Abụ Ọma
Ndị nọ n’eluigwe, toonụ Jehova.+
Ndị nọ n’ebe ndị kacha elu, toonụ ya.
2 Ndị mmụọ ozi ya niile, toonụ ya.+
Ụsụụ ndị agha ya niile, toonụ ya.+
3 Anyanwụ na ọnwa, toonụ ya.
Kpakpando niile na-enye ìhè, toonụ ya.+
6 Ọ na-eme ka ha na-adị ruo mgbe niile ebighị ebi.+
O nyela iwu ga na-achị ha mgbe niile.+
7 Toonụ Jehova n’ụwa,
Unu nnukwu anụ mmiri na mmiri niile miri emi,
8 Unu àmụ̀mà na akụ́ mmiri ígwé, snoo na urukpuru,
Unu oké ifufe ndị na-eme ihe o kwuru,+
9 Unu ugwu ukwu na unu ugwu nta niile,+
Unu osisi na-amị mkpụrụ na unu osisi sida niile,+
10 Unu anụ ọhịa+ na unu anụ ụlọ niile,
Unu anụ ndị na-arị arị na nnụnụ,
11 Unu ndị eze ụwa na unu mba niile,
Unu ndị isi na unu ndị ikpe niile e nwere n’ụwa,+
12 Unu ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa,*
Ndị agadi nakwa ụmụaka.
Ọ dị ebube karịa eluigwe na ụwa.+
14 Ọ ga-eme ka ndị ya sikwuo ike,*
Ka e wee na-aja ndị niile na-erubere ya isi mma,
Ya bụ, ndị Izrel, bụ́ ndị na-abịa ya nso.
Toonụ Jaa!*