Bịaruo Chineke Nso
Aha Gị Ọ̀ Dị ‘n’Akwụkwọ Ncheta’ Chineke?
JEHOVA ọ̀ na-ahụ mbọ niile ndị na-efe ya na-agba iji mee ihe dị ya mma? Ee, ọ na-ahụ ha! Ma ihe ọ na-ahụ abụghị naanị omume ọma ndị ha na-eme na okwu ọma ndị ha na-ekwu iji too ya. Ọ na-ahụdị echiche ọma ha na-eche banyere ya. Ihe ọzọkwa bụ na Jehova agaghị echefu ndị na-efe ya na ihe ọma niile ha mere. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Anyị ga-ahụ azịza ajụjụ a n’ihe Malakaị onye amụma dere n’akwụkwọ Malakaị.—Gụọ Malakaị 3:16.
N’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ anọ gara aga, mgbe Malakaị na-ebu amụma n’Izrel, ndị Izrel hapụrụ Chineke ma na-eme omume rụrụ arụ. Ndị nchụàjà hapụrụ ọrụ Chineke nyere ha, ebe ndị Izrel ndị ọzọ nọ na-eme omume ọjọọ ndị dị ka ịgba afa, ịkwa iko, na igwu wayo. (Malakaị 2:8; 3:5) Ma n’oge ahụ, e nwere ụfọdụ ndị Izrel ndị nọgidere na-efe Chineke. Gịnị ka ha nọ na-eme?
Malakaị kwuru, sị, “Ndị na-atụ egwu Jehova nọ na-akparịta ụka.” Ịtụ egwu Chineke abụghị ihe ọjọọ. Ihe Malakaị na-ekwu bụ na ndị Izrel ahụ na-akwanyere Chineke ùgwù, ha achọghịkwa ime ihe ga-ewute ya. Ị̀ hụrụ na Malakaị kwuru na ndị ahụ na-atụ egwu Chineke “nọ na-akparịta ụka”? O doro anya na ha zukọtara na-ekwu okwu ọma banyere Jehova ma na-agba ibe ha ume. Nke a ga-eme ka ihe ọjọọ ndị a na-eme n’obodo ha ghara ime ka ha daa mbà n’obi, ọ ga-emekwa ka ha ghara iso mewe ihe ọjọọ.
E nwere ụzọ ọzọ dị mkpa ndị Izrel ahụ na-efe Jehova si na-akwanyere Jehova ùgwù: Ha nọ “na-echebara aha ya echiche.” Otú e si sụgharịa ya na Baịbụl ọzọ bụ na ha “na-asọpụkwara aha ya.” Ihe ndị ha na-eche n’echiche gosiri na ha na-akwanyere Jehova ùgwù. Ha chebaara Jehova na aha ya echiche. Jehova ọ̀ ma banyere ihe ahụ ha na-eme?
Ee, ọ ma, n’ihi na Malakaị kwuru, sị: “Jehova nọkwa na-ege ntị ma na-anụ ihe ha na-ekwu.” Jehova nọ n’ebe obibi ya dị n’eluigwe gee ntị ma nụ okwu ọma niile ndị na-efe ya nọ na-agwa ibe ha iji too ya. Ọ hụkwara ihe niile ha nọ na-eche n’echiche. (Abụ Ọma 94:11) Ma, ihe Jehova mere abụghị naanị ige ntị n’okwu ọma ndị ha kwuru na ịhụ ihe ndị ha chere n’echiche.
Malakaị kwukwara, sị: “E wee malite ide akwụkwọ ncheta n’ihu ya.” Akwụkwọ ahụ bụ ebe e dere aha ndị niile ji obi ha fee Jehova. Cheta na a kpọrọ akwụkwọ ahụ “akwụkwọ ncheta.”a Nke a na-egosi anyị na Jehova emekataghị chefuo ndị fere ya otú ọ chọrọ, ọ gaghịkwa echefu ihe ndị ha mere iji too ya, ma omume ọma ha, okwu ọma ha, ma echiche ọma ha. Ma o nwere ihe mere Chineke ga-eji cheta ha. O kwere nkwa na ya ga-enye ndị niile a na-ehichapụghị aha ha n’akwụkwọ ncheta ya ndụ ebighị ebi.b—Abụ Ọma 37:29.
Obi kwesịrị ịtọ anyị ụtọ na anyị amatala na Jehova ejighị mbọ niile anyị na-agba ka anyị fee ya otú ọ chọrọ egwuri egwu! Ihe e kwuru na Malakaị 3:16 kwesịrị ime ka anyị chebara otú anyị si na-efe Chineke echiche. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘Aha m ọ̀ dị ‘n’akwụkwọ ncheta’ Chineke? Ọ ga-adị na ya ma ọ bụrụ na anyị na-agbasi mbọ ike kwa ụbọchị ka anyị na-akpa àgwà, na-ekwu okwu ma na-eche echiche otú ga-eme ka Jehova cheta anyị.
Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl n’ọnwa Disemba:
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Okwu Hibru a sụgharịrị “ncheta” apụtaghị naanị icheta ihe. Ọ pụtakwara ime ihe banyere ihe ahụ e chetara.
b Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere nkwa Chineke kwere, nke bụ́ na ya ga-eme ka ndị na-efe ya nweta ndụ ebighị ebi, gụọ isi nke 3 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.