Ṅụrịa Ọṅụ N’ụwa Ahụ Dị Ọcha Nke Dị N’ihu!
LEE aha obi ụtọ anyị pụrụ inwe na Jehova, bụ́ Chineke nke usoro na ịdị ọcha, ga-emezu nzube mbụ ya ime ka ụwa ghọọ paradaịs zuru ụwa ọnụ! (Aịsaịa 11:6-9) Ọ na-ekwe nkwa, sị: ‘Okwu m nke na-esi n’ọnụ m pụta agaghị alaghachikwute m n’efu, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mezuo ihe tọrọ m ụtọ.’ ‘Chineke apụghị ikwu okwu ụgha,’ ya mere okwu ndị a abụghị okwu efu.—Aịsaịa 55:11; Ndị Hibru 6:18.
Obi pụrụ iru anyị ala na Jehova ga-eji ịhụnanya tinye ọnụ n’okwu ahụ tupu ụmụ mmadụ agabiga ókè na-enweghị ngwọta, ókè nke ndakpọ gburugburu ebe obibi nile na-apụghị ịkwụsị akwụsị!—Mkpughe 11:18.
Jehova ga-ewepụ ndị oké mmetọ na-enweghị nchegharị na mmadụ ndị ji nnupụisi na-eleghara ụkpụrụ ya nile nke ịdị n’usoro na ịdị ọcha anya. Ọ dịghị onye a ga-ekwe ka o tinye Paradaịs ahụ e weghachiworo n’ihe ize ndụ.—Ilu 2:20-22.
N’oge ọchịchị Alaeze Chineke, n’okpuru ntụziaka nke Kraịst Jisọs, a ga-akụziri ụmụ mmadụ ụzọ isi kpochapụ ihe ọ bụla fọdụrụ nke na-akpata mmetọ nkịtị. Mgbe ahụ—ọ bụghị ugbu a—bụ mgbe ọ ga-adị mkpa ka ndị nile na-ejere Chineke ozi keresie òkè ike n’atụmatụ onwe onye na nke ọha na eze nke ga-enye aka ná mkpocha zuru ụwa ọnụ nke na-enweghị atụ.—Tụlee Ezikiel 39:8-16.
Ndị lanarịrị ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe dị ugbu a ga-akwado ihe omume mkpocha nkịtị nke a site n’inwe ụdị nraranye na ịnụ ọkụ n’obi ahụ ha ji kere òkè n’ọrụ mkpocha ime mmụọ nke oge a.—Abụ Ọma 110:3.
Ụwa nke dị ọcha aghaghị ịbịa, nke ga-abịa mgbe ọrụ mkpocha kasị ukwuu nke e metụworo mgbe ọ bụla gasịrị, bụ́ nke Alaeze Chineke ga-arụzu. A ga-ewepụ ihe àmà nile nke mmetọ. Ọ dịghị ebe ọ bụla a ga-ahụ ihe nsekasị. A gaghị enwekwa ololo, kom kom, akpa plastik, akwụkwọ chịngọm na ihe nracha, akwụkwọ akụkọ, na magazin ndị a tụfuru atụfu ndị tọgbọsịrị n’ụsọ osimiri ọ bụla ma ọ bụ ebe ọ bụla yiri paradaịs.
Ṅụrịa ọṅụ n’ụwa ahụ dị ọcha nke dị n’ihu!
[Foto dị na peeji nke 7]
Ị̀ ga-ekere òkè ná mkpocha ahụ zuru ụwa ọnụ nke ga-ewere ọnọdụ n’oge na-adịghị anya?