“Laghachikwutenụ M, Mụ Onwe M Ga-alaghachikwutekwa Unu”
Ezinụlọ ahụ na-enwe obi ụtọ ná mkpapụ ha na-eme n’ọhịa. Mgbe ahụ, Peter, onye kasị dị nta, kpafuru, na-arịda otu ugwu ebe ọ na-achụso otu ọsa. Na mberede, urukpuru gbajiri oji, mmiri malitekwara izo. Na mbụ, ọ bụ nsha nsha mmiri, ma o ji nwayọọ nwayọọ malite izosi ike. Ezinụlọ ahụ mere ngwa ngwa chịkọta ihe onwunwe ha wee gbaga n’ụgbọ ala ha. Onye ọ bụla chekwara echiche banyere ebe Peter nọ.
N’otu oge ahụ, Peter na-agbalị ịgaghachi n’ebe ezinụlọ ya nọ. O siri ike ịhụ ihe dị n’ihu, ụzọ ugwu ahụ na-amịkwa amị n’oge mmiri na-ezo. Na mberede, ala yiri ihe mikpuru n’okpuru ụkwụ ya ka ọ dabara n’ime otu olulu dị omimi, nke zoro ezo. Ọ gbalịrị ịrịgopụta, ma akụkụ ya nile na-amị amị nke ukwuu.
Mmiri ozuzo na-eruda n’ugwu ahụ ma na-awụju pọtọpọtọ n’olulu ahụ. Peter nọ n’ezi ihe ize ndụ nke ịbụ onye o riri. Ma mgbe ahụ nna ya chọtara ya wee jiri ụdọ sepụta ya. Mgbe e mesịrị, a baara Peter oké mba maka ịkpafu. Ma, n’ịbụ onye e ji blanket kpuchite n’ógwè aka nne ya, ọ bụ ihe dị mfe ịnakwere okwu mba ọ bụla.
Ahụmahụ nke a na-akọwa nke ọma banyere ihe na-eme ụfọdụ ndị so ná ndị Chineke na mbụ. Ha adabawo n’olulu dị omimi nke usoro ihe nke a, ha na-agbalịsikwa ike isi na ya rịgopụta wee laghachi na nzukọ Jehova mara mma. Lee ka o si bụrụ ihe obi ụtọ ịmara na Jehova bụ onye ebere, dịkwa njikere ‘ịtụda ụdọ,’ ma nyere ha aka ịpụta n’ihe ize ndụ!
Omume Obi Ebere nke Jehova
Laa azụ n’oge Israel, n’oge e wusịrị ụlọ nsọ ahụ, Solomọn kpere ekpere nraranye nke ọ nọ n’ime ya rịọ Jehova ka ọ na-aṅa ntị n’arịrịọ ndị e lekwasịrị anya n’ụlọ nsọ ahụ rịọ. Mgbe ahụ o kwuru, sị: “Mgbe ha [ndị Israel] ga-emehie megide gị, (n’ihi na ọ dịghị mmadụ ọ bụla nke na-adịghị emehie,) i wee wesa ha iwe, rara ha nye n’ihu onye iro ha, . . . ha wee chegharịa n’obi ha n’ala ebe a dọtara ha n’agha, wee chegharịa, rịọ gị amara n’ala ndị na-adọta ha n’agha, . . . nụrụkwa n’eluigwe, bụ́ ọnọdụ obibi gị guzosiri ike, ekpere ha na arịrịọ amara ha, mezie ikpe ha.”—1 Ndị Eze 8:46-49.
E mezuru arịrịọ nke Solomọn ọtụtụ mgbe n’akụkọ ihe mere eme nke Israel. Ọtụtụ mgbe, ndị Chineke chigharịrị ma gbahapụ ya. Mgbe ahụ, ha matara mmejọ ha wee laghachi, na-achọ ya. Jehova gbaghakwaara ha. (Deuterọnọmi 4:31; Aịsaịa 44:21, 22; 2 Ndị Kọrint 1:3; Jemes 5:11) Site n’ọnụ Malakaị, Jehova chịkọtara otu puku afọ nke mmeso o mesoro ndị Ya mgbe Ọ sịrị: “Site n’ụbọchị nile nke nna unu ha ka unu wezụgaworo onwe unu n’ụkpụrụ m nile, unu edebeghịkwa ha. Laghachikwutenụ m, mụ onwe m ga-alaghachikwutekwa unu.”—Malakaị 3:7.
Ihe Ndị Na-akpata Mkpọbi Ụkwụ
Dị ka ọ dị n’ebe ndị Israel nọ, ndị Chineke ole na ole taa na-echigharị ma kewapụ onwe ha na nzukọ Jehova. N’ihi gịnị? Ụfọdụ na-achụso ihe yiri ka ọ̀ bụ na o nweghị ihe ọjọọ dị na ya na mbụ, dị ka Peter na-achụso ọsa. Nke a bụ ihe mere Ada. Ọ kọrọ, sị: “Ọ bụ omume nke ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ ije rikọọ nri ọnụ n’otu ụlọ oriri dị nso n’oge ehihie. Ya mere, mgbe ha kpọrọ m òkù ka m bịa ṅụọ otu iko kọfị mgbe anyị gbasara ọrụ, o sighịrị m ike ịnakwere. Echere m na adịghị m eji oge m kwesịrị iji jee nzukọ ma ọ bụ mee nkwusa eme ihe. Amataghị m na nke a pụrụ ịbụ ọdịda ka m na-ada n’idebe ụkpụrụ ahụ dị ná 1 Ndị Kọrint 15:33.
“N’oge na-adịghị anya, m sooro ha na-agba ịnyịnya n’ụbọchị Saturday. Mgbe ahụ m na-eso ha aga ile sinima na ihe nkiri. Nke ahụ dugara m n’ịhapụ nzukọ ụfọdụ. N’ikpeazụ, adịghị m aga nzukọ ọ bụla ma ọ bụ na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ. Mgbe m ghọtara ihe na-emenụ, adịghịkwa m eso ọgbakọ na-akpakọ.”
N’ọnọdụ ndị ọzọ ihe kpatara ya pụrụ ịbụ mmehie nzuzo dị oké njọ nke na-eme ka onye ahụ chee na ya erughị eru ijere Chineke ozi. (Abụ Ọma 32:3-5) Ma ọ bụ, mmadụ pụrụ inwe mkpọbi ụkwụ n’ihe ndị Kraịst bụ enyi ya kwuru ma ọ bụ mee, n’aghọtaghị na, dị ka Solomọn kwuru, “ọ dịghị mmadụ ọ bụla nke na-adịghị emehie.”—1 Ndị Eze 8:46; Jemes 3:2.
Ndị ọzọ na-enwekwa nkụda mmụọ mgbe ha natara ịdọ aka ná ntị. (Ndị Hibru 12:7, 11) Ndọrọ nke ụzọ ndụ ịhụ ihe onwunwe n’anya emewo ka ọtụtụ kwụsị ijere Chineke ozi. Ọtụtụ mgbe, n’ọchịchọ a na-achọ inwe ihe ịga nke ọma n’ụwa, ha emikpuwo onwe ha nke ukwuu n’ọrụ ego nke na ha enwekwaghị ohere ná ndụ ha maka ozi Chineke. (Matiu 13:4-9); 1 Timoti 6:9, 10) Ọ̀ bụ na olileanya adịghịrị ndị ọnọdụ ha dị otú ahụ?
Ị̀ Ga-anara Ịkpọ Òkù Jehova?
N’otu oge, Jisọs kwuru ihe siri ike nghọta, ụfọdụ nwekwara mkpọbi ụkwụ. Ihe ndekọ ahụ na-asị: “Ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ wee laghachi azụ. ha esoghịkwa ya ejegharị ọzọ.” Ma ọ bụghị ha nile nwere mkpọbi ụkwụ. Ihe ndekọ Bible ahụ gara n’ihu, sị: “Jisọs sịrị ndị ozi iri na abụọ ahụ, Ùnu onwe unu [ọ̀] na-achọkwa ịla? Saịmọn Pita zara ya, sị, Onyenwe anyị, Ònye ka anyị ga-ejekwuru? I nwere okwu nke ndụ ebighị ebi.” (Jọn 6:66-68) Ndị ozi Jisọs ji amamihe ghọta na ọ ga-abụ ọdachi ịhapụ Jisọs.
Ụfọdụ ndị dapụrụ mesịrị nwee nkwubi okwu yiri nke ahụ. Ha ghọtara na ịhapụ nzukọ Chineke bụ iwere nzọụkwụ na-eweta ọdachi, na ọ bụkwa nanị n’aka Jehova na Kraịst ka ha ga-enweta okwu ndị na-eduga ná ndụ. Ozugbo ha nwere nghọta dị otú ahụ, ha kwesịkwara ịghọta na oge agabeghị ha ịgbanwe obi ha, rịọ Jehova maka mgbaghara, ma laghachikwute ya. Ọ bụ Jehova onwe ya kpọrọ òkù ahụ, sị: “Laghachikwutenụ m, mụ onwe m ga-alaghachikwute unu.”—Malakaị 3:7.
N’ezie, olee ebe onye Kraịst obi ya ziri ezi pụrụ ịchọta obi ụtọ ma ọ́ bụghị n’ijere Jehova ozi? Ọ bụrụ na mmadụ akpafuo mgbe ọ bụworo akụkụ nke nzukọ Chineke ruo oge ụfọdụ, gịnị na-echere ya n’ụwa nke nọ n’ézì? Ngwa ngwa ọ ga-aghọta na ugbu a ọ bụ akụkụ nke ụwa nke na-eme ihe ike karị. Ọ ga-achọta onwe ya ka ọ na-ekere òkè n’usoro ihe nke jupụtara n’ihu abụọ, okwu ụgha, aghụghọ, na omume rụrụ arụ, ụwa nke dị ize ndụ na nke na-adịghị enye obi ụtọ dị ka olulu pọtọpọtọ ahụ nke na-eyi ndụ nke Peter ahụ na-eto eto egwu. Mgbe ọ matara onwe ya wee ghọta na ndụ ebighị ebi ya nọ n’ihe ize ndụ, o kwesịghị ịtụfu oge ọ bụla n’ịchọ enyemaka iji tọhapụ onwe ya n’ọnọdụ ahụ. Ma, ịlaghachi pụrụ ịbụ ihe na-adịghị mfe.
Ị̀ bụ onye gbalịworo ịlaghachikwute Jehova ma chọpụta na ọ bụ ihe siri ike? Mgbe ahụ, mara na enyemaka dị gị mkpa. Kwerekwa na ụmụnna gị ndị nwoke na ndị nwanyị nọ ná nzukọ Chineke dị njikere inyere gị aka. Ma ị ga-eme mgbalị iji gosi Jehova ọchịchọ gị. Oge eruwo mgbe ị ‘ga-echegharị n’obi gị’ wee ‘chigharịkwute Jehova.’—1 Ndị Eze 8:47.
Ndị E Nyeere Aka Ịlaghachi
Ada kọwara ihe nyeere ya aka ịlaghachikwute Jehova: “Kpọmkwem n’oge o kwesịrị, nwanna nwanyị onye duziiri m ọmụmụ ihe kpọrọ m òkù isoro ya jee mgbakọ sekit. Ọ bụ nnọọ onye na-ahụ n’anya nke ukwuu! Ọ gwaghị m okwu nkatọ ọ bụla ma ọlị! O gosiri m ịhụnanya dị ukwuu. Otu afọ agafewo kemgbe m bịara nzukọ ikpeazụ, ma anọwo m na-atụgharị uche n’ịtọgbọ n’efu nke ụwa nakwa n’eziokwu ahụ nke bụ na n’azụ ihe ndọrọ ndị ahụ na-egbu mara mara, e nwere nanị mwute, nkụda aka, na omume rụrụ arụ. Ya mere, ekpebiri m ije mgbakọ ahụ. Mgbe m rutere n’ebe ihe nkiri ahụ, bụ́ ebe a nọ nwee mgbakọ ahụ, agara m n’oche ndị dị n’azụ wee zoo onwe m n’ebe gbara ọchịchịrị. Achọghị m ka ụmụnna hụ m ma jụọ m ajụjụ.
“Otú ọ dị, ihe omume ahụ nyere ndụmọdụ nke dị m mkpa nke ukwuu. Mgbe ọ bịara ná ngwụsị, ekpebiri m ọ bụghị nanị ịlaghachikwute ndị Jehova kamakwa inye ya onwe m site n’obi m dum. Ụmụnna ahụ nabatara m n’ụzọ na-ekpo ọkụ, ‘nwa mmefu’ ahụ laghachikwara.” (Luk 15:11-14) Ihe ndị ahụ nile mere n’oge gara aga, ugbu a Ada anọwo n’ozi oge nile ruo ihe karịrị 25 afọ.
Ihe mere n’ọnọdụ nke onye ọzọ kpafuru akpafu rụpụtara ihe yiri nke ahụ na-enye obi ụtọ. Ụfọdụ ndị okenye nyere José ndụmọdụ nke gosipụtara echiche nke ha karịa nke ụkpụrụ Bible. José, n’ịbụ onye nwere nkụda aka na onye a kpasuru iwe, mesịrị ghọọ onye na-adịghị ejekwa ozi. Ruo afọ asatọ, o kewapụrụ onwe ya n’ebe ndị Chineke nọ, n’ime oge ahụ, ọ lụrụ onye na-ekweghị ekwe, ghọọkwa nna nke ụmụ, nke ọ hapụrụ ka e mee otu n’ime ha baptism na Chọọchị Katọlik.
N’ikpeazụ, e nyeere ya aka mgbe onye nlekọta sekit mere nleta ọzụzụ atụrụ n’ebe ọ nọ ma gbaa ndị okenye ume ime otu ihe ahụ. E weghachiri ya, o nwekwara obi ụtọ ịhụ ka nwunye ya nwere mmasị n’eziokwu. José na-eje ozi ugbu a dị ka okenye n’ọgbakọ. Dị ka ahụmahụ abụọ ndị a na-egosi, Jehova adịghị ajụ ịgọzi ndị ahụ na-anara òkù o ji ịhụnanya na-akpọ ka a laghachi.
Otú ọ dị, iji wee nweta ngọzi ndị dị otú ahụ, mmadụ aghaghị ibu ụzọ nwee ekele maka enyemaka a na-enye ya ma nara ya. N’ọtụtụ ọgbakọ, ụmụnna na-echeta ndị ahụ na-adịghị ejekwa ozi ma na-eleta ha site n’oge ruo n’oge, na-agbalị inyere ha aka. Ịnara enyemaka dị otú ahụ na-egosi inwe ekele maka obi ebere Jehova.—Jemes 5:19, 20.
N’eziokwu, ugbu a bụ oge ịnara ịkpọ òkù Jehova: Laghachikwutenụ m.” (Malakaị 3:7; Aịsaịa 1:18) Echekwala ọzọ. Ihe ndị na-eme n’ụwa ji oké ọsọ na-eme. Ebe kasị mma ịnọ n’oge oké ifufe ahụ na-abịa n’ọdịnihu bụ n’ime nzukọ Jehova, ịnọrọ n’udo n’okpuru nchebe ya. Ọ bụ nanị ndị ahụ na-agbaba n’ime Jehova nwere olileanya siri ike nke ịbụ ndị e zobere pụọ n’ọnụma ya n’oké ụbọchị ahụ nke iwe ya.—Zefanaịa 2:2, 3.
[Foto dị na peeji nke 30]
Ị̀ ga-anara ịkpọ òkù Jehova bụ́, “Laghachikwutenụ m”?