Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g23 nke 1 p. 6-8
  • Oké Osimiri

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Oké Osimiri
  • Teta!—2023
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ndị Na-emetọ Oké Osimiri
  • E Kere Ụwa Anyị A Ka Ọ Dịgide
  • Ihe Ndị Mmadụ Na-eme Ka Nsogbu A Kwụsị
  • Ihe Mere Obi Ga-eji Sie Anyị Ike​—Ihe Baịbụl Kwuru
  • “Njupụta nke Oké Osimiri Nile”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Isiokwu Ndị Dị na Teta! A
    Teta!—2023
  • Gịnị Ka Mmadụ Na-eme Elu Ala?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Dị na Teta! A
    Teta!—2023
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2023
g23 nke 1 p. 6-8
Ebe ọmarịcha azụ̀ dị iche iche gbara otu onye gara ịhụ ihe ndị dị n’ala mmiri gburugburu. Ihe ndị yiri ahịhịa na nkume jukwara ebe ahụ.

Georgette Douwma/Stone via Getty Images

ỤWA ANYỊ A Ọ̀ GA-ADỊGIDE?

OKÉ OSIMIRI

Ọ BỤ n’oké osimiri ka anyị si enweta ọtụtụ ihe anyị na-eri, ọ bụkwa na ya ka e si enweta ọtụtụ ihe e ji emepụta ọgwụ. Oké osimiri na-emepụta ihe karịrị ọkara ikuku ọksijin (oxygen) niile e nwere n’ụwa, na-amịkọrọkwa anwụrụ ọkụ ụmụ mmadụ na-emepụta. Ihe ọzọ bụ na oké osimiri na-eme ka ụwa anyị ghara ịna-ekpo oké ọkụ ma ọ bụ na-ajụ oké oyi.

Ihe Ndị Na-emetọ Oké Osimiri

Oké okpomọkụ na-achọ igbukpọ akịrịkọ, ihe ndị yiri ahịhịa na nkume dị n’ala ala oké osimiri, na ihe ndị ọzọ dị ndụ n’oké osimiri. Ndị ọkà mmụta sayensị ekwuola na ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ihe ahụ niile dị n’ala ala oké osimiri nwere ike ịnwụchapụ n’ime afọ iri atọ na-abịanụ. Ma, e kee ihe niile dị n’ime oké osimiri ụzọ anọ, ọ bụ ihe ndị a ji otu ụzọ n’ime ha ndụ.

Ndị ọkachamara ekwuola na ọ ga-abụ na nnụnụ mmiri itoolu n’ime iri ọ bụla eriela plastik. Ha na-ekwukwa na ọ bụ plastik na-egbu ọtụtụ nde anụmanụ ndị bi n’ime oké osimiri kwa afọ.

Onyeisi Òtù Mba Ụwa bụ́ António Guterres kwuru n’afọ 2022, sị: “Anyị anaghị elebara oké osimiri anya. Taakwa, m nwere ike ịsị na ‘Nsogbu A Na-enwe n’Ihe Gbasara Oké Osimiri Bụzi Nsogbu Gbata Gbata.’”

E Kere Ụwa Anyị A Ka Ọ Dịgide

E kere oké osimiri na ihe ndị dị ndụ bi na ya otú ha ga na-edebe onwe ha ọcha ma dịrị na-aga. Naanị ihe ga-akpa ha aka ọjọọ bụ ihe ndị ụmụ mmadụ ji na-emetọsị oké osimiri. Otu akwụkwọ aha ya bụ Regeneration: Ending the Climate Crisis in One Generation kwuru na ọ bụrụ na ndị mmadụ akwụsị imetọsị oké osimiri, “oké osimiri na-eji aka ya edozi onwe ya ma dịrị na-aga.” Lee ihe ụfọdụ gosiri na ihe a bụ eziokwu:

  • Ụmụ irighiri ihe dị ndụ a na-akpọ faịtoplanktọn (phytoplankton) na-amịkọrọ ikuku kabọn dayọgzaịd (carbon dioxide). E kwuru na ọ bụ ikuku a kacha eme ka ụwa na-ekpo oké ọkụ. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ikuku kabọn dayọgzaịd ụmụ irighiri ihe ndị a na-amịkọrọ hà ka nke osisi na ahịhịa niile dị n’elu ala na-amịkọrọ.

  • E nwekwara irighiri ihe ndị ọzọ na-eri azụ̀ ndị nwụrụ anwụ nakwa ọkpụkpụ ha. Ozu azụ̀ ndị ahụ gaara na-emetọ oké osimiri. Ihe ndị ọzọ bi ná mmiri na-abịazi rie irighiri ihe ndị ahụ. N’ebe a na-edebe ihe n’Ịntanet nke a na-akpọ Smithsonian Institution Ocean Portal, e kwuru na ihe a “na-eme ka oké osimiri dị ọcha ma na-enwu gbaa.”

  • Otú ọtụtụ ihe ndị bi n’oké osimiri si agbari nri n’afọ ha na-eme ka kemikal ọjọọ ndị dị n’oké osimiri belata. Kemikal ndị a nwere ike igbu akịrịkọ, ihe ndị yiri ahịhịa na nkume dị n’ala ala oké osimiri, nakwa ihe ndị ọzọ dị ndụ n’oké osimiri.

    Ị̀ MAARA?

    Otú Ahịhịa Ndị Dị n’Oké Osimiri Si Eme Ka Oké Osimiri Dị Ọcha

    Ebe ebili mmiri si n’oké osimiri mere na-apụta n’akụkụ mmiri. A na-ahụkwa ala mmiri, ahịhịa ndị dị n’ala mmiri, na ihe ụfọdụ bi ná mmiri. Ka ebili mmiri ahụ nuuru na-apụta n’akụkụ osimiri, ahịhịa ndị ahụ dị n’ala mmiri mere ka ọ na-ebelata, meekwa ka ọ ghara ibufusị ájá na ihe ndị ọzọ o bu na-aga. Azụ̀ na ihe ndị ọzọ bi ná mmiri na-eri ihe ndị ha na-ahụ n’ahịhịa. Ebili mmiri na-erutezi n’akụkụ mmiri anaghị akpacha ike, mmiri ya na-adịkwa ọcha.

    Ahịhịa ndị na-eto n’ala oké osimiri na-eme ka mmiri ghara ibupụ ájá ndị dị n’ime oké osimiri. Ha na-echebe ihe ndị yiri nkume dị n’ala ala oké osimiri ka ha ghara ịnwụ, na-emekwa ka a ghara ịna-enwekarị oké ebili mmiri. Ihe ọzọ bụ na ha na-eme ka mmiri ghara ibufusị ájá ndị dị n’akụkụ oké osimiri.

Ihe Ndị Mmadụ Na-eme Ka Nsogbu A Kwụsị

Foto ndị na-egosi: 1. Ebe otu nwoke na-ewepụta ihe oriri ọ zụtara n’ahịa n’akpa o ji na-eme ihe ndị ọzọ bara uru kama ịbụ nke ọ ga-eji gaa ahịa otu ugboro tụfuo ya. 2. Ebe otu nwaanyị nọ n’usekwu ya na-agbanye mmiri n’ihe mmiri ya ọ na-agaghị atụfu otu ugboro o ji ya gbara mmiri.

Iji akpa na ihe mmiri ndị anyị na-agaghị atụfu otu ugboro anyị jichara ha tinye ihe ma ọ bụ gbanye mmiri ga-eme ka mmetọ a na-emetọ oké osimiri belata

Ọ bụrụ na a naghị awụba unyi n’ime oké osimiri, ọ gaghị adị mkpa ka e mee ka oké osimiri dị ọcha. N’ihi ya, ndị ọkachamara na-agwa ndị mmadụ ka ha ghara ịna-atụfu akpa, komkom, na plastik mgbe ọ gachara ha mkpa otu ugboro, kama ka ha jirikwa ha na-eme ihe ndị ọzọ.

Ma, a ka kwesịrị imekwu ihe. Na nso nso a, otu ụlọ ọrụ si n’akụkụ oké osimiri kpokọta unyi ga-eju ihe karịrị otu puku (1,000) gwongworo naanị n’ime otu afọ. Ebili mmiri si n’oké osimiri bupụta unyi ndị a. Ọ bụ n’otu narị mba na iri na abụọ (112) ka e si kpokọta unyi ndị a.

Ụlọ ọrụ a na-akpọ National Geographic kwuru na “o nwere ike mmetọ e jirila kemikal ọjọọ metọọ oké osimiri agaghịzi enwe mmekwata.” Ha kwukwara na ihe ndị dị ndụ dị n’oké osimiri “agaghịzi enwe ike ịna-edebe oké osimiri ọcha n’ihi mmetọ ndị mmadụ ji anwụrụ ọkụ, mmanụ ụgbọala, kol, na ụdị mmanụ ndị ọzọ na-emetọ oké osimiri.”

Ihe Mere Obi Ga-eji Sie Anyị Ike​—Ihe Baịbụl Kwuru

“Ihe ndị i kere eke juru n’ụwa. Oké osimiri buru ezigbo ibu ma saa mbara. Imirikitiimi ihe ndị dị ndu, ma ndị ukwu ma ndị nta, juru n’ime ha.​—Abụ Ọma 104:24, 25.

Ọ bụ Onye kere anyị kere oké osimiri niile, meekwa ka ha nwee ike ịna-edebe onwe ha ọcha. Chegodị ihe a: Ebe ọ bụ na ọ ma ihe niile banyere oké osimiri na ihe ndị bi na ha, ọ̀ bụ na ọ gaghị emeli ka oké osimiri niile e metọrọ dịghachi mma? Gụọ isiokwu bụ́ “Chineke Kwere Nkwa na Ụwa Anyị A Ga-adịgide.” Ọ dị na peeji nke 15.

MỤTAKWUO IHE NDỊ ỌZỌ

Ebe azụ̀ pilot whale na-egwu mmiri n’oké osimiri.

Blue Planet Archive/Doug Perrine

Ndị ọkà mmụta sayensị esila n’aka otu anụmanụ bi ná mmiri mụta ịna-ewepụsị eju mmiri a na-akpọ banakụl (barnacle) n’ahụ́ nnukwu ụgbọ mmiri n’ejighị kemikal ọjọọ. Gụọ isiokwu bụ́ “Otú Ahụ́ Azụ̀ Pilot Whale Si Eme Onwe Ya Ka Ọ Dị Ọcha.” Ọ dị na jw.org.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya