Imeru Ihe n’Ókè n’Uwe na n’Ejiji
1 “Ndị nwoke nile, ọbụna ụmụ nwoke ndị ka na-eto eto kpọrọ taị. Ụmụ nwanyị nile na ụmụaka ndị nwanyị nile, ma ndị nọ n’oge uto ma ndị obere, yi uwe gbadara agbada ma ọ bụ sket. E nweghị onye yi uwe jeans ma ọ bụ uwe a na-akpọchighị olu ya akpọchi. Onye ọ bụla nọ n’ebe a na-egbuke egbuke.” Nke a bụ ihe otu akụkọ kwuru. Ụdị ìgwè mmadụ dị aṅaa ka ọ na-akọwa? Ọ̀ bụ nzukọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị? Ọ̀ bụ asọmpi egwuregwu? Ọ̀ bụ ndị na-eti egwú rock? Ọ dịghị ma ọlị! Ọ na-akọwa ìgwè ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị bịara otu mgbakọ distrikti buru ibu n’afọ gara aga.
2 N’obodo ọzọ e nwere mgbakọ, otu onye nta akụkọ nke otu akwụkwọ akụkọ si otú a kọwaa ìgwè Ndịàmà ahụ: “Ndị nwoke nile dị ọcha, yiri kootu, kpọọkwa taị. Ndị nwanyị yi uwe kwesịrị ekwesị, maakwa mma.” Onye nke abụọ na-ekiri ihe na-emenụ, bụ́ onye nche, kwuru, sị: “Unu bụ ndị na-akpa àgwà ọma, ndị na-akwanyere mmadụ ùgwù, na ndị na-adị ọcha. Ihe m hụrụ masịrị m. N’ime ụwa a ruru unyi, unu ekpochapụwo unyi!” Lee okwu ọma ha bụ banyere anyị! Ọ̀ bụ na anyị enweghị ekele na a pụrụ ikwu okwu ọma ndị dị otú a banyere òtù ụmụnna anyị? N’ezie, ndị nile so n’ìgwè ahụ tụnyere ụtụ n’akụkọ ọma ndị ahụ site n’ọdịdị ha kwesịrị nṅomi.
3 A marawo n’ụwa nile na anyị dị nnọọ iche n’otú anyị si eji ejiji. (Mal. 3:18) N’ihi gịnị? N’ihi na anyị na-agbaso ndụmọdụ ahụ sitere n’Akwụkwọ Nsọ nke bụ́ iji “uwe a haziri nke ọma na-achọ onwe [anyị] mma n’imeru ihe n’ókè na uche zuru okè, . . . n’ụzọ kwesịrị [ndị] na-ekwupụta na ha na-asọpụrụ Chineke.”—1 Tim. 2:9, 10.
4 Gịnị Ka Ị Na-egosi Site n’Uwe na Ejiji Gị? Uwe ndị anyị na-eyi na otú anyị si eyi ha na-agba àmà doro anya banyere anyị—ihe ndị anyị kwenyere, àgwà, na ebumnuche anyị. Ụdị uwe anyị na-enwe mmasị na ya na-egosi ụdị onye anyị bụ na ihe anyị na-ekwusa. Ọ dịghị mgbe anyị ga-akwalite echiche na omume rụrụ arụ nke ụwa na-eme ka ọ na-ewu ewu. Ihe bụ́ nchegbu anyị abụghị ma ụdị ahụ ọ̀ bụ ụdị na-ewu nnọọ ewu kama ọ bụ ma ò kwesịrị ekwesị maka onye na-asị na ya bụ onyeozi Chineke. (Rom 12:2) Kama ịhọrọ ọdịdị nke na-egosipụta mmụọ nnwere onwe ma ọ bụ nke na-enye echiche ụzọ ndụ rụrụ arụ, anyị na-achọ igosi na anyị na-enye “Chineke otuto” n’ezie.—1 Pita 2:12.
5 Mgbe ụfọdụ, onye bụ́ onye ọhụrụ, onye na-enweghị ahụmahụ, ma ọ bụ onye na-adịghị ike n’ụzọ ime mmụọ pụrụ ịnakwere ihe ọ bụla ụwa na-akwado n’uwe na n’ejiji n’ebughị ụzọ tụlee echiche ọ na-enye banyere Jehova na ọgbakọ ya. Anyị nile pụrụ ime nnyocha onwe onye ụfọdụ iji chọpụta ma echiche nke ụwa ò nwewo mmetụta n’ahụ́ anyị. Anyị pụrụ ijekwuru otu nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ, onye a na-akwanyere ùgwù ma rịọ ya ka ọ gwa anyị n’eziokwu ihe ọ chọpụtara banyere ụdị uwe anyị na-eyi na ejiji anyị na-eji, mgbe ahụkwa, chebasiere aro ndị ọ tụụrụ anyị echiche ike.
6 Ụfọdụ na-ekwere n’egbughị oge na ha kwesịrị ilezi anya n’otú ha si eji ejiji mgbe ha na-aga mgbakọ. Ma ha na-ewetulata aka n’otú ha si eji ejiji n’oge ha na-enwe ntụrụndụ mgbe e mechisịrị ihe omume. Nọgide na-agbaso ụkpụrụ ahụ dị elu nke kwesịịrị ndị ozi bụ́ Ndị Kraịst. (2 Kọr. 6:3, 4) N’ebe ọ bụla anyị na-aga n’ebe ọha na eze pụrụ ịhụ anyị, baajị mgbakọ anyị nakwa uwe na ejiji anyị kwesịrị ekwesị na-eme ka a mata anyị dị ka Ndịàmà Jehova. N’ihi ya, uwe anyị kwesịrị ịbụ nke a haziri nke ọma ma kwesị ekwesị mgbe nile, na-egosipụta na anyị “abụghị akụkụ nke ụwa.”—Jọn 15:19.
7 Ka anyị mee ihe nile anyị pụrụ ime ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi” nke afọ a iji gosi na anyị bụụrụ “Jehova, bụ́ Chineke [anyị] ndị [dị] nsọ.” Okwu ọma ndị ga-esi na ya apụta ga-atụkwasịkwu ihe ‘n’otuto, aha, na ịma mma’ Jehova.—Deut. 26:19.
Igbe dị na peeji nke 6]
Ụzọ Isi Nye Jehova Otuto:
■ Jie ejiji n’ụzọ kwesịrị onye ozi Chineke.
■ Zere ụdị uwe ndị na-egosipụta mmụọ nke ụwa.
■ Gosipụta imeru ihe n’okè, bụ́ nke na-egosi uche zuru okè.