Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 3/96 p. 2
  • Nzukọ Ije Ozi Maka March

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzukọ Ije Ozi Maka March
  • Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite March 4
  • Izu Na-amalite March 11
  • Izu Na-amalite March 18
  • Izu Na-amalite March 25
Ozi Alaeze Anyi—1996
km 3/96 p. 2

Nzukọ Ije Ozi Maka March

Izu Na-amalite March 4

Abụ 1 (6)

5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara site n’Ozi Alaeze Anyị.

10 min: “Gọzienụ Jehova ‘Kwa Ụbọchị.’” Ajụjụ na azịza. Gụpụta paragraf nke 2-5 dị ka oge nyere ohere ya. Nye agbamume dị mma maka ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka na nke oge nile.

15 min: “Jiri Magazin Anyị Mee Ihe n’Ụzọ Kasị Mma.” Okwu na-ekpo ọkụ nke onye nlekọta ije ozi ga-ekwu, na-adabere na paragraf 1 ruo 12 nke ihe ntinye.

15 min: “Ihe Ọmụma nke Ezi Chineke ahụ Na-eduba ná Ndụ.” Tụlee ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị a tụrụ aro ha. Mee otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ.

Abụ 78 (104) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite March 11

Abụ 164 (65)

5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ndị na-eduzi ọmụmụ ihe dị iche iche kwesịrị ịgba ndị ọhụrụ na-enwe ezi ọganihu n’ọmụmụ Bible ha ume iru eru iji bụrụ ndị nkwusa a na-emebeghị baptism. Ndị nne na nna pụkwara inyere ụmụ ha aka ịbụ ndị nkwusa. Tụlee usoro a tụrụ aro ya nke e depụtara ná Nhazi E Mere Iji Jezuo Ozi Anyị, peji nke 97-100.

15 min: “Jiri Magazin Anyị Mee Ihe n’Ụzọ Kasị Mma.” Soro ndị na-ege ntị tụlee paragraf nke 13 ruo 16 nke ihe ntinye. Kwusie okwu ike ná mkpa ọ dị ime mgbalị pụrụ iche iji kesaa Ụlọ Nche na Teta! n’April na May. Ebe ọ bụ na a na-ebipụta magazin ndị ahụ n’asụsụ dị iche iche, anyị kwesịrị ịgwa ndị na-asụ asụsụ ọzọ na anyị pụrụ inye ha magazin mgbe mgbe n’asụsụ ala ha. N’ókèala a na-arụ ọrụ mgbe mgbe, ikesa magazin anyị pụrụ ịbụ ụzọ kasị irè nke ịzụlite mmasị, ebe ọ bụ na ha na-enye ihe ọmụma dị ọhụrụ kwa izu. N’ebe a chọtara mmasị ná nletaghachi, nyefee ụtụ. Mee ka otu ìgwè ezinụlọ mee ihe ngosi oge mmụgharị ihe, dị ka a kọwara na paragraf nke 13. Ọzọ, rụtụ aka n’aro ụfọdụ ndị dị irè maka ịmụba ntinye nke magazin.

15 min: “Rite Uru Site n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 1996—Akụkụ nke 3.” Okwu nke onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekwu. Gbaa ndị nile pụrụ ime ya ume idenye aha ha na ime ihe omume e kenyere ha mgbe nile. Kọwaa n’ụzọ doro anya ụkpụrụ nduzi maka ịkpọpụta aha dị ịche iche nke Bible.

10 min: “Magazin Hausa.” Ntụle a ga-eso ndị na-ege ntị mee, nke onye nlekọta ije ozi ga-eme.

Abụ 211 (68) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite March 18

Abụ 6 (4)

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

15 min: “Mgbakọ Distrikti Na-akpọ Òkù Na-akpali Akpali!—Jiri Ọṅụ Na-eto Jehova Site n’Ụbọchị Ruo n’Ụbọchị!” Ajụjụ na azịza.

20 min: “Nyere Ndị Ọzọ Aka Inweta Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ.” Tụlee ụzọ iche ihe n’ihu ndị a tụrụ aro ha maka iji mee ihe ná nletaghachi. Mee otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ. Mesie ike ihe mgbaru ọsọ nke ịmalite ọmụmụ ihe.

Abụ 130 (58) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite March 25

Abụ 5 (28)

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee “Ihe Ncheta Maka Ememe Ncheta.” Kọwaa ihe mere o ji dị mkpa ịga. (Lee Ụlọ Nche nke February 15, 1985, peji nke 18-20.) Tụlee atụmatụ e nwere iji nyere ndị agadi, ndị na-adịkwaghị ike, na ndị ọhụrụ aka ịbịa. Tụlee ndokwa ndị e mere maka ọrụ ozi ubi sara mbara n’ime izu a dị n’ihu. Ọzọ, tụlee isiokwu bụ́, “Ebe A Na-ele Ndị A Na-amaghị Ndị Ha Bụ Ọbịa nke Ọma,” na peji nke 22 nke mbipụta Teta! nke October 8, 1995.

15 min: “Akwụkwọ Ọhụrụ Na-eme Ka Ihe Ọmụma Chineke Pụta Ìhè.” Ntụle ajụjụ na azịza. Gbaa mmadụ nile ume ịmata n’ụzọ zuru ezu ihe ndị dị n’akwụkwọ ka ha wee nwee ike iji ya mee ihe n’ụzọ dị irè n’ubi.

10 min: Na-emekọ Ihe Ọnụ Dị Ka Otu Ezinụlọ. Nna agwa ezinụlọ ya okwu n’ụzọ a na-emebughị ndokwa ya banyere mkpa e nwere maka imekọ ihe ọnụ, na-adabere n’Ụlọ Nche nke September 1, 1993, peji nke 16-19. Kwusie okwu ike n’ọmụmụ ihe ezinụlọ na ọrụ ikwusa ozi ọma. Kọwapụta otú ezinụlọ ndị dị ugbu a si agbasasị n’ihi na ha na-eji oge dị nta na-anọkọ ọnụ, bụrụkwa ndị na-enweghị mmasị n’otu ihe. Ịmụkọ Okwu Chineke ọnụ na ikerekọ òkè ọnụ n’ozi bụ ngọzi nye ezinụlọ ndị Kraịst. Mesie ike mkpa nna nwere ịhazi ihe ndị a nke ọma, nakwa nne inye nkwado. Ụmụaka kwesịrị igosi mmasị n’ihe omume ime mmụọ, na-esoro ndị mụrụ ha na-arụ ọrụ n’ụzọ chiri anya. Ezinụlọ ga-adị n’otu, bụrụkwa nke e wusiri ike ịnagide nrụgide na-arị elu e nwere ime omume dị ka ndị ụwa.

10 min: “Ime Nkwadebe—Mkpịsị Ugodi nke Ihe Ịga nke Ọma.” Ajụjụ na azịza. Kwuo na anyị ga-enyefe ụtụ Ụlọ Nche n’April na May. Mee ndokwa ugbu a site n’ịtụ ọda magazin ndị ọzọ, inweta fọm ụtụ, na ime atụmatụ iji kwadoo ndokwa ọgbakọ mere maka ọrụ Ụbọchị Magazin.

Abụ 7 (111) na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya