Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/13 p. 3-5
  • Àgwà Na-ewetara Chineke Otuto

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Àgwà Na-ewetara Chineke Otuto
  • Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Na-emenụ Omume Dị Mma Na-etiti Ndị Mba Ọzọ”
    Ozi Alaeze Anyi—2014
  • Ihe Ndị A Ga-eburu n’Uche Banyere Mgbakọ Ukwu
    Ozi Alaeze Anyi—2015
  • Mgbakọ Distrikti Na-enyere Anyị Aka Ịghọtakwu Eziokwu Dị na Baịbụl
    Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Ụbọchị Atọ A Ga-eji Wusie Okwukwe Anyị Ike
    Ozi Alaeze Anyi—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2013
km 8/13 p. 3-5

Àgwà Na-ewetara Chineke Otuto

1. Olee otú ndị mmadụ si ama na Ndịàmà Jehova abịala mgbakọ?

1 Mgbe ọ bụla anyị na-aga mgbakọ, ndị mmadụ na-ama. N’ọtụtụ ebe, ụlọ mgbasa ozi na-agwa ndị mmadụ na anyị abịala mgbakọ. Ụmụnna anyị na-ejukwa na họtel dị iche iche nakwa n’ebe a na-ere nri. Ndị mmadụ na-ahụkwa ọtụtụ Ndịàmà Jehova ka ha yi baajị. Ka anyị kwuo ihe ụfọdụ ga-enyere anyị aka ịkpa àgwà ga-ewetara Chineke otuto mgbe anyị gara mgbakọ.—1 Pita 2:12.

2. Olee otú ejiji anyị nwere ike isi wetara Chineke otuto ma anyị gaa mgbakọ?

2 Ejiji Dị Mma: Otú ejiji anyị na-adị ma anyị jikere gaa igere ihe omume na-amasị ndị mmadụ. Ma, otú anyị si jie ejiji mgbe a gbasara ihe omume, dị ka mgbe anyị gara ịzụ ihe, na-akacha agwa ndị mmadụ ụdị ndị anyị bụ. Ihe anyị na-eyi mgbe a gbasara ihe omume na-adị iche n’ihe anyị na-eyi mgbe a na-eme ihe omume. Ma, anyị kwesịrị iyi ihe dị mma n’anya, ọ bụghị nke ga-atapara anyị n’ahụ́ ma ọ bụkwanụ nke a ga na-ahụ ihe anyị yi n’ime. Ndị mmadụ kwesịrị ịhụ na anyị dị iche. (Rom 12:2) Anyị kwesịkwara ịna-eyi baajị anyị. Ọ na-eme ka ndị mmadụ mara na e nwere mgbakọ n’obodo ha. Ọ na-enyekwara anyị aka izi ozi ọma, na-emekwa ka ụmụnna anyị mara ndị anyị bụ.

3. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị nwere ndidi, na-akpakwa ezigbo àgwà?

3 Ndidi na Ezigbo Àgwà: Ihe ọtụtụ na-eche taa bụ naanị onwe ha, ha anaghịkwa ekele ndị meere ha ihe. Obi ga-adị ndị mmadụ ụtọ ma anyị na-enwe ndidi ma na-akpa ezigbo àgwà n’ebe anyị bi ma ọ bụkwanụ ma anyị gaa ịzụ ihe. (2 Tim. 3:1-5) Anyị kwesịrị ibu ndị ọzọ n’obi mgbe anyị na-enweta oche ma ọ bụkwanụ mgbe a na-eke akwụkwọ ọhụrụ. (1 Kọr. 10:23, 24) Otu nwoke bịara mgbakọ anyị kwuru na ya e nweghị ike icheta ihe e kwuru ná mgbakọ ahụ ọ gara, ma ya agaghị echefu otú ụmụnna ndị ahụ si na-akpa ezigbo àgwà.

4. Gịnị mere anyị ga-eji wepụta onwe anyị ịrụ ọrụ ná mgbakọ ma ọ bụrụ na anyị ga-emeli ya?

4 Wepụta Onwe Gị: Ihe e ji mara Ndị Kraịst bụ na ha na-ewepụta onwe ha ịrụrụ Jehova ọrụ. (Ọma 110:3) Ì nwere ike iwepụta onwe gị ka i soro rụọ ọrụ ná mgbakọ distrikti afọ a? N’otu ebe a chọrọ ịnọ nwee mgbakọ, ihe dị ka narị ụmụnna isii gara zachaa ebe ahụ tupu a malite mgbakọ ahụ. Ndị na-arụ ebe ahụ kwuru, sị: “Anyị ahụtụbeghị ụdị ihe a. O juru anyị anya na a gaghị akwụ ndị a niile bịara rụọ ọru a ụgwọ.” Ọ dị anyị ka mgbakọ distrikti nke afọ a mee bịawa abịawa ka anyị nụ ihe Jehova ga-agwa anyị. Ọ bụghị naanị na anyị ga-ege ntị ma mụta ihe kama, anyị ga-etokwa Jehova bụ́ Chineke anyị.

[Igbe dị na peeji nke 4, 5]

Ihe Ndị A Ga-eburu n’Uche Banyere Mgbakọ Distrikti nke Afọ 2013

◼ Oge Ihe Omume: N’ụbọchị atọ ahụ dum, ihe omume ga na-amalite ma o jiri nkeji iri abụọ gafee elekere itoolu nke ụtụtụ. A maa ọkwa na a na-aga ịmalite ịkpọ abụ olu ụtọ, anyị niile kwesịrị ịnọdụ ala ka ebe niile ghara ịdị ghaa ghaa ghaa tupu a malite ihe omume. Ihe omume nke ụbọchị Fraịdee na Satọdee ga-emechi mgbe ọ fọrọ nkeji iri ka ọ kụọ elekere ise nke uhuruchi, ebe nke ụbọchị Sọnde ga-emechi mgbe ọ fọrọ nkeji iri abụọ na ise ka ọ kụọ elekere anọ nke uhuruchi.

◼ Ịdọba Ụgbọala: N’ebe niile a ga-enwe mgbakọ, ndị atendantị ga-egosi ndị mmadụ ebe ha ga-adọba ụgbọala ha. Biko mee ihe ha gwara gị.—1 Kọr. 13:4, 5.

◼ Inwetara Ndị Ọzọ Oche: Ndị i nwere ike inwetara oche bụ naanị ndị gị na ha so n’otu ụgbọala ma ọ bụ ndị gị na ha bi n’otu ụlọ, nakwa ndị ị na-amụrụ Baịbụl bịara mgbakọ ahụ.—1 Kọr. 13:5.

◼ Nri Ehihie: Biko, buru nri ehihie gị bịa n’ụlọ mgbakọ kama ịga zụwa nri mgbe a gbasara ihe omume nke ụtụtụ. Jiri obere ihe a na-etinye nri ga-abali n’okpuru oche buru nri gị bịa. A chọghị ka e bubata ndị nke buru oké ibu n’ụlọ mgbakọ. Ejikwala ihe na-akụwa akụwa abata n’ụlọ mgbakọ.

◼ Onyinye: Anyị nwere ike inye onyinye si anyị n’obi ma anyị gaa mgbakọ distrikti iji gosi na obi dị anyị ụtọ maka mgbakọ ahụ. E nwee onye chọrọ iji akwụkwọ ndọrọ ego nye onyinye ná mgbakọ, o kwesịrị ide okwu abụọ bụ́ “Watch Tower” n’ebe a na-ede aha onye ga-adọrọ ego ahụ.

◼ Ihe Mberede: Ọ bụrụ na ihe gbata gbata emee, biko, gwa onye atendantị nọ nso. Onye atendantị ahụ ga-akpọga onye ahụ ihe mere n’ebe a na-anara ọgwụ ozugbo, ka ndị na-arụ ebe ahụ lebara onye ahụ anya.

◼ Ọgwụ: Ọ bụrụ na o nwere ọgwụ dọkịta kwuru ka ị na-aṅụ, biko, jiri nke ga-ezuru gị bịa mgbakọ ahụ n’ihi na ị gaghị enweta ya n’Ụlọ Mgbakọ. Atụnyela ihe e ji agba ọgwụ n’ihe a na-awụnye ahịhịa n’ụlọ mgbakọ. Tụnye ya n’ebe a na-etufu ihe nwere ike imerụ mmadụ ahụ́.

◼ Akpụkpọ Ụkwụ: Ọtụtụ ndị na-emerụ ahụ́ n’ihi ụdị akpụkpọ ụkwụ ha yi. Ọ ga-adị mma ma i yiri akpụkpọ ụkwụ na-agaghị enye gị nsogbu ma ị na-aga ije, nke na-agaghịkwa emerụ gị ahụ́ n’ụkwụ.

◼ Sent: Anyị ga-egosi na anyị na-echebara ndị ọzọ echiche ma ọ bụrụ na anyị eselatatụ aka n’otú anyị si agba sent n’ihi na e nwere ndị ísì ya na-enye nsogbu.—1 Kọr. 10:24.

◼ Fọm Please Follow Up (S-43): Dejupụta fọm Please Follow Up ma e nwee onye i ziri ozi ọma n’ebe ị gara mgbakọ, ya enwee mmasị. I dejupụtachaa ya, nye ya ndị na-arụ n’ebe a na-enye akwụkwọ ná mgbakọ ma ọ bụkwanụ gị enye ya odeakwụkwọ ọgbakọ unu ma ị laruo.

◼ Ebe A Na-ere Nri/Ndị Na-ere Ihe ná Mpụga Ụlọ Mgbakọ: Ị gaa ebe a na-ere nri, kpaa àgwà ga-eme ka ndị mmadụ sọpụrụ aha Jehova. Jie ejiji dị mma. Anyị ekwesịghị ịga zụwa ihe mgbe a na-eme ihe omume.

◼ Ụlọ Obibi:

(1) Ị gaa ka e nye gị ụlọ, anarala ọnụ ụlọ ole ị ma na ị gaghị ebicha na ha. Ekwela ka ndị gị na ha ga-anọ n’ụlọ e nyere gị karịa ole e kwuru ga-anọ na ya.

(2) Agwala onye i nwetara ụlọ na nke ya na ị gaghịzi ebi n’ụlọ ya, ọ gwụkwala ma ọ bụ n’ihi ihe ụfọdụ ị na-amaghị otú ị ga-esi eme ya. Gbalịa gwa ya n’oge ma ụdị ihe a mee.—Mat. 5:37.

(3) Esila nri n’ebe a na-achọghị ka a nọrọ sie nri. Esila nri mgbe a na-eme ihe omume n’ihi na o gosighị na i ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe.

(4) Ndị nne na nna kwesịrị ịma ihe ọ bụla ụmụ ha na-eme ma mgbe a na-eme ihe omume ma mgbe ha nọ n’ebe e nyere ha ụlọ.

(5) Nọrọ naanị n’ụlọ e nyere gị. Anọla na nke a na-enyeghị gị. Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwoke, anọtela aka n’abalị n’ụlọ e nyere ụmụnna nwaanyị, ehikwala ebe ahụ. Ụmụnna nwaanyị ekwesịghịkwa ịnọte aka n’ụlọ ụmụnna nwoke, ha ekwesighịkwa ihi ebe ahụ.

(6) Ọ bụrụ na e nwee nsogbu n’ebe e nyere gị ụlọ, hụ na ị gwara ndị na-ahụ maka ụlọ ozugbo.

◼ Ozi Afọ Ofufo: Onye ọ bụla chọrọ inye aka kwesịrị ịga na ngalaba na-ahụ maka ozi afọ ofufo n’Ụlọ Mgbakọ. Ụmụaka ndị na-erubeghị afọ iri na isii nwekwara ike inye aka. Ha na onye ga-elebara ha anya kwesịrị ịrụkọ. O nwere ike ịbụ nne ha ma ọ bụ nna ha ma ọ bụkwanụ onye ọzọ toro eto nne ha ma ọ bụ nna ha kwetara ka o lebara ha anya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya