Ihe Ndị A Ga-eburu n’Uche Banyere Mgbakọ Ukwu
Oge Ihe Omume: N’ụbọchị atọ ahụ a ga-enwe mgbakọ a, ihe omume ga na-amalite ma o jiri nkeji iri abụọ gafee elekere asatọ nke ụtụtụ. A maa ọkwa na a na-aga ịmalite ịkpọ abụ olu ụtọ, anyị niile kwesịrị ịnọdụ ala ka ebe niile ghara ịdị ghaa ghaa ghaa tupu a malite ihe omume. Ihe omume nke ụbọchị Fraịdee na Satọdee ga-emechi ma ọ fọ nkeji ise ka ọ kụọ elekere anọ nke mgbede, ebe nke ụbọchị Sọnde ga-emechi ma ọ fọ nkeji iri na ise ka ọ kụọ elekere atọ.
‘Jiri Abụ Too Jehova’: Ndị fere Jehova n’oge ochie bụrụ abụ iji too ya. Ndị na-efe Jehova taa na-abụkwa abụ ma ha zukọta ife ya. (Ọma 28:7) Tupu a malite ihe omume nke ụtụtụ ma ọ bụ nke ehihie n’ụbọchị atọ a ga-enwe mgbakọ a, a ga-ebu ụzọ kpọnye abụ olu ụtọ. E jighị abụ ndị a echere oge, kama ha na-enyere anyị aka ịmatakwu onye Jehova bụ, na-efekwa ya. N’ihi ya, ọ bụrụ na nwanna na-akpọpụta ndị ga-ekwu okwu ekwuo na a chọwala ịkpọnye abụ olu ụtọ, anyị niile kwesịrị ịga nọrọ ọdụ gewe ntị n’abụ ndị ahụ kama ịkpawa nkata. Anyị ga-esi otú a gosi na obi dị anyị ụtọ maka abụ a ụmụnna anyị mepụtara. Ụmụnna ụfọdụ na-agbara onwe ha ụgbọ aga Patasịn n’Amerịka ugboro abụọ n’afọ emepụta ụdị abụ ndị a ka anyị na-egere ha. Abụ olu ụtọ kpọchaa, anyị niile kwesịrị iji obi anyị niile bụọ abụ ndị a họpụtara maka mgbakọ a iji too Jehova.
Ịdọwa Ụgbọala: N’ebe niile a ga-enwe mgbakọ, ndị atendantị ga na-egosi ndị mmadụ ebe ha ga-adọwa ụgbọala ha. Ọ bụrụ na unu si n’otu ezinụlọ, unu nwere ike iburu otu ụgbọala n’ihi na ebe e mere maka ịdọwa ụgbọala ebughị ibu. Biko meenụ ihe ọ bụla ndị atendantị gwara unu.—1 Kọr. 13:4, 5.
Inwetara Ndị Ọzọ Oche: E mepee ụzọ e si abanye ebe a na-enwe mgbakọ, unu ekwola ekwo ka ọ ghara ịdị ka ùnu na-azọ ebe unu ga-anọ azọ. Unu echela naanị gbasara onwe unu. Unu nwere ike ịhapụrụ ndị ọzọ ebe unu gaara achọ ịnọ. Ụdị àgwà a na-egosi na anyị bụ ezigbo Ndị Kraịst, ọ ga-ewetakwara Chineke otuto. (Jọn 13:34, 35; 1 Kọr. 13:5; 1 Pita 2:12) Ndị i nwere ike inwetara oche bụ naanị ndị gị na ha so n’otu ụgbọala ma ọ bụ ndị gị na ha bi n’otu ụlọ ma ọ bụkwanụ ndị ị na-amụrụ Baịbụl bịara mgbakọ. Biko, adọwala ihe ọ bụla n’oche ị na-anaghị edowere mmadụ ka ndị ọzọ nwee ike ịhụ oche ha ga-anọ. E nwere ebe e mere ka ndị agadi na ndị ahụ́ na-adịchaghị na-anọ. Ọ bụ naanị otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ na-elekọta onye ahụ ga-anọnyere ya n’ihi na oche dị ebe ahụ ehighị nne.
Jie Ejiji Dị Mma: Anyị kwesịrị iji ejiji dị mma ma anyị gaa mgbakọ. Ejiji anyị ekwesịghị ịdị ka nke ndị na-abụghị Ndị Kraịst. (1 Tim. 2:9) Anyị nọrọgodị ebe anyị bi, anyị ekwesịghị iji ejiji na-adịghị mma ma ọ̀ bụ tupu a malite ihe omume ma ọ̀ bụ mgbe a gbasara. Ọ bụrụ na anyị ejie ejiji dị mma, anyị ga-enwe ike ịna-eyi baajị anyị, ihere agaghịkwa eme anyị izi ozi ọma mgbe ọ bụla ohere ya pụtara. Ọ bụrụ na anyị ejie ejiji dị mma ná mgbakọ ukwu anyị, ọ ga-eme ka ndị mmadụ chọwa ịmụ Baịbụl, ọ ga-emekwa Jehova obi ụtọ.—Zef. 3:17.
Jizie Ekwentị Ntị Gị ma Ọ Bụ Ihe Ndị Yiri Ya Ejizi: Anyị kwesịrị ime ka ekwentị anyị ma ọ bụ ihe ndị yiri ya ghara ịna-eme mkpọtụ mgbe ihe omume na-aga n’ihu. Anyị ekwesịghị ịdọpụ ụmụnna anyị uche ma ọ bụ nọchie ha ụzọ ma anyị jiri ekwentị anyị ma ọ bụ ihe ndị yiri ya na-esete ihe a na-eme ná mgbakọ. Anyị ekwesịghịkwa iji ha na-ezirịta ozi mgbe ihe omume na-aga n’ihu.
Nri Ehihie: Biko, buru nri ehihie gị bịa n’ụlọ mgbakọ kama ịga zụwa nri mgbe a gbasara ihe omume nke ụtụtụ. Jiri obere ihe a na-etinye nri ga-abali n’okpuru oche buru nri gị bịa. A chọghị ka e bubata ndị nke buru oké ibu n’ụlọ mgbakọ. Ejikwala ihe na-akụwa akụwa abata n’ụlọ mgbakọ.
Onyinye: Anyị nwere ike inye onyinye si anyị n’obi ma anyị gaa mgbakọ ukwu iji kwado ya. E nwee onye chọrọ iji akwụkwọ ndọrọ ego nye onyinye ná mgbakọ, o kwesịrị ide okwu abụọ bụ́ “Watch Tower” n’ebe a na-ede aha onye ga-adọrọ ego ahụ. Mmadụ nwekwara ike isi na kaadị ndọrọ ego ya nye onyinye n’ala mgbakọ.
Ọgwụ: Ọ bụrụ na o nwere ọgwụ dọkịta kwuru ka ị na-aṅụ, biko, jiri nke ga-ezuru gị bịa mgbakọ n’ihi na ị gaghị enweta ya ná mgbakọ ahụ. Atụnyela ihe e ji agba ọgwụ n’ihe a na-awụnye ahịhịa n’ụlọ mgbakọ. Tụnye ya n’ebe a na-atụfu ihe nwere ike imerụ mmadụ ahụ́.
Akpụkpọ Ụkwụ: Kwa afọ, ụfọdụ akpụkpọ ụkwụ ndị mmadụ na-eyi na-emerụ ha ahụ́ n’ụkwụ ma ọ bụ na-eme ka ha daa ada. Ọ ga-adị mma ka i yiri akpụkpọ ụkwụ na-agaghị enye gị nsogbu ma ị na-aga ije, nke na-agaghịkwa emerụ gị ahụ́ n’ụkwụ.
Oche: E kwesịghị ibubata oche e ji akwagharị nwa ọhụrụ ma ọ bụ oche nkịtị n’ụlọ mgbakọ. Ma, ndị nne na nna nwere ike ibubata oche ha ga-ekunye ụmụ ha ka ha ghara ịda, dọwa ya n’akụkụ ha.
Sent: Anyị ga-egosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya ma ọ bụrụ na anyị eselatatụ aka n’otú anyị si agba sent n’ihi na e nwere ndị ísì ya na-enye nsogbu.—1 Kọr. 10:24.
Fọm Please Follow Up (S-43): Dejupụta fọm Please Follow Up ma e nwee onye i ziri ozi ọma n’ebe ị gara mgbakọ, ya enwee mmasị. I dejupụtachaa ya, nye ya ndị na-arụ n’ebe a na-enye akwụkwọ ná mgbakọ ma ọ bụkwanụ gị enye ya odeakwụkwọ ọgbakọ unu ma ị laruo.
Ebe A Na-ere Nri: Ị chọọ ịga ebe a na-ere nri, jie ejiji dị mma, kpaakwa àgwà ga-ewetara aha Jehova otuto n’ebe ahụ.
Ụlọ Obibi:
Ị gaa ka e nye gị ụlọ, anarala ọnụ ụlọ ole ị ma na ị gaghị ebicha na ha. Ekwela ka ndị gị na ha ga-anọ n’ụlọ e nyere gị karịa ole e kwuru ga-anọ na ya.
Agwala onye i nwetara ụlọ na nke ya na ị gaghịzi ebi n’ụlọ ya, ọ gwụkwala ma ọ̀ bụ n’ihi ihe ụfọdụ ị na-amaghị otú ị ga-esi eme ya. Gbalịa gwa ya n’oge ma ụdị ihe a mee ka o nwee ike inye ya onye ọzọ. (Mat. 5:37) Ọ bụrụ na ị gaghịzi ebi n’ụlọ i nwetara na họtel, gwa ndị họtel ahụ ihe dị ka ụbọchị abụọ ma ọ bụ karịa tupu ụbọchị ị gwara ha na ị ga-abanye na ya. Ọ bụrụ na i meghị otú ahụ, ha agaghị enyeghachi gị ego gị.
Ọ bụrụ na i bi na họtel, i jiri ihe e ji ebu ibu bucha ibu gị, weghachikwa ya ebe i si were ya ka ndị ọzọ nwee ike iji ya buo ibu nke ha.
Esila nri n’ebe a na-achọghị ka a nọrọ sie nri.
Emebila ihe oriri ọ bụla a panyere gị na họtel i bi.
Anyị na ndị na-arụ na họtel ma ọ bụ ụmụnna na-enye ụlọ na-emekọ ihe, anyị kwesịrị ịna-akpa àgwà na-egosi na mmụọ nsọ na-achị anyị. Anyị kwesịrị iburu n’obi na ọrụ ha abụghị obere ọrụ n’ihi na ha na-ahụ gbasara ọtụtụ ndị. Ha ga-achọkwa ka anyị na-akwanyere ha ùgwù, na-agwa ha okwu ọma, na-enwekwara ha ndidi.
Ndị nne na nna kwesịrị ịma ihe ọ bụla ụmụ ha na-eme mgbe ha nọ n’ebe e nyere ha ụlọ.
Nọrọ naanị n’ụlọ e nyere gị. Anọla na nke a na-enyeghị gị ka ndị mmadụ ghara iju otu ebe. Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwoke, anọtela aka n’abalị n’ụlọ e nyere ụmụnna nwaanyị, ehikwala ebe ahụ. Ụmụnna nwaanyị ekwesịghịkwa ịnọte aka n’ụlọ ụmụnna nwoke, ha ekwesighịkwa ihi ebe ahụ.
Ọ bụrụ na e nwee nsogbu n’ebe e nyere gị ụlọ, hụ na ị gwara ụmụnna na-ahụ maka ụlọ ozugbo.
Ịrụ Ọrụ ná Mgbakọ: Onye ọ bụla chọrọ ịrụ ọrụ ná mgbakọ kwesịrị ịga na nke ndị na-ahụ maka ndị na-ewepụta onwe ha ịrụ ọrụ n’Ụlọ Mgbakọ. Ụmụaka ndị na-erubeghị afọ iri na isii nwekwara ike inye aka. Ha na onye ga-elebara ha anya kwesịrị ịrụkọ. O nwere ike ịbụ nne ha ma ọ bụ nna ha ma ọ bụkwanụ onye ọzọ toro eto nne ha ma ọ bụ nna ha kwetara ka o lebara ha anya.