Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 6/8 p. 3-5
  • À Ga-enwe Ụwa nke Ụgbọ Ala Na-adịghị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • À Ga-enwe Ụwa nke Ụgbọ Ala Na-adịghị?
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Agaghị Ihu Ma Ọ Bụ Azụ Zuru Ụwa Ọnụ
  • Iyi Egwu nke Mmetọ
  • Ịchọ Ihe Ngwọta A Pụrụ Ịnakwere
    Teta!—1996
  • Gịnị Ka Mmadụ Na-eme Elu Ala?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ịchọta Ezi Ihe Ngwọta
    Teta!—1996
  • Ịchọ Ndụ Dị Mma
    Teta!—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 6/8 p. 3-5

À Ga-enwe Ụwa nke Ụgbọ Ala Na-adịghị?

Ị̀ PỤRỤ iche echiche banyere ụwa nke ụgbọ ala na-adịghị? Ma ọ bụ ị̀ pụrụ ịkpọtụ mmepụta ọ bụla aha bụ́ nke gbanweworo ụzọ ịdị ndụ na akparamàgwà nke ụmụ mmadụ n’ime narị afọ ndị gaworo aga n’ụzọ pụtara ìhè dị ka ha meworo? Ma ụgbọ ala adịghị, a gaghị enwe ebe ndị ji ụgbọ ala eme njem na-akwụsị maka ihi ụra, ụlọ nri na ụlọ ihe nkiri ndị nwere ebe a na-adọba ụgbọ ala. Nke ka mkpa, ọ bụrụ na bọs, tagzi, obere ụgbọ ala, ma ọ bụ gwongworo adịghị, olee otú ị ga-esi gaa ọrụ? gaa ụlọ akwụkwọ? Olee otú ndị ọrụ ugbo na ndị na-emepụta ngwá ahịa ga-esi buga ngwá ahịa ha n’ahịa?

“Otu n’ime achụmnta ego isii na United States na-adabere ná mmepụta, nkesa, ndozi, ma ọ bụ iji ụgbọ ala eme ihe,” ka akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica na-arịba ama, na-ekwukwa: “Ire ahịa na risit nke ụlọ ọrụ na-emepụta ụgbọ ala na-anọchi anya ihe karịrị otu ụzọ n’ime ụzọ ise nke azụmahịa mbukọrọ nke mba ahụ na ihe karịrị otu ụzọ n’ime ụzọ anọ nke ahịa a na-ere ná mkpụrụ ná mkpụrụ na ya. Nye mba ndị ọzọ nkezi ndị a dịtụ nta karị, ma Japan na mba ndị dị n’ọdịda anyanwụ Europe ejiriwo ọsọ na-eru ọ̀tụ̀tụ̀ nke United States.”

Otú o sina dị, ụfọdụ na-ekwu na ụwa ụgbọ ala na-adịghị ga-abụ ebe ka mma. Ha na-ekwu nke a n’ihi ihe abụọ bụ isi.

Agaghị Ihu Ma Ọ Bụ Azụ Zuru Ụwa Ọnụ

Ọ bụrụ na ị gbagharịtụwo gburugburu ruo ogologo oge ka ị na-achọ ohere ndọba ụgbọ ala, ọ dịghị mkpa onye ọ bụla ịgwa gị na ọ bụ ezie na ụgbọ ala dị mma, ọ dịghị mma inwe nnọọ ọtụtụ ụgbọ ala n’ógbè ndị mmadụ bijubigara ókè. Ma ọ bụ ọ bụrụ na ọ dịtụwo mgbe agaghị ihu ma ọ bụ azụ nke ụgbọ ala nwụchiri gị, ị na-amara otú o si abụ ihe na-akụda mmụọ ịbụ onye e jibidoro n’ime ụgbọ ala e mere ịgagharị agagharị, ma bụrụ nke a manyeworo ịkwụrụ otu ebe.

Na 1950, ọ bụ nanị United States nwere 1 ụgbọ ala maka mmadụ 4 ọ bụla. Ka ọ na-erule 1974, Belgium, France, Germany, Great Britain, Itali, Netherlands, na Sweden eruwo ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ. Ma ka ọ dị mgbe ahụ, ọnụ ọgụgụ nke United States arịwo elu ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 1 ụgbọ ala maka mmadụ 2 ọ bụla. Ugbu a Germany na Luxembourg nwere ihe dị ka 1 ụgbọ ala maka mmadụ 2 ọ bụla bi n’ebe ahụ. Belgium, France, Great Britain, Itali, na Netherlands anọghị n’ebe dị anya n’azụ.

Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’obodo ukwu dị iche iche—n’agbanyeghị ebe ha pụrụ ịdị n’ụwa—na-aghọzi nnukwu ebe ndọba ụgbọ ala. Dị ka ihe atụ, n’India n’oge nnwere onwe ha na 1947, New Delhi bụ́ isi obodo ya nwere 11,000 obere ụgbọ ala na gwongworo. Ka ọ na-erule 1993 ọnụ ọgụgụ ahụ karịrị 2,200,000! Mmụba na-enweghị atụ—ma bụrụ “ọnụ ọgụgụ a na-atụ anya ịdị okpukpu abụọ ka ọ na-erule ná ngwụsị nke narị afọ a,” dị ka magazin bụ́ Time si kọọ.

Ka ọ dị ugbu a, n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, ebe nwere nanị otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ọnụ ọgụgụ ụgbọ ala e nwere maka otu onye n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe, e nwere ihe dị ka 400 nde a na-atụ anya na ha ga-enwe ụgbọ ala. N’ime afọ ole na ole, ọnọdụ dị na China, bụ́ ebe a matara ruo ugbu a n’ihi 400 nde ịnyịnya ígwè ya, ga-agbanweworị. Dị ka a kọrọ na 1994, “gọọmenti na-eme atụmatụ maka mmụba dị ngwa ná mmepụta ụgbọ ala,” n’imepụta malite na 1.3 nde ụgbọ ala kwa afọ ruo nde 3 ka ọ na-erule ná ngwụsị nke narị afọ a.

Iyi Egwu nke Mmetọ

“Britain enwekwaghị ikuku dị ọcha,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Daily Telegraph nke October 28, 1994, kwuru. Ikekwe e kwuru nke a karị otú ọ dị n’ezie, ma otú o sina dị, ọ bụ eziokwu ruo n’ókè nke ịkpata nchegbu. Prọfesọ Stuart Penkett, nke Mahadum East Anglia, dọrọ aka ná ntị, sị: “Ụgbọ ala na-agbanwezi ọdịdị nke ọnọdụ ihu igwe anyị dum.”

Ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke mmetọ carbon monoxide, ka akwụkwọ bụ́ 5000 Days to Save the Planet na-ekwu, “na-anapụ ahụ ikuku oxygen, na-ebibi ikike nghọta na echiche, na-ebelata ikike mmetụta ma na-akpata orù ụra.” Òtù Ahụ Ike Ụwa na-ekwukwa, sị: “Ihe dị ka ọkara ndị nile bi n’obodo ukwu na Europe na Ebe Ugwu America bụ ndị e kpughere nye ọ̀tụ̀tụ̀ dị oké elu nke carbon monoxide.”

A na-eme atụmatụ na n’ebe ụfọdụ, anwụrụ ọkụ ụgbọ ala na-agbapụ na-egbu ọtụtụ mmadụ kwa afọ—tụkwasị n’ọtụtụ ijeri dollar mmebi gburugburu ebe obibi na-atụfu. Na July 1995 otu akụkọ telivishọn kwuru na ihe dị ka 11,000 ndị Britain na-anwụ kwa afọ site ná mmetọ ikuku ụgbọ ala na-akpata.

Na 1995 e nwere Nzukọ Maka Ihu Igwe nke Mba Ndị Dị n’Otu na Berlin. Ndị nnọchiteanya sitere 116 mba kwetara na ọ dị mkpa ime ihe. Ma ná ndakpọ olileanya nke ọtụtụ ndị, e yigharịrị ọrụ nke isetịpụ ihe mgbaru ọsọ na iguzobe ụkpụrụ ndị doro anya ma ọ bụ banyere ịtụpụta usoro ihe omume doro anya.

N’ịtụle ihe akwụkwọ bụ́ 5000 Days to Save the Planet kwuru laa azụ na 1990, ikekwe a tụrụ anya enweghị ọganihu nke a. “Ọdịdị ikike ọchịchị na ọnọdụ akụ̀ na ụba n’ọha mmadụ oge a nke mmepụta ngwá ahịa,” ka ọ rụtụrụ aka, “na-egosipụta na atụmatụ ndị e ji alụso mbibi nke gburugburu ebe obibi ọgụ bụ ihe a ga-anakwere nanị ma ọ bụrụ na ha adịghị emegide ihe omume dị iche iche nke akụ̀ na ụba.”

N’ihi ya, Time dọrọ aka ná ntị n’oge na-adịbeghị anya banyere “ikwe omume bụ́ na mmụba nke carbon dioxide na gas ndị ọzọ na-akpata ịrị elu nke okpomọkụ na mbara igwe ga-eji nwayọọ nwayọọ na-ekpo ụwa ọkụ. Ihe ga-esi na ya pụta, dị ka ihe ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị kwuru si dị, pụrụ ịbụ oké ọkọchị, mgbaze nke mkpụkọta ikpo ice, ịrị elu nke ọ̀tụ̀tụ̀ oké osimiri, idei mmiri nke akụkụ oké osimiri, oké ifufe ndị dị ike karị na ọdachi ihu igwe ndị ọzọ.”

Ịdị njọ nke nsogbu mmetọ na-egosipụta na a ghaghị ime ihe. Ma ọ̀ bụ gịnị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya