Malakaị
3 “Lee, m na-ezite onye ozi m, ọ ga-edozikwa ụzọ n’ihu m.+ Na mberede, ezigbo Onyenwe unu, onye unu na-achọ, ga-abịa n’ụlọ nsọ ya;+ onye ozi nke ọgbụgba ndụ ga-abịakwa, onye unu na-atụsi anya ya ike. Lee, ọ ga-abịa.” Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.
2 “Ma ònye ga-edili ụbọchị ọ ga-abịa, ònye ga-eguzolikwa mgbe ọ ga-apụta? N’ihi na ọ ga-adị ka ọkụ onye na-anụcha ihe, dịkwa ka ncha+ nke ndị na-asụ ákwà. 3 Ọ ga-anọdụkwa ka onye na-anụcha ihe na onye na-asacha ọlaọcha.+ Ọ ga-asacha ụmụ Livaị. Ọ ga-anụcha ha ka ọlaedo, nụchaakwa ha ka ọlaọcha. Ha ga-abụzi ndị ezi omume ndị na-ewetara Jehova onyinye. 4 Onyinye Juda na Jeruselem na-eweta ga-adị Jehova mma, otú ọ dị ya n’oge ndị dị anya gara aga nakwa otú ọ dị ya n’oge ochie.+
5 “M ga-abịa ikpe unu ikpe. M ga-ama ndị a ikpe ọsọ ọsọ: ndị dibịa afa,+ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko, ndị na-aṅụ iyi ụgha,+ ndị na-aghọgbu onye ha goro ọrụ,+ ndị na-aghọgbu nwaanyị di ya nwụrụ, ndị na-aghọgbu nwa na-enweghị nna,*+ nakwa ndị na-ekweghị enyere onye mbịarambịa aka.*+ Ha anaghị atụ egwu m.” Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.
6 “N’ihi na abụ m Jehova; anaghị m agbanwe agbanwe.*+ Unu bụ ụmụ Jekọb; unu anwụchabeghị. 7 Malite n’ụbọchị ndị nna nna unu, unu hapụrụ ntụziaka m, unu emeghịkwa ha.+ Lọghachikwutenụ m, m ga-alọghachikwutekwa unu.”+ Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.
Ma, unu na-asị: “Olee otú o si bụrụ na anyị kwesịrị ịlọghachikwute gị?”
8 “Mmadụ efu ọ̀ ga-ezu Chineke ohi? Ma unu na-ezu m ohi.”
Unu na-asịkwa: “Olee otú anyị si zuo gị ohi?”
“Unu anaghị eweta otu ụzọ n’ụzọ iri nakwa onyinye dị iche iche. 9 Unu bụ ndị a bụrụ ọnụ* n’ihi na unu na-ezu m ohi. N’eziokwu, mba unu niile na-eme otú ahụ. 10 Webatanụ otu ụzọ n’ụzọ iri niile n’ụlọ nsọ m,*+ ka nri wee dịrị n’ụlọ nsọ m.+ Biko, nwaleenụ m n’ihe a, ka unu hụ ma ọ̀ bụ na mụ agaghị emeghe ọnụ ụzọ mmiri nke eluigwe+ ma wụsa unu ngọzi ruo mgbe ihe ọ bụla na-agaghị akọ unu.”+ Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.
11 “M ga-abara ihe na-eripịa ihe* mba n’ihi unu. Ọ gaghị ebibi ihe ala unu mepụtara, osisi vaịn ndị dị n’ubi unu ga-amịkwa mkpụrụ.”+ Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.
12 Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, “Mba niile ga-ekwu na unu bụ ndị obi ụtọ+ n’ihi na ala unu* ga-abụ ala obi ụtọ.”
13 Jehova kwuru, sị, “Okwu unu kwuru gbasara m dị njọ.”
Unu na-asịkwa: “Olee ihe ọjọọ anyị kwurịtara gbasara gị?”+
14 “Unu na-asị, ‘Ijere Chineke ozi abaghị uru.+ Olee uru anyị ritere na anyị nọ na-eme ihe ọ chọrọ ka anyị mee ma na-agbarụ ihu anyị iji gosi Jehova nke ụsụụ ndị agha na mmehie anyị wutere anyị? 15 Ugbu a, anyị chere na ọ bụ ndị mpako na-enwe obi ụtọ. Ihe na-agazikwara ndị na-eme ajọ omume.+ Ha na-anwa Chineke, ma o nweghị ihe na-eme ha.’”
16 N’oge ahụ, ndị na-atụ egwu Jehova nọ na-akparịta ụka, otu onye na ibe ya, Jehova nọkwa na-ege ntị ma na-anụ ihe ha na-ekwu. E wee nọrọ n’ihu Jehova dee aha+ ndị na-atụ egwu ya na ndị na-echebara aha ya echiche* n’akwụkwọ e dere aha ndị ọ ga-echeta.+
17 Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, “Ha ga-abụ nke m+ n’ụbọchị m ga-eme ka ha bụrụ ndị pụrụ iche.+ M ga-emetekwara ha ebere* otú nna si emetere nwa ya nke na-ejere ya ozi ebere.+ 18 Unu ga-ahụkwa ọzọ ihe dị iche n’onye ezi omume na onye ajọ omume,+ n’onye na-ejere Chineke ozi na onye na-anaghị ejere ya ozi.”