Ị̀ Pụrụ Inye Aka?
1 Pọl onyeozi dụrụ ndị nọ n’ọgbakọ ọdụ ka ha “na-echegbu onwe ha nye ibe ha n’otu ụzọ ahụ.” (1 Kọr. 12:25) N’ihi ya, anyị kwesịrị inwerịta mmasị n’ebe ibe anyị nọ ma dị njikere iji ịhụnanya nye aka mgbe ọ dị mkpa. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ụmụnna nwanyị ime mmụọ nọ n’etiti anyị na-azụlite ụmụ ha n’eziokwu nanị ha. Ụmụnna nwanyị a bu ibu nile nke ịzụ ụmụ ha n’ụzọ ime mmụọ. N’ezie ha ruru eru inweta agbamume obiọma na enyemaka anyị bara uru “n’akụkụ ihe na-akpa” ha. (Rom 12:13a) Ị̀ pụrụ inyere ha aka?
2 Ụzọ Ndị Ị Pụrụ Isi Nye Aka: Iburu ndị na-aghaghị iji ụgbọ njem ọha na eze mee ihe n’ụgbọala gị gaa nzukọ na mgbakọ pụrụ ibelatara ezinụlọ ahụ oké mmefu. Inyere onye bụ́ nne aka ilekọta obere ụmụaka ya ná nzukọ pụrụ ime ka o nwee ike irite uru n’ụzọ zuru ezu karị n’usoro ihe omume ahụ. N’otu aka ahụ, inyere ya aka mgbe ọ kpọ ụmụ ya na-aga ozi ubi pụrụ ime ka o nwetatụ ahụ efe. Inwe ezi mmasị n’ebe ụmụaka ahụ nọ—imeta ha enyi—pụrụ inwe mmetụta dị ukwuu n’ahụ ndị ntorobịa anyị n’ụzọ dị mma. Ịkpọ ezinụlọ nwere nanị nne ma ọ bụ nna mgbe ụfọdụ isonye n’ọmụmụ ihe ezinụlọ unu ga-abụ ihe na-enye ume ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ.
3 Nwee Ezi Uche: Anyị ga-akpachara anya ka anyị ghara ịmanye onye na-ahụghị mkpa ọ dị ịnakwere enyemaka anyị. Anyị ekwesịghịkwa itinye aka n’ihe dịịrị ezinụlọ mmadụ mgbe anyị na-enye aka dị mkpa. Otú ọ dị, ụmụnna nwanyị na ndị di na nwunye ga-akasị nọrọ n’ọnọdụ dị mma inyere nwanna nwanyị nọ ná mkpa aka.
4 A na-agba ndị Kraịst nile ume ‘ịgbaso ọrụ ile ọbịa anya nke ọma’ n’ebe ibe ha nọ. (Rom 12:13b) Inyere ụmụnna anyị nwoke na ụmụnna anyị nwanyị n’ime mmụọ aka bụ otu n’ime ọtụtụ ụzọ anyị si egosi ịhụnanya ahụ yiri nke Kraịst nke dị n’etiti anyị.—Jọn 13:35.