Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 4/15 p. 15-20
  • Ụbọchi ahụ Dị Egwu nke Jehova Dị Nso

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụbọchi ahụ Dị Egwu nke Jehova Dị Nso
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Na Mgbe Ikpeazụ”
  • Chineke Abịa Nso n’Ikpe
  • Ndị Na-eguzosi Ike n’Ezi Ihe n’Akwụkwọ nke Ndụ
  • Ònye Ga-alanahụ Ụbọchị Jehova?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • “Ngọzi Ruo Mgbe Ọ Na-adịghị Ihe Ga-akọ” Gị
    Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Malakaị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Aha Gị Ọ̀ Dị ‘n’Akwụkwọ Ncheta’ Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 4/15 p. 15-20

Ụbọchi ahụ Dị Egwu nke Jehova Dị Nso

“E wee deere ndị na-atụ egwu Jehova, ndị na-echekwa echiche aha Ya, akwụkwọ ncheta n’ihu Ya.”—MALAKAỊ 3:16.

1, 2. Banyere ụbọchị dị egwu dị aṅaa ka Malakaị dọrọ aka ná ntị ya?

ỊDỊ egwu! Ka chi na-abọ n’August 6, 1945, e bibiri otu nnukwu obodo n’otu ntabi anya. Ihe dị ka 80,000 mmadụ nwụrụ! Ọtụtụ iri puku mmadụ nwere oké mmerụ ahụ! Ọkụ ọgbụgba na-ekweghị nchịkwata! Bọmbụ nuklia arụwo ọrụ ya. Olee otú ọnọdụ dịịrị Ndịàmà Jehova n’oge ọdachi ahụ? E nwere nanị otu Onyeàmà na Hiroshima—onye e jichiri n’ime mgbidi ndị na-enye nchebe nke ụlọ mkpọrọ n’ihi iguzosi ike n’ezi ihe ya nke onye Kraịst. Ụlọ mkpọrọ ahụ dakasịrị adakasị, ma ihe emerụghị nwanna anyị ahụ. Dị ka o si kwuo ya, bọmbụ atọm tụpụtara ya n’ụlọ mkpọrọ—ma eleghị anya ọ bụ nanị ihe dị mma nke bọmbụ ahụ rụzuru.

2 N’agbanyeghị otú ntiwapụ bọmbụ ahụ bụruru ihe na-atụ egwu, ọ bụ ihe dị nta mgbe e ji ya tụnyere “oké ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova” nke dị nnọọ n’ihu. (Malakaị 4:5) Eenụ, e nwewo ụbọchị ndị dị egwu n’oge gara aga, ma ụbọchị a nke Jehova ga-aka ha nile.—Mak 13:19.

3. Ọdịiche dị aṅaa ka a ga-arịba ama n’etiti “anụ ahụ nile” na ezinụlọ Noa mgbe Iju Mmiri ahụ na-eru nso?

3 N’ụbọchị Noa “anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ, bibiri ụzọ ya n’elu ụwa,” Chineke wee sị: “Ụwa jupụtara n’ihe ike site na ha; ma, lee, M ga-ebibi ha na ụwa.” (Jenesis 6:12, 13) Dị ka e dekọrọ na Matiu 24:39, Jisọs sịrị na ndị ahụ “amaghịkwa ruo mgbe oké iju mmiri ahụ bịara, kpopụ ha nile.” Ma Noa na-ekwesị ntụkwasị obi, “onye na-ekwusa ezi omume,” tinyere ezinụlọ ya na-atụ egwu Chineke, lanarịrị Iju Mmiri ahụ.—2 Pita 2:5.

4. Ihe atụ ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Sọdọm na Gọmọra na-enye?

4 Jud 7 na-akọ: “Dị ka Sọdọm na Gọmọra, na obodo dị ha gburugburu, ebe ha raara onwe ha nye n’ịkwa iko . . . , wee pụọ soo anụ ahụ dị iche, e debewo ha n’ihu ọha mmadụ dị ka ihe ngosi, na-ahụ ahụhụ mmehie nke ọmụma ikpe ziri ezi, nke bụ ọkụ ebighị ebi.” Ndị ahụ na-adịghị asọpụrụ Chineke lara n’iyi n’ihi ụzọ ndụ ha ruru unyi n’ụzọ na-asọ oyi. Ka ógbè dị iche iche nke oge a bụ́ ndị ji mmekọahụ biri kpachara anya! Ma, rịba ama na e chebere Lọt na-atụ egwu Chineke na ụmụ ya ndị nwanyị abụọ ndụ n’oge ọdachi ahụ, ọbụna dị ka a ga-echebe ndị na-efe Jehova n’oge mkpagbu ukwu ahụ nke ji oké nso na-abịa.—2 Pita 2:6-9.

5. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ikpe ndị e mezuru n’isi Jerusalem?

5 Tụleekwa ihe atụ ịdọ aka ná ntị e nyere mgbe Jehova ji ndị agha mwakpo kpochapụ Jerusalem, obodo ahụ dị ebube nke n’otu oge bụworo “ihe obi ụtọ nke ụwa nile.” (Abụ Ọma 48:2) Ọdachi ndị a weere ọnọdụ, nke mbụ na 607 T.O.A., ọzọkwa na 70 O.A., n’ihi na ndị sịrị na ha bụ ndị Chineke gbahapụrụ ezi ofufe. Dị ka ihe obi ụtọ, ndị ohu Jehova na-anọgidesi ike n’ihe lanarịrị. Ọdachi nke 70 O.A. (nke e sere n’okpuru) bụ nke a kọwara dị ka “mkpagbu, nke aha mkpagbu dị otú a a ka adịghị site ná mmalite okike ụwa nke Chineke kere ruo mgbe a.” O wepụrụ kpam kpam usoro ihe ndị Juu dapụrụ n’ezi ofufe, n’echiche ahụkwa kpọmkwem ọ “gaghị adịkwa ma ọlị.” (Mak 13:19) Ma ọbụna mmezu nke a nke ihe Chineke kpere n’ikpe bụ nanị onyinyo nke ‘oké mkpagbu ahụ’ nke na-eyi usoro ihe dum nke ụwa egwu ugbu a.—Mkpughe 7:14.

6. N’ihi gịnị ka Jehova ji ekwe ka ọdachi bịa?

6 N’ihi gịnị ka Chineke ga-eji kwere ka ajọ ọdachi dị iche iche mee, bụ́ ndị na-eweta mfu nke ọtụtụ ndụ? N’ọnọdụ nke Noa, nke Sọdọm na Gọmọra, na nke Jerusalem, Jehova na-emezu ihe e kpere n’ikpe n’isi ndị bibiworo ụzọ ha n’elu ụwa, ndị metọsịworo mbara ụwa a mara mma site ná mmetọ nkịtị na nretọ nke omume, na ndị siworo n’ezi ofufe dapụ, ma ọ bụ jụ ya. Taa anyị na-eguzo n’ụsọ nke mmezu ihe e kpere n’ikpe nke ga-emetụta ihe nile nke ga-erikpu ụwa dum.—2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-9.

“Na Mgbe Ikpeazụ”

7. (a) Gịnị ka ikpe dị iche iche nke Chineke n’oge ochie buru amụma ya? (b) Olileanya dị aṅaa dị ebube dị n’ihu?

7 Mbibi ndị ahụ nke oge ochie bụ ihe amụma nke mkpagbu ukwu ahụ dị egwu nke a kọwara na 2 Pita 3:3-13. Onyeozi ahụ na-ekwu, sị: “Unu buru ụzọ mara nke a, na ndị ọchị ga-eji ịchị ọchị bịa na mgbe ikpeazụ, na-aga dị ka agụụ ihe ọjọọ nke aka ha si dị.” Mgbe ahụ, n’ịtụkwasị uche n’ụbọchị Noa, Pita dere: “Ụwa nke dị n’oge ahụ [lara] n’iyi, n’ihi na iju mmiri gbara ya: ma eluigwe nke dị ugbu a, ha na ụwa, ka a kpadoworo nye ọkụ site n’otu okwu ahụ, ebe a na-edebe ha nye ụbọchị nke ikpe na ịla n’iyi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” Ná ngwụsị nke mkpagbu ahụ kasị ukwuu, ịchịisi Alaeze Mesaịa ahụ nke a nọworo ogologo oge na-eche ga-eweghara ọdịdị ọhụrụ—“eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha.” Lee aha olileanya na-enye ọṅụ ọ bụ!

8. Olee otú ihe ndị na-eme n’ụwa si eru ọ̀tụ̀tụ̀ ha kasị elu?

8 N’ime narị afọ nke 20 anyị, ihe ndị na-eme n’ụwa agawo n’ihu iru ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu. Ọ bụ ezie na mkpochapụ nke Hiroshima abụghị ihe omume Chineke, a pụrụ ịgụnye ya ‘n’ihe dị egwu’ Jisọs buru amụma ya maka oge ọgwụgwụ. (Luk 21:11) Ọ malitere iyi egwu nuklia nke ka na-ekokwasị ihe a kpọrọ mmadụ dị ka igwe ojii nke oké mmiri ozuzo. N’ihi ya, otu isi akụkọ dị na The New York Times nke November 29, 1993, na-agụ, sị: “Égbè Ndị ahụ Pụrụ Ịtatụwo Nchara ma A Ka Na-atụ Ngwá Agha Nuklia Ndị ahụ Mmanụ.” Ka ọ dị ugbu a, agha n’etiti mba na mba, agbụrụ, na ebo dị iche iche nọgidere na-ewe ihe ubi na-atụ ụjọ. N’ọgbọ ndị gara aga ọnụ ọgụgụ ka nnọọ ukwuu nke ndị agha na-eri bụ ndị soja. Taa, 80 pasent nke ndị agha na-eri ka a kọrọ na ha bụ ndị nkịtị, ka a hapụ ikwu banyere ọtụtụ nde ndị na-agbalaga site n’ala nna ha dị ka ndị gbara ọsọ ndụ.

9. Olee otú ndị ndú okpukpe siworo gosipụta ịbụ enyi nke ụwa?

9 Ọtụtụ mgbe ndị ndú okpukpe egosiwo onwe ha, nọgidekwa na-eme otú ahụ, ịbụ “enyi nke ụwa” site n’itinyesi aka ike n’agha na mbili imegide ọchịchị bụ́ ndị na-akwafu ọbara. (Jemes 4:4) Ụfọdụ na ndị dike n’ịzụ ahịa anyaukwu ejikọwo aka n’azụmahịa ụwa ka ndị a na-emepụta ngwá agha na-akpata ọnwụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ buru ibu ma na-ewulite òtù ndị na-ere ọgwụ ike. Dị ka ihe atụ, n’ịkọ banyere ogbugbu nke otu onye South America bụ́ onye isi n’azụmahịa ọgwụ ọjọọ, The New York Times sịrị: “N’izo azụmahịa ọgwụ ya n’ihe mkpuchi nke akụ̀ na ụba azụmahịa iwu kwadoro na ọdịdị nke onye na-eme ihe ọma, o nwere ihe omume redio nke ya, ndị ụkọchukwu Roman Katọlik na-esonyekarịkwara ya.” The Wall Street Journal kọrọ na tinyere ibibi ndụ ọtụtụ nde mmadụ na-aghọ ndị ọgwụ riri ahụ, onye isi azụmahịa ọgwụ ọjọọ nke a ji aka ya tụzie ogbugbu nke ọtụtụ puku mmadụ. The Times nke London rịbara ama: “Ndị ahụ na-egbu mmadụ na-akwụkarị ụgwọ maka Mas pụrụ iche iji nye ekele . . . n’otu oge ahụ mas ili ozu nke onye ha gburu na-ewere ọnọdụ n’ebe ọzọ.” Lee aha ihe obi ọjọọ ọ bụ!

10. Olee otú anyị kwesịrị isi lee ọnọdụ na-akawanye njọ nke ụwa anya?

10 Ònye ma arụrụala ndị ọzọ ụmụ mmadụ ndị mmụọ ọjọọ na-akwali ka ga-akpata n’elu ụwa a? Dị ka 1 Jọn 5:19 na-ekwu, “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ,” Setan bụ́ Ekwensu. Taa ọ bụ “ahụhụ [na-adịrị] ụwa na oké osimiri: n’ihi na ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.” (Mkpughe 12:12) Otú ọ dị, n’ụzọ na-enye obi ụtọ, Ndị Rom 10:13 na-ekwe anyị nkwa na “onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Onyenwe anyị, a ga-azọpụta ya.”

Chineke Abịa Nso n’Ikpe

11. Ọnọdụ ndị dị aṅaa n’Israel kpalitere amụma Malakaị?

11 Banyere ọdịnihu dị nso nke ihe a kpọrọ mmadụ, amụma Malakaị na-eme ka ihe gaje ime doo anya. E depụtara Malakaị ikpeazụ n’ogologo ahịrị nke ndị amụma Hibru oge ochie. Israel enwewo ahụmahụ ntọgbọrọ n’efu nke Jerusalem na 607 T.O.A. Ma 70 afọ ka ọ gasịrị Jehova egosiwo ebere ịhụnanya n’iweghachi mba ahụ n’ala ya. Ma, n’ime otu narị afọ, Israel na-abanyeghachi ọzọ ná ndapụ n’ezi ofufe na mmebi iwu. Ndị ahụ adịghị enye aha Jehova nsọpụrụ, na-elefuru iwu ezi omume ya anya, ma na-emetọ ụlọ nsọ ya site n’iweta anụ kpuru ìsì, daa ngwụrọ, na-arịakwa ọrịa maka iji chụọ àjà. Ha na-achụpụ ndị nwunye ha lụtara n’okorobịa ha ka ha wee lụrụ ndị inyom ala ọzọ.—Malakaị 1:6-8; 2:13-16.

12, 13. (a) Nnụcha dị aṅaa dịworo mkpa maka òtù ndị nchụàjà e tere mmanụ? (b) Olee otú nnụcha si abakwara oké ìgwè mmadụ ahụ uru?

12 Ọrụ ime nnụcha dị mkpa. A kọwara ya na Malakaị 3:1-4. Dị ka Israel oge ochie, ọ dị mkpa ime ka Ndịàmà Jehova nke oge a dị ọcha, ya mere a pụrụ iji ọrụ nnụcha Malakaị kọwara mee ihe n’ebe ha nọ. Ka Agha Ụwa Mbụ na-eru ọgwụgwụ ya nso, ụfọdụ n’ime Ndị Mmụta Bible, dị ka a maara Ndịàmà mgbe ahụ, ejigideghị nnọpụiche doro anya n’ihe omume nile nke ụwa. Na 1918, Jehova zitere “Onye ozi ọgbụgba ndụ” Ya, Kraịst Jisọs, ná ndokwa ụlọ nsọ ime mmụọ Ya ime ka ìgwè nta ahụ nke ndị na-efe Ya ofufe dị ọcha pụọ ná ntụpọ nile nke ụwa. N’ụzọ amụma, Jehova ajụwo, sị: “Ònye ga-anagide ụbọchị ọbịbịa [onye ozi ahụ], ọ̀ bụkwa onye ga na-eguzogide mgbe a na-ahụ Ya anya? n’ihi na Ya onwe ya dị ka ọkụ onye nnụcha ihe na dị ka ncha nke ọsụ ákwà: Ọ ga-anọdụkwa ala dị ka onye nnụcha ọlaọcha nke na-eme ka ọ dị ọcha, Ọ ga-emekwa ka ụmụ Livaị dị ọcha, sichaakwa ha dị ka ọlaedo na ọlaọcha; ha ga na-eweta nso Jehova onyinye ịnata ihu ọma n’ezi omume.” Dị ka ndị a nụchara, ha emewo nnọọ nke ahụ!

13 Ìgwè ahụ nke ndị nchụàjà e tere mmanụ dị nanị 144,000 n’ọnụ ọgụgụ. (Mkpughe 7:4-8; 14:1, 3) Ma, gịnị banyere ndị Kraịst ndị ọzọ raara onwe ha nye taa? N’ịmụba ugbu a iru ọtụtụ nde, ndị a na-emejupụta “oké ìgwè mmadụ” ndị a ga-emekwa ka ha dị ọcha pụọ n’ụzọ nile nke ụwa, ‘na-asa uwe mwụda ha, na-emekwa ka ha dị ọcha n’ọbara Nwa atụrụ ahụ.’ (Mkpughe 7:9, 14) N’ihi ya, site n’inwe okwukwe n’àjà mgbapụta nke Nwa Atụrụ ahụ, Kraịst Jisọs, ha na-enwe ike ịnọgide na-enwe nguzo dị ọcha n’ihu Jehova. E kwere ha nkwa nlanarị gabiga mkpagbu ukwu ahụ dum, bụ́ ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova.—Zefanaịa 2:2, 3.

14. Okwu ndị dị aṅaa ka ndị Chineke taa kwesịrị ịṅa ntị ka ha na-anọgide na-azụlite mmadụ ọhụrụ ahụ?

14 Tinyere ihe fọdụrụnụ ahụ ná ndị nchụàjà, oké ìgwè mmadụ a aghaghị ịṅa ntị n’okwu ndị ọzọ nke Chineke: “M ga-abịakwute unu nso ikpe ikpe; M ga-abụkwa onye àmà dị ngwa megide ndị mgbaasị, na imegide ndị na-akwa iko, na imegide ndị na-aṅụ iyi ụgha, na imegide ndị na-emegbu onye e goro ọrụ n’ụgwọ ọrụ ya na nwanyị di ya nwụrụ na nwa mgbei, ndị na-ewezụgakwa ọbịa n’ihe ya, ndị na-adịghị atụ egwu m . . . N’ihi na Mụ onwe m, bụ́ Jehova, agbanweghị.” (Malakaị 3:5, 6) Ee e, ụkpụrụ Jehova adịghị agbanwe, ya mere n’egwu Jehova, ndị ya taa aghaghị ịjụ ụdị ikpere arụsị nile ma na-eme ihe n’eziokwu, n’ịkwụwa aka ọtọ, na-emesapụkwa aka ka ha nọgidere na-azụlite àgwà ndị Kraịst.—Ndị Kọlọsi 3:9-14.

15. (a) Òkù dị aṅaa nke obi ebere ka Jehova na-akpọ? (b) Olee otú anyị pụrụ isi zere ‘ịpụnara Jehova ihe’?

15 Jehova na-akpọ onye ọ bụla nke pụrụ isiwo n’ụzọ ezi omume ya nile wezụga onwe ya òkù, na-asị: “Laghachikwutenụ m, Mụ onwe m ga-alaghachikwutekwa unu.” Ọ bụrụ na ndị a ajụọ, sị: “N’ime gịnị ka anyị ga-alaghachi?” ọ na-aza, sị: “Unu na-apụnara m ihe.” Ná nzaghachikwa nye ajụjụ nke na-esonụ: “N’ime gịnị ka anyị pụnarawooro Gị ihe?” Jehova na-asị na ha apụnarawo ya ihe site n’ịhapụ iweta ihe ha kasị mma dị ka onyinye n’ije ozi ụlọ nsọ ya. (Malakaị 3:7, 8) Ebe anyị ghọworo akụkụ nke ndị Jehova, anyị kwesịrị ịchọ n’ezie itinye akụkụ kasị mma nke ume ọrụ anyị, ikike, na ihe onwunwe dị iche iche n’ije ozi Jehova. Otú a, kama ịpụnara Chineke ihe, anyị ‘na-anọgide na-ebu ụzọ achọ alaeze ya na ezi omume ya.’—Matiu 6:33.

16. Agbamume dị aṅaa ka anyị na-achọta na Malakaị 3:10-12?

16 E nwere ụgwọ ọrụ dị ukwuu maka ndị nile wezụgara ụzọ nile nke ụwa nke ijere nanị onwe onye ozi, nke ịhụ ihe onwunwe n’anya, n’azụ ha, dị ka Malakaị 3:10-12 na-egosi: “Biko, nwaanụ m na nke a, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị, ma M gaghị emeghere unu window nile nke eluigwe, wụsara unu ngọzi, ruo mgbe ọnọdụ agaghị ezu ịnagide ya.” Nye ndị nile na-egosi ekele, Jehova na-ekwe nkwa ịba ụba na ịmị mkpụrụ ime mmụọ. Ọ gbakwụnyere: “Ọ bụkwa Ndị ihe na-agara nke ọma ka mba nile ga-akpọ unu: n’ihi na unu onwe unu ga-abụ ala nke na-atọ ụtọ.” Ọ̀ bụ na ọ dịbeghị otú ahụ n’etiti ọtụtụ nde ndị Chineke nwere obi ekele gburugburu ụwa taa?

Ndị Na-eguzosi Ike n’Ezi Ihe n’Akwụkwọ nke Ndụ

17-19. (a) Olee otú ọgba aghara dị na Rwanda siworo metụta ụmụnna anyị n’ebe ahụ? (b) Obi ike dị aṅaa ka ndị a na-ekwesị ntụkwasị obi jiworo gaa n’ihu?

17 N’ebe a, anyị pụrụ ikwu okwu banyere iguzosi ike n’ezi ihe nke ụmụnna anyị nwoke na nwanyị bụ́ ndị Rwanda. Ha ewetawo mgbe nile onyinye ndị kasị mma n’ụzọ ime mmụọ n’ụlọ ime mmụọ nke ofufe Jehova. Dị ka ihe atụ, ná Mgbakọ Distrikti “Izi Ihe Chineke” ha na December 1993, 2,080 ndị nkwusa Alaeze ha nwetara ngụkọta nke 4,075 ndị mmadụ bịaranụ. E nwere 230 Ndịàmà ọhụrụ e mere baptism, n’ime ndị a kwa, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 150 debanyere aha n’ije ozi ịsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa sochiri ya.

18 Mgbe ịkpọasị ebo tiwapụrụ n’April 1994, e gburu ma ọ dịkarịa ala 180 Ndịàmà, gụnyere onye nlekọta obodo Kigali, bụ́ isi obodo, na ezinụlọ ya dum. Ndị nsụgharị isii n’ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Kigali, anọ n’ime ha ndị Hutu na abụọ ndị Tutsi, nọgidere na-arụ ọrụ ọtụtụ izu n’okpuru oké iyi egwu, ruo mgbe ọ dịrị mkpa ka ndị Tutsi gbalaga, e wee gbuo ha n’ebe a na-enyocha ndị mmadụ. N’ikpeazụ, n’iburu ihe fọdụrụ ná ngwá ọrụ kọmputa ha, anọ ndị fọdụrụnụ gbalagara na Goma, dị na Zaire, ebe ha ji ịnọgidesi ike n’ihe gaa n’ihu ịsụgharị Ụlọ Nche gaa n’asụsụ Kinyarwanda.—Aịsaịa 54:17.

19 Ndịàmà a gbara ọsọ ndụ, ọ bụ ezie na ha nọ n’ọnọdụ ọjọọ, bu ụzọ mgbe nile jụọ maka nri ime mmụọ tupu ihe nkịtị. N’oké ịchụ àjà, ụmụnna ndị na-ahụ n’anya si n’ọtụtụ ala nwere ike iwetara ha ihe enyemaka. Site n’okwu ọnụ na site n’ịdị n’usoro ha n’okpuru ọnọdụ tara akpụ, ndị a gbara ọsọ ndụ agbawo àmà dị ịtụnanya. Ha anọgidewo n’ezie na-eweta n’ofufe Jehova ihe ha ndị kasị mma. Ha egosipụtawo obi ike yiri nke Pọl dị ka e kwupụtara ya ná Ndị Rom 14:8: “A sị na anyị dị ndụ, ọ bụ n’ebe Onyenwe anyị nọ ka anyị dị ndụ; ma a sị na anyị nwụrụ, ọ bụ n’ebe Onyenwe anyị nọ ka anyị nwụrụ: ya mere, ma ànyị dị ndụ, ma ànyị nwụrụ anwụ, anyị bụ ndị nke Onyenwe anyị.”

20, 21. (a) Aha olè ndị ka a na-edeghị n’akwụkwọ ncheta Jehova? (b) Aha olè ndị pụtara n’akwụkwọ ahụ, n’ihi gịnịkwa?

20 Jehova na-edekọ aha ndị nile na-ejere ya ozi n’iguzosi ike n’ezi ihe. Amụma Malakaị na-aga n’ihu, sị: “Mgbe ahụ ndị na-atụ egwu Jehova na-ekwurịta okwu, otu onye na ibe ya: Jehova wee ṅaa ntị, nụ, e wee deere ndị na-atụ egwu Jehova, ndị na-echekwa echiche aha Ya, akwụkwọ ncheta n’ihu Ya.”—Malakaị 3:16.

21 Lee ka o si dị mkpa taa na anyị na-egosi egwu Chineke n’ịsọpụrụ aha Jehova! Ime otú ahụ, anyị agaghị ata ahụhụ ọmụma ikpe, dị ka ndị ahụ ji mmasị na-akwado usoro ihe nke ụwa nke a ga-ata. Mkpughe 17:8 na-akọ na ‘e deghị aha ha n’akwụkwọ nke ndụ ahụ.’ Dị ka ezi uche na-egosi, aha pụtakarịsịrị ìhè e dere n’akwụkwọ nke ndụ Jehova bụ nke Onye Ndú nke ndụ, Ọkpara Chineke n’onwe ya, bụ́ Jisọs Kraịst. Matiu 12:21 na-asị: “Ọ bụkwa n’aha Ya ka mba nile ga-atụkwasị obi.” Àjà mgbapụta Jisọs na-eme ka e jide ndụ ebighị ebi n’aka maka ndị nile nwere okwukwe na ya. Lee aha ihe ùgwù ọ bụ aha anyị n’otu n’otu ịbụ nke a gbakwụnyere na nke Jisọs n’akwụkwọ mpịakọta ahụ!

22. Ịkpa ókè dị aṅaa ga-edo anya mgbe Jehova mezuru ihe e kpere n’ikpe?

22 Olee otú ọ ga-esi gaara ndị ohu Chineke n’ikpe ahụ? Jehova na-aza na Malakaị 3:17, 18: “M ga-enwekwa ọmịiko n’ahụ ha, dị ka mmadụ si enwe ọmịiko n’ahụ nwa ya nke na-efe ya. Unu ga-alaghachikwa hụ ihe dị iche n’etiti onye ezi omume na onye na-emebi iwu, n’etiti onye na-efe Chineke na onye na-adịghị efe Ya.” Nkewa ahụ ga-apụta ìhè nye ndị nile: ndị mmebi iwu, ịbụ ndị e kewapụrụ maka mbibi ebighị ebi, na ndị ezi omume, ịbụ ndị a nwapụtara maka ndụ ebighị ebi n’ógbè elu ala nke Alaeze ahụ. (Matiu 25:31-46) Ya mere oké ìgwè mmadụ nke ndị yiri atụrụ ga-alanarị oké ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Ikpe ndị dị aṅaa ka Jehova mezuru n’oge Bible?

◻ Olee otú ọnọdụ taa si yie ndị dị n’oge ochie?

◻ Nnụcha dị aṅaa werewooro ọnọdụ ná mmezu nke amụma Malakaị?

◻ Aha olè ndị ka e dere n’akwụkwọ ncheta Chineke?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya