E nwere ebe e mere ka ndị agadi na ndị ahụ́ na-adịchaghị na-anọ. Ọ bụ naanị otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ na-elekọta onye ahụ ga-anọnyere ya n’ihi na oche dị ebe ahụ ehighị nne.
◼ Ihe Nkiri: Ọ ga-adị mma ka nwanna nwaanyị ọ bụla kere nnukwu ịchafụ wepụ ya ma e mewe ihe nkiri ka ọ ghara ịnọchiri ndị ọzọ ụzọ.
◼ Nri Ehihie: Biko, buru nri ehihie gị bịa n’ụlọ mgbakọ kama ịga zụwa nri mgbe a gbasara ihe omume nke ụtụtụ. Jiri obere ihe a na-etinye nri ga-abali n’okpuru oche buru nri gị bịa. A chọghị ka e bubata ndị nke buru oké ibu n’ụlọ mgbakọ. Ejikwala ihe na-akụwa akụwa abata n’ụlọ mgbakọ.
◼ Onyinye: Anyị nwere ike inye onyinye si anyị n’obi ma anyị gaa mgbakọ ukwu iji gosi na obi dị anyị ụtọ maka mgbakọ ahụ. E nwee onye chọrọ iji akwụkwọ ndọrọ ego nye onyinye ná mgbakọ, o kwesịrị ide okwu abụọ bụ́ “Watch Tower” n’ebe a na-ede aha onye ga-adọrọ ego ahụ.
◼ Ihe Mberede: Ọ bụrụ na ihe gbata gbata emee, biko, gwa onye atendantị nọ nso. Onye atendantị ahụ ga-akpọga onye ahụ ihe mere n’ebe a na-anara ọgwụ ozugbo, ka ndị na-arụ ebe ahụ lebara onye ahụ anya.
◼ Ọgwụ: Ọ bụrụ na o nwere ọgwụ dọkịta kwuru ka ị na-aṅụ, biko, jiri nke ga-ezuru gị bịa mgbakọ ahụ n’ihi na ị gaghị enweta ya n’Ụlọ Mgbakọ. Atụnyela ihe e ji agba ọgwụ n’ihe a na-awụnye ahịhịa n’ụlọ mgbakọ. Tụnye ya n’ebe a na-etufu ihe nwere ike imerụ mmadụ ahụ́.
◼ Akpụkpọ Ụkwụ: Ọtụtụ ndị na-emerụ ahụ́ n’ihi ụdị akpụkpọ ụkwụ ha yi. Ọ ga-adị mma ma i yiri akpụkpọ ụkwụ na-agaghị enye gị nsogbu ma ị na-aga ije, nke na-agaghịkwa emerụ gị ahụ́ n’ụkwụ.
◼ Sent: Anyị ga-egosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya ma ọ bụrụ na anyị eselatatụ aka n’otú anyị si agba sent n’ihi na e nwere ndị ísì ya na-enye nsogbu.—1 Kọr. 10:24.
◼ Fọm Please Follow Up (S-43): Dejupụta fọm Please Follow Up ma e nwee onye i ziri ozi ọma n’ebe ị gara mgbakọ, ya enwee mmasị. I dejupụtachaa ya, nye ya ndị na-arụ n’ebe a na-enye akwụkwọ ná mgbakọ ma ọ bụkwanụ gị enye ya odeakwụkwọ ọgbakọ unu ma ị laruo.
◼ Ebe A Na-ere Nri/Ndị Na-ere Ihe ná Mpụga Ụlọ Mgbakọ: Ị gaa ebe a na-ere nri, kpaa àgwà ga-ewetara aha Jehova otuto. Jie ejiji dị mma. Anyị ekwesịghị ịga zụwa ihe mgbe a na-eme ihe omume.
◼ Ụlọ Obibi:
Ị gaa ka e nye gị ụlọ, anarala ọnụ ụlọ ole ị ma na ị gaghị ebicha na ha. Ekwela ka ndị gị na ha ga-anọ n’ụlọ e nyere gị karịa ole e kwuru ga-anọ na ya.
Agwala onye i nwetara ụlọ na nke ya na ị gaghịzi ebi n’ụlọ ya, ọ gwụkwala ma ọ bụ n’ihi ihe ụfọdụ ị na-amaghị otú ị ga-esi eme ya. Gbalịa gwa ya n’oge ma ụdị ihe a mee.—Mat. 5:37.
Esila nri n’ebe a na-achọghị ka a nọrọ sie nri. Esila nri mgbe a na-eme ihe omume n’ihi na ọ naghị egosi na ihe a na-ekwu dị gị mkpa.
Ndị nne na nna kwesịrị ịma ihe ọ bụla ụmụ ha na-eme ma mgbe a na-eme ihe omume ma mgbe ha nọ n’ebe e nyere ha ụlọ.
Nọrọ naanị n’ụlọ e nyere gị. Anọla na nke a na-enyeghị gị. Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwoke, anọtela aka n’abalị n’ụlọ e nyere ụmụnna nwaanyị, ehikwala ebe ahụ. Ụmụnna nwaanyị ekwesịghịkwa ịnọte aka n’ụlọ ụmụnna nwoke, ha ekwesighịkwa ihi ebe ahụ.
Ọ bụrụ na e nwee nsogbu n’ebe e nyere gị ụlọ, hụ na ị gwara ndị na-ahụ maka ụlọ ozugbo.
◼ Ozi Afọ Ofufo: Onye ọ bụla chọrọ inye aka kwesịrị ịga na ngalaba na-ahụ maka ozi afọ ofufo n’Ụlọ Mgbakọ. Ụmụaka ndị na-erubeghị afọ iri na isii nwekwara ike inye aka. Ha na onye ga-elebara ha anya kwesịrị ịrụkọ. O nwere ike ịbụ nne ha ma ọ bụ nna ha ma ọ bụkwanụ onye ọzọ toro eto nne ha ma ọ bụ nna ha kwetara ka o lebara ha anya.