Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 6/8 p. 5-8
  • Ịchọ Ihe Ngwọta A Pụrụ Ịnakwere

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịchọ Ihe Ngwọta A Pụrụ Ịnakwere
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ibelata Ihe Ndị Na-akpata Mmetọ
  • Iji Nwayọọ Aga
  • Ịgba Ịnyịnya Ígwè
  • Imegharị Nkà
  • Nanị Akụkụ nke Nsogbu Ahụ
  • Ịchọta Ezi Ihe Ngwọta
    Teta!—1996
  • À Ga-enwe Ụwa nke Ụgbọ Ala Na-adịghị?
    Teta!—1996
  • Ewo, Ka M Kurutụ Ikuku Dị Ọcha!
    Teta!—1996
Teta!—1996
g96 6/8 p. 5-8

Ịchọ Ihe Ngwọta A Pụrụ Ịnakwere

ỤGBỌ ALA abụghị nanị ihe na-akpata mmetọ. Ezinụlọ nke aka mmadụ, ụlọ ọrụ mmepụta ihe, na ígwè ọrụ ọkụ eletrik aghaghịkwa iso ná ndị a ga-ata ụta. Ma, òkè ụgbọ ala na-ekere n’ịkpata mmetọ zuru ụwa ọnụ buru ibu.

N’eziokwu, 5000 Days to Save the Planet ji anya ike na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na a ga-ekwu ihe kpatara mfu a nile—karịsịa mmetụta ịgbapụ carbon dioxide na-enwe n’ihu igwe anyị—mgbe ahụ ikekwe a garaghị arụwo ụgbọ ala ma ọlị.” Ka o sina dị, ọ na-ekweta, sị: “Ma nke ahụ bụ nhọrọ nke ma ndị na-emepụta ụgbọ ala, ma ụlọ ọrụ na-arụ okporo ụzọ, ma ụlọ ọrụ dị iche iche nke gọọmenti, ma ọbụna ọha mmadụ, ndị ndụ ha na-adabere n’ụzọ na-arị elu n’ụzọ ime njem onwe onye, na-adịghị njikere iche n’echiche.”

Nkà na ụzụ ahụ bugara mmadụ n’ọnwa ó kwesịghị inwe ike imepụta ụgbọ ala na-adịghị akpata mmetọ? Ime ihe adịghị mfe mgbe ọ bụla dị ka ikwu ihe, ya mere ruo mgbe a ga-emeri ihe isi ike nke imepụta ụgbọ ala na-adịghị akpata mmetọ, ọchịchọ a na-achọ ihe ngwọta ndị ọzọ a pụrụ ịnakwere na-aga n’ihu.

Ibelata Ihe Ndị Na-akpata Mmetọ

N’afọ ndị 1960 United States tiri iwu mere ka ọ dị mkpa ịrụnye ihe nchekwa n’ụgbọ ala dị iche iche iji gbochie mgbapụ nke ihe ndị na-akpata mmetọ. Mba na gọọmenti ndị ọzọ emewo otu ihe ahụ eri oge.

Ngwá ọrụ catalyst nke na-agbanwe anwụrụ ọkụ, bụ́ nke na-achọ ka e jiri mmanụ ụgbọ ala na-enweghị opu na-eme ihe, bụzi ndị e ji eme ihe n’ụzọ sara mbara iji zachapụ ihe mmetọ ndị na-emerụ ahụ. N’agbata 1976 na 1980, mgbe ọtụtụ ndị na-akwọ ụgbọ ala malitesịworo iji gas na-enweghị opu eme ihe, ọ̀tụ̀tụ̀ opu dị n’ọbara ndị America ji otu ụzọ n’ime ụzọ atọ dalata. Ọ dịkwa mma na ọ dalatara, n’ihi na opu gabigara ókè pụrụ imetụta usoro akwara ma gbochie ikike ịmụta ihe. Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, ọ bụ ezie na e nwewo ndalata n’ọ̀tụ̀tụ̀ opu n’ime ọtụtụ mba ndị mepere emepe, a pụghị ikwu otu ihe ahụ banyere ala ndị na-emepechabeghị emepe.

Ihe ịga nke ọma nke ngwá ọrụ catalyst na-agbanwe anwụrụ ọkụ na-enye obi ụtọ, ma e kwekọrịtabeghị iji ha eme ihe. N’ihi mbelata nke ịrụ ọrụ ọ kpatara mgbe a kwụsịrị itinye opu na ya, a gbanwere ọ̀tụ̀tụ̀ hydrocarbon dị na mmanụ ụgbọ ala. Nke a akpatawo mmụba ná mgbapụ nke ihe ndị ọzọ na-akpata ọrịa cancer, dị ka benzene na toluene, bụ́ ndị ngwá ọrụ catalyst na-agbanwe anwụrụ ọkụ na-adịghị ebelata ọ̀tụ̀tụ̀ mgbapụ ha.

E wezụga nke ahụ, ngwá ọrụ catalyst na-agbanwe anwụrụ ọkụ na-achọ ka e jiri platinum na-eme ihe. Dị ka Prọfesọ Iain Thornton, nke Imperial College na Britain si kwuo, otu n’ime nsogbu ha abụrụwo ịrị elu nke platinum a wụpụrụ n’ájá dị n’akụkụ ụzọ. Ọ dọrọ aka ná ntị banyere ikwe omume na “ụdị ndị na-agbari agbari nke platinum pụrụ ịbanye n’usoro mmepụta nri.”

N’agbanyeghị ihe ịga nke ọma ọ bụla nke “ngwá ọrụ catalyst na-agbanwe anwụrụ ọkụ n’Ebe Ugwu America, Japan, South Korea na ọtụtụ mba Europe” wetaworo, 5000 Days to Save the Planet na-ekwenye n’ụzọ ziri ezi, na “mmụba dị oké elu n’ọnụ ọgụgụ nke ụgbọ ala e nwere gburugburu ụwa ebibisịwo kpam kpam uru ndị ọ baara ikuku dị mma.”

Iji Nwayọọ Aga

Ụzọ ọzọ nke ibelata anwụrụ ọkụ ụgbọ ala na-agbapụ bụ ijikwu nwayọọ na-anya ụgbọ ala. Ma na United States, n’oge na-adịbeghị anya, steti ụfọdụ etinyewo ihe n’ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ. Na Germany, iti iwu abụghị ihe a na-anakwere. Ndị na-emepụta ụgbọ ala, ndị ihe na-agara ha ahịa bụ ikike ha nwere ịrụ ụgbọ ala ndị siri ike na-agba oké ọsọ gabiga 150 kilomita n’otu hour, na-emegidekarị ya, dị nnọọ ka ọtụtụ ndị ọkwọ ụgbọ ala ndị ọzọ na-eme. Otú ọ dị, o yiri ugbu a ka ihe ka ọtụtụ n’ime ndị Germany dị njikere ịnakwere iti iwu megide ịgba oké ọsọ ọ bụghị nanị n’ihi ihe ndị metụtara gburugburu ebe obibi kamakwa n’ihi nchebe.

Ná mba ụfọdụ a na-achọ n’aka ndị ọkwọ ụgbọ ala iji nwayọọ na-anya mgbe mmetọ ruru ọ̀tụ̀tụ̀ a na-apụghị ịnakwere—ma ọ bụ ikekwe ịkwụsị ịnya ụgbọ ala kpam kpam. Otu njụta echiche e mere na 1995 kpughere na 80 pasent nke ndị Germany ga-ekwe ka e nwee ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ a kpaara ókè ma ọ bụrụ na ọ̀tụ̀tụ̀ ozone adị oké elu. Ọtụtụ obodo ukwu n’ụwa nile, tinyere Atens na Rom, ewereworị nzọụkwụ dị iche iche iji gbochie ịnya ụgbọ ala n’okpuru ọnọdụ ụfọdụ. Ndị ọzọ na-atụle ime otu ihe ahụ.

Ịgba Ịnyịnya Ígwè

Iji belata ụgbọ ala, obodo ukwu ụfọdụ ewepụtawo ọnụ ego pụrụ iche maka iji bọs eme njem. Ndị ọzọ na-ewepụta usoro iji bọs eme njem n’efu maka ndị na-akwọ ụgbọ ala na-akwụ obere ego iji dọba ụgbọ ala ha n’ebe a na-adọba ụgbọ ala. Obodo ukwu ndị ọzọ nwere ụzọ ndị e doro iche nanị maka bọs na tagzi iji mee ka ụdị ndị a nke ime njem na-aga ngwa ngwa.

A rịbara otu ụzọ ọhụrụ nke imeri nsogbu ahụ ama n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The European: “N’ịbụ ndị otu mkpọsa e mere na Netherlands n’afọ ndị ikpeazụ nke afọ ndị 1960 kpaliri, ndị Denmark na-arụsi ọrụ ike emepụtawo otu atụmatụ iji belata mmetọ ikuku na njupụta nke ụgbọ ala site n’ịrụgide ndị mmadụ iji wheel abụọ eme ihe kama wheel anọ.” E debere ịnyịnya ígwè n’ebe dị iche iche n’okporo ámá Copenhagen nile. Ịtụnye otu mkpụrụ ego n’ime otu ngwá ọrụ na-atọhapụ otu ịnyịnya ígwè maka iji ya mee ihe. A pụrụ inwetaghachi ego ahụ mgbe e mesịrị bughachi ịnyịnya ígwè ahụ n’ebe kwesịrị ekwesị. Oge ga-ekpebi ma atụmatụ a ọ̀ ga-adị irè ma bụrụ nke ọha nakweere.

Iji gbaa ume iji ịnyịnya ígwè eme ihe n’ọnọdụ ụgbọ ala, obodo ukwu ụfọdụ nke Germany na-enye ndị na-agba ya ohere ịgbafe n’okporo ámá ụgbọ ala na-eche ihu nanị n’otu ụzọ ná ncherịta ihu! Ebe ọ bụ na ihe dị ka otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke njem nile a na-eme n’obodo ukwu na ihe karịrị otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke njem ndị a na-eme n’ime ime obodo erughị kilomita atọ, ọtụtụ n’ime ụmụ amaala pụrụ iji ụkwụ ma ọ bụ ịnyịnya ígwè gaa ha n’ụzọ dị mfe. Nke a ga-enye aka belata mmetọ; n’otu oge ahụ, ndị na-agba ya ga na-enweta mmega ahụ dị ha mkpa.

Imegharị Nkà

Ọrụ na-aga n’ihu n’imepụta ụgbọ ala ndị na-adịghị akpata mmetọ. E mepụtawo ụgbọ ala eletrik ndị batrị na-enye ike, ma ha adịghị agbasi ọsọ ike, a dịghịkwa anya ha ruo ogologo oge. Otu ihe ahụ bụ eziokwu banyere ụgbọ ala ndị ikike sitere n’anyanwụ na-enye ike.

Ihe ọzọ a ka na-enyocha ikwe omume ya bụ iji hydrogen eme ihe dị ka mmanụ ụgbọ ala. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na hydrogen adịghị agbapụ ihe ọ bụla na-akpata mmetọ, ma ọnụ ahịa ya dị oké elu.

N’ịghọta mkpa e nwere maka imepụtaghachi ụgbọ ala, president United States bụ́ Clinton mara ọkwa na 1993 na gọọmenti na ụlọ ọrụ na-emepụta ụgbọ ala na United States ga-ejikọ aka n’imepụta ụgbọ ala maka ọdịnihu. O kwuru, sị: “Anyị gaje ịmalite ọrụ nkà na ụzụ nke nwere oké ebumnobi karịa nke ọ bụla mba anyị gbalịtụworo inwe.” O dobeghị anya ma ọ̀ ga-ekwe omume “imepụta ụgbọ ala dị irè n’ụzọ nile ma dị mma n’ihe metụtara gburugburu ebe obibi maka narị afọ nke 21,” nke o kwuru okwu banyere ya. Ebumnobi atụmatụ ahụ bụ imepụta ihe atụ nke ụgbọ ala ahụ n’ime iri afọ—ma, n’ọnụ ego buru oké ibu.

Ụfọdụ ndị na-emepụta ụgbọ ala na-arụ ọrụ n’ụdị ndị ji ngwakọta nke mmanụ ụgbọ ala na eletrik arụ ọrụ. Nke e nweworo ugbu a na Germany—n’ọnụ ahịa dị elu—bụ ụgbọ ala egwuregwu eletrik na-enye ike nke nwere ike iru ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ 100 kilomita n’otu hour malite n’ebe o guzo n’otu ebe n’ime nkeji itoolu, na-agakwa n’ihu iru ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ dị oké elu bụ́ 180 kilomita n’ime otu hour. Ma mgbe o rusịrị 200 kilomita, ọ na-anyụ ọkụ ruo mgbe a pụrụ inyeghachi batrị ya ike n’ime ihe na-adịghị ala karị hour atọ. Nnyocha na-aga n’ihu, a na-atụkwa anya ọganihu ka ukwuu.

Nanị Akụkụ nke Nsogbu Ahụ

Ụzọ isi kwụsị mgbapụ na-egbu egbu bụ nanị akụkụ nke nsogbu ahụ. Ụgbọ ala na-akpatakwa mmetọ mkpọtụ, ihe onye ọ bụla bi n’akụkụ okporo ụzọ na-ekwo ekwo matara nke ọma. Ebe ọ bụ na mkpọtụ na-aga n’ihu nke ụgbọ ala pụrụ imetụta ahụ ike n’ụzọ dị njọ, nke a bụkwa akụkụ bụ isi nke nsogbu chọrọ ngwọta.

Ndị hụrụ ihe ndị e kere eke n’anya ga-arụtụkwa aka na ọtụtụ mile nke okporo ụzọ jọrọ njọ emebiwo ịma mma ebumpụta ụwa nke ọtụtụ ime ime obodo, tinyere ebe achụmnta ego ndị na-adịghị mma n’anya na bọọdụ mkpọsa ngwá ahịa ndị pụrụ ịdị n’akụkụ ha. Ma ka ọnụ ọgụgụ ụgbọ ala na-amụba, otú ahụ ka mkpa e nwere maka ụzọ ndị ọzọ na-amụba.

Ụgbọ ala ụfọdụ, mgbe ọtụtụ afọ nke imetọ ihe gasịrị n’aka onye nwe ha, na-aga n’ihu n’ụzọ mmetọ ha ọbụna ‘mgbe ha nwụsịrị.’ Ụgbọ ala a tụfuru atụfu, ndị na-eje ozi nanị dị ka ihe na-asọ anya oyi, abụrụwo nsogbu nke na a ghaghị ịmachibido iwu n’ebe ụfọdụ iji zere njupụta ha n’ime ime obodo n’ụzọ na-adịghị mkpa. Ọ̀ dị mgbe a ga-emepụta ọkachamma n’ụgbọ ala, nke e ji ihe ndị a ga-emegharị n’ụzọ dị mfe rụọ? Ọ dịghị mfe inweta ụgbọ ala dị otú ahụ ma ọlị.

“Ihe ka ọtụtụ n’ime ndị Germany nwere oké nchegbu banyere gburugburu ebe obibi,” ka otu akwụkwọ akụkọ e dere na nso nso a na-ekwu, na-ekwukwa sị, “ma ole na ole na-eme ihe kwekọrọ na nke ahụ.” E hotara na otu onye ọrụ gọọmenti kwuru, sị: “Ọ dịghị onye na-eche na ọ bụ ya kpatara ya, ọ dịghịkwa onye dị njikere ịbụ onye ụta dịịrị.” Ee, o siri ike ịgwọta nsogbu dị iche iche n’ime ụwa nke e ji ndị mmadụ bụ́ “ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya” na “ndị na-adịghị agba ndụ” mara.—2 Timoti 3:1-3.

Ma, ọchịchọ a na-achọ ihe ngwọta a pụrụ ịnakwere na-aga n’ihu. Ọ̀ dị mgbe a pụrụ ịchọta ezi ihe ngwọta nye mmetọ na ụgbọ ala?

[Foto dị na peeji nke 7]

À pụrụ ibelata mmetọ site na anyị iji usoro ime njem ọha na eze eme ihe, inwekọ otu ụgbọ ala, ma ọ bụ ịgba ịnyịnya ígwè?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya