Akụkọ Ọchịchị Chineke
Liberia: E megheghachiri alaka ụlọ ọrụ dị na Monrovia na September 1, ka e mechisịrị ya ruo ọnwa 15 n’ihi agha obodo. Ha nyere akụkọ ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu nke ndị nkwusa a na-enwetụbeghị mbụ bụ́ 1,977 na September.
Mozambique: E ruru ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu nke ndị nkwusa bụ́ 28,005 na September. Ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ochie bụ 25,790 na May 1975, n’ihi ya nke a bụ ihe dị ịrịba ama n’akụkọ ọchịchị Chineke na Mozambique.
Nepal: E ruru ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu nke ndị nkwusa bụ́ 306 na September. A na-eduzi ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọmụmụ Bible 500 ugbu a.
St. Helena: E nyere ụlọ ọ bụla n’àgwàetiti a otu Akụkọ Alaeze nke 35.
Ọtụtụ mba ji ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu nke ndị nkwusa malite afọ ije ozi a, bụ́ nke ruru ịrị elu pasent 5 karịa nkezi nke afọ gara aga: Hong Kong, 4,230; Madagascar, 8,749 (gụnyere ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị ọsụ ụzọ oge nile 912); Taiwan, 3,497.