Gịnị Ka Mmadụ Na-eme Elu Ala?
NA NARỊ afọ atọ gara aga, ụmụ mmadụ bi usoro okike nso karị. N’akụkụ ka ukwuu, mgbanwe ụmụ mmadụ kpataworo na gburugburu ebe obibi zuru ụwa ọnụ adịghị eyi ya egwu dị ka o si eyi ya egwu taa. Oké mgbanwe n’usoro mmepụta ihe amalitebeghị. E nweghị ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ike eletrik, ụIọ ọrụ mmepụta ihe, ụgbọ ala, na ebe ndị ọzọ e si enweta mmetọ ikuku na mmiri nke jupụtara ebe nile. Ọ pụrụ isiworị ike mmadụ iche echiche nke imebi ụwa dum.
Ma, obụna laa azụ n’oge ahụ, a nọ na-akpọsa n’ebe nile otu ịdọ aka ná ntị banyere mmebi nke ga-ezu ụwa ọnụ. A hụrụ ịdọ aka ná ntị ahụ n’akwụkwọ ikpeazụ nke Bible, o bukwara amụma banyere oge mgbe Chineke ga-etinye aka n’ihe omume ụmụ mmadụ “imebi ndị ahụ na-emebi ụwa.”—Mkpughe 11:17, 18.
Lee nnọọ ka o si bụrụ ihe nkasi obi nye ndị nile na-echegbu onwe ha banyere enweghị ikike nke mmadụ nke oge a n’ilekọta elu ala, ịmara na Onye Okike nke mbara ala anyị nke a magburu onwe ya ga-azọpụta ya pụọ ná mbibi! Ị pụrụ ịjụ, sị, ‘Ma ànyi eruwo n’ọnọdụ dị njọ otú ahụ n’ezie nke na ọ dị mkpa ka Chineke tinye aka?’ Ọ dị mma, tụlee eziokwu ụfọdụ metụtara ya wee kpebiere onwe gị.
Oké Ọhịa Dị Iche Iche
Oké ọhịa dị iche iche na-eme ka elu ala maa mma, na-emekwa ka ọtụtụ nde nke ụdị ihe dị iche iche dị ndụ nwee ihe oriri na ebe obibi. Ka osisi dị iche iche na-etolite, na-emepụtakwa nri, ha na-eje ozi ndị ọzọ dị mkpa, dị ka ịmịkọrọ ikuku carbon dioxide na iwepụta ikuku oxygen ahụ dị oké mkpa. N’ihi ya, magazin National Geographic na-asị, “Ha na-ewepụta otu ihe ngwọta nye mwulite okpomọkụ ahụ zuru ụwa ọnụ nke na-eyi ndu n’elu ala egwu dị ka anyị si mara ya.”
Ma mmadụ na-emebisị ihe nketa ya nke oké ọhịa. Oké ọhịa ndị dị na North America na Europe na-anwụsị n’ihi mmetọ ikuku na mmiri. Ọchịchọ mba ndị nwere ọtụtụ ụlọ ọrụ mmepụta ihe na-achọ ihe dị iche iche na-ebibikwa akụkụ dị ukwuu nke oké ọhịa ndị e nwere n’akụkụ ụwa ebe e nwere okpomọkụ. Otu akwụkwọ akụkọ dị n’Africa kọwara na n’ime 1989, “a tụrụ anya ibuga 66 nde cubic mita [nke osisi sitere n’ebe okpomọkụ] ná mba ndị ọzọ—48 pasenti gaa Japan, 40 pasenti gaa Europe.”
Ọzọkwa, ná mba ụfọdụ, ndị ọrụ ubi na-esu oké ọhịa dị iche iche ọkụ iji nweta ala ebe ha ga-akọ ụgbọ. N’oge na-adịghị anya, ájá ahụ na-esighị ike nke dị n’ala oké ọhịa na-abụ nke ike gwụsịrị, ọ ga-adịkwa mkpa ka ndị ọrụ ubi ahụ suo oké ọhịa ndị ọzọ ọkụ. A na-eche na n’ime narị afọ nke a nanị, e kpochapụwo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara n’oké ọhịa nile e nwere n’ụwa.
Oké Osimiri Dị Iche Iche
Oké osimiri ndị dị n’ụwa na-arụkwa ọrụ dị mkpa n’ime ka ikuku dị ọcha, ihe mmadụ na-eme nọkwa na-emebi ha. Oké osimiri na-amịkọrọ ọ̀tụ̀tụ̀ ikuku carbon dioxide dị ukwuu. Ụmụ irighiri ihe ndị dị ndụ dị na mmiri na-amịkọrọkwa ikuku carbon dioxide ma na-ekupụta ikuku oxygen. Dr. George Small kọwara ịdị mkpa nke usoro ndụ nke a, sị: “Pasenti iri asaa nke ikuku oxygen na-abata n’ikuku kwa afọ na-abịa site n’ụmụ irighiri ihe ndị dị ndụ ndị dị n’osimiri.” Ma, ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị na-adọ aka ná ntị na a pụrụ ibelata ihe ndị a dị ndụ dị n’oké osimiri n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu n’ihi mbelata nke ihe nchebe ozone dị n’ikuku, nke a na-eche na ọ bụ mmadụ kpatara ya.
Ọzọkwa, ụmụ mmadụ na-awụnye ihe ruru unyi, mmanụ, na ọbụna ihe mkpofu ndị nwere nsí na-egbu egbu n’ime oké osimiri. Mba ụfọdụ na-ekwere ibelata ihe “mkpofu ndị ha na-ekwe ka a wụnye n’oké osimiri, ma ndị ọzọ jụrụ ajụ. Ọbụna na otu mba dị n’Ọdịda Anyanwụ ụwa nwere ike ịwụnye ihe mkpofu ndị nwere nsí nuklia n’ime ha n’oké osimiri. Onye ahụ a ma ama n’ime nnyocha n’oké osmiri bụ Jacques Cousteau na-adọ aka ná ntị, sị: “Anyị aghaghị ịzọpụta oké osimiri ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịzọpụta ihe a kpọrọ mmadụ.”
Mmiri Ọṅụṅụ
Mmadụ na-emebi ọbụna mmiri ọ na-aṅụ aṅụ! Ná mba ndị dara ogbenye, ọtụtụ nde mmadụ na-anwụ kwa afọ n’ihi mmiri e metọrọ emetọ. Ná mba ndị batụrụ ọgaranya karị, a na-emetọ ebe e si enweta mmiri site n’ihe ndị dị ka ọgwụ fertilizer ndị e ji eme ka ala mepụtakwuo ihe na ọgwụ e ji egbu ụmụ ahụhụ ndị na-asọba n’osimiri dị iche iche wee banye n’ime ọdọ mmiri ndị dị n’okpuru ala. Na 1986, mmepụta nke ọgwụ e ji egbu ụmụ ahụhụ n’ụwa dum bụ 2.3 nde tọn, a na-akọkwa na òṭụ̀ṭụ̀ mmụba ya bụ 12 pasenti kwa afọ.
Ebe ọzọ e si enwe mmetọ ikuku na mmiri bụ ebe dị iche iche a na-ebukọba mmiri ọgwụ. Akwụkwọ Scientific American kọwara, sị, “Drọnụ ndị ahụ e ji ígwè mee, ndị mmiri ọgwụ ndị ahụ dị n’ime ha, yiri nnọọ bọmbụ ogbunamgbe ndị ga-agbawa mgbe nchara tapuru ha.” Akwụkwọ akụkọ ahụ kwukwara na ụdị mmetọ ikuku na mmiri nke a na-eme “gburugburu ụwa n’ọtụtụ puku ebe ndị e bukọbara ihe mkpofu sitere ná mmiri ọgwụ.”
Gịnị na-esi na nke a apụta? Gburugburu ụwa, osimiri ndị dịbu ọcha na-aghọ ebe mkpofu ihe nke unyi ndị sitere n’ụlọ ọrụ mmepụta ihe. A na-eche na 20 nde ndị Europe na-aṅụ mmiri sitere n’osimiri Rhine, ma osimiri nke a bụ ihe e metọrọ nke ukwuu nke na apịtị e si n’ala ya gwọpụta bụ nke e metọworo nke ukwuu nke na ọ bụ ihe ize ndụ iji ya kpochie ala!
Usoro Ịrụ Ọrụ Ubi
Ọ bụ ihe dị egwu na mmadụ na-emebi ọbụna ala ubi ya. N’ime United States nanị, e mebiwo 20 pasenti nke ala e kewapụrụ iche maka ịgba ya mmiri, dị ka akwụkwọ Scientific American ahụ si kọọ. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? N’ihi na ịgbabiga mmiri n’ala ókè na-eme ka e nwee nnú karịrị otú o kwesịri n’ájá ahụ. Ọtụtụ mba emebiwo ala bara oké uru n’ụzọ dị otú a. Akwụkwọ bụ The Earth Report kọrọ, sị, “A na-akwụsị ịrụ ọrụ n’ala dị ukwuu n’ihi itinyebiga ya nnú ókè n’otu ọ̀ṭụ̀ṭụ̀ ahụ e ji na-enweta ala ọhụrụ a ga-arụ ọrụ na ha site n’atụmatụ ọhụrụ nke ịgba mmiri n’ala.” Otu nsogbu ọzọ zuru ebe nile bụ anụmanụ ịta nri n’ala gabiga ókè, bụ́ nke pụrụ ịdị na-enye aka ná mgbasa nke ọzara dị iche iche.
Ọtụtụ Ụgbọ Ala Karịa Otú O Kwesịrị
E kwuwo ọtụtụ ihe banyere ala na mmiri nke mbara ala anyị. Ma gịnịkwanụ banyere ikuku ya? A nọkwa na-emebi nke a, e nwekwara ọtụtụ ndị aka ha dị na nke a. Iji kpọtụ nanị otu n’ime ha aha, tụlee ihe banyere ụgbọ ala. Ndị a bụ ịdọ aka ná ntị sitere n’akwụkwọ akụkọ atọ a ma ama n’ihe banyere ọkà mmụta sayensị: “Ụgbọ ala na-emetọ ikuku karịa ihe ọ bụla ọzọ mmadụ na-eme.” (New Scientist) “E nwere ugbu a 500 nde ụgbọ ala ndị dị n’ihe ndekọ na mbara ala nke a . . . Ịgbaju tankị ha bụ ihe a na-eji otu ụzọ n’ụzọ atọ nke mmanụ a na-emepụta n’ụwa dum na-eme. . . . Ọnụ ọgụgụ ụgbọ ala e nwere na-amụba ngwa ngwa karịa ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ dịnụ.” (Scientific American) “Iji mmanụ petrol eme ihe n’akụkụ nile nke usoro mmepụta ihe, iji ya eme ihe na ịwụfu nke e jiworo mee ihe bụ otu ụzọ bụ isi e si na-eweta mmetọ nke gburugburu ebe obibi na ọrịa.”—The Ecologist.
Ee, a nọ na-emetọ mbara ala anyị, na-emebi ya. A nọ na-emetọ oké osimiri ya dị iche iche, mmiri ọṅụṅụ, ala ubi, na ọbụna ikuku ya, n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu. N’ezie, nanị nke a ga-atụ aro na oge ahụ dị nso mgbe Chineke ga-etinye aka wee ‘mebie ndị ahụ na-emebi ụwa.’ (Mkpughe 11:18) Otú ọ dị, e nwere ụzọ ndị ọzọ, ndị dị njọ ọbụna karị, e si na-emebi ụwa. Ka anyị hụ nnọọ ihe ha bụ.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]
“Anyị aghaghị ịzọpụta oké osimiri ma ọ bụrụ ma anyị chọrọ ịzọpụta ihe a kpọrọ mmadụ.”—Jacques Cousteau