Ịzọpụta Ụwa Pụọ Ná Mmebi
OTU mgbe n’oge gara aga n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, Chineke zọpụtara elu ala pụọ ná mbibi n’aka ụmụ mmadụ. 0 mere nke ahụ site n’otu ịjụ mmiri zuru ụwa ọnụ n’oge Noa. Anyị enweghị ihe ndekọ ọ bụla na-egosi na ụmụ mmadụ nọ na-emebi elu ala nkịtị n’oge ahụ. Ma a nọ na-emebi ụwa n’ụzọ ọzọ ruo n’ókè nke mere na Chineke chere na ọ dị mkpa ime ihe siri oké ike banyere ya.
Bible na-akọ, sị: “E bibiri ụwa n’ihu Chineke, ụwa jupụtakwara n’ihe ike. Chineke wee hụ ụwa, ma, lee, e bibiri ya; n’ihi na anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ, bibiri ụzọ ya n’elu ụwa.” (Jenesis 6:4, 11, 12) Ee, n’oge Noa, Chineke lere ụwa anya dị ka ihe e mebiri emebi n’ihi ime ihe ike na mmebi iwu nke ihe a kpọrọ mmadụ.
N’otu aka ahụkwa, mgbe Israel oge ochie malitere iwere Ala Nkwa ahụ, Chineke dọrọ aka ná ntị, sị: “Unu emerụkwala ala ahụ nke unu onwe unu bi n’ime ya: n’ihi na ọbara, nke ahụ na-emerụ ala . . . emekwala ka ala ahụ . . . rụọ arụ.” (Ọnụ Ọgụgụ 35:33, 34) Ya mere, Kenean bụ ebe mebiri emebi n’ihi ikpe ọmụma ọbara nke ndị bi n’ime ya. Otu ihe atụ jọgburu onwe ya banyere nke a bụ omume ha nke iji ụmụntakịrị na-achụrụ chi ha dị iche iche àjà.
Ndị Kenean na-eme omume rụrụ arụ n’ebe ọ dị ukwuu, nke a metụtakwara otú Chineke si lee ala ahụ anya. Ọ dọrọ ndị Israel aka ná ntị, sị: “Unu ewerela [omume ndị a rụrụ arụ] merụọ onwe unu: n’ihi na e weere ihe ndị a nile mee ka mba nile rụọ arụ, bụ́ ndị mụ onwe m na-achụpụ n’ihu unu: ala ahụ rụkwara arụ: . . . ala ahụ na-agbọpụtakwa ndị bi n’ime ya.” (Levitikọs 18:24, 25) Omume rụrụ arụ na mwụfu ọbara mebiri Kenean ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ nke na Chineke bibiri mba nile nke ndị Kenean.
Mmebi Nke Ụwa
Gịnị banyere n’oge a? Ọ̀ bụ na anyị adịghị ebikwa n’ọgbọ nke ime ihe ike a na-akparaghị ókè, mwụfu ọbara, na omume na-adịghị ọcha? N’agbanyeghị ihe ụmụ mmadụ na-eme iji nwaa idozi mmebi nke ọ kpatawooro elu ala nkịtị, ọ dịghị mgbe ọ bụla ọ pụrụ iweghachite ná ndụ ọnụ ọgụgụ ahụ e chere na o ruru otu narị nde ndị nwụworo n’agha ya nile n’ime narị afọ nke a; ọ pụghịkwa ịkpọghachite ná ndụ ọtụtụ nde mmadụ ndị ahụ ndị omempụ gbuworo, ma ọ bụkwanụ ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ, bụ́ ndị ọ dị mwute ịhụ na ha nwụrụ n’ihi agụụ. O doro anya na ọ pụghị iweghachite ihe ahụ e chere na o ruru 40 ruo 60 nde ụmụntakịrị a na-amụghị amụ, bụ́ ndị a na-apịgbu n’ike site ná nsikwopụ afọ ime kwa afọ. Ànyị pụrụ inwe ihe ịrụ ụka ọ bụla na ụwa bụ ihe a na-emebi emebi n’anya Chineke site n’ihe ndị dị otú a—ka a hapụgodị ịkpọtụ omume na-adịghị ọcha aha, bụ́ nke jupụtara ebe nile taa?
Ezi echiche na-agwa anyị na Chineke aghaghị ime ihe n’oge na-adịghị anya iji wee zọpụta elu ala site n’ihe omume ụmụ mmadụ nke na-akpata mbibi, amụma Bible na-akwadokwa nke a. Ma ọ̀ bụ gịnị ka ọ ga-eme? Bible na-agwa anyị na ọ gaje “imebi ndị ahụ na-emebi ụwa.” (Mkpughe 11:8; tụlee Matiu 24:3-14.) Dị nnọọ ka onyenwe ụlọ na-achụpụ onye bi n’ụlọ ya nke na-ebibi ihe, otú ahụ ka Chineke “ga-achụpụ” ndị ahụ na-emebi ọmarịcha ihe okike ya, bụ́ elu ala.
Bible na-ekwu, sị: “Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-efopụ na ya.” (Ilu 2:22) Bible kpọrọ ihe nke a Chineke gaje ime n’isi nso Amagedọn. (Mkpughe 16:16) Jisọs kpọkwara ya “mkpagbu ukwu . . . nke ihe dị ka ya akadịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe a, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị.” (Matiu 24:21) Ọ ga-adị ukwuu ọbụna karịa Iju Mmiri ahụ.
Nke a ọ̀ bụ ihe ngwọta gabigara ókè ma ọ bụ nke ikpe ziri ezi na-adịghị na ya? Ee e, ọ bụ ihe ruuru Chineke, dị ka Onye Kere elu ala, ikpebi onye kwesịrị ibi na ya. 0 nwekwara ikike ịjụ mmadụ ajụjụ maka ihe o meworo. Karịsịa, ọ bụrụ na Chineke ekwere ka mmadụ nọgide na-aga n’ụzo ya n’enweghị ihe mgbochi ọ bụla, elu ala ga-abụ ihe e mebiri emebi nye onye ọ bụla, ọ ga-abụkwa ihe na-agaghị ekwe omume ịdị ndụ. N’aka nke ọzọ, site ‘n’imebi ndị ahụ na-emebi ụwa,’ Chineke na-echebere ndị nwere obi ekele ihe nketa anyị bụ elu ala. Bible kwere nkwa, sị: “N’ihi na ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ndị zuru okè ga-afọdụkwa n’ime ya.”—Ilu 2:21.
Site n’enyemaka Chineke, ọtụtụ nde mmadụ achọtawo ike nke ga-enyere ha aka igosipụta onwe ha dị ka ndị na-enweghị ihe ịta ụta ọ bụla n’ihi na ha chọrọ ịbụ ndị ga-afọdụ iji nweta ọṅụ site n’ihe okike nke Chineke. Ha na-agbasokwa ụkpụrụ omume dị elu nke Chineke, na-ezerekwa ime ihe ike na ikpe ọmụma ọbara ọbụna n’ụzọ na-apụtaghị ìhè. Ya mere, ha abụghị ndị na-emebi ụwa n’echiche nke a dị mkpa.
Ụwa Nke A Zọpụtara Pụọ ná Mmebi
Ndị dị otú ahụ nweziri olileanya na-enye ọṅụ nke ịhụ ka ụwa nke a gbanwere site n’ọnọdụ ya e mebiri emebi nke dị ugbu a gaa n’ịbụ paradaịs nke na-enye ahụ ike. Ee, ọbụna na a ga-eme ka anụ ahụ ha dị ọcha, sachapụkwa mmetụta nile na-emebi emebi nke mmehie site n’ahụ ha. Akwụkwọ ikpeazụ nke Bible kọwara onyinye Chineke nke ime ka ihe a nile kwe omume dị ka “osimiri nke mmiri nke ndụ,” bụ́ mmiri ihe atụ. N’akụkụ ọ bụla nke osimiri nke a “ka osisi nke ndụ dịkwa, na-amị ụzọ mkpụrụ iri na abụọ, na-enye mkpụrụ ya n’ọnwa n’ọnwa: akwụkwọ osisi ahụ bụ ihe ime ka ahụ dị mba nile ike.”—Mkpughe 22:1, 2.
Ọhụụ nke a sitere n’ike mmụọ Chineke bụ ihe na-ekwe nkwa na Chineke ga-azọpụta elu ala na ihe a kpọrọ mmadụ nọ na ya site ná mbibi. Amụma ndị ọzọ na-eme ka e leba anya n’ọdịnihu nke ụwa e weghachiworo n’ọnọdụ dị mma. Dị ka ihe atụ, tụlee nhụta bu ụzọ nke Aịsaịa depụtara n’ụzọ abụ, sị: “Obi ga-atọ ọzara na ala kpọrọ nkụ ụtọ; ala ihe na-adịghị ga-etegharịkwa egwu ọṅụ, gbawaa okoko ọhịa, dị ka rose. Ọ ga-agbawa nke ukwuu, tegharịakwa egwu ọṅụ, ee, n’itegharị egwu ọṅụ na n’iti mkpu ọṅụ.” (Aịsaịa 35:1, 2) N’oge ahụ, a gaghị enwe oké osimiri ndị e metọrọ emetọ, ájá ala ndị e mebiri emebi, ma ọ bụ ikuku nke nwere nsí na-egbu egbu.
Nke ka mkpa bụ na elu ala agaghị abụkwa nke e ji ime ihe ike, mwụfu ọbara, ma ọ bụ omume na-adịghị ọcha mebie. Ọ bụ nanị ndị ahụ na-asọpụrụ Chineke, ụkpụrụ ya nile, na ihe okike ya ga-anọ n’ebe ahụ. (Mkpughe 21: 7, 8) Gee ntị ugbu a n’ihe ndị dị ebube ga-esi n’ihe a nile pụta: “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo. . . . Lee, ana m eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ.”—Mkpughe 21:4, 5.
Lee nnọọ ihe obi ụtọ ihe si na nke a pụta ga-abụ! Lee ka anyị si nwee obi ụtọ na n’oge na-adịghị anya, Chineke ‘ga-emebi ndị ahụ na-emebi ụwa’! Leekwa nnọọ ka nkwa ndị a sitere n’ike mmụọ Chineke na-esi akpali anyị ịchọ ijere Chineke ozi, bụ́ onye ga-azọpụta elu ala pụọ ná mmebi, wee mee ka ọ ghọọ ebe obibi bụ paradaịs nye ihe a kpọrọ mmadụ ndị nwere obi ziri ezi!
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
Bible kwmru na Chineke gaje “imebi ndị ahụ na-emebi ụwa.”—Mkpughe 11:18