Ikpochapụ Mmetọ—site N’obi Na N’uche
JEHOVA enyeghị ụmụ mmadụ ọchịchọ maka iru unyi ma ọ bụ adịghị n’usoro. A haziri ebe obibi ha bụ́ ala ịbụ paradaịs nke ịdị ọcha, usoro, na ịma mma. Chineke ezubeghị ka o metọọ wee ghọọ ebe mkpofu ihe na-adịghị mma ile anya.—Jenesis 2:8, 9.
Otú ọ dị, mgbe ụmụ mmadụ jụrụ nduzi Chineke, ha malitere iwulite ụdị usoro ụwa nke ha. N’ihi enweghị amamihe Chineke na enweghị ahụmahụ, a manyewo ha ịmụta ihe site n’ime nnwale dị iche iche. Akụkọ ihe mere eme nke ụwa na-emesi eziokwu Bible ike nke bụ na ụmụ mmadụ apụghị inwe ihe ịga nke ọma n’ịchị onwe ha; ruo ọtụtụ puku afọ ‘mmadụ enwewo ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.’ (Eklisiastis 8:9; Jeremaịa 10:23) Nsogbu mmetọ nke e nwere n’oge a, n’ụdị ya nile, bụ ihe si n’ajọ ọchịchị nke mmadụ pụta.
Inwe Echiche Chineke
Ndị nwere ọchịchọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ na-agbalịsi ike ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ nile nke Onye Okike banyere ịdị ọcha. Otú a, Ndịàmà Jehova chere otu nsogbu ihu mgbe e mere atụmatụ maka otu mgbakọ mba nile a ga-enwe na Prague, Czechoslovakia, n’etiti afọ 1991.a Ihe dị ka 75,000 ndị mmadụ ga-abịa, bụ́ ìgwè nke Ámá Egwuregwu Strahov ga-abata nke ọma. Ma e jibeghị ámá egwuregwu ahụ mee ihe kemgbe afọ ise. Ọ dabawo n’ọnọdụ chọrọ oké nrụzi, nke ọnọdụ ihu igwe meworo ka ọ ghara ịdị mma ile anya. Ihe dị ka 1,500 Ndịàmà Jehova tinyere ihe karịrị 65,000 hour n’ịrụzigharị ya na itegharị ya ágbá. Tupu oge mgbakọ ahụ eruo, ọrụ mkpocha nke a emewo ka ámá egwuregwu ahụ bụrụ ebe kwesịrị ekwesị a ga-anọ fee ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova.
Gịnị na-akpali Ndịàmà Jehova ịdị iche, ọ bụ ezie na ụwa n’ozuzu ya na-egosi enweghị nghọta maka ịdị ọcha na ịdị n’usoro? Ọ bụ ịghọta ndụmọdụ Bible nke bụ na ndị Kraịst kwesịrị ikpochapụ àgwà ndị na-ezighị ezi, dị ka ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, enweghị nchebara echiche, anyaukwu, na enweghị ịhụnanya. ‘Yipụchasịa mmadụ ochie ahụ, ya na omume ya nile,’ ka Bible kwuru. Jiri “mmadụ ọhụrụ ahụ, nke a na-eme ya ka ọ dị ọhụrụ ruo ná mmazu dị ka onyinyo nke Onye kere ya si dị” dochie ya. Ọdịdị mmadụ nke e ji ịhụnanya maka ịdị ọcha, ịdị n’usoro, na ịma mma wee mara adịghị enye ohere maka àgwà nke imetọ ihe.—Ndị Kọlọsi 3:9, 10; 2 Ndị Kọrint 7:1; Ndị Filipaị 4:8; Taịtọs 2:14.
Ọdịdị mmadụ ọhụrụ ahụ chọrọ ndị Kraịst n’aka ịmụrụ anya n’ihe banyere mmetọ, ọ bụghị ịkpata mmetọ n’ebe ọ dị ukwuu ma ọ bụ iji nnupụisi na-eleghara iwu ndị na-emegide mmetọ nke ndị ọchịchị na-eti. Ọ na-enyere ha aka izere inwe àgwà ịtụfu ihe, ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, na umengwu bụ́ nke na-eduga n’ịtụsa ihe aghara aghara. Site n’ịkwalite nkwanye ùgwù maka ihe onwunwe ndị ọzọ, ọ na-emegide iji ihe nsekasị na-eme ihe dị ka ụzọ isi kwupụta uche gị, dị ka ihe ị na-echeghị na ọ dị njọ, ma ọ bụ dị ka ụdị ọzọ nke nkà ise ihe. Ọ chọrọ n’aka anyị ime ka ebe obibi, ụgbọ ala, uwe, na ahụ anyị dị ọcha.—Tụlee Jemes 1:21.
Banyere mmadụ ndị na-adịghị njikere iyikwasị ọdịdị mmadụ ọhụrụ nke a, à pụrụ ịta Chineke ụta maka igbochi ha inweta ndụ n’ime Paradaịs ya na-abịa abịa? Ọ dịghị ma ọlị. Onye ọ bụla nke ka nwere àgwà nke imetọ ihe n’ime obi ma ọ bụ uche ya ga-eyi ịma mma paradaịs ahụ e weghachiworo ná mbara Ala egwu, bụ́ nke ga-akpatara ndị ahụ nwere ọchịchọ idozi ya oké mwute. Mkpebi Chineke nke “imebi ndị ahụ na-emebi ụwa” bụ nke ezi omume na nke ịhụnanya.—Mkpughe 11:18; 21:8.
Ànyị Ga-ekeresi Òkè Ike?
Otú ọ dị, nke a ọ̀ pụtara na a chọrọ ka ndị Kraịst na-akwalite atụmatụ nke imegide mmetọ ma ọ bụ ime mkpocha?
O doro anya na mmetọ bụ ihe na-emebi ahụ ike na nchebe ọha. Jehova nwere mmasị ziri ezi banyere ihe ndị dị otú ahụ, dị ka anyị pụrụ ịhụ site n’iwu ndị o nyere ụmụ Israel. (Ọpụpụ 21:28-34; Deuterọnọmi 22:8; 23:12-14) Ma ọ dịghị mgbe ọ bụla ọ gwara ha ka ha tọghata ndị ọzọ n’okwu ndị metụtara nchebe ọha; ọ dịghịkwa mgbe a gwara ndị Kraịst narị afọ mbụ ka ha mee otú ahụ.
Taa, ọ pụrụ ịdị mfe okwu ndị metụtara gburugburu ebe obibi ịghọ ihe iseokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị. N’ezie, e guzobewo òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụfọdụ kpọmkwem maka nzube nke idozi nsogbu gburugburu ebe obibi. Onye Kraịst nke hapụrụ onwe ya ịkwado ihe ndị metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị anọpụghịkwa iche n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Jisọs hapụụrụ ndị na-eso ụzọ ya ụkpụrụ ahụ bụ: “Ha esiteghị n’ụwa, dị ka mụ onwe m na-esiteghị n’ụwa.” Onye Kraịst nke jụrụ ụkpụrụ ahụ na-etinye onwe ya n’ihe ize ndụ nke ịkwado “ndị isi oge a, ndị a na-eme ka ha ghara ịdị irè.”—Jọn 17:16; 1 Ndị Kọrint 2:6.
Jisọs agbalịghị idozi nsogbu nile nke ọnọdụ ndị mmadụ n’oge ya; ọ gwaghịkwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha mee otú ahụ. Iwu o nyere ha bụ: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism . . . , na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke m nyere unu n’iwu.” O nyeghị ha iwu banyere ụkpụrụ gburugburu ebe obibi.—Matiu 28:19, 20.
N’ịkọwa ihe kwesịrị ibute ụzọ ná ndụ nke onye Kraịst, Kraịst sịrị: “Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze ya, na ezi omume ya.” (Matiu 6:33) Mgbe Jehova, site n’Alaeze Mesaịa, ga-etinye ụkpụrụ ezi omume ya nile n’ọrụ n’ụzọ zuru ụwa ọnụ, nsogbu gburugburu ebe obibi ga-abụ nke e doziri n’ụzọ na-adịgide adịgide nakwa n’ụzọ ga-eju mmadụ nile afọ.
Otú a, Ndịàmà Jehova na-ewere nguzo ziri ezi. N’ihi ihe e dere ná Ndị Rom 13:1-7, ọ bụ iwu na ha ga-eji ezi akọ na uche na-erube isi n’iwu ndị ọchịchị bụ́ ndị na-achịkwa gburugburu ebe obibi. Tụkwasị na nke ahụ, ịhụ onye agbata obi ha n’anya n’ụzọ nke Chineke na-akpali ha igosi nkwanye ùgwù maka ihe onwunwe nke ndị ọzọ—nke ọha ma ọ bụ nke mmadụ—site n’emebighị ọdịdị ya ma ọ bụ site n’atụfughị ihe aghara aghara. Ma o doro anya na e nyeghị ha ntụziaka ibute ụzọ n’atụmatụ mkpocha nke ụwa. Ha na-edebe ikwusa ozi nke Alaeze Chineke n’ụzọ ziri ezi n’ọnọdụ mbụ, na-aghọta na nke a bụ ụzọ isi mee ihe kachasị mma nke na-adịgide adịgide.
Mkpocha Ime Mmụọ
A dọrọ ụmụ Israel oge ochie aka ná ntị banyere ihe ndị ga-esi n’ime ya pụta ma ọ bụrụ na ha emetọ ụwa site n’ịwụfu ọbara, site n’ibi ndụ rụrụ arụ, ma ọ bụ site n’igosi enweghị nkwanye ùgwù maka ihe ndị dị nsọ. (Ọnụ Ọgụgụ 35:33; Jeremaịa 3:1, 2; Malakaị 1:7, 8) N’ụzọ dị ịrịba ama, a mara ha ikpe maka mmetọ ime mmụọ nke a, ọ bụghị maka mmetọ nkịtị ọ bụla nke ọ pụrụ ịbụ na ikpe ya makwara ha.b
Ya mere, ọ bụ mmetọ ma ọ bụ adịghị ọcha ime mmụọ ka onye Kraịst n’ụzọ bụ isi na-agbalịsi ike izere. Ọ na-eme nke a site n’iyikwasị “mmadụ ọhụrụ” ahụ, bụ́ nke na-ekpochapụ àgwà mmetọ nile site n’obi na n’uche. Ihe karịrị nde Ndịàmà Jehova anọ na-erite uru site ná mkpocha ime mmụọ nke a, na-eme ka e nwee n’etiti ha ịdị ọcha okpukpe na nke omume, tinyekwara ịdị ọcha nkịtị dị ịrịba ama.—Ndị Efesọs 4:22-24.
Oge a bụ oge maka ọrụ mkpocha ime mmụọ. Ọrụ mkpocha nkịtị zuru ụwa ọnụ ga-esochi n’oge ya, ọ ga-azọpụtakwa ebe obibi anyị ka ọ ghara ịghọ ebe mkpofu ihe zuru ụwa ọnụ site n’ime ka o nwee gburugburu ebe obibi kwesịịrị ya nke mmetọ na-adịghị na ya.—Eklisiastis 3:1.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Iji nwetakwuo akụkọ zuru ezu banyere usoro nke a nke mgbakọ ndị e nwere n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, lee Teta! nke December 22, 1991 [Bekee].
b Ndị Israel maara banyere usoro nke ịgbaze ígwè. A chọtawo ebe ụfọdụ ha si gwupụta ọla, a gbazekwara ọla iji mepụta ngwá ọrụ e ji eme ihe n’ụlọ nsọ. (Tụlee 1 Ndị Eze 7:14-46.) O yiri ka ọ bụ ihe na-ekweghị omume na e ji usoro ịgbaze ihe nke a mee ihe n’akpataghị ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke mmetọ n’ụdị nke anwụrụ, unyi a gbazepụtara, na iberibe ígwè, nke nwere ma eleghị anya nsogbu ndị ọ kpatara. Ma, ọ pụtara ìhè na Jehova dị njikere ịnagide ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta nke adịghị ọcha ógbè n’ime ókèala nke a ndị mmadụ bisasịrị ebisasị, nke dịpụkwara iche.