Ì Jikerela Maka Oriri Ime Mmụọ?
1. Olee otú onye kpọrọ oriri si ejikere maka ya?
1 Onye kpọrọ oriri na-ejikere nke ọma. Ọ ga-aga zụta ihe ọ ga-esi, sie ya otú ọ ga-atọ ụtọ, ma bupụtara ya ndị ọ kpọrọ oriri. Ọ ga-ahazikwa otú ọ ga-esi enye ndị ahụ nri. Ihe ọzọ ọ ga-eme bụ idozi ebe a ga-anọ eri nri ahụ. Ndị a kpọrọ oriri ga-ejikerekwa ejikere, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ebe ha ga-aga oriri ahụ dịtụ anya. Ọ bụ eziokwu na nnukwu ọrụ dịịrị onye kpọrọ ndị mmadụ oriri, obi na-adị ya ụtọ mgbe ya na ndị enyi ya na ndị ezinụlọ ya nọkọrọ rie nri ahụ dị ụtọ. N’oge na-adịghị anya, Ndịàmà Jehova n’ụwa niile ga-agbakọta n’ìgwè n’ìgwè maka iri nri ime mmụọ ha tụwara anya ya kemgbe, ya bụ, Mgbakọ Distrikti “Na-echenụ Nche!” A rụọla ọtụtụ ọrụ iji kwadebe okwu ndị a ga-ekwu nakwa ihe ndị ọzọ a ga-eme ná mgbakọ ahụ. A kpọrọ anyị niile òkù ịbịa. Ka anyị nwee ike ịga mgbakọ ahụ ma rite ezigbo uru na ya, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ijikere nke ọma.—Ilu 21:5.
2. Olee ihe ndị anyị ga-eme iji nọrọ ya n’ụbọchị niile a ga-eri nri ime mmụọ a?
2 Rite Ezigbo Uru: Ì mechaala ndokwa niile dị mkpa ka i mee iji hụ na i so rie nri ime mmụọ ahụ niile? Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, gwa onye were gị n’ọrụ na ị ga-aga nnọkọ niile nke mgbakọ ahụ malite n’ụbọchị mbụ ruo n’ụbọchị ikpeazụ. Ì mechaala ndokwa maka ụgbọ ị ga-eji aga na ebe ị ga-arahụ? Ndị okenye kwesịrị ịhụ na e mere ndokwa dị mma maka ndị agadi na ndị ahụ́ na-adịghị ma ọ bụ ndị ọzọ chọrọ enyemaka.—Jere. 23:4; Gal. 6:10.
3. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịga mgbakọ mba niile a na-agwaghị anyị gaa?
3 N’obodo ụfọdụ, a ga-enwe mgbakọ mba niile. Buru n’obi na e nwere ọgbakọ ndị a họọrọ ka ha gaa mgbakọ ahụ, nweekwa ndị ga-esi obodo ọzọ gaa ya. Mgbe alaka ụlọ ọrụ na-ahazi mgbakọ mba niile a, ha leziri anya nke ọma tụlee oche ole dị n’ebe ndị a ga-eme ya na ụlọ ole dị na họtel ndị a chọtara maka ndị ga-aga ya, jiri ya kpebie mmadụ ole ha ga-agwa ka ha gaa. Mmadụ ga-akarị akarị ma ọ bụrụ na ndị nkwusa agaa mgbakọ mba niile a na-agwaghị ha gaa.
4. Olee ihe ndị ga-enyere anyị aka ijikere maka okwu nke ụbọchị ọ bụla?
4 Gbalịa hụ na ị garuru n’ụlọ mgbakọ n’oge n’ụbọchị ọ bụla, ka i nwee ike nweta oche tupu ihe omume amalite. Jiri nkeji ole na ole leruo akwụkwọ usoro ihe omume gị anya tupu a malite. Nke a ga-enyere gị aka ịkwadebe obi gị maka ihe ndị a ga-atụle. (Ezra 7:10) Ọ bụrụ na onyeisi oche nnọkọ ekwuo na abụ olu ụtọ na-aga ịmalite, gere abụ olu ụtọ ahụ, ma jikere iso n’abụ nakwa n’ekpere mmeghe.
5. Olee otú ezinụlọ anyị ga-esi erite ezigbo uru n’ihe omume?
5 Ọ bụrụ na ezinụlọ anọkọọ ọnụ, ọ ga-eme ka ndị nne na nna hụ na ụmụ ha na-ege ntị nke ọma. (Diut. 31:12) A na-agba mmadụ niile ume ka ha na-asapeta Baịbụl ha ma soro mgbe a na-agụ amaokwu Akwụkwọ Nsọ ọ bụla. Idetu ihe ụfọdụ ga-enyere gị aka ige ntị nke ọma. E mechaa, ihe ndị ahụ i dere ga-enyere gị aka icheta isi ihe ndị e kwuru. Gbalịa ka gị na mmadụ ghara ịna-akparịta ụka ma ọ bụkwanụ ka ị ghara ịna-agagharị mgbe a na-ekwu okwu. Ọ bụrụ na i nwere ekwe ntị, ekwela ka ọ dọpụ gị ma ọ bụ ndị ọzọ uche. Ọ bụrụ na a gbasaa n’ụbọchị ọ bụla, í cheghị na ọ ga-adị mma ma gị na ndị ọzọ kwurịta ihe ndị e kwuru tọrọ unu ụtọ?
6. Olee ohere pụrụ iche anyị na-enwe ná mgbakọ anyị, oleekwa otú anyị ga-esi rite ezigbo uru na ya?
6 Ná mgbakọ distrikti, anyị na-enwe ohere anyị na ụmụnna anyị na-eji akpakọrịta, bụ́kwanụ ohere ndị ụwa na-enweghị. (Ọma 133:1-3; Mak 10:29, 30) Ọ́ gaghị adị mma ma i kpebie ugbu a na ị ga-eme ka ndị gị na ha nọ n’oche mata onye ị bụ ma soro ha kwurịta okwu n’oge nri ehihie? Nke a bụ otu uru ọ na-aba ma mmadụ buru nri ehihie bịa nọrọ n’ala mgbakọ rie ya kama ịgawa n’ebe a na-ere nri. Hụ na oge a anyị na ụmụnna anyị ji agbarịta onwe anyị ume akwaghị gị.—Rom 1:11, 12.
7. Olee ihe anyị kwesịrị ime ugbu a banyere uwe anyị ga-eyi ná mgbakọ?
7 Ejiji: Ọ dị mma ịmara na Jehova nyere ụmụ Izrel iwu ka ha dụnye ihe dị yọrị yọrị n’ọnụ ọnụ ala uwe mwụda ha, dụnyekwa eriri na-acha anụnụ anụnụ n’elu ebe ahụ a dụnyere ihe ahụ dị yọrị yọrị. (Ọnụ Ọgụ. 15:37-41) Ihe ahụ ha dụnyere ga na-echetara ha na ha bụ ndị Jehova họpụtara iche ife ya ofufe. Taa, uwe dị mma na nke dị ùgwù anyị yi ná mgbakọ na-eme ka anyị dị iche n’ụwa. Ọ na-agbara ndị na-ahụ anyị àmà, ọbụna mgbe anyị gara n’ebe a na-ere nri n’oge ihe omume gbasara. N’ihi ya, bido ugbu a chebawara uwe ị ga-eyi echiche.
8. Olee otú anyị ga-esi agbara ndị ọzọ àmà n’ebe anyị gara mgbakọ?
8 Gbaara Ndị Mmadụ Àmà: Anyị ga-enwe ike ịgbara ndị bi n’obodo anyị ga-aga mgbakọ àmà ma ọ bụrụ na anyị akwadebe ugbu a. Otu nwanna nwoke na nwunye ya gara iri ihe n’otu ụlọ nri mgbe a gbasara ihe omume. Mgbe ha ruru, nwanna nwoke ahụ gosiri onye wetaara ha nri baajị mgbakọ o yi, jụzie ya, sị: “Ò nweela ndị ị hụrụ yi ụdị baajị a?” Onye ahụ gwara ya na ya ahụla ha ma na-eche ihe mere onye ọ bụla n’ime ha ji yiri baajị ahụ. Ha maliteziri ịkparịta ụka, nwanna ahụ agwakwa ya ka ọ bịa mgbakọ ahụ.
9. Olee otú anyị ga-esi egosi Onye kpọrọ anyị oriri, bụ́ Jehova, na obi dị anyị ụtọ?
9 Ọ bụ eziokwu na ọ bụ ụmụnna anyị ga-eme ihe omume niile, ma okwu, ma ajụjụ ọnụ, ma ihe ngosi, ọ bụ Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, ji ịhụnanya ya na-enye anyị nri ime mmụọ a kwa afọ. (Aịza. 65:13, 14) Anyị ga-egosi na obi dị anyị ụtọ n’ihe Onye kpọrọ anyị oriri a nyere anyị ma ọ bụrụ na anyị anọrọ ya n’ụbọchị ọ bụla, ma soro rie nri ime mmụọ niile a ga-enye anyị. Ì mechaala ndokwa niile i kwesịrị ime?
[Igbe dị na peeji nke 6]
Ihe Ndị A Ga-eburu n’Uche Banyere Mgbakọ Distrikti
◼ Oge Ihe Omume: N’ụbọchị atọ ahụ dum, ihe omume ga na-amalite ma o jiri nkeji iri abụọ gafee elekere itoolu nke ụtụtụ. Mgbe a mara ọkwa na a na-aga ịmalite ịkpọ abụ olu ụtọ, anyị niile kwesịrị ịnọdụ ala ka e nwee ike ịmalite ihe omume a n’ụzọ dị ùgwù. Ihe omume nke ụbọchị Friday na Saturday ga-emechi mgbe ọ fọrọ nkeji ise ka ọ kụọ elekere ise nke uhuruchi, ebe nke ụbọchị Sunday ga-emechi n’elekere anọ nke uhuruchi. Ma ná mgbakọ mba niile, ihe omume ga-amalite na Thursday ma o jiri nkeji iri abụọ gafee elekere mbụ nke ehihie, mechiekwa ma ọ fọdụ nkeji iri na ise ka ọ kụọ elekere ise nke uhuruchi.
◼ Ịdọba Ụgbọala: N’ebe niile a ga-eme mgbakọ, ndị atendantị ga-egosi ndị mmadụ ebe ha ga-adọwa ụgbọala ha ji bịa. Biko soro ntụziaka ha.—1 Kọr. 14:40.
◼ Ịchọtara Ndị Ọzọ Oche: Ndị i nwere ike ịchọtara oche bụ naanị ndị gị na ha so n’otu ụgbọala ma ọ bụ ndị gị na ha bi n’otu ụlọ.
◼ Nri Ehihie: Biko, buru nri ehihie gị bịa n’ụlọ mgbakọ kama ịga zụwa nri mgbe a gbasara ihe omume nke ụtụtụ. I nwere ike jiri obere igbe nri ga-abali n’okpuru oche buru nri gị bịa. A chọghị ka e bubata igbe nri ndị buru oké ibu, ihe ndị na-akụwa akụwa, na mmanya na-aba n’anya n’ụlọ mgbakọ.
◼ Onyinye: Anyị nwere ike igosi ekele anyị nwere maka mgbakọ anyị site n’inye onyinye afọ ofufo maka ọrụ zuru ụwa ọnụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị ma ọ bụ ná mgbakọ distrikti. N’akwụkwọ ndọrọ ego ọ bụla a ga-enye n’onyinye ná mgbakọ distrikti, e kwesịrị ide okwu abụọ bụ́ “Watch Tower” n’ebe a na-ede aha onye ga-adọrọ ego ahụ.
◼ Ihe Ọghọm na Ihe Mberede: Ọ bụrụ na ihe gbata gbata emee onye nọ n’ala mgbakọ, biko, gwa onye atendantị nọ nso. Onye atendantị ahụ ga-akpọga ya n’Ebe Ịnara Ọgwụ ozugbo, ka ndị nlekọta ahụ́ ike ruru eru anyị nwere ná ngalaba ahụ lebara onye ahụ ahụ́ na-adịghị anya ma nyere ya aka.
◼ Itinye Ihe A Na-ekwu na Teepụ: E kwesịghị ịkwụnye ihe ọ bụla e ji eteepụ ihe n’ọkụ eletrik ma ọ bụ n’ígwè okwu ndị dị n’ala mgbakọ. Ma e nwere ike itinye ihe ndị a na-eme na teepụ naanị ma ọ bụrụ na ọ gaghị adọpụ ndị ọzọ uche.
◼ Oche E Ji Akwagharị Nwa Ọhụrụ: E kwesịghị ibubata oche e ji akwagharị nwa ọhụrụ n’ụlọ mgbakọ. Ma e nwere ike bubata oche e ji ejide ụmụaka ka ha ghara ịda, dewe ya n’ebe ndị mụrụ ha nọ.
◼ Ihe Nkiri: Ọ gaghị adị mma ka ụmụnna nwaanyị fụrụ ịchafụ ndị buru ibu n’ehihie Sunday mgbe a na-eme ihe nkiri, n’ihi na ọ ga-eme ka ndị nọ ha n’azụ ghara ịhụ ihe a na-eme. Ha ekwesịghị ime otú ahụ n’ihi otú e si arụ Ụlọ Mgbakọ ugbu a.—1 Kọr. 10:24.
◼ Sent: Anyị ga-egosi na anyị na-echebara ndị ọzọ echiche ma ọ bụrụ na anyị eselatatụ aka n’otú anyị si agba sent. Nke a bụ n’ihi ndị ísì sent na-enye nsogbu n’ahụ́.—Fil. 2:4.
◼ Fọm A Na-edejupụta ma Mmadụ Gosi Mmasị: E kwesịrị idejupụta fọm Please Follow Up (S-43) ma e nwee onye anyị ziri ozi ọma gosiri mmasị n’ebe anyị gara mgbakọ distrikti. Ndị nkwusa kwesịrị iji otu fọm a ma ọ bụ abụọ bịa mgbakọ. Ọ bụrụ na i dejupụtara fọm a, i nwere ike iwega ya na Ngalaba Na-ahụ Maka Akwụkwọ ma ọ bụkwanụ nye ya odeakwụkwọ ọgbakọ unu ma unu lọta mgbakọ.
◼ Ebe A Na-ere Nri/Ndị Na-ere Ihe ná Mpụga Ụlọ Mgbakọ: Ị gaa ebe a na-ere nri, kpaa ezi àgwà iji sọpụrụ aha Jehova. Ọ gaghị adị mma ịga riwe nri ma ọ bụ zụwa ihe mgbe ihe omume na-aga n’ihu. Ọ bụrụ na e nwere ihe ị chọrọ ịzụ, ọ ga-akacha mma ịzụ ya tupu ihe omume amalite ma ọ bụ mgbe a gbasara.
◼ Ụlọ Obibi: (1) Gosi na i nwere àgwà e ji mara onye mmụọ Chineke na-edu mgbe ị gara ka e nye gị ụlọ n’ebe a na-eme mgbakọ. (2) Anọla n’ụlọ obibi ndị dị n’ala mgbakọ ma ọ bụrụ na ọ bụghị Ndị Na-enye Ụlọ n’Ala Mgbakọ nyere gị ya. Nọrọ naanị n’ebe ha nyere gị ụlọ. (3) Ọ bụrụ na ịbụ nwanna nwoke, anọtela aka n’abalị n’ụlọ e nyere ụmụnna ndị nwaanyị ma ọ bụ hie ebe ahụ. Ụmụnna nwaanyị ekwesịghịkwa ime otú ahụ. (4) Ọ bụrụ na e nwee nsogbu n’ebe e nyere gị ụlọ, hụ na ị gwara ndị na-ahụ maka ụlọ ozugbo. (5) Ọ bụrụ na e nyere gị ụlọ na họtel, mee ihe otú ndị họtel ahụ chọrọ ka e si na-eme. (6) Esila nri n’ebe a na-achọghị ka a nọrọ sie nri. (7) Esila nri mgbe ihe omume na-aga n’ihu n’ihi na nke ahụ anaghị egosi na i ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe.—Luk 10:38-42.