“Webatanụ Otu Ụzọ n’Ụzọ Iri Nile n’Ụlọ Akụ Nke M”
“Nwaanụ m na nke a, . . . ma m gaghị emeghere unu window nile nke eluigwe.”—MALAKAỊ 3:10.
1. (a) Na narị afọ nke ise T.O.A., ọkpụkpọ òkù dị aṅaa ka Jehova nyere ndị ya? (b) Na narị afọ mbụ O.A., gịnị ka a rụpụtara site na Jehova ịbịa n’ụlọ nsọ maka ikpe ikpe?
NA NARỊ afọ nke ise T.O.A., ndị Israel abụwo ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi nye Jehova. Ha kwụsịrị inye otu ụzọ n’ụzọ iri ma weta anụmanụ ndị na-ekwesịghị ekwesị n’ụlọ nsọ ahụ dị ka onyinye. Otú o sina dị, Jehova kwere nkwa na Ọ bụrụ na ha ga-ewebata otu ụZỌ n’ụzọ iri ahụ dum n’ime ụlọ akụ ya, Ọ ga-awụsa ha ngọzi ruo mgbe ọnọdụ na-agaghị ezu ịnagide ya. (Malakaị 3:8-10) Mgbe ihe dị ka 500 afọ gasịrị, Jehova, onye Jisọs nọchiri anya ya dị ka onye ozi Ya nke ọgbụgba ndụ, bịara n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem maka ikpe ikpe. (Malakaị 3:1) A hụrụ na ihe kọrọ Israel dị ka mba, ma a gọziri ndị ahụ laghachikwutere Jehova n’ụba. (Malakaị 3:7) E tere ha mmanụ ịghọ ụmụ ime mmụọ Jehova, okike ọhụrụ, “Israel nke Chineke.”—Ndị Galetia 6:16; Ndị Rom 3:25, 26.
2. Olee mgbe oge ruru ka Malakaị 3:1-10 nwee mmezu nke ugbo abụọ, gịnịkwa ka a kpọrọ anyị òkù ime n’ihe banyere nke a?
2 Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 1,900 afọ mgbe nke a gasịrị, na 1914, Jisọs nọkwasịrị n’ocheeze dị ka Eze nke Alaeze eluigwe Chineke, okwu ndị ahụ e kwuru n’ike mmụọ Chineke na Malakaị 3:1-10 eruwo oge inwe mmezu nke ugbo abụọ. N’ikwekọ n’ihe omume nke a na-akpali akpali, a na-akpọ ndị Kraist òkù taa iwebata otu ụzọ n’ụzọ iri dum n’ime ụlọ akụ ahụ. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị onwe anyị ga-enweta ngọzi ruo mgbe ọnọdụ na-agaghị ezu ịnagide ya.
3. Ònye bụ onye ozi ahụ nke na-akwadebe ụzọ n’ihu Jehova (a) na narị afọ nke mbụ? (b) tupu agha ụwa mbụ?
3 Banyere ọbịbịa ya n’ụlọ nsọ ahụ, Jehova sịrị: “Lee, mụ na-eziga onye ozi m, ọ ga-edozikwa ụzọ n’ihu m.” (Malakaị 3:1) Iji mezuo nke a na narị afọ mbụ, Jọn Onye Na-eme Baptism bịara n’Israel na-ekwusa nchegharị nke mmehie. (Mak 1:2, 3) È nwere ọrụ nkwadebe n’ihe banyere ọbịbịa nke ugbo abụọ nke Jehova ga-abịa n’ụlọ nsọ ya? Ee. N’ọtụtụ iri afọ tupu agha ụwa nke mbụ, Ndị Mmụta Bible pụtara ìhè n’ụwa, na-akụzi ozizi Bible dị ọcha ma na-ekpughe okwu ụgha ndị na-adịghị enye Chineke nsọpụrụ, dị ka ozizi Atọ n’Ime Otu na ọkụ ala mmụọ. Ha dọkwara aka ná ntị banyere ọbịbịa nke ọgwụgwụ Oge Ndị Jentaịl na 1914. Ọtụtụ ṅara ndị a na-enye ìhè nke eziokwu ntị.—Abụ Ọma 43:3; Matiu 5:14, 16.
4. Ajụjụ ndị dị aṅaa ka a na-aghaghị ịza n’ụbọchị Onyenwe anyị?
4 Afọ 1914 malitere ihe Bible kpọrọ ‘ụbọchị Onyenwe anyị.’ (Mkpughe 1:10) Ihe omume ndị na-akpali akpali gaje iwere ọnọdụ n’ụbọchị ahụ, gụnyere nkọwapụta nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na ịhọpụta onye ahụ ilekọta “ihe nile [Onyenwe ya] nwere.” (Matiu 24:45-47) Laa azụ na 1914, ọtụtụ puku chọọchị zọọrọ na ha bụ ndị Kraịst. Olee ìgwè nke Onyenwenụ ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, ga-amata dị ka ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche? A gaje ịza ajụjụ ahụ mgbe Jehova bịara n’ụlọ nsọ ahụ.
Ịbịa n’Ụlọ NSỌ Ime Mmụọ
5, 6. (a) Olee ụlọ nsọ nke Jehova bịara na ya maka ikpe ikpe? (b) Ikpe dị aṅaa ka Krisendọm natara site n’aka Jehova?
5 Otú ọ dị, n’ụlọ nsọ dị aṅaa ka Ọ bịara? O doro anya na Ọ bụghị n’ụlọ nsọ nkịtị dị na Jerusalem. E bibiri ihe fọdụrụ n’ụlọ nsọ ahụ laa azụ n’afọ 70 O.A. Otú Ọ dị, Jehova nwere ụlọ nsọ ka ukwuu nke Jerusalem ahụ sere onyinyo ya. Pọl kwuru okwu banyere ụlọ nsọ nke a ka ukwuu ma gosi ịdị ukwu ya n’ezie, na-enwe ebe nsọ ya n’eluigwe na otu ogige n’ebe a n’elu ala. (Ndị Hibru 9:11, 12, 24; 10:19, 20) Ọ bụ n’oké ụlọ nsọ ime mmụọ nke a ka Jehova bịara maka ọrụ ikpe ikpe.—Tụlee Mkpughe 11:1; 15:8.
6 Olee mgbe nke a mere? Dị ka ihe àmà zuru ezu e nwere si dị, ọ bụ na 1918.a Gịnị si na nke ahụ pụta? Nye Krisendọm, Jehova hụrụ nzukọ nke aka ya na-atapụta ọbara, usoro okpukpe rụrụ arụ nke soroworo ụwa nke a kwaa iko, na-eme onwe ya enyi nke ndị nwere akụ ma na-emegbu ndị ogbenye, na-akụzi ozizi ndị ọgọ mmụọ kama ijigide ofufe dị ọcha. (Jemes 1:27; 4:4) Site n’ọnụ Malakaị, Jehova adọworị aka ná ntị, sị: “M ga-abụkwa onye àmà dị ngwa megide ndị mgbaasị, na imegide ndị na-akwa iko, na imegide ndị na-aṅụ iyi ụgha, na imegide ndị na-emegbu onye e goro ọrụ n’ụgwọ ọrụ ya na nwanyị di ya nwụrụ na nwa mgbei.” (Malakaị 3:5) Krisendọm emewo ihe ndị a nile nakwa nke ka njọ. Ka ọ na-erule 1919 ọ bụ ihe doro anya na Jehova amawo ya ikpe mbibi, ya na ndị ọzọ so na Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ ihe owuwu zuru ụwa ọnụ nke okpukpe ụgha. Site na mgbe ahụ gaa n’ihu, a kpọkuru ndị obi ha ziri ezi, sị: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta.”—Mkpughe 18:1,4.
7. Ònye ka Jisọs matara dị ka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche?
7 Mgbe ahụ, ònye bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche? Na narị afọ nke mbụ, ọ malitere site n’obere ìgwè ahụ ṅara ntị n’ọrụ ịgba àmà nke Jọn Onye Na-eme Baptism na Jisọs, onye ozi nke ọgbụgba ndụ ahụ. Na narị afọ anyị, ọ bụ puku ole na ole ahụ ṅara ntị n’ọrụ nkwadebe ahụ nke Ndị Mmụta Bible rụrụ n’afọ ndị ahụ bu ụzọ tupu 1914. Ndị a tachiri obi n’ọnwụnwa n’oge agha ụwa nke mbụ, ma ha gosipụtara na obi ha nọnyeere Jehova.
Ọrụ Nhichapụ
8, 9. Laa azụ na 1918, n’ụzọ ndị dị aṅaa ka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche si nọro ná mkpa nhichapụ, nkwa dịkwa aṅaa ka Jehova kwere banyere nke a?
8 Otú ọ dị, ọbụna ìgwè nke a nọ ná mkpa nhichapụ. Ụfọdụ ndị nọworo n’etiti ha ghọrọ ndị iro nke okwukwe wee bụrụ ndị e kpochapụrụ. (Ndị Filipaị 3:18) Ndị ọzọ adịghị njikere ibu ibu ọrụ ndị metụtara ijere Jehova ozi wee kpafuo. (Ndị Hibru 2:1) E wezụga nke ahụ, e nwere omume ndị Babilọn ka fọdụrụ nke ọ dị mkpa ka e wepụ. Dịkwa ka ọgbakọ, ọ dịkwa mkpa ka e hichaa ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche. A ghaghị ịmụta ọnọdụ ziri ezi nke nnọpụiche n’ebe ụwa nke a dị ma tinye ya n’omume. Ka ụwa na-aghọwanye nke rụrụ arụ karị, ọ dị mkpa ka ha lụsie ọgụ ike idebe ịdị ọcha nke omume na nke ime mmụọ nke ọgbakọ.—Tụlee Jud 3, 4.
9 Ee, nhicha dị mkpa, ma Jehova ji ịhụnanya kwe nkwa banyere Jisọs ahụ nọkwasịworo n’ocheeze: “Ọ ga-anọdụkwa ala dị ka onye nnụcha ọlaọcha nke na-eme ka ọ dị ọcha, ọ ga-emekwa ka ụmụ Livaị dị ọcha, sichakwa ha dị ka ọlaedo na ọlaọcha; ha ga na-eweta nso Jehova onyinye ịnata ihu ọma n’ezi omume.” (Malakaị 3:3) Na-amalite na 1918, Jehova, site n’ọnụ onye ozi nke a nke ọgbụgba ndụ, emezuwo nkwa ya ma mee ka ndị ya dị ọcha.
10. Ụdị onyinye dị aṅaa ka ndị Chineke wetara, ọkpụkpọ òkù dị aṅaa ka Jehova nyere ha?
10 Ụmụnna Kraist e tere mmanụ na oké ìgwè mmadụ, bụ́ ndị mesịrị sonyere ha n’ozi Jehova, ritechara uru site na Jehova ime omume dị ka onye nnụcha na onye na-esicha ọlaọcha. (Mkpughe 7:9, 14, 15) Dị ka otu ọgbakọ, ha bịara, ka na-abịakwa, inye onyinye n’ezi omume. Onyinye ha “ga-atọkwa Jehova ụtọ, dị ka n’ụbọchị mgbe ebighị ebi gara aga, na dị ka n’afọ nile gara aga.” (Malakaị 3:4) Ọ bụ ndị a ka Jehova kpọrọ òkù n’ụzọ amụma, sị: “Webatanụ otu ụzo n’ụzọ iri nile n’ụlọ akụ nke m, ka ihe oriri wee dị n’ụlọ m, biko, nwaanụ m na nke a, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị, ma m gaghị emeghere unu window nile nke eluigwe, wụsara unu ngọzi, ruo mgbe ọnọdụ agaghị ezu ịnagide ya.”—Malakaị 3:10.
Onyinye na Otu Ụzọ n’Ụzọ Iri
11. N’ihi gịnị ka inye onyinye dị ka usoro Iwu Mosis si dị ji ghara ịdịkwa n’iwu?
11 N’ụbọchị Malakaị, ndị Chineke wetara n’ụzọ nkịtị onyinye na otu ụzọ n’ụzọ iri, dị ka mkpụrụ ọka, mkpụrụ osisi, na anụ a na-akpa akpa. Ọbụna n’oge Jisọs, ndị Israel na-ekwesị ntụkwasị obi nyere onyinye n’ụzọ nkịtị n’ụlọ nsọ ahụ. Otú ọ dị, mgbe ọnwụ Jisọs gasịrị, ihe ndị ahụ nile gbanwere. E wepụrụ Iwu ahụ, gụnyere iwu ahụ nke inye kpọmkwem onyinye nkịtị na otu ụzọ n’ụzọ iri. (Ndị Efesọs 2:15) Jisọs mezuru ụdị inye onyinye ndị, ahụ e buru n’amụma n’okpuru Iwu ahụ. (Ndị Efesọs 5:2; Ndị Hibru 10:1, 2, 10) Mgbe ahụ, n’ụzọ dị aṅaa ka ndị Kraịst pụrụ isi webata onyinye na otu ụzọ n’ụzọ iri?
12. Ụdị onyinye na àjà ime mmụọ dị aṅaa ka ndị Kraịst na-achụ?
12 Nye ha, onyinye bụ n’ụzọ pụrụ iche nke metụtara ihe ime mmụọ. (Tụlee Ndị Filipaị 2:17; 2 Timoti 4:6.) Dị ka ihe atụ, Pọl kwuru okwu banyere ọrụ ime nkwusa di ka inye onyinye mgbe o kwuru, sị: “Ka anyi site n’aka ya na-achụ àjà, bụ́ otuto, nye Chineke mgbe nile, nke ahụ bụ, mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta nye aha ya.” Ọ rụtụrụ aka n’ụdị àjà ime mmụọ ọzọ mgbe ọ gbara ume, sị: “Unu echezọla ime ihe dị mma na ime ka unu na ndị ọzọ nwekọọ ihe unu: n’ihi na àjà dị otú a na-atọ Chineke ezi ụtọ.” (Ndị Hibru 13:15,16) Mgbe ndị mụrụ ụmụ na-agba ụmụ ha ume ịbanye n’ozi ọsụ ụzọ, a pụrụ ikwu na ha na-enye ha Jehova, dịkwa ka Jefta nyere nwa ya nwanyị dị ka “àjà nsure ọkụ” n’aka Chineke, bụ́ onye nyeworo ya mmeri ahụ.—Ndị Ikpe 11:30, 31, 39.
13. N’ihi gịnị ka a na-achọghị ndị Kraịst n’aka inye otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ha na-akpata n’ụzọ nkịtị?
13 Otú ọ dị, gịnị banyere otu ụzọ n’ụzọ iri? Ndị Kraịst hà nwere ibu ọrụ iwepụta otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe onwunwe ha na-akpata ma nye ya ọgbakọ Jehova, ma e jiri ya tụnyere ihe a na-eme na chọọchị ụfọdụ nke Krisendọm? Ee e, nke ahụ abụghị iwu. E nweghị akụkụ akwụkwọ nsọ na-ekwupụta ụkpụrụ dị otú ahụ nye ndị Kraịst. Mgbe PọI na-anakọta ụtụ maka ndị nọ ná mkpa na Judia, o kwughị kpọmkwem ọ̀tụ́tụ́ ihe e kwesịrị inye. Kama nke ahụ, ọ sịrị: “Ka onye ọ bụla n’etiti unu nye dị ka o buru ụzọ họpụta n’obi ya; ọ bụghị site ná mwute, ma ọ bụ site ná mkpa: n’ihi na Chineke hụrụ onye were obi ụtọ na-enye n’anya.” (2 Ndị Kọrint 9:7) N’ikwu okwu banyere ndị nọ n’ozi pụrụ iche, PọI gosiri na ọ bụ ezie na a na-akwado ụfọdụ n’ụzọ ziri ezi site n’onyinye afọ ofufo, ya onwe ya dị njikere ịrụ ọrụ na ịkwado onwe ya. (Ọrụ 18:3, 4; 1 Ndị Kọrint 9:13-15) E nweghị otu ụzọ n’ụzọ iri ọ bụla e kere maka nzube nke a.
14. (a) N’ihi gịnị ka iweta otu ụzọ n’ụzọ iri ji ghara ịnọchi anya anyị inye Jehova ihe nile anyị nwere? (b) Gịnị ka otu ụzọ n’ụzọ iri nọchiri anya ya?
14 O doro anya na nye ndị Kraịst, otu ụzọ n’ụzọ iri sere onyinyo, ma ọ bụ nọchiri anya, ihe. Ebe ọ bụ otu ụzọ n’ụzọ iri, ọnụ ọgụgụ ahụ bụ iri bụrụkwa nke na-esekarị onyinyo izu ezu elu ala na Bible, otu ụzọ n’ụzọ iri ọ̀ na-ese onyinyo anyị inye Jehova ihe nile anyị nwere? Ee e. Mgbe anyị raara onwe anyi nye Jehova ma gosipụta nke a site na baptism ime mmiri, ọ bụ mgbe ahụ ka anyị nyere ihe nile anyị nwere. Malite n’oge ahụ anyị mere nraranye, ọ dịghị ihe ọ bụla anyị nwere nke na-abụghị nke Jehova. Otú ọ dị, Jehova na-ahapụ ndi mmadụ n’otu n’otu ka ha hazie ihe ha nwere. Ya mere otu ụzọ n’ụzọ iri nọchiri anya akụkụ nke ihe anyi nwere anyị na-ewetara Jehova, ma ọ bụ jiri na-eme ihe n’ozi Jehova, dị ka ngosipụta nke ịhụnanya anyị nwere maka ya nakwa nghọta anyị ghọtara eziokwu bụ na anyị bụ ndị o nwe. Otu ụzọ n’ụzọ iri nke oge a ekwesịghị ịbụ nanị otu n’ime iri. N’ọnọdụ ụfọdụ ọ ga-adị ala. Ná ndị ọzọ ọ ga-akari. Onye ọ bụla na-eweta ihe obi ya kpaliri ya iweta na ihe ọnọdụ ya nyere ohere ya.
15, 16. Gịnị ka a gụnyere n’otu ụzọ n’ụzọ iri ime mmụọ anyị?
15 Gịnị ka a gụnyere n’otu ụzọ n’ụzọ iri ime mmụọ nke a? Na nke mbụ, anyị na-enye Jehova oge na ike anyị. Oge anyị na-etinye ná nzukọ nile, n’ije mgbakọ na mgbakọ ukwu nile, n’ozi ubi, ihe ndị a nile bụ ihe a na-enye Jehova—otu akụkụ nke otu ụzọ n’ụzọ iri anyị. Oge na ike anyi na-etinye n’ileta ndị ọrịa na inyere ndị ọzọ aka—ọzọkwa, ndị a bụ akụkụ nke otu ụzọ n’ụzọ iri anyị. Inye aka n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze nakwa n’ikere òkè n’ọrụ imezi na ihicha ụlọ nzukọ ahụ bụkwa otu akụkụ.
16 Otu ụzọ n’ụzọ iri anyị gụnyekwara onyinye ego anyị. N’ihi mmụba pụrụ iche nke nzukọ Jehova na-enwe n’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga, ibu ọrụ ego amụbawo. Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ọhụrụ adịwo mkpa, tinyere alaka ụlọ ọrụ ndị ọhụrụ na Ụlọ Mgbakọ ndị ọhụrụ, ya na idobe ndị ahụ e wuworo n’ọnọdụ dị mma. Ịkwụ ụgwọ a na-emefu n’isi ndị ahụ wepụtaworo onwe ha maka ozi pụrụ iche—ndị na-ejikarị onwe ha achụ oké àjà iji mee otú ahụ—na-emejupụtakwa ihe ịma aka dị ukwuu. Na 1991 ihe e mefuru iji lekọta ndị ozi ala ọzọ, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, na ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche nanị ruru ihe karịrị 40 nde dollar, ha nile bụ nke e nwetara site n’onyinye afọ ofufo.
17. Kpọmkwem ihe dị aṇaa ka anyị kwesịrị inye dị ka otu ụzọ n’ụzọ iri ime mmụọ anyị?
17 Kpọmkwem gịnị ka anyị kwesịrị inye dị ka otu ụzọ n’ụzọ iri ime mmụọ anyị? Jehova adịghị esetịpụ ọ̀tụ̀tụ̀ ihe a ga-enye. Otú o sina dị, mmetụta nke nraranye, ezi ịhụnanya maka Jehova na ụmụnna, nakwa mmetụta nke ịdị ngwa site n’ịghọta na e nwere ndụ ndị a ga-azọpụta, na-agba anyị ume iwebata otu ụzọ n’ụzọ iri ime mmụọ anyị dum. A na-akpali anyị ijere Jehova ozi ruo n’ókè kasị ukwuu o kwere mee. Ọ bụrụ na anyị enwe aka ntagide ma ọ bụ jiri ịma ọsụ na-enye onwe anyị ma ọ bụ ihe ndị anyị nwere, nke a ga-abụ otu ihe ahụ dị ka ịpụnara Chineke ihe.—Tụlee Luk 21:1-4.
Ndị A Gọziri ruo Mgbe Ọnọdụ Na-agaghị Ezu Ịnagide Ya
18, 19. Olee ụzọ e siworo gọzie ndị Jehova maka iweta otu ụzọ n’ụzọ iri ha dum?
18 Kemgbe 1919, ndị Jehova azaghachiwo n’ụba site n’inye oge, ike, na ego ndị ha nwere maka mkpa nile nke ọrụ nkwusa ahụ. N’ezie ha ewebatawo otu ụzọ n’ụzọ iri dum n’ime ụlọ akụ ahụ. Dị ka ihe si na nke ahụ pụta, Jehova emezuwo nkwa ya ma wụsa ngọzi ruo mgbe ọnọdụ na-agaghị ezu ịnagide ya. A hụwo nke a n’oké mmụba ha na-amụba n’ọnụ ọgụgụ ha. Site na puku ole na ole nke ndị e tere mmanụ na-ejere Jehova ozi mgbe ọ bịara n’ụlọ nsọ ya na 1918, ha amụbawo ruo n’oge a, ndị ahụ e tere mmanụ nakwa ndị enyi ha, bụ́ atụrụ ọzọ ahụ, eruwo ọnụ ọgụgụ karịrị nde anọ na 211 ala dị iche iche. (Aịsaịa 60:22) A gọziwokwa ndị a site ná nghọta na-amụba amụba nke eziokwu. E mewo ka okwu amụma doo ha anya karị. Obi ike ha nwere ná mmezu nke nzube Jehova nile abụwo nke guzosiri ike. (2 Pita 1:19) Ha bụ n’ezie ndị “mmụta Jehova.”—Aịsaịa 54:13.
19 Site n’ọnụ Malakaị, Jehova buru amụma ngọzi ỌZỌ: “Mgbe ahụ ndị na-atụ egwu Jehova na-ekwurịta okwu, otu onye na ibe ya: Jehova wee ṅaa ntị, nụ, e wee deere ndị na-atụ egwu Jehova, ndị na-echekwa echiche aha ya, akwụkwọ ncheta n’ihu ya.” (Malakaị 3:16) N’ime ọgbakọ nile ndị na-azọrọ na ha bụ ndị Kraịst, nanị Ndịàmà Jehova na-eche echiche aha ya ma na-ebuli ya elu n’etiti mba nile. (Abụ Ọma 34:3) Lee otú obi si dị ha ụtọ ịbụ ndị e mesiri obi ike na Jehova na-echeta ikwesị ntụkwasị obi ha!
20, 21. (a) Mmekọrịta dị aṅaa a gọziri agọzi ka ndị Kraịst na-enwe? (b) N’ihe banyere Iso Ụzọ Kraịst, ọdịiche dị aṅaa na-apụtawanye ìhè karị?
20 Ihe fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ bụ ndị pụrụ iche nke Jehova, ndị oké ìgwè ahụkwa, bụ́ ndị na-enubata isonyere ha, na-eso ha enweta ngọzi nile nke ofufe dị ọcha. (Zekaraịa 8:23) Site n’ọnụ Malakaị, Jehova kwere nkwa, sị: “Ha ga-abụkwa ndị nke m, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị, n’ụbọchị ahụ mgbe mụ onwe m ga na-eme ihe, bụ́ ihe nke aka m; m ga-enwekwa ọmịiko n’ahụ ha, dị ka mmadụ si enwe ọmịiko n’ahụ nwa ya nke [na-ejere ya ozi, NW].” (Malakaị 3:17) Lee aha ngọzi Ọ bụ na Jehova nwere echiche dị nro otú ahụ maka ha!
21 N’ezie, ọdịiche dị n’etiti ezi ndị Kraịst na ndị ụgha na-apụtawanye ìhè karị. Ka ndị Jehova na-agbalịsi ike ịnogide n’ụkpụrụ ya nile, Krisendọm na-aga n’ihu imikpu n’ime mgbagwoju anya nke adịghị ọcha nke ụwa nke a. N’ezie, okwu Jehova aghọwo eziokwu: “Unu ga-alaghachikwa hụ ihe dị iche n’etiti onye ezi omume na onye na-emebi iwu, n’etiti onye na-efe Chineke na onye na-adịghi efe ya.”—Malakaị 3:18.
22. Ngọzi ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ inwe obi ike ịnọgide na-enwe ma ọ bụrụ na anyị ewebata otu ụzọ n’ụzọ iri dum?
22 N’oge na-adịghị anya, ụbọchị ime mpịazi ga-abịa nye ndị Kraịst ụgha. “Lee, ụbọchị ahụ na-abịa, ọ na-ere dị ka ite ọkụ ukwu; ndị nganga nile na onye ọ bụla nke na-eme ihe mmebi iwu ga-abụkwa ahịhịa ọka: ụbọchị ahụ nke na-abịa ga-erechapụ ha, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị.” (Malakaị 4:1) Ndị Jehova maara na ọ ga-echebe ha n’oge ahụ, dị ka o chebere mba ime mmụọ ya laa azụ n’afọ 70 O.A. (Malakaị 4:2) Lee otú obi si dị ha ụtọ na nkwa ahụ bụ nke ha! N’ihi ya, ruo mgbe ahụ, ka onye ọ bụla n’ime anyị na-egosi obi ekele na ịhụnanya maka Jehova site n’iwebata otu ụzọ n’ụzọ iri dum n’ime ụlọ akụ ya. Mgbe ahụ anyị pụrụ inwe obi ike na ọ ga-anọgide na-agọzi anyị ruo mgbe ọnọdụ na-agaghị ezu ịnagide ya.
[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]
a Maka inwetakwu ihe ọmụma, lee Ulọ Nche nke June 15, 1987, peji nke 14-20.
Ị Pụrụ Ịkọwa?
◻ N’oge a, olee mgbe Jehova bịara n’ụlọ nsọ ahụ ya na onye ozi ya nke ọgbụgba ndụ?
◻ Ònye bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche, nhichapụ dịkwa aṅaa dị ha mkpa mgbe 1918 gasịrị?
◻ Ụdị onyinye ime mmụọ dị aṅaa ka ezi ndị Kraịst na-ewetara Jehova?
◻ Gịnị bụ otu ụzọ n’ụzọ iri ahụ a kpọrọ ndị Kraịst òkù iweta n’ụlọ akụ ahụ?
◻ Ngọzi ndị dị aṅaa ka ndị Chineke na-enweta site n’inye otu ụzọ n’ụzọ iri ime mmụọ?
[Foto dị na peeji nke 15]
Otu ụzọ n’ụzọ iri ime mmụọ anyị gụnyere inye ike anyị na ihe ndị anyị nwere iji wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche
[Foto dị na peeji nke 16]
N’ihi ngọzị Jehova gọziri ndị ya, ọ dịwo mkpa inwe ọtụtụ ihe owuwu, gụnyere Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ