Mgbakọ Distrikti Na-akpọ Òkù Na-akpali Akpali!—Jiri Ọṅụ Na-eto Jehova Site n’Ụbọchị Ruo n’Ụbọchị!
1 ‘A sị na opi na-ada nke a na-amaghị isi ya, ònye ga-akwadebe onwe ya ije agha?’ ka Pọl onyeozi jụrụ. (1 Kọr. 14:8) Òkù a kpọrọ ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto” ọ̀ dara ụda ma doo anya? Ee, n’ezie. ‘Jiri ọṅụ na-eto Jehova kwa ụbọchị’ bu ozi ahụ na-akpali akpali! À kpaliri obi gị site n’òkù a a kpọrọ ime ihe? Usoro ihe omume mgbakọ ahụ jupụtara n’ezi ihe ndị mere anyị ga-eji na-eto Eze nke mgbe ebighị ebi, bụ́ Jehova, mgbe nile.—Abụ Ọma 35:27, 28.
2 Eluigwe nile nke dị ebube na-akọ ebube Jehova ‘otu ụbọchị na ibe ya.’ (Abụ Ọma 19:1-3) Ọ bụrụ na ihe okike ndị na-enweghị olu okwu, ndị na-adịghị ndụ na-eto Jehova mgbe nile, ọ̀ bụ na anyị bụ́ ụmụ mmadụ nwere ọgụgụ isi ekwesịghị inwe mmetụta nke ịbụ ndị a kpaliri iweli olu anyị n’inye ya otuto mgbe nile n’ihi àgwà ya ndị na-enweghị atụ na ihe ndị ọ na-arụzu? Ònye ruru eru ịnata otuto anyị ji ọṅụ enye karịa Onye Okike anyị dị ebube?—Abụ Ọma 145:3, 7.
3 Site n’Ụbọchị Ruo n’Ụbọchị: Onye ọbụ abụ ahụ e nyere ike mmụọ nsọ dere, sị: “Na-ezisanụ ozi nzọpụta Ya site n’otu ụbọchị ruo ụbọchị ọzọ. N’ihi na Jehova dị ukwuu, bụrụkwa onye a na-eto nke ukwuu.” (Abụ Ọma 96:2, 4) Ọ̀ bụ nanị ndị ọsụ ụzọ ka nke a dịịrị? Ee e! Nke a ọ̀ pụtara na anyị nile kwesịrị ịgwa ndị ọzọ okwu banyere Jehova mgbe ọ bụla na n’ebe ọ bụla anyị nwere ike, ọbụna n’ụbọchị ndị anyị na-anọghị n’ozi ụlọ n’ụlọ? Ee! Mkpa nke ito Jehova kwa ụbọchị na ịgwa ndị ọzọ banyere ụzọ nke nzọpụta ya dị oké ngwa. Ndị mmadụ aghaghị ịmara na Jehova bụ Eze Mgbe Ebighị Ebi, na O nyewokwa Ọkpara Ya e mere ebube, bụ́ Jisọs Kraịst, ịchịisi ụwa. Ịhụnanya maka Jehova na ndị mmadụ ga-eme ka anyị nọgide na-ekwu okwu banyere ozi a na banyere ndokwa ya maka nzọpụta n’ebe ọ bụla a pụrụ ịhụ ndị mmadụ.—Abụ Ọma 71:15.
4 N’ụbọchị nile nke ozi elu ala ya, Jisọs Kraịst setịpụrụ ihe nlereanya kasị mma dị ka onye na-ebute ụzọ n’inye Jehova otuto. Ọ sịrị: “Ekele m [Gị], Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa.” (Mat. 11:25) N’ikwekọ n’okwu ya, n’ebe ọ bụla Jisọs nọ, o toro Jehova n’ihu ọha. N’ebe ọ bụla kwa ìgwè mmadụ gbakọtara—ma ọ̀ bụ n’ụlọ nzukọ ndị Juu, n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem, n’elu ugwu, ma ọ bụ n’akụkụ oké osimiri—o toro Jehova. Ọ bụrụ na anyị agbasochie nzọụkwụ Jisọs anya site n’ịnọgide na-arụchi ọrụ anya kwa ụbọchị n’ibuli Jehova elu n’ihu ọha, anyị ga-anụ ụtọ ihe ọṅụ na obi ụtọ ndị ọ ga-arụpụta.
5 Ịza Òkù Ahụ: Ị̀ ga-aza òkù ahụ nke ito Jehova n’ihu ọha kwa ụbọchị? Cheta, afọ ndụ abụghị ihe mgbochi. Abụ Ọma 148:12 na-akpọ ụmụ okorobịa, ụmụ agbọghọ, ndị agadi na ụmụntakịrị òkù ito Jehova. Ndị na-eto eto, ùnu ga-eto Jehova n’etiti ụmụ akwụkwọ ibe unu na ndị nkụzi n’ime afọ akwụkwọ a? Ndị toruworo ogo mmadụ, ndị unu na ha na-arụkọ ọrụ n’ebe ọrụ hà na-anụ banyere Jehova na nzube ya nile, mgbe e nwere oge kwesịrị ekwesị iji kwurịta okwu? Anyị nile kwesịrị ime ka ikwu okwu banyere Jehova bụrụ akụkụ dị ukwuu nke ndụ anyị dị ka iku ume na iri ihe. Ọbụna ọ bụrụ na ndị na-enweghị mmasị adịghị aṅa ntị n’ihe anyị na-ekwu, e nwere Onye na-aṅa ntị, ọ ga-akwụghachikwa anyị ụgwọ.—Mal. 3:16.
6 Ka ọgwụgwụ nke usoro a na-abịaru nso, òkù ahụ na-apụ gaa ná nsọtụ nile nke ụwa, sị: “Toonụ Ja.” (Abụ Ọma 106:1) Ka iti mkpu otuto anyị na-adawanye ụda ka ụbọchị nke ọ bụla na-agafe, ka ndị nile wee mara na Onye aha ya bụ Jehova bụ Onye Kasị Elu n’elu ụwa nile.—Abụ Ọma 83:18.