Mgbakọ Distrikti Na-akpali Anyị Iso Chineke Na-eje Ije
Lee nnọọ ka Mgbakọ Distrikti “Soro Chineke Na-eje Ije” siworo chetaghachiri anyị ntụziaka doro anya Jehova nyere, sị: “Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya”! (Aịsa. 30:21) Itinye ntụziaka ndị e nyere anyị n’ọrụ ga-enyere anyị aka ‘ịnọrọsi ike na nche banyere otú anyị si na-eje ije.’ (Efe. 5:15) Ịtụgharị uche n’ihe ndị anyị mụtara ga-enyere anyị aka ‘ịnọgide na-eje ije n’eziokwu ahụ.’—3 Jọn 3.
Jiri ajụjụ ndị na-esonụ na ihe ndị i deturu ná mgbakọ ahụ kwadebe ma kere òkè n’ịtụleghachi ihe ndị e kwuru n’usoro ihe omume mgbakọ distrikti ahụ. A ga-eme ntụleghachi a ná Nzukọ Ije Ozi nke izu na-amalite March 7.
1. Olee otú Ịnọk si nwee ike iso Chineke jee ije n’agbanyeghị na o bi n’oge ọgba aghara? (Hib. 11:1, 5, 6; Jud 14, 15; “Soro Chineke Na-eje Ije n’Oge Ọgba Aghara”)
2. Olee ebe ndị anyị pụrụ itinye ụkpụrụ ahụ dị na Luk 16:10 n’ọrụ ná ndụ anyị? (“Ị̀ ‘Na-ekwesị Ntụkwasị Obi n’Ihe Kasị Nta’?”)
3. (a) Kwuo ezigbo ihe mmụta anọ dị na Hosea isi 6 ruo 9 bụ́ ndị ga-enyere anyị aka iso Chineke na-eje ije. (Hos. 6:6, 7; 7:14; 8:7) (b) Oleekwa ihe ndị ọzọ dị na Hosea isi 10 ruo 14 bụ́ ndị na-enyere anyị aka iso Chineke na-eje ije? (“Amụma Hosea Na-enyere Anyị Aka Iso Chineke Na-eje Ije”—Okwu Ọtụtụ Ndị Kwuru)
4. Olee ezigbo ihe Ndị Kraịst bụ́ di na nwunye pụrụ ime iji mee ka alụmdi na nwunye ha sie ike? (Ilu 12:4; Efe. 5:29; “Unu Atọsala ‘Ihe Chineke Kekọtaworo’”)
5. Olee otú anyị si egosipụta nkwanye ùgwù maka mgbakọta anyị ndị dị nsọ? (Ekli. 5:1; Aịsa. 66:23; “Igosi Nkwanye Ùgwù Maka Mgbakọta Anyị Ndị Dị Nsọ”)
6. (a) Olee ụzọ atọ dị mkpa anyị si eme nkwusa bụ́ ndị anyị kwesịrị inyocha iji hụ na anyị na-ekere òkè nke ọma na ha? (Aịsa. 52:7; Zek. 8:23; Mak 6:34) (b) Olee ihe ndị dị n’akwụkwọ Good News for People of All Nations ị chọpụtara na ha bara uru nke ukwuu? (“Ozi Ọma Maka Ndị nke Mba Nile”; “Inyere Ndị Na-asụ Asụsụ Ọzọ Aka”)
7. Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị ọhụrụ aka inwe obi ike n’ikwusa ozi Alaeze ahụ? (Ikpe 7:17; “Inyere Ìgwè Mmadụ Aka Isonyere Anyị n’Ozi Ahụ”)
8. Olee otú anyị si egosipụta na anyị kwenyesiri ike na “oké ụbọchị Jehova dị nso”? (Zef. 1:14; “Na-eje Ije n’Okwukwe, Ọ Bụghị n’Ihe Anya Na-ahụ”)
9. (a) Olee ókè anyị ịsụ ngọngọ ma ọ bụ ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ dịruru ná njọ? (Mak 9:42-48) (b) Olee otú anyị pụrụ isi zere ịbụ ndị e mere ka ha sụọ ngọngọ? (Ọma 119:165) (ch) Olee otú anyị pụrụ isi zere ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ? (1 Kọr. 10:24; “Zere ‘Ihe Na-eme Ka A Sụọ Ngọngọ’”)
10. Olee otú anyị pụrụ isi nwee echiche ziri nnọọ ezi ma a bịa n’ịchọ onye anyị ga-alụ, n’ịnara ọgwụgwọ, nakwa n’achụmnta ego? (Ọma 26:4; Mat. 6:25; 1 Tim. 6:9; “Nọgidenụ Na-enwe Uche Ziri Nnọọ Ezi”)
11. (a) Olee ihe dị ịrịba ama banyere oge ndị mmadụ lere Jizọs ọbịa? (Luk 10:42; 24:32) (b) Olee otú anyị pụrụ isi tụrụ ndụ n’ụzọ ga-ewetara anyị na ndị ọzọ ume ọhụrụ? (1 Kọr. 10:31-33; “Ihe Omume Ndị Na-ewuli Elu Bụ́ Ndị Na-enye Ume Ọhụrụ”)
12. Dị ka Abụ Ọma nke 23 si kwuo, olee ngọzi ndị anyị na-enweta dị ka atụrụ Jehova, oleekwa ibu ọrụ ndị anyị nwere? (1 Kọr. 10:21; “Jehova Bụ Onye Na-azụ Anyị Dị Ka Atụrụ”)
13. Olee otú Ndị Kraịst si aṅa ntị na ndụmọdụ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ nke bụ́ ‘ịzụpụta oge kwesịrị ekwesị’? (Efe. 5:16; “Ịzụpụta Oge Kwesịrị Ekwesị”)
14. (a) Gịnị ka ‘oge awa nke ikpe,’ bụ́ nke e kwuru banyere ya ná Mkpughe 14:7 gụnyere? (b) Olee otú anyị si egosi n’eziokwu na anyị abụghị akụkụ nke Babilọn Ukwu ahụ? (“‘Nọrọnụ na Nche’—Oge Awa nke Ikpe Abịawo”) (ch) Olee isi ihe ndị masịrị gị na broshuọ ahụ bụ́ Nọrọ na Nche?
15. Kwuo àgwà atọ ndị dị anyị mkpa iji ghara “ịgbahapụ ụzọ kwụ ọtọ.” (2 Pita 2:15; “Nọrọnụ na Nche Megide ‘Ịgbahapụ Ụzọ Kwụ Ọtọ’”)
16. Olee otú ndị ntorobịa pụrụ isi zere “okporo ụzọ ndị na-emebi iwu”? (Ilu 4:14; “Ndị Ntorobịa—Na-ejenụ Ije n’Ụzọ nke Ezi Omume”)
17. (a) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Pọl si setịpụ ihe nlereanya magburu onwe ya n’ihe banyere ntachi obi? (Ọrụ 14:19, 20; 16:25-33) (b) Gịnị mere na ọ dịghị anyị mkpa ịtụ ndị iro nke ezi ofufe egwu? (Ihe Nkiri na okwu bụ́ “Na-agba Àmà nke Ọma Taa n’Agbanyeghị Mmegide”)
18. Olee ngọzi ndị so Chineke na-eje ije na-enweta? (“Iso Chineke Na-eje Ije Na-eweta Ngọzi Ugbu A Nakwa Ruo Mgbe Ebighị Ebi”)
Ka anyị kpebisie nnọọ ike irube isi ‘n’okwu anyị na-anụ n’azụ anyị’ iji soro Nna anyị nke eluigwe na-eje ije ruo mgbe ebighị ebi.—Aịsa. 30:21; Jọn 3:36.