Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Inwe Ndị Anyị Na-ewegara Magazin Ọ Bụla E Bipụtara
Ihe Mere O Ji Dị Mkpa: Ọtụtụ ndị na-agụ magazin anyị anaghị achọ ka anyị na ha na-amụ ihe. O nwere ike ịbụ n’ihi na ha achọghị ịgbanwe chọọchị ha na-aga ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha chere na ha enweghị ohere ka anyị na ha na-amụ Baịbụl. Ma, ka ha na-agụ magazin anyị na-aga, ịmụ Okwu Chineke nwere ike ịgụwa ha agụụ. (1 Pita 2:2) Otu isiokwu ha gụrụ nwere ike imetụ ha n’obi. Otú ihe si dịrị ha nwekwara ike ịgbanwe. Ọ bụrụ na anyị ana-agachi na nke ha anya, gharakwa ịnọte aka ma anyị gaa, ha ga-achọ ka anyị na-abịa. Ọ ga-enyekwara anyị aka ịmata ihe ndị ha ga-achọ ka anyị na ha kparịta, anyị amarakwa ihe ndị bụ́ mkpa ha. Ka oge na-aga, anyị na ha nwere ike malite ịmụ Baịbụl.
Mee Ihe A n’Ọnwa A:
Dee aha ndị ị chọrọ ịna-ewegara magazin n’ọnwa ọ bụla n’akwụkwọ ma gbalịa wegara ha ndị nke ọhụrụ. I nyechaa ha ya, gwa ha na ị ga-ewetara ha nke ọnwa ọzọ.