Olee Ụzọ Anyị Pụrụ Isi Kwụghachi Jehova Ụgwọ?
JEHOVA CHINEKE bụ ihe nlereanya kachasị mma nke inye ihe. Ọ na-enye ihe nile a kpọrọ mmadụ “ndụ, na ume, na ihe nile.” (Ọrụ 17:25) Chineke na-eme ka anyanwụ ya wakwasị ma ndị ajọ omume ma ndị ezi omume. (Matiu 5:45) N’ezie, ‘Jehova na-enye anyị mmiri ozuzo site n’eluigwe na oge mkpụrụ, na-emeju obi anyị n’ihe oriri na ọṅụ.’ (Ọrụ 14:15-17) Ee, “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè nke e nyere enye si n’elu bịa, ebe o si n’aka Nna nke ìhè rịdata”!—Jemes 1:17.
E wezụga ihe onyinye nile a na-ahụ anya ndị Chineke nyere, ọ na-ezipụta ìhè na eziokwu ime mmụọ. (Abụ Ọma 43:3) Ndị ohu Jehova na-eguzosi ike n’ihe na-enweta ngọzi n’ụba site ná nri ime mmụọ ndị a na-enye n’oge kwesịrị ekwesị site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45-47) Anyị pụrụ irite uru site ná ndokwa ime mmụọ ndị Chineke mere n’ihi na o mewo ka o kwe omume ụmụ mmadụ ndị na-emehie emehie, ndị na-anwụkwa anwụ, ịbụ ndị e mere ka ha na ya dịghachi ná mma. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Site n’ọnwụ nke Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, onye nyere ndụ ya dị ka ihe mgbapụta maka ọtụtụ ndị. (Matiu 20:28; Ndị Rom 5:8-12) Lee nnọọ onyinye nke a bụ site n’aka Chineke nke na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova!—Jọn 3:16.
Ò Kwere Omume Ịkwụghachi Ya Ụgwọ?
Ọtụtụ narị afọ tupu e weta ihe mgbapụta ahụ, otu onye ọbụ abụ na-ede ihe site n’ike mmụọ nsọ nwere ekele dị omimi maka obi ebere, nnapụta na enyemaka Chineke nyeworo, nke na o kwuru, sị: “M̀ ga-esi aṅaa nyeghachi Jehova mmeso ọma ya nile o mesoworo m? Iko nke nzọpụta nile ka m ga-ebuli, ọ bụkwa aha Jehova ka m ga-akpọku. Ka m kwụghachi Jehova nkwa nile m kwere, ka m kwụghachi ha n’ihu ndị ya nile.”—Abụ Ọma 116:12-14.
Ọ bụrụ na anyị bụ ndị ji obi anyị nile rara onwe anyị nye Jehova, anyị na-akpọku aha ya n’okwukwe, na-akwụghachikwa nkwa nile anyị kweworo ya. Dị ka Ndịàmà Jehova, anyị pụrụ ịgọzi Chineke site n’ikwu okwu dị mma banyere ya n’oge nile, na-ekwusakwa ozi nke Alaeze ya. (Abụ Ọma 145:1, 2, 10-13; Matiu 24:14) Ma anyị apụghị ime ka Jehova baa ọgaranya, bụ́ onye ihe nile bụ nke ya, ma ọ bụ kwụghachi ya ụgwọ maka uru nile anyị riteworo n’aka ya.—1 Ihe Emere 29:14-17.
Ịtụnye ụtụ maka ọganihu nke ọdịmma Alaeze abụghị ụzọ anyị si akwụghachi Jehova ụgwọ ma ọ bụ mee ka ọ baa ọgaranya. Otú ọ dị, onyinye ihe dị otú ahụ na-enye anyị ohere igosipụta ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ. Ụtụ ndị a tụnyere, n’abụghị n’ihi mkpali ịchọ ọdịmma onwe onye nanị ma ọ bụ iji mee mkpọsa ma ọ bụ iji nata otuto ọha, kama site ná mmụọ mmesapụ aka na iji kwalite ezi ofufe, na-ewetara onye nyere ya obi ụtọ na ngọzi Jehova. (Matiu 6:1-4; Ọrụ 20:35) Mmadụ pụrụ ijide n’aka ikere òkè n’onyinye ihe dị otú ahụ na n’obi ụtọ na-esi na ya apụta site n’iwepụta ihe mgbe mgbe site n’ihe onwunwe ya iji kwadoo ezi ofufe na iji nyere ndị kwesịrị ekwesị aka. (1 Ndị Kọrint 16:1, 2) È kwesiri ime nke a site n’inye otu ụzọ n’ụzọ iri?
Ì Kwesiri Inye Otu Ụzọ n’Ụzọ Iri
Jehova sitere n’ọnụ onye amụma ya bụ Malakaị kwuo, sị: “Webatanụ otu ụzọ n’ụzọ iri nile n’ụlọ akụ nke m, ka ihe oriri wee dị n’ụlọ m, biko, nwaanụ m na nke a, . . . ma m gaghị emeghere unu window nile nke eluigwe, wụsara unu ngọzi, ruo mgbe ọnọdụ agaghị ezu ịnagide ya.” (Malakaị 3:10) Otu nsụgharị ọzọ na-agụ, sị: “Webatanụ otu ụzọ n’ụzọ iri dum ahụ n’ime ụlọ nkwakọba ihe.”—An American Translation.
Otu ụzọ n’ụzọ iri bụ otu ụzọ nke ihe e kewasịrị ụzọ iri. Ọ bụ 10 pasenti nke a na-enye ma ọ bụ nke a na-akwụ dị ka ụgwọ e ji egosi obi ekele. A na-enyekarị otu ụzọ n’ụzọ iri n’ihe banyere okpukpe. Ọ pụtara inye otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe mmadụ kpatara iji kwalite ofufe.
Nna ochie ahụ bụ Abraham (Abram) nyere eze ahụ bụ onye nchụaja, bụ́ Melkizedek onye Selem otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe a dọtara n’agha site ná mmeri o meriri Kedoalaoma na ndị òtù ya. (Jenesis 14:18-20; Ndị Hibru 7:4-10) Mgbe o mesịrị, Jekọb ṅụrụ iyi inye Chineke otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe onwunwe ya. (Jenesis 28:20-22) N’ọnọdụ nke ọ bụla, onyinye nke otu ụzọ n’ụzọ iri bụ nke e ji afọ ofufo mee, n’ihi na ndị Hibru oge ochie ahụ enweghị iwu ọ bụla nke rụgidere ha inye otu ụzọ n’ụzọ iri.
Inye Otu Ụzọ n’Ụzọ Iri n’Okpuru Iwu Ahụ
Dị ka ndị Jehova, ụmụ Israel natara iwu ndị chọrọ ka ha na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri. O yiri ka iwu ndị a metụtara iji otu ụzọ n’ụzọ iri ugbo abụọ dị iche iche nke ihe ha kpatara n’afọ na-eme ihe, ọ bụ ezie na ndị ọkà mmụta ụfọdụ na-eche na e nwere nanị otu ugbo n’afọ a na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri. A naghị enye otu ụzọ n’ụzọ iri n’afọ Sabat, ebe a na-adịghị atụ anya inweta ihe ọ bụla n’afọ ahụ. (Levitikọs 25:1-12) A na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri tụkwasị n’onyinye nke mkpụrụ mbụ a na-enye Chineke.—Ọpụpụ 23:19.
A na-ewere otu ụzọ n’ụzọ iri nke mkpụrụ nke ala na nke osisi ndị na-amị mkpụrụ nakwa ma eleghị anya nke mmụba nke ìgwè ehi na ìgwè atụrụ wee jee n’ebe nsọ ahụ ma nye ya ndị Livaị, bụ́ ndị na-enweghị ihe nketa ọ bụla n’ala ahụ. Ha onwe ha na-enyekwa otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ha natara iji kwadoo usoro ndị nchụaja sitere n’Erọn. Ihe àmà gosiri na a na-azọchapụta ọka, meekwa ka mkpụrụ vine na nke osisi olive ghọọ mmanya na mmanụ tupu e nye otu ụzọ n’ụzọ iri ahụ. Ọ bụrụ na ọ masị onye Israel inye ego kama inye ihe e wetara n’ubi, ọ pụrụ ime otú ahụ ya bụrụhaala na ọ tụkwasịrị otu ụzọ n’ụzọ ise n’ọnụ ahịa ya.—Levitikọs 27:30-33; Ọnụ Ọgụgụ 18:21-30.
O yikwara ka à na-ewepụta otu ụzọ n’ụzọ iri ọzọ iche. Ezinụlọ na-ejikarị ya eme ihe mgbe ndị mmadụ zukọtara maka ememe dị iche iche. Ma gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ogologo njem a ga-aga iru Jerusalem dị ukwuu hie nne nke na ọ gaghị ekwe omume ibu otu ụzọ n’ụzọ iri nke a jee? Mgbe ahụ, a na-ere ọka, mmanya ọhụrụ, mmanụ, na anụmanụ ndị ahụ iji nweta ego nke ọ ga-adị mfe iji jee. (Deuterọnọmi 12:4-18; 14:22-27) N’ọgwụgwụ nke afọ nke atọ ma ọ bụ nke isii ọ bụla nke usoro afọ sabat asaa ahụ, a na-edebe otu ụzọ n’ụzọ iri ahụ iche maka ndị Livaị, ndị ọbịa, ndị inyom di ha nwụrụ, na ụmụ mgbei.—Deuterọnọmi 14:28, 29; 26:12.
N’okpuru Iwu ahụ, e nweghị ahụhụ ọ bụla dịịrị onye na-enyeghị otu ụzọ n’ụzọ iri. Kama nke ahụ, Jehova mere ka ndị ahụ nwee mkpali nke ibu ọrụ dịịrị ha inye otu ụzọ n’ụzọ iri. Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị mkpa ka ha kwupụta n’ihu ya na a kwụzuwo otu ụzọ n’ụzọ iri ahụ. (Deuterọnọmi 26:13-15) A na-ele ihe ọ bụla e jighachiri azụ n’ụzọ na-ezighị ezi anya dị ka ihe e zunaara Chineke.—Malakaị 3:7-9.
Inye otu ụzọ n’ụzọ iri abụghị ndokwa nke bụ ibu arọ. N’eziokwu, mgbe ụmụ Israel debere iwu ndị ahụ, ha na-enwe ihe ịga nke ọma karị. Otu ụzọ n’ụzọ iri ahụ na-akwalite ezi ofufe n’atụkwasịghị uche gabiga ókè n’ụzọ e si enweta ihe e ji enye ya. N’ihi ya, ndokwa inye otu ụzọ n’ụzọ iri gara nke ọma nye ndị nile nọ n’Israel. Ma inye otu ụzọ n’ụzọ iri ọ̀ dịịrị ndị Kraịst?
Ọ̀ Bụ Iwu na Ndị Kraịst Ga-enye Otu Ụzọ n’Ụzọ Iri?
Ruo ogologo oge ụfọdụ, inye otu ụzọ n’ụzọ iri bụ ihe a na-emekarị na Krisendọm. Akwụkwọ The Encyclopedia Americana kwuru, sị: “O . . . ji nwayọọ nwayọọ ghọọ ihe a na-eme n’ebe nile ka ọ na-eru narị afọ nke 6. Nzukọ Kansụl nke Tours na 567 na Nzukọ Kansụl nke abụọ nke Macon na 585 kwadoro inye otu ụzọ n’ụzọ iri. . . . A malitere iji ya na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, karịsịa, mgbe a malitere inye ma ọ bụ iresị ndị nkịtị ikike ịnata otu ụzọ n’ụzọ iri. Na-amalite na Pope Gregory nke Asaa, e kwupụtara na ihe omume nke a bụ nke megidere iwu. Mgbe ahụ, ọtụtụ ndị nkịtị wejere ikike ịnata otu ụzọ n’ụzọ iri ha ná ngalaba dị iche iche nke ụlọ ndị mọnk na katidral dị iche iche. Nhazigharị Chọọchị ahụ amachibidoghị inye otu ụzọ n’ụzọ iri, a nọgidekwara na-aga n’ihu n’ihe omume ahụ na Chọọchị Roman Katọlik na ná mba dị iche iche nke ndị Protestant.” E kpochapụrụ inye otu ụzọ n’ụzọ iri ma ọ bụ jiri nwayọọ nwayọọ jiri ihe ọzọ dochie anya ya n’ọtụtụ mba dị iche iche, ọ bụkwa nanị okpukpe ole na ole na-eme ya ugbu a.
Ya mere, ọ̀ bụ ihe a chọrọ ndị Kraịst n’aka inye otu ụzọ n’ụzọ iri? N’akwụkwọ nkọwa Bible ya, Alexander Cruden kwuru, sị: “Ma Onye Nzọpụta anyị ma ndị ozi ya adịghị nke nyere iwu ọ bụla n’okwu nke a metụtara otu ụzọ n’ụzọ iri.” N’eziokwu, e nyeghị ndị Kraịst iwu inye otu ụzọ n’ụzọ iri. Chineke n’onwe ya wetara Iwu Mosis ahụ ná njedebe, gụnyere ndokwa ya nke inye otu ụzọ n’ụzọ iri, na-akpọgide ya n’osisi ịta ahụhụ nke Jisọs. (Ndị Rom 6:14; Ndị Kọlọsi 2:13, 14) N’ihi ya, kama ịbụ ndị a chọrọ n’aka inye ọnụ ego a kara aka iji hụ maka mmefu ndị a na-eme n’ọgbakọ, ndị Kraịst na-enye onyinye afọ ofufo.
Jiri Ihe Onwunwe Gị Nye Jehova Nsọpụrụ
N’ezie, ọ bụrụ na onye Kraịst ejiri afọ ofufo kpebie inye otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ọ na-enweta iji kwadoo ọganihu nke ezi ofufe, a gaghị enwe ihe ọ bụla dị n’Akwụkwọ nsọ megide onyinye ọ na-enye ihe dị otú ahụ. N’akwụkwọ ozi o ji zite onyinye ya, otu nwa okoro nta dị afọ 15 na Papua New Guinea dere, sị: “Mgbe m bụ nwata, nna m na-agwa m, sị, ‘Mgbe ị malitere ịrụ ọrụ, ị ghaghị inye Jehova mkpụrụ mbụ gị.’ Echetara m okwu ndị ahụ dị n’Ilu 3:1, 9, nke na-ekwu na anyị aghaghị inye Jehova mkpụrụ mbụ anyị iji nye ya nsọpụrụ. Ya mere ekwere m nkwa ime nke a, ugbu a kwa, m ghaghị imezu nkwa m. Enwere m obi ụtọ nke ukwuu izitere unu ego nke a iji nye aka n’ọrụ Alaeze ahụ.” Bible adịghị akpọku ndị Kraịst ikwe nkwa dị otú ahụ. Otú ọ dị, inye ihe n’afọ ofufo bụ ụzọ dị mma isi gosipụta ezi mmasị anyị nwere n’ịkwalite ezi ofufe.
Onye Kraịst pụrụ ịhọrọ ịhapụ ịka ọnụ ego ọ bụla a kpaara ókè akara banyere onyinye ndị ọ na-enye iji kwalite ofufe nke Jehova Chineke. Iji mee ihe atụ: Mgbe ha nọ n’otu mgbakọ Ndịàmà Jehova, ụmụnna nwanyị abụọ meworo agadi nọ na-akparịta ihe banyere ụtụ ndị a pụrụ ịtụnye n’ọrụ Alaeze ahụ. N’ihe banyere inweta nri n’ala mgbakọ ahụ, otu n’ime ụmụnna ahụ, onye dị 87 afọ, jụrụ ego ole ọ pụrụ iwe ka ya nwee ike ịtụnye ego ole ahụ. Nwanna nwanyị nke ọzọ, onye dị 90 afọ, sịrị: ‘Nanị nye ihe i chere na o ruru—tụkwasịkwa ihe nta n’elu ya.’ Lee nnọọ àgwà ọma nwanna nwanyị nke a meworo agadi karị gosipụtara!
Ebe ndị Jehova raraworo ihe nile ha nwere nye ya, ha na-eji obi ụtọ enye onyinye ego na ihe ndị ọzọ iji kwadoo ezi ofufe. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 8:12.) N’eziokwu, ụzọ ndị Kraịst nke inye ihe na-enye ohere dị iche iche iji gosipụta obi ekele dị omimi maka ofufe nke Jehova. Onyinye ihe dị otú ahụ abụghị nke a kpaara ókè ịbụ otu ụzọ n’ụzọ iri, a pụkwara inwe ọnọdụ dị iche iche ndị a na-akpali mmadụ inye ihe dị ukwuu karị iji kwadoo ọganihu nke ọdịmma Alaeze.—Matiu 6:33.
Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ka onye ọ bụla n’etiti unu nye dị ka o buru ụzọ họpụta n’obi ya; ọ bụghị site ná mwute, ma ọ bụ site ná mkpa: n’ihi na Chineke hụrụ onye weere obi ụtọ na-enye n’anya.” (2 Ndị Kọrint 9:7) Ọ bụrụ na i jiri obi ụtọ na afọ ofufo na-enye ihe iji kwadoo ezi ofufe, ị ga-enwe ihe ịga nke ọma, n’ihi na otu ilu amamihe dị na ya kwuru, sị: “Sọpụrụ Jehova site n’akụ gị, sitekwa ná mkpụrụ mbụ nke ihe omume gị nile: ọba gị nile ga-ejupụtakwa n’ihe nriju afọ, ebe nzọcha mkpụrụ vine gị nile ga-etiwakwa ná mmanya vine ọhụrụ.”—Ilu 3:9, 10.
Anyị apụghị ime ka Onye Kachasị Ihe Nile Elu baa ọgaranya. Ọlaọcha na ọlaedo nile bụ nke ya, anụ ọhịa nile dị n’otu puku ugwu, na ihe ọma nile a na-apụghị ịgụta ọnụ. (Abụ Ọma 50:10-12) Ọ dịghị mgbe ọ bụla anyị pụrụ ịkwụghachi Chineke ụgwọ ọrụ maka uru nile anyị riteworo n’aka ya. Ma anyị pụrụ igosi obi ekele anyị dị omimi nye ya, nakwa maka ihe ùgwù nke ije ozi dị nsọ iji wetara ya otuto. Anyị pụkwara ijide n’aka na ngọzi ndị bara ụba ga-abịara ndị ji mgbasapụ aka na-enye ihe iji kwadoo ezi ofufe na iji sọpụrụ Chineke ahụ nke na-ahụ n’anya, onye nwekwara afọ ofufo, bụ́ Jehova.—2 Ndị Kọrint 9:11.
[Igbe dị na peeji nke 29]
ỤZỌ ỤFỌDỤ NDỊ SI ENYE AKA N’ỌRỤ ALAEZE AHỤ
◻ ỤTỤ A NA-ATỤNYE MAKA ỌRỤ ZURU ỤWA ỌNỤ: Ọtụtụ ndị na-ewepụta ma ọ bụ mawapụta ego iche nke ha na-etinye n’igbe onyinye ndị ahụ a mapawara akwụkwọ bụ “Onyinye Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ—Matiu 24:14.” Kwa ọnwa, ọgbakọ dị iche iche na-ezije ego ndị a n’isi ụlọ ọrụ ụwa dum nke dị na Brooklyn, New York, ma ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ nke kasị dịrị ha nso.
◻ ONYINYE: A pụrụ iziga onyinye ego afọ ofufo gaa kpọmkwem n’ụlọ ọrụ Watchtower Bible and Tract Society of Pennsylvania, 25 Columbia Heights, Brooklyn, New York 11201, ma ọ bụ gaa n’alaka ụlọ ọrụ Society dị ná mba ọ bụla. A pụkwara ịtụnye ọla ma ọ bụ ihe ndị ọzọ bara uru. E kwesịrị izitekọ onyinye ndị a na akwụkwọ ozi dị mkpirikpi nke na-akọwa na ha bụ onyinye.
◻ ONYINYE NKE A PỤRỤ ỊNARAGHACHI: A pụrụ inye Watch Tower Society ego ka ha jidere mmadụ ná ntụkwasị obi ruo mgbe onye ahụ nwụrụ, n’ọnọdụ nke bụ na a ga-enyeghachi ya onye ahụ nyere ya ma ọ bụrụ na o nwee mkpa.
◻ ỊNSHỌRANSỊ: A pụru idenye aha Watch Tower Society dị ka ndị a ga-akwụ ụgwọ ma ọ bụrụ na onye dejupụtara akwụkwọ ịnshọransị ahụ anwụọ ma ọ bụ n’atụmatụ ego a na-erite ma a laa ezumike nká. E kwesịrị ime ka Society mara banyere ndokwa ọ bụla dị otú ahụ.
◻ IHE NDEKỌ EGO ỤLỌ AKỤ: A pụrụ ime ndokwa ka ihe ndekọ ego ụlọ akụ, satifiketi ndebe ego, ma ọ bụ ihe ndekọ ego ezumike nká nke ndị mmadụ n’otu n’otu dịrị ná ntụkwasị obi n’aha Watch Tower Society, ma ọ bụ kwuo na ọ bụ ha ka a ga-akwụ ụgwọ ahụ mgbe onye debere ya nwụrụ, n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị ụlọ akụ dị n’ógbè ahụ na-agbaso. E kwesịrị ime ka Society mara banyere ndokwa ọ bụla dị otú a.
◻ IHE NDỊ NỌCHIRI ANYA EGO: A pụrụ inye Watch Tower Society ihe ndị nọchiri anya ego dị ka onyinye kpam kpam ma ọ bụ ná ndokwa nke bụ na onye nyere ha ga-anọgide na-enweta ego a na-akwụ maka ha.
◻ ALA NA ỤLỌ: A pụrụ inye Watch Tower Society ala ma ọ bu ụlọ nke a pụrụ ire ere site n’inye ya dị ka onyinye kpam kpam ma ọ bụ site n’inye onye ahụ nyere ya ohere nke ịnọgide na-ebi n’ebe ahụ n’oge nile ọ dị ndụ. Mmadụ kwesịrị ime ka Society mara tupu o denyere Society ụlọ ma ọ bụ ala ọ bụla.
◻ IKE EKPE NA IHE NTỤKWASỊ OBI: A pụrụ idenyere Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania ihe onwunwe ma ọ bụ ego n’akwụkwọ ike ekpe nke e deziri nke ọma n’ụzọ iwu kwadoro, ma ọ bụ a pụrụ ịkpọ Society aha dị ka ndị ga-erite uru ná ndokwa atụmatụ ego. Atụmatụ ego ndị e mere ka ha baara òtù okpukpe uru pụrụ ime ka e sepụtụrụ mmadụ ego ụtụ isi ọ ga-akwụ. E kwesịrị izijere Society otu n’ime akwụkwọ ike ekpe ma ọ bụ nke ndokwa atụmatụ ego dị otú ahụ.
Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere okwu ndị a, dega akwụkwọ na Treasurer’s Office, Watch Tower Bible and Tract Society, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State, ma ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ Society kasị dịrị gị nso.