Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ibu ọrụ dị aṅaa ka ndị Kraịst nwere n’ibelata mmerụ a na-emerụ gburugburu ebe obibi anyị—ala, oké osimiri, na ikuku?
Dị ka Ndịàmà Jehova, anyị nwere nchegbu dị omimi banyere ọtụtụ nsogbu ọnọdụ gburugburu ụwa ndị na-emetụta ebe obibi anyị bụ́ ụwa ugbu a. Karịa ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ, anyị ghọtara na e kere ụwa ịbụ ebe obibi dị ọcha, nke mara mma maka ezinụlọ mmadụ zuru okè. (Jenesis 1:31; 2:15-17; Aịsaịa 45:18) Anyị nwekwara nkwa Chineke na ọ ‘ga-emebi ndị ahụ na-emebi ụwa.’ (Mkpughe 11:18) Ya mere o ziri ezi itinye mgbalị ndị a haziri nke ọma, nke ezi uche dị na ha, n’izere ịtụkwasị ihe n’ụzọ na-adịghị mkpa ná mmebi mmadụ nọgidere na-emebi ụwa anyị. Otú ọ dị, rịba okwu ahụ bụ “ezi uche” ama. O zikwara ezi n’echiche Akwụkwọ Nsọ ịnọ na nche megide ikwere ka ihe ndị metụtara njikọ dị n’etiti ihe ndị e kere eke na ihe ndị a na-eme ghọọ ihe ndị bụ isi na-echegbu anyị.
Ọbụna mmadụ nkịtị dị ndụ na-ewepụta ihe ndị a na-atụfu atụfu. Dị ka ihe atụ, ịkọpụta, ịkwadebe na iri nri na-ewepụta mgbe mgbe ihe ndị a na-atụfu atụfu, ọ bụ ezie na nje pụrụ ịgbarịsi ihe ka ukwuu n’ime ha. (Abụ Ọma 1:4; Luk 3:17) Azụ e chekpọrọ n’ọkụ nke Jisọs e si n’ọnwụ kpọlite meere ndị na-eso ụzọ ya, aghaghị ịkpatawo anwụrụ ọkụ, ntụ, na ọkpụkpụ azụ ụfọdụ a ga-atụfu atụfu. (Jọn 21:9-13) Ma a haziri usoro ọrụ ihe ndị nwere ndụ na ndị na-enweghị ndụ nke ụwa ịhụ maka ihe ndị dị otú a.
Ndị Chineke ekwesịghị ileghara ihe ndị metụtara njikọ dị n’etiti ihe ndị e kere eke anya. Jehova chọrọ ka ndị ya n’oge ochie mee ihe dị iche iche iji kpofuo ihe ndị a na-ekpofu ekpofu, ihe omume ndị nwere uru ma ná njikọ dị n’etiti ihe ndị e kere eke ma n’ịdị ọcha. (Deuterọnọmi 23:9-14) Ebe anyị makwaara otú o si ele ndị na-emebi ụwa anya, anyị ekwesịghị nnọọ ilefuru ihe ndị anyị pụrụ ime iji debe gburugburu ebe obibi anyị ọcha anya. Anyị pụrụ igosipụta nke a n’ikpofu ihe ndị a na-ekpofu ekpofu nke ọma, karịsịa ihe ndị bu nsí. Anyị na-eji obi anyị akwado mgbalị ndị a na-eme iji ihe ndị a na-ekpofu ekpofu mee ihe, na-enwe ihe ndị ọzọ mere a ga-eji otú ahụ ma ọ bụrụ na Siza nyere iwu ya. (Ndị Rom 13:1, 5) Mmadụ ụfọdụ na-enweta afọ ojuju site n’imekwu ihe ndị ọzọ, dị ka ịhọrọ iji ihe ndị nje pụrụ igweri egweri mee ihe kama iji ndị ga-atụkwasị ihe n’ikpo ahịhịa e nwere n’elu ala na n’ime osimiri.
Otú ọ dị, ókè onye Kraịst ga-agaru n’okwu a bụ okwu dịịrị onwe onye ọ gwụla ma ọ dị ihe iwu kwuru. Usoro mgbasa ozi na-eme ka o doo anya na ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-adabakarị ngwa ngwa n’ọnyà nke imebiga ihe ókè. Okwu ndụmọdụ Jisọs metụtara okwu a nnọọ: “Unu ekpela ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe . . . Ma gịnị mere i ji lee irighiri ahịhịa nke dị n’anya nwanna gị, ma ị tụgharịghị uche ná ntụhie nke dị n’anya nke gị?” (Matiu 7:1, 3) Iburu nke a n’uche pụrụ inyere anyị aka ka anyị ghara ileghara ihe ndị ọzọ dị oké mkpa anya.
Onye amụma Jeremaịa dere, sị: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwee ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) Ileghara ụkpụrụ nke a anya wetara ihe a kpọrọ mmadụ ihu na ihu n’ebe “oge dị oké egwu” nọ, dị ka e kwuru na 2 Timoti 3:1-5. Ihe Chineke dekọwokwara ná Mkpughe 11:18 na-anwapụta na mgbalị nile nke mmadụ iwepụ n’ụwa nsogbu ndị bụ isi nke njikọ dị n’etiti ihe ndị e kere eke, gụnyere mmetọ, agaghị enwe ihe ịga nke ọma zuru ezu. A pụrụ inwe ọganihu ụfọdụ, ma ihe ngwọta na-adịgide adịgide e nwere nanị ya ga-achọ ka Chineke tinye aka.
N’ihi nke a anyị na-atụkwasị uche anyị na ihe ndị anyị nwere n’ihe ngwọta nke Chineke, kama ịdị na-anwa iwepụ ihe mgbaama ọrịa ndị dị n’elu n’elu. Na nke a anyị na-agbaso ihe nlereanya Jisọs, onye tinyere akụkụ ka ukwuu nke ozi ya ‘n’ịgbara eziokwu ahụ àmà.’ (Jọn 18:37) Kama inye ụwa nri ma ọ bụ iwepụ oké nsogbu ndị zuru ụwa ọnụ n’etiti ọha na eze—gụnyere mmetọ—Jisọs zoro aka n’ebe ihe ngwọta zuru ezu maka nsogbu ndị na-eti ụmụ mmadụ ihe otiti dị.—Jọn 6:10-15; 18:36.
Ọ bụ ezie na ịhụnanya maka mmadụ ibe anyị na-akwali anyị izere imetọ ala, mbara ụwa, ma ọ bụ isi mmiri n’ụzọ na-enweghị isi, anyị na-anọgide na-agbara eziokwu ahụ àmà. Nke a gụnyere ịkụziri ndị mmadụ itinye eziokwu Bible n’ọrụ na izere iji anwụrụ ọkụ, ihe ọṅụṅụ na-aba anya gabigara ókè, ma ọ bụ ọgwụ ndị na-eweta mbibi, mebie ahụ. Ka ọtụtụ nde ndị ọhụrụ na-aghọ ndị na-eso ụzọ, ha amụtawo àgwà ịdị ọcha na ichebara ndị ọzọ echiche. Ya mere ọrụ nkwusa ahụ etinyewo ihe n’ụzọ nkịtị n’ibelata nsogbu dum nke mmetọ taa. Ma nke ka mkpa, ndị Kraịst na-eso ụzọ na-agbalịsi ike inwogha ụdị mmadụ ha na àgwà ha nile ugbu a ka ha wee kwekọọ n’ụwa Paradaịs ahụ dị ọcha nke Chineke gaje imere ndị na-efe ya ezi ofufe n’isi nso.