Abụ Ọma
Keleenụ Jehova n’ihi na ọ dị mma.+
Ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.+
4 Jehova, biko, cheta m mgbe ị na-emere ndị gị amara.+
Lekọta m ma zọpụta m,
5 Ka ihe ọma ị na-emere ndị ị họọrọ wee baara m uru,+
Ka m wee soro mba gị ṅụrịa ọṅụ,
Ka m wee jiri obi ụtọ soro ndị i ketara too gị.
6 Anyị emehiela otú nna nna anyị hà mehiere.+
Anyị emeela ihe ọjọọ. Anyị akpaala àgwà ọjọọ.+
7 Nna nna anyị hà ejighị ọrụ ndị dị ebube ị rụrụ n’Ijipt kpọrọ ihe.*
Ha echetaghị ịhụnanya gị nke dị ukwuu,
Kama ha nupụrụ isi n’oké osimiri, n’Oké Osimiri Uhie.+
9 Ọ baara Oké Osimiri Uhie mba, ya ataa.
O duuru ha si n’ala ala osimiri ahụ gafere ka à ga-asị na ọ bụ ala ịkpa.*+
11 Mmiri kpuchiri ndị iro ha.
E nweghị otu onye n’ime ha fọrọ.+
12 Ha nweziri okwukwe ná nkwa o kwere.+
Ha malitere ịbụ abụ, na-eto ya.+
13 Ma ha chefuru ihe ndị o mere ngwa ngwa.+
Ha echereghị ka o nye ha ntụziaka.
14 Kama ha nwewere akpịrị ogologo n’ala ịkpa.+
Ha nwara Chineke n’ọzara.+
15 O nyere ha ihe ha rịọrọ,
Ma o mere ka ha malite ịrịa ọrịa ọjọọ nke mere ka ike na-agwụ ha* ma mechaa gbuo ha.+
16 Ha nweere Mosis anyaụfụ n’ebe ha mara ụlọikwuu.
Ha nwekwaara Erọn,+ bụ́ onye nsọ Jehova,+ anyaụfụ.
18 Ọkụ rere ìgwè mmadụ ahụ.
Ọkụ regburu ndị ọjọọ ahụ.+
21 Ha chefuru Chineke,+ Onye Nzọpụta ha,
Onye mere ihe ndị dị ịtụnanya n’Ijipt,+
22 Onye rụrụ ọrụ ndị dị ebube n’ala Ham,+
Meekwa ihe ndị dị egwu n’Oké Osimiri Uhie.+
23 Ọ fọrọ obere ka o nye iwu ka e kpochapụ ha.
Ma Mosis, onye ọ họọrọ, rịọrọ ya arịrịọ
Ka ọnụma ya dajụọ.+
24 Ha wee gosi na e nweghị ihe ha ji ọmarịcha ala ahụ kpọrọ.+
Ha enweghị okwukwe ná nkwa ya.+
25 Ha nọ na-atamu ntamu n’ụlọikwuu ha.+
Ha egeghị ntị n’olu Jehova.+
29 Àgwà ha kpasuru Chineke iwe.+
Ọrịa ọjọọ wee malite ịrịa ha.+
32 Ha kpasuru Chineke iwe na mmiri Meriba.*
Mosis wee banye ná nsogbu n’ihi ha.+
35 Kama ha na ndị mba ọzọ nọ na-emekọ ihe.+
38 Ha nọ na-egbu* ndị aka ha dị ọcha,+
Ya bụ, ụmụ ha ndị nwoke na ụmụ ha ndị nwaanyị,
Ndị ha ji chụọrọ arụsị dị iche iche ndị Kenan na-efe àjà.+
Ọbara ndị ha gburu wee merụọ ala ahụ.
39 Ihe ndị ha na-eme mere ka ha gharazie ịdị ọcha.
Ha kpara àgwà ka ndị akwụna, hapụ Chineke fewe chi ọzọ.+
40 Jehova wee wesa ndị ya iwe dị ọkụ,
Ọ kpọkwara ndị o ketara asị.
42 Ndị iro ha megburu ha,
Chịakwa ha.
43 Ọ napụtara ha ọtụtụ ugboro.+
45 O ji maka ha na-echeta ndụ ya na ha gbara,
Ọ na-emetekwara ha ebere n’ihi ịhụnanya ya nke dị ukwuu.+
47 Jehova Chineke anyị, biko, zọpụta anyị.+
Ka mmadụ niile sịkwa, “Amen!”*
Toonụ Jaa!*