Ịchọta Ezi Ihe Ngwọta
OKWU CHINEKE, bụ́ Bible, na-ekwu banyere oge mgbe ọchịchị eluigwe nke Chineke ga-agwọworị nsogbu nile nke ihe a kpọrọ mmadụ, bụ́ nke na-agụnyezi nsogbu nke mmetọ si n’ụgbọ ala. Alaeze Mesaịa nke a, nke a kụziwooro ọtụtụ ikpe ekpere maka ya, ọ̀ ga-enye ezi ihe ngwọta site n’imepụta ụgbọ ala na-enweghị mmetọ ma ọlị? Ka à ga-enwe ezi ihe ngwọta site n’ikpofusị ụgbọ ala nile n’ụwa? Ebe ọ bụ na Bible adịghị enye anyị otu azịza kpọmkwem, anyị apụghị ime ihe ọ bụla karịa nanị ichere wee hụ.—Matiu 6:9, 10.
Ma anyị pụrụ ijide nke a n’aka: Ọchịchị Chineke agaghị ekwe ka mmetọ mebie ịma mma nke okike na Paradaịs ahụ e weghachiri eweghachi nke Alaeze ahụ ga-eweta.—Aịsaịa 35:1, 2, 7; 65:17-25.
Ebe ọ bụ na a nọworị na-enye ndị na-erube isi n’Okwu Chineke ọzụzụ maka ndụ n’ime ụwa ọhụrụ na-enweghị mmetọ, olee otú ha kwesịrị isi lee iji ụgbọ ala eme ihe anya taa? Teta! nke November 8, 1988, tụlere isiokwu bụ́ “À Pụrụ Ịzọpụta Ọhịa Ndị Ahụ?” Ọ kọrọ na ụfọdụ n’ime ndị ọkà mmụta sayensị chere na e nwere njikọ dị n’agbata ihe ndị na-emetọ ikuku ụgbọ ala na-agbapụ na oké ọhịa ndị na-anwụ anwụ. Nke a mere ka otu onye na-agụ akwụkwọ anyị nke nwere nchegbu degara Watchtower Society akwụkwọ na-ajụ ma n’iburu eziokwu a n’uche, ma ọ̀ ga-abụ ihe kwesịrị ekwesị nye ndị Kraịst ịnya ụgbọ ala. O doghị ya anya ma ime nke ahụ ọ̀ ga-egosi enweghị nkwanye ùgwù maka ihe ndị Jehova kere eke.
A zara akwụkwọ ozi ya, n’otu akụkụ, n’ụzọ na-esonụ: “Ndịàmà Jehova na-erube isi n’ụzọ zuru ezu nye iwu nchịkwa gburugburu ebe obibi ndị isi gọọmenti tiri iji belata mmetọ. (Ndị Rom 13:1, 7; Taịtọs 3:1) Iwere nzọụkwụ gabiga ókè gọọmenti chọrọ bụ ihe dịịrị mkpebi nke onye ahụ. Ọ bụrụ na mmadụ ekpebie ịkwụsị ịnya ụgbọ ala, nke ahụ bụ okwu dịịrị nanị ya. Otú ọ dị, isiokwu Teta! ahụ gosiri otú ọ dị ụfọdụ ndị, site n’ikwu na peji nke 23, sị: ‘Ọtụtụ ndị na-eme ihe bara uru iji kwụsị mmetọ nke ikuku ruo n’ókè ọ ga-ekwe mee. Ha ji nwayọọ na-anya ụgbọ ala, na-eme njem dị nta karị, na-abanye n’òtù ndị na-anya ụgbọ ala, na-anya ụgbọ ala na-eji gasoline lead na-adịghị na ya eme ihe, na-erube isi n’iwu megidere mmetọ ikuku nke ndị na-achị achị tiri.’”
Ezi Nguzo nke Ndị Kraịst
Azịza nke a gosipụtara ezi nguzo nke ndị Kraịst. A ghaghị icheta na ọ bụghị nanị ụgbọ ala na-akpata mmetọ. Ụgbọ elu na ụgbọ okporo ígwè—n’ezie, ihe ka ọtụtụ n’ime ụzọ ọgbara ọhụrụ nke usoro ime njem—na-eme otú ahụ. Ma e mepụtaghị usoro ndị a nke ime njem nanị n’ihi nzube nke mmetọ. Mmetọ ndị ha na-akpata bụ mmetụta ọjọọ, bụ́ nke dị mwute na ọ bụ amamihe a kpaara ókè na àgwà ndị na-ezughị okè kpatara ha.
Ụlọ Nche nke January 1, 1993, peji nke 31, tụlere okwu a, na-asị: “Dị ka Ndịàmà Jehova, anyị nwere nchegbu dị omimi banyere ọtụtụ nsogbu ọnọdụ gburugburu ụwa ndị na-emetụta ebe obibi anyị bụ́ ụwa ugbu a. Karịa ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ, anyị ghọtara na e kere ụwa ịbụ ebe obibi dị ọcha, nke mara mma maka ezinụlọ mmadụ zuru okè. (Jenesis 1:31; 2:15-17; Aịsaịa 45:18) . . . Ya mere o ziri ezi itinye mgbalị ndị a haziri nke ọma, nke ezi uche dị na ha, n’izere ịtụkwasị ihe n’ụzọ na-adịghị mkpa ná mmebi mmadụ nọgidere na-emebi ụwa anyị. Otú ọ dị, rịba okwu ahụ bụ ‘ezi uche’ ama. . . . Ndị Chineke ekwesịghị ileghara ihe ndị metụtara njikọ dị n’etiti ihe ndị e kere eke anya. Jehova chọrọ ka ndị ya n’oge ochie mee ihe dị iche iche iji kpofuo ihe ndị a na-ekpofu ekpofu, ihe omume ndị nwere uru ma ná njikọ dị n’etiti ihe ndị e kere eke ma n’ịdị ọcha. (Deuterọnọmi 23:9-14) Ebe anyị makwaara otú o si ele ndị na-emebi ụwa anya, anyị ekwesịghị nnọọ ilefuru ihe ndị anyị pụrụ ime iji debe gburugburu ebe obibi anyị ọcha anya. . . . Otú ọ dị, ókè onye Kraịst ga-agaru n’okwu a bụ okwu dịịrị onwe onye ọ gwụla ma ọ dị ihe iwu kwuru. . . . Ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-adabakarị ngwa ngwa n’ọnyà nke imebiga ihe ókè. . . . Mgbalị nile nke mmadụ iwepụ n’ụwa nsogbu ndị bụ isi nke njikọ dị n’etiti ihe ndị e kere eke, gụnyere mmetọ, agaghị enwe ihe ịga nke ọma zuru ezu. A pụrụ inwe ọganihu ụfọdụ, ma ihe ngwọta na-adịgide adịgide e nwere nanị ya ga-achọ ka Chineke tinye aka. N’ihi nke a anyị na-atụkwasị uche anyị na ihe ndị anyị nwere n’ihe ngwọta nke Chineke, kama ịdị na-anwa iwepụ ihe mgbaama ọrịa ndị dị n’elu n’elu.”
Ndị Kraịst nwere ezi nguzo ka ha na-agbaso ụkpụrụ Bible, na-eburu n’uche ọrụ Chineke ha nataworo bụ́ ikwusa ozi nke Alaeze Chineke n’ụwa nile. (Matiu 24:14) Ọ dịghị ihe dị mkpa ma ọ bụ dị ngwa karịa nke ahụ! Ọ bụrụ na usoro ime njem na nke nzirịta ozi oge a pụrụ inyere ndị Kraịst aka imezu ibu ọrụ a, ha nwere ihe nile mere ha ga-eji jiri ha mee ihe. N’otu oge ahụ, ha na-ezere mmetọ na-adịghị mkpa ma ọ bụ nke a kpachaara anya na-eme. Ha si otú a na-ejigide akọ na uche dị ọcha ma n’ihu Chineke ma n’ihu mmadụ.
Ya mere ọ bụ ezie na anyị amaghị taa otú a ga-emesị gwọta nsogbu nke mmetọ na ụgbọ ala, anyị maara na a ga-agwọta ya. N’eziokwu, ezi ihe ngwọta ahụ dị nso nke ukwuu.
[Igbe dị na peeji nke 9]
Ịlụso Mmetọ Ọgụ
• Ịga ije ma ọ bụ ịgba ịnyịnya ígwè mgbe o kwere omume
• Isonye n’ìgwè na-enwekọ otu ụgbọ ala
• Ịrụ ọrụ n’ụgbọ ala mgbe mgbe
• Ibu n’obi mgbe nile iji mmanụ ụgbọ ala dị ọcha na-eme ihe
• Izere ime njem na-adịghị mkpa
• Ịnya ụgbọ ala n’ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ dị mma, ma bụrụ nke na-aga n’ihu n’ihu
• Iji usoro ime njem ọha na eze eme ihe mgbe o kwere omume ma kwesị ekwesị
• Ịgbanyụ injin kama ịhapụ ya nkịtị mgbe ụgbọ ala na-eguzo otu ebe ruo ogologo oge ọ bụla