Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 12/1 p. 7-12
  • Ngọzi Jehova Na-eme Mmadụ Ọgaranya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ngọzi Jehova Na-eme Mmadụ Ọgaranya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịba Ụba nke Kasị Mkpa
  • Akụ Ime Mmụọ Taa
  • Otu Ụzọ n’Ụzọ Iri na Inye Onyinye
  • “Tụkwasịnụ Obi Unu n’Ụzọ Nile Unu”
  • Ịpụnara Jehova Ihe
  • Ịbụ Ndị ‘Ezi Onyenwe ahụ’ Kpere Ikpe
  • “Webatanụ Otu Ụzọ n’Ụzọ Iri Nile n’Ụlọ Akụ Nke M”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • “Ngọzi Ruo Mgbe Ọ Na-adịghị Ihe Ga-akọ” Gị
    Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Malakaị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ònye Ga-alanahụ Ụbọchị Jehova?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 12/1 p. 7-12

Ngọzi Jehova Na-eme Mmadụ Ọgaranya

“Ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ, ọgaranya, Ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.”—ILU 10:22.

1-3. Ọ bụ ezie na ọtụtụ na-enwe nchegbu banyere ihe onwunwe, eziokwu dị aṅaa banyere akụ ihe onwunwe ka mmadụ nile kwesịrị ịnakwere?

ỤFỌDỤ ndị adịghị akwụsị ikwu okwu banyere ego—ma ọ bụ onwunwe ha na-enweghị ya. Dị ka ihe mwute nye ha, n’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga, ha enwewo ọtụtụ ihe ịtụle. Na 1992 ọbụna Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa ahụ bara ọgaranya nwere ndakpọ ọnọdụ akụ na ụba, ndị isi ọrụ nakwa ndị nkịtị na-arụ ọrụ chọtakwara onwe ha n’ụkọ ọrụ. Ọtụtụ chere echiche ma ọ̀ dị mgbe ha ga-ahụkwa ihe ịga nke ọma guzosiri ike.

2 Ọ̀ dị njọ inwe nchegbu banyere ọdịmma ihe onwunwe anyị? Ee e, ruo n’ókè ụfọdụ ọ bụ nnọọ ebumpụta. N’otu oge ahụ, e nwere otu eziokwu bụ isi nke anyị na-aghaghị ịnakwere banyere akụ na ụba. E mee elu mee ala, ihe onwunwe nile na-esite n’aka Onye Okike. Ọ bụ “Chineke, bụ́ Jehova, . . . Onye meworo ụwa na ihe nile nke si n’ime ya apụta ka ọ saa mbara; Onye na-enye ndị bi n’elu ya ume ha na-eku, Onye na-enyekwa ndị na-ejegharị n’ime ya mmụọ.”—Aịsaịa 42:5.

3 Ọ bụ ezie na Jehova adịghị aka akara onye ga-abụ ọgaranya na onye ga-abụ ogbenye, anyị nile ga-aza ajụjụ maka ụzọ anyị si jiri òkè ọ bụla anyị ketara ‘n’ụwa na ihe nile si n’ime ya apụta’ mee ihe. Ọ bụrụ na anyị ejiri akụ anyị na-eme ka anyị bụ ndị nwe ndị ỌZỌ, Jehova ga-ajụ anyị ajụjụ maka ya. Onye ọ bụla nke bụkwa ohu nke akụ kama ịbụ nke Jehova ga-achọpụta na “onye na-atụkwasị obi n’akụ ya, onye ahụ ga-ada.” (Ilu 11:28; Matiu 6:24; 1 Timoti 6:9) E mee elu mee ala, ụba ihe onwunwe nke a na-edoghị n’okpuru Jehova site n’obi bụ nke na-abaghị uru.—Eklisiastis 2:3-11, 18, 19; Luk 16:9.

Ịba Ụba nke Kasị Mkpa

4. N’ihi gịnị ka ụba ime mmụọ ji dị mma karịa ịba ụba nke ihe onwunwe?

4 Tụkwasị n’ụba ihe onwunwe, Bible na-ekwu okwu banyere ụba ime mmụọ. O doro anya na ụdị nke a ka mma. (Matiu 6:19-21) Ụba ime mmụọ na-eweta mmekọrịta afọ ojuju n’ebe Jehova nọ nke pụrụ ịdịru ebighị ebi. (Eklisiastis 7:12) Ọzọkwa, ndị ohu Chi neke bara ọgaranya n’ime mmụọ adịghị atụfu ngọzi ihe onwunwe ndị dị mma. N’ime ụwa ọhụrụ, a ga-ejikọta akụ ime mmụọ na ụba ihe onwunwe. Ndị na-ekwesị ntụkwasị obi ga-enweta nchebe ihe onwunwe nke a na-adịghị enweta site n’ịsọ mpi dị ilu ma ọ bụ iji ahụ ike na obi ụtọ chụọ àjà, dị ka e si emekarị n’oge a. (Abụ Ọma 72:16; Ilu 10:28; Aịsaịa 25:6-8) Ha ga-achọpụta na n’ụzọ ọ bụla “ngọzi Jehova . . . na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.”—Ilu 10:22.

5. Nkwa dị aṅaa ka JISỌS kwere banyere ihe onwunwe?

5 Ọbụna taa ndị ahụ ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe na-enwe mmetụta nke ịdị jụụ ụfọdụ ma a bịa n’ihe banyere ihe onwunwe. N’eziokwu, ha na-arụ ọrụ iji kwụọ ụgwọ ha ma nye ezinụlọ ha nri. Ma ọ bụ ụfọdụ pụrụ ọbụna ịbụ ndị tụfuru ọrụ ha n’oge ndakpọ ọnọdụ akụ na ụba. Ma ha adịghị abụ ndị mikpuru onwe ha ná nchegbu ndị dị otú ahụ. Kama nke ahụ, ha na-ekweta ná nkwa Jisọs mgbe ọ sịrị: “Unu echegbula onwe unu, sị, Gịnị ka anyị ga-eri? ma ọ bụ, Gịnị ka anyị ga-aṅụ? ma ọ bụ, Gịnị ka a ga-eji gbokwasị anyị? . . . N’ihi na Nna unu nke eluigwe na-amata na ihe ndị a nile dị unu mkpa. Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze ya, na ezi omume ya; a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a nile.”—Matiu 6:31-33.

Akụ Ime Mmụọ Taa

6, 7. (a) Kọwaa akụkụ ụfọdụ nke ụba ime mmụọ nke ndị Chineke. (b) Amụma dị aṅaa ka e na-emezu n’oge a, ajụjụ ndị dịkwa aṅaa ka nke a na-ewelite?

6 N’ihi ya, ndị Jehova ahọrọwo idebe Alaeze ahụ n’ọnọdụ mbụ ná ndụ ha, leekwa otú ha si bụrụ ndị a gọziri agọzi! Ha na-enwe ọganihu bara ụba n’ọrụ ha nke ime ndị na-eso ụzọ. (Aịsaịa 60:22) Ha bụ ndị Jehova na-akụziri ihe, na-enweta ezi ihe ime mmụọ na-erupụta dị ka mmiri na-adịghị ata ata nke a na-ewepụta site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45-47; Aịsaịa 54:13) Ọzọkwa, mmụọ Jehova dị n’ahụ ha, na-akpụzigharị ha ịghọ òtù ụmụnna obi ụtọ zuru ụwa ọnụ.—Abụ Ọma 133:1; Mak 10:29, 30.

7 Nke a bụ n’ezie ụba ime mmụọ, ihe ego na-apụghị ịzụta. Ọ bụ mmezu pụtara ìhè nke nkwa Jehova: “Webatanụ otu ụzọ n’ụzọ iri nile n’ụlọ akụ nke m, ka ihe oriri wee dị n’ụlọ m, biko, nwaanụ m na nke a, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị, ma m gaghị emeghere unu window nile nke eluigwe, wụsara unu ngọzi, ruo mgbe ọnọdụ agaghị ezu ịnagide ya.” (Malakaị 3:10) Taa anyị ahụwo ka nkwa a mezuru. Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka Jehova, bụ́ Isi Iyi nke akụ nile, ji rịọ ka ndị ohu ya webata otu akụkụ nke ihe dị iri ma ọ bụ otu ụzọ n’ụzọ iri? Ònye na-erite uru site n’otu ụzọ n’ụzọ iri? Iji zaa ajụjụ ndị a, tụlee ihe mere Jehova ji kwuo okwu ndị a site n’ọnụ Malakaị na narị afọ nke ise T.O.A.

Otu Ụzọ n’Ụzọ Iri na Inye Onyinye

8. N’ikwekọ n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, na gịnị ka ụba ihe onwunwe nke Israel ga-adabere?

8 N’oge Malakaị ndị Chineke enweghị ọganihu. Gịnị mere na ọ dịghị otú ahụ? N’otu akụkụ o metụtara inye onyinye na otu ụzọ n’ụzọ iri. Laa azụ n’oge ahụ, Israel nọ n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu Mosis. Mgbe Jehova mere ọgbụgba ndụ ahụ, o kwere nkwa na ọ bụrụ na Israel edebe akụkụ nke ha, ga-agọzi ha n’ụzọ ime mmụọ na ihe onwunwe. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọganihu Israel dabeere n’ikwesị ntụkwasị obi ha.—Deuterọnọmi 28:1-19.

9. N’oge Israel oge ochie, n’ihi gịnị ka Jehova ji chọọ ka ndị Israel na-akwụ otu ụzọ n’ụzọ iri ma na-enye onyinye?

9 Akụkụ nke ibu ọrụ Israel n’okpuru Iwu ahụ bụ iweta onyinye n’ụlọ nsọ ahụ na inye otu ụzọ n’ụzọ iri. E surere ụfọdụ n’ime onyinye ndị ahụ kpam kpam n’ọkụ n’ebe ịchụàjà Jehova, ebe e kere ndị ọzọ n’etiti ndị nchụàjà na ndị bịara ịchụ àjà ahụ, na-ewere akụkụ pụrụ iche nye Jehova onyinye. (Levitikọs 1:3-9; 7:1-15) Banyere otu ụzọ n’ụzọ iri, Mosis gwara ndị Israel, sị: “Otu ụzọ n’ụzọ iri ihe nile nke ala, site ná mkpụrụ ọghịgha nke ala, ma ọ bụ site ná mkpụrụ osisi, ihe Jehova nwere ka ọ bụ: ọ bụ ihe nsọ dịrị Jehova.” (Levitikọs 27:30) E nyere otu ụzọ n’ụzọ iri ahụ n’aka ndị ọrụ Livaị n’ụlọ ikwuu na mgbe e mesịrị n’ụlọ nsọ ahụ. N’aka nke ha, ndị Livaị na-abụghị ndị nchụàjà ga-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ha natara n’aka ndị nchụàjà sitere n’Erọn. (Ọnụ Ọgụgụ 18:21-29) N’ihi gịnị ka Jehova ji chọọ ka Israel na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri? Na nke mbụ, ka ha wee nwee ike igosi n’ụzọ gbara ọkpụrụkpụ ekele ha nwere maka ịdị mma nke Jehova. Na nke abụọ, ka ha wee nwee ike inye onyinye iji kwadoo ndị Livaị, bụ́ ndị pụrụ mgbe ahụ ịtụkwasị uche n’ibu ọrụ ha, gụnyere ịkụzi Iwu ahụ. (2 Ihe Emere 17:7-9) N’ụzọ dị otú a, a kwadokwara ofufe dị ọcha, onye ọ bụla ritekwara uru.

10. Gịnị mere mgbe Israel na-ewetaghị otu ụzọ n’ụzọ iri na onyinye?

10 Ọ bụ ezie na ndị Livaị mesịrị jiri otu ụzọ n’ụzọ iri na onyinye mee ihe nke ukwuu, ha bụ n’ezie ihe ndị e nyere Jehova, ya mere ha aghaghị ịdị n’ụdị dị mma, kwesịkwa ya. (Levitikọs 22:21-25) Gịnị mere mgbe ụmụ Israel na-ewetaghị otu ụzọ n’ụzọ iri ha ma ọ bụ mgbe ha wetara onyinye dị ala? E nweghị ntaramahụhụ ọ bụla a kpọrọ aha n’Iwu ahụ, ma e nwere ihe ndị si na ya apụta. Jehova jichiri ngọzi ya, ndị Livaị, bụ́ ndị a na-enyeghị nkwado ihe onwunwe, hapụrụ ọrụ ha iji kwadoo onwe ha. Otú a, ndị Israel nile tara ahụhụ ya.

“Tụkwasịnụ Obi Unu n’Ụzọ Nile Unu”

11, 12. (a) Gịnị si na ya pụta mgbe Israel lelịrị idebe Iwu ahụ? (b) Ọrụ dị aṅaa ka Jehova nyere Israel mgbe ọ kpọlatara ha site na Babilọn?

11 N’oge nile nke akụkọ ihe mere eme Israel, ụfọdụ bụ ihe nlereanya n’ịgbalị idebe Iwu ahụ, gụnyere ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri. (2 Ihe Emere 31:2-16) Otú ọ dị, dị ka ihe bụ ụkpụrụ mmadụ nile, mba ahụ emeghị otú a chọrọ. Mgbe mgbe, ha mebiri ọgbụgba ndụ ha na Jehova, ruo mgbe o mesịrị hapụ ka e merie ha, n’afọ 607 T.O.A., ka a dọrọkwa ha laa Babilọn.—2 Ihe Emere 36:15-21.

12 Nke ahụ bụ ịdọ aka ná ntị siri ike, ma mgbe 70 afọ gasịrị, Jehova weghachiri ndị ya n’ala nna ha. Ọtụtụ n’ime amụma Paradaịs ndị ahụ dị n’Aịsaịa nwere mmezu mbụ ha mgbe ha latasịrị. (Aịsaịa 35:1, 2; 52:1-9; 65:17-19) Ma, isi ihe mere Jehova ji kpọlata ndị ya abụghị iji wuo paradaịs elu ala, kama iji wughachi ụlọ nsọ ahụ ma wetaghachi ezi ofufe. (Ezra 1:2, 3) Ọ bụrụ na Israel erubere Jehova isi, abamuru ihe onwunwe ga-esochi ya, ngọzi Jehova ga-emekwa ha ndị ọgaranya ma n’ụzọ ime mmụọ ma n’ụzọ ihe onwunwe. N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, ozugbo ha latara n’ala nna ha n’afọ 537 T.O.A., ndị Juu wuru ebe ịchụàjà na Jerusalem ma malite ọrụ n’ụlọ nsọ ahụ. Otú ọ dị, ha natara mmegide siri ike wee kwụsị. (Ezra 4:1-4, 23) Dị ka ihe si na ya pụta, Israel enwetaghị ngọzi Jehova.

13, 14. (a) Gịnị sochiri mgbe Israel jụrụ iwughachi ụlọ nsọ ahụ? (b) Olee otú e si mesịa wughachi ụlọ nsọ ahụ, ma ọdịda ndị dị aṅaa n’akụkụ Israel ka a kọrọ akụkọ ha?

13 N’afọ 520 T.O.A., Jehova kpọlitere ndị amụma bụ́ Hagaị na Zekaraịa iji gbaa Israel ume ịlaghachi n’ọrụ ahụ nke iwu ụlọ nsọ. Hagaị gosiri na mba ahụ na-enwe ihe isi ike nke ihe onwunwe ma jikọta nke a na enweghị ịnụ ọkụ n’obi ha maka ụlọ Jehova. Ọ sịrị: “Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị: Tụkwasịnụ obi unu n’ụzọ nile unu. Unu aghawo ọtụtụ mkpụrụ, ma nke nta ka unu webatara; unu na-eri ihe, ma ọ dịghị afọ juworo unu; unu na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ma ọ dịghị nṅụju afọ unu ṅụjuworo; unu yiri uwe, ma ọ dịghị okpomọkụ na-ekpo mmadụ; ọzọ, onye na-arụta ụgwọ ọrụ na-arụta ụgwọ ọrụ itinye n’akpa puru epu. Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị: Tụkwasịnụ obi unu n’ụzọ nile unu. Rịgoonụ n’ugwu, bute osisi, wuo ụlọ a, ọ ga-atọkwa m ụtọ, a ga-asọpụkwara m.”—Hagaị 1:5-8.

14 N’ịbụ ndị Hagaị na Zekaraịa gbara ume, ụmụ Israel tụkwasịrị obi ha n’ụzọ ha nile, e wee wuo ụlọ nsọ. Otú ọ dị, mgbe ihe dị ka 60 afọ gasịrị, Nehemaịa jere Jerusalem wee chọpụta na Israel elelịwokwa Iwu Jehova anya ọzọ. O doziri nke a. Ma mgbe o jere nke ugbo abụọ, ọ chọpụtara na ihe adịwo njọ ọzọ. Ọ kọrọ, sị: “M wee mata na e nyeghị òkè ndị Livaị enye; ndị Livaị na ndị ọbụ abụ, bụ́ ndị na-eje ozi ahụ, wee gbalaga, nwoke ọ bụla n’ubi ya.” (Nehemaịa 13:10) E doziri nsogbu nke a, “Juda nile wee webata otu ụzọ n’ụzọ iri nke ọka na mmanya vine ọhụrụ na mmanụ n’ụlọ akụ.”—Nehemaịa 13:12.

Ịpụnara Jehova Ihe

15, 16. Maka ọdịda ndị dị aṅaa ka Jehova, site n’ọnụ Malakaị, ji baara Israel mba?

15 Ma eleghị anya, amụma ahụ nke Malakaị buru bụ n’otu oge a dum, onye amụma ahụ na-agwakwu anyị ihe banyere ekwesịghị ntụkwasị obi nke Israel. O dekọrọ okwu Jehova gwara Israel, sị: “Ọ bụrụkwa na nna ka m bụ, olee ebe nsọpụrụ m dị? Ọ bụrụkwa na onyenwe mmadụ ka m bụ, olee ebe egwu m dị? ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị unu, unu ndị nchụàjà, ndị na-elelị aha m.” Gịnị bụ ihe dị njọ na nke ahụ? Jehova kọwara, sị: “Mgbe unu na-eweta anụ kpụrụ ìsì nso [unu na-asị], Ihe ọjọọ adịghị ya! Mgbe unu na-eweta nso nke gwọrọ ngwụrọ na nke na-arịa ọrịa [unu na-asị], Ihe ọjọọ adịghị ya!”—Malakaị 1:6-8.

16 N’ụzọ nkọwa nke a doro anya, Malakaị gosiri na ọ bụ ezie na ụmụ Israel wetara onyinye, ịdị njọ nke ihe ndị a kpughere enweghị nkwanye ùgwù dị oké njọ. Malakaị dekwara, sị: “Site n’ụbọchị nile nke nna unu ha ka unu wezụgaworo onwe unu n’ụkpụrụ m nile, unu edebeghịkwa ha. Laghachikwutenụ m, mụ onwe m ga-alaghachikwutekwa unu, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị.” Ndị Israel chere echiche banyere kpọmkwem ihe ha ga-eme, ya mere ha jụrụ, sị: “N’ime gịnị ka anyị ga-alaghachi?” Jehova zara, sị: “Mmadụ, ọ̀ ga-apụnara Chineke ihe? Ma unu na-apụnara m ihe.” Olee ụzọ Israel pụrụ isi pụnara Jehova ihe, bụ́ Isi Iyi nke akụ nile? Jehova zara, si: “N’otu ụzọ n’ụzọ iri nile na àjà mbuli nile.” (Malakaị 3:7, 8) Ee, site n’ewetaghị otu ụzọ n’ụzọ iri na onyinye ha, Israel pụnaara Jehova ihe!

17. Nzube dị aṅaa ka otu ụzọ n’ụzọ iri na onyinye mezuru n’Israel, nkwa dịkwa aṅaa ka Jehova kwere banyere otu ụzọ n’ụzọ iri?

17 Ntụle nke a nke akụkọ ihe mere eme na-egosi mkpa otu ụzọ n’ụzọ iri na onyinye dị n’Israel. Ha bụ ngosipụta nke obi ekele n’akụkụ nke onye na-enye ihe. Ha nyekwara aka ịkwado ezi ofufe n’ụzọ ihe onwunwe. Otú a, Jehova gara n’ihu ịgba ndị Israel ume, sị: “Webatanụ otu ụzọ n’ụzọ iri nile n’ụlọ akụ nke m.” N’igosi ihe ga-esochi nke ahụ ma ha mee otú a, Jehova kwere nkwa, sị: ‘M ga-awụsara unu ngọzi, ruo mgbe ọnọdụ agaghị ezu ịnagide ya.’ (Malakaị 3:10) Ngọzi Jehova ga-eme ha ọgaranya.

Ịbụ Ndị ‘Ezi Onyenwe ahụ’ Kpere Ikpe

18. (a) Banyere ọbịbịa ònye ka Jehova na-adọ aka ná ntị? (b) Olee mgbe a bịara n’ụlọ nsọ ahụ, ònye bịara, ọ̀ bụkwa gịnị ka ọ rụpụtaara Israel?

18 Jehova site n’ọnụ Malakaị dọkwara aka ná ntị na ya gaje ịbịa ikpe ndị ya ikpe. “Lee, mụ na-eziga onye ozi m, ọ ga-edozikwa ụzọ n’ihu m: Onyenwe unu ahụ unu onwe unu na-achọ ga-abịaru ụlọ ukwu Ya na mberede; ọbụna onye ozi ọgbụgba ndụ ahụ, onye ihe ya na-atọ unu ụtọ, lee, ọ na-abịa.” (Malakaị 3:1) Olee mgbe ọbịbịa ahụ e kwere ná nkwa a ga-abịa n’ụlọ nsọ weere ọnọdụ? Na Matiu 11:10, Jisọs hotara amụma Malakaị banyere onye ozi nke ga-akwadebe ụzọ ma jiri ya mee ihe n’ọnọdụ Jọn Onye Na-eme Baptism. (Malakaị 4:5; Matiu 11:14) Ya mere n’afọ 29 O.A., oge ikpe ahụ eruwo! Ònye bụ onye ozi nke abụọ, bụ́ onye ozi nke ọgbụgba ndụ ahụ, onye ga-esonyere Jehova, bụ́ ‘ezi Onye­nwe ahụ,’ bịa n’ụlọ nsọ? Ọ bụ Jisọs n’onwe ya, ugbo abụọ, ọ bịakwara n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem wee mee ka ọ dị ọcha n’ụzọ na-akpali akpali, na-achụpụ ndị ahụ na-agbanwe ego na-adịghị eme ihe n’eziokwu. (Mak 11:15-17; Jọn 2:14-17) Banyere oge ikpe nke narị afọ mbụ a, Jehova na-ajụ n’ụzọ amụma, sị: “Ònye ga-anagide ụbọchị ọbịbịa ya? Ọ̀ bụkwa onye ga na-eguzogide mgbe a na-ahụ ya anya?” (Malakaị 3:2) N’ezie, Israel eguzoghị. E nyochara ha, hụ na ihe kọrọ ha, n’afọ 33 O.A., a chụpụkwara ha dị ka mba Jehova họọrọ.—Matiu 23:37-39.

19. N’ụzọ dị aṅaa ka otu ihe fọdụrụ si laghachikwute Jehova na narị afọ mbụ, ngọzi dịkwa aṅaa ka ha nwetara?

19 Otú ọ dị, Malakaị dekwara, sị: “[Jehova] ga-anọdụkwa ala dị ka onye nnụcha ọlaọcha nke na-eme ka ọ dị ọcha, ọ ga-emekwa ka ụmụ Livaị dị ọcha, sichakwa ha dị ka ọlaedo na ọlaọcha; ha ga na-eweta nso Jehova onyinye ịnata ihu ọma n’ezi omume.” (Malakaị 3:3) N’ikwekọ na nke a, ọ bụ ezie na a chụpụrụ ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ndị na-azọrọ na ha na-ejere Jehova ozi na narị afọ mbụ, e mere ka ụfọdụ dị ọcha, ha wee bịakwute Jehova, na-achụ àjà a na-anara nke ọma. Olee ndị? Ndị ahụ ṅaworo Jisọs ntị, bụ́ onye ozi nke ọgbụgba ndụ ahụ. Na Pentikọst 33 O.A., a kpọkọtara 120 n’ime ndị a ṅara ntị n’otu ụlọ elu dị na Jerusalem. N’ịbụ ndị e mere ka ha dị ike site na mmụọ nsọ, ha malitere inye onyinye n’ezi omume, ngwa ngwa ọnụ ọgụgụ ha mụbakwara. Ozugbo, ha gbasara n’akụkụ nile nke Alaeze Ukwu Rom. (Ọrụ 2:41; 4:4; 5:14) Otú a, ihe fọdụrụnụ laghachikwutere Jehova.—Malakaị 3:7.

20. Mgbe e bibiri Jerusalem na ụlọ nsọ ahụ, gịnị mere Israel ọhụrụ nke Chineke?

20 Ihe a fọdụrụ n’Israel, nke mesịrị gụnye ndị Jentaịl e webatara, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, n’ùkwù mkpọrọgwụ nke Israel, bụ “Israel nke Chineke” ọhụrụ, mba nke ihe mejupụtara ya bụ ndị Kraịst e ji mmụỌ nsọ tee mmanụ. (Ndị Galetia 6:16; Ndị Rom 11:17) N’afọ 70 O.A., “ụbọchị . . . na-ere dị ka ite ọkụ ukwu” bịakwasịrị Israel anụ ahụ mgbe e bibiri Jerusalem na ụlọ nsọ ya site n’aka ndị agha Rom. (Malakaị 4:1; Luk 19: 41-44) Gịnị mere Israel ime mmụỌ nke Chineke? Jehova gosiri “ọmịiko n’ahụ ha, dị ka mmadụ si enwe ọmịiko n’ahụ nwa ya nke [na-ejere ya ozi, NW].” (Malakaị 3:17) Ọgbakọ ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ ṅara ntị n’ịdọ aka ná ntị amụma nke JISỌS. (Matiu 24:15, 16) Ha lanarịrị, ngọzi Jehova nọgidekwara na-eme ha ọgaranya n’ụzọ ime mmụọ.

21. Ajụjụ ndị dị aṅaa fọdụrụ banyere Malakaị 3:1 na 10?

21 Lee aha iwepụ Jehova n’ụta nke ahụ bụ! Otú ọ dị, olee ụzọ e si emezu Malakaị 3:1 n’oge a? Oleekwa ụzọ onye Kraịst kwesịrị isi zaghachi n’agbamume ahụ dị na Malakaị 3:10 nke iweta otu ụzọ n’ime ụzọ iri ahụ dum n’ụlọ akụ ahụ? A ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.

Ị̀ Pụrụ Ikọwa?

◻ E mee elu mee ala, ònye bụ Isi lyi nke akụ nile?

◻ N’ihi gịnị ka ọganihu ime mmụọ ji dị mma karịa akụ ihe onwunwe?

◻ Nzube dị aṅaa ka otu ụzọ n’ụzọ iri na onyinye mezuru n’Israel?

◻ Olee mgbe Jehova, bụ́ ‘ezi Onyenwe ahụ,’ bịara n’ụlọ nsọ ahụ ikpe Israel ikpe, gịnịkwa si na ya pụta?

◻ Olee ndị laghachikwutere Jehova mgbe ọ bịasịrị n’ụlọ nsọ ya na narị afọ mbụ O.A.?

[Foto dị na peeji nke 10]

Onye ozi nke ọgbụgba ndụ ahụ, bụ́ Jisọs, site n’ịnọchi anya Jehova, bịara n’ụlọ nsọ ahụ maka ikpe ikpe na narị afọ mbụ O.A.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya