Malitere Ndị Ị Na-ewegara Magazin Ọmụmụ Baịbụl
1. Gịnị mere ọgbakọ Jehova ji agwa anyị kemgbe ka anyị nwee ndị anyị na-ewegara Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta! kwa ọnwa?
1 Ọtụtụ ndị na-enwe mmasị ịgụ akwụkwọ anyị. Ma, ha anaghị achọ ka anyị na ha na-amụ ihe. N’ihi ya, ọgbakọ Jehova na-agwa anyị kemgbe ọtụtụ afọ ka anyị nwee ndị anyị na-ewegara Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta! kwa ọnwa. Ka ndị mmadụ na-agụ akwụkwọ anyị, ha nwere ike malite inwe mmasị n’Okwu Chineke. (1 Pita 2:2) Ka oge na-aga, ha nwere ike ịgụta ihe ga-eme ka ha chọọ ka a mụwara ha Baịbụl.
2. Olee ihe ndị anyị nwere ike ime ka ndị anyị na-ewegara magazin nwewe mmasị n’ihe Baịbụl kwuru?
2 Gwa Ya Ihe Ole na Ole: Ọ bụrụ na ị gaa iwegara mmadụ magazin, gbaa mbọ ka gị na ya kwurịta ihe ụfọdụ. Ime otú ahụ ga-eme ka gị na ya dịrịkwuo ná mma. Unu dịrịkwuo ná mma, ọ ga-eme ka ị mata ihe ụfọdụ gbasara ya, ihe ndị ọ na-achọ ịmatakwu nakwa ihe ndị o kweere. Ịmata ihe ndị a ga-enyere gị aka ịma ihe ị ga-ekwu, ya eruo ya n’obi. (Ilu 16:23) Tupu ị gaa na nke ya, kwadoo ihe ndị ị ga-ekwu nke ọma. I ruo, gị na ya kwurịta ụfọdụ ihe dị n’Ụlọ Nche ahụ ma ọ bụ Teta! ahụ, gụọkwanụ amaokwu Baịbụl ụfọdụ. Ime otú a nwere ike ime ka ọ nwewe mmasị n’ihe Baịbụl kwuru. (1 Kọr. 3:6) Ọ ga-adị mma ka i dee ụbọchị ọ bụla ị gara na nke ya n’akwụkwọ. Deekwa akwụkwọ i nyere ya, ihe unu kwurịtara na amaokwu Baịbụl ndị unu gụrụ.
3. Olee mgbe anyị kwesịrị ịgaghachi na nke onye anyị na-ewegara magazin?
3 Olee Mgbe Anyị Kwesịrị Ịgaghachi? I nweta magazin ọhụrụ, i kwesịrị ịga nye ya onye ị na-ewegara ya kwa ọnwa. Ma, ọ bụrụ na onye ahụ chọrọ ka gị na ya na-ekwurịta ihe dị na nke i nyere ya, ya abụrụkwa na i nwere ohere, i nwere ike ịgaghachi na nke ya tupu ị gaa inye ya ọzọ. Dị ka ihe atụ, ya mee otu izu ma ọ bụ izu abụọ i wegaara ya magazin, i nwere ike ịga na nke ya. I ruo, gị asị ya, “E nwere isiokwu dị na magazin ahụ m bịara igosi gị.” Ọ bụrụ na ọ gụbeghị ya, ọ ga-eme ka ọ chọọ ịgụ ya. Ya bụrụkwa na ọ gụọla ya, i nwere ike ịjụ ya ihe o chere gbasara isiokwu ahụ. Ya kwuchaa, gị na ya nwere ike iji nkeji ole na ole kwurịta ya. I nwekwara ike iwegara onye ahụ traktị, broshọ, ma ọ bụkwanụ akwụkwọ ọzọ anyị na-enye ndị mmadụ n’ọnwa ahụ ma ọ bụrụ na ịgụ akwụkwọ anyị ndị ọzọ na-amasị ya.
4. Gịnị ka anyị kwesịrị anyị gụrụ anyị emee iji mara ma ndị anyị na-ewegara magazin hà ga-achọ ịmụwa Baịbụl?
4 Jiri aka gị gwa onye ị na-ewegara magazin ka unu mụwa Baịbụl. Echerela ka ọ gwa gị ya. Ọ bụrụgodị na o nweela mgbe ị gwara ya ka unu mụwa Baịbụl ma o kwetaghị, ị gụrụ gụrụ gosi ya isiokwu bụ́ “Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara,” nke na-agba n’Ụlọ Nche. O nwere ike ikweta ka gị na ya kwurịta ya, ya bụrụgodị na gị na ya ga na-eguzo ọtọ jiri nkeji ole na ole na-amụ ya. Ma, ọ bụrụ na o kweghị, akwụsịla ị na-ewegara ya magazin.