Magazin Hausa
1 Ùnu nwere ndị ọ bụla na-asụ Hausa n’ókèala unu? Obi abụọ adịghị ya na ọgbakọ nile dị n’Ebe Ugwu ga-aza ee. Ma gịnị banyere Ebe Ndịda? E nwekwara ọtụtụ ndị na-asụ Hausa n’ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’obodo ndị dị n’Ebe Ndịda. E nwere ha ọbụna n’obodo ndị ka nta na n’ime ime obodo nke mba a. Ọgbakọ unu ò nwere ọda maka magazin Hausa?
2 Anyị na-agba ọgbakọ ndị nwere ụfọdụ ndị na-asụ Hausa n’ókèala ha ume ka ha tinye ọda maka magazin Hausa ole na ole, ma ọ dịkarịa ala, kwa ọnwa. A na-atụ aro ka ọgbakọ ndị buru ibu karị tụọ ọda mkpụrụ ise nke Ụlọ Nche Hausa, ma ọ dịkarịa ala, kwa ọnwa. Cheta na a na-ebipụta ya nanị otu ugbo n’ọnwa. Ọgbakọ ndị dị nta karị pụrụ ịtụ ọda magazin abụọ ma ọ bụ atọ. Ndị ọsụ ụzọ nile kwesịrị inwe ọda otu kwa ọnwa ma ọ dịkarịa ala ma ọ bụrụ na ha nwere onye ọ bụla na-asụ Hausa n’ókèala ha. N’ezie, ndị nọ n’ebe a na-asụ Hausa ga-achọ ọbụna ịtụ ọda ọnụ ọgụgụ ka ukwuu. Otú ọ dị, buru n’uche na ịtụ ọda na-adabere n’ihe ụmụnna ga na-ewere mgbe nile.
3 Ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọ kwesịrị ịdị njikere ịchịrị magazin Hausa ụfọdụ mgbe ha na-apụ n’ọrụ nkwusa, ma ọ bụ mgbe ha na-aga ahịa. Chọpụta ndị na-agụ Hausa ma chee magazin ndị ahụ n’ihu ha. Ọ bụrụ na ụfọdụ nwere mmasị n’ịgụ magazin ndị ahụ, tinye ha n’ụzọ magazin gị ka i wee na-enye ha mbipụta ọhụrụ nke Ụlọ Nche Hausa kwa ọnwa mgbe ọ pụtara.
4 Cheta ihe Jisọs kwuru banyere ụbọchị anyị na Mak 13:10, sị: “A ghaghịkwa ibu ụzọ kwusaa ozi ọma nke m n’ihu mba nile.” Nke ahụ na-agụnye ụba mmadụ buru ibu nke ndị na-asụ Hausa anyị nwere—ihe dị ka 40 nde. A na-ebipụta Ụlọ Nche n’asụsụ Hausa ugbu a n’àgwà zuru ezu, dị ka ọ dị n’asụsụ ndị ọzọ. Ka anyị were ngwá ọrụ ọma nke a mee ihe n’ụzọ bara uru iji nyere anyị aka n’ikwusa ozi ọma ahụ gwa mmadụ nile n’ókèala e kenyere anyị.