Ezinụlọ Ndị Kraịst Na-emekọ Ihe Ọnụ
“Ma, ụmụnna m, . . . ka e mee unu ka unu zuo okè n’otu uche ahụ na n’otu izu ahụ.”—1 NDỊ KỌRINT 1:10.
1. Olee ihe bụ ọnọdụ dịnụ banyere ịdị n’otu n’ọtụtụ ezinụlọ?
EZINỤLỌ gị ọ̀ bụ nke dị n’otu? Ka ò yiri ka onye ọ bụla na-agara onwe ya? Ùnu na-emekọ ihe ọnụ? Ka ọ̀ na-esi ike unu nile ịnọ n’otu ebe n’otu oge ahụ? Okwu ahụ n’onwe ya bụ́ “ezinụlọ” na-enye echiche nke ndị èzí dị n’otu.a Ma, ọ bụghị ezinụlọ nile dị n’otu. Otu onye ọkà okwu bụ́ onye Britain ọbụna gara n’ihu ikwu, sị: “Kama ịbụ ebe ndabere nke ọha na eze dị mma, ezinụlọ . . . bụ isi iyi nke enweghị afọ ojuju anyị nile.” Nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu n’ezinụlọ gị? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ̀ bụ iwu na ọ ga-adị otú ahụ?
2. Olee ndị na Bible na-enye ihe àmà nke isite n’ezinụlọ dị mma?
2 Ịdị n’otu ma ọ bụ adịghị n’otu nke ezinụlọ na-adaberekarị n’idu ndú ya, ma ọ̀ bụ site n’aka nne na nna ma ọ bụ nne ma ọ bụ nna nke ọ bụ nanị ya. N’oge Bible, ezinụlọ ndị dị n’otu bụ́ ndị na-efekọ ofufe ọnụ nwetara ngọzi Jehova. Nke a bụ eziokwu n’Israel oge ochie, ebe ada Jefta, Samson, na Samuel, nke ọ bụla n’ụzọ dị iche nyere ihe àmà nke isite n’ezinụlọ na-atụ egwu Chineke. (Ndị Ikpe 11:30-40; 13:2-25; 1 Samuel 1:21-23; 2:18-21) N’oge mmalite ndị Kraịst, e ji ihe ọmụma nke Akwụkwọ Nsọ Hibru zụlite Timoti, onye ji ikwesị ntụkwasị obi sonyere Pọl ná njem ozi ala ọzọ ụfọdụ nke Pọl, site n’aka nne ya ochie bụ́ Lọịs na nne ya bụ́ Yunaịsi. Lee aha onye na-eso ụzọ na onye ozi ala ọzọ nke pụrụ iche ọ ghọrọ!—Ọrụ 16:1, 2; 2 Timotiy 1:5; 3:14, 15; leekwwa Ọrụ Ndị Ozi 21:8, 9.
N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Mekọọ Ihe Ọnụ?
3, 4. (a) Àgwà ndị dị aṅaa kwesịrị ịpụta ìhè n’ezinụlọ dị n’otu? (b) Olee otú ebe obibi pụrụ isi bụrụ nanị ụlọ?
3 N’ihi gịnị ka o ji baa uru ka ezinụlọ na-emekọ ihe ọnụ? N’ihi na ọ na-ewulite ịghọtarịta ibe na ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù. Kama ịkpapụ onwe anyị iche site ná ndị ọzọ, anyị na-anọ nso ma na-enye nkwado. Otu isiokwu pụtara n’oge na-adịbeghị anya gara aga n’akwụkwọ bụ́ Family Relations kwuru, sị: “Onyinyo doturu anya apụtawo bụ́ nke na-akọwa àgwà ndị pụtara ìhè nke ‘ezinụlọ ndị siri ike.’ Àgwà ndị dị otú ahụ gụnyere ịrara onwe onye nye na ekele maka ndị ọzọ, nnọkọrịta ọnụ, ezi nkwurịta okwu, ikike idozi nsogbu, na akụkụ ime mmụọ siri ike.”
4 Mgbe àgwà ndị a dị n’ezinụlọ, ebe obibi adịkwaghị abụ ebe a na-agbara mmanụ ụgbọ ala, ebe a na-akwụsịtụ maka petrol. Ọ bụ ihe karịrị ụlọ. Ọ bụ ebe na-adọrọ adọrọ nke na-adọrọ mmasị ndị òtù ezinụlọ. Ọ bụ ebe izu ike nke na-ekpo ahụ ọkụ na nke ịhụnanya, ọmịiko, na nghọta. (Ilu 4:3, 4) Ọ bụ akwụ nnụnụ ebe a na-emepụta ịdị n’otu ezinụlọ, ọ bụghị ọnụ akpị nke nserịta okwu na nkewa. Ma olee otú e si emezu nke a?
Imekọ Ihe Ọnụ n’Ọmụmụ Ihe Ezinụlọ
5. Gịnị ka anyị na-etinye n’ọrụ iji mụta ezi ofufe?
5 A na-amụta ezi ofufe Jehova site n’iji ikike iche echiche anyị, ma ọ bụ “uche” eme ihe. (Ndị Rom 12:1) E kwesịghị ịdị na-achịkwa akparamagwa anyị site ná mmetụta uche ndị na-agafe agafe, dị ka ndị ahụ a na-akpalite site n’okwuchukwu ọnụ efu na ozi ọma TV e ji aghọgbu mmadụ. Kama nke ahụ, a na-akwali anyị site n’ọmụmụ ihe anyị chiri anya na ntụgharị uche na Bible na akwụkwọ e ji amụ Bible ndị “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” na-ewepụta. (Matiu 24:45) Ihe omume anyị dị iche iche nke ndị Kraịst bụ ihe ndị sitere n’anyị inweta uche nke Kraịst n’ọnọdụ ma ọ bụ ọnwụnwa ọ bụla pụrụ ibilite. N’akụkụ nke ahụ, Jehova bụ́ Onye Ukwu Na-akụzi Ihe nke anyị nwere.—Abụ Ọma 25:9; Aịsaịa 54:13; 1 Ndị Kọrint 2:16.
6. Olee ihe atụ zuru ụwa ọnụ nke ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị nwere?
6 Ọmụmụ Bible ezinụlọ na-ekere òkè dị mkpa n’ọnọdụ ime mmụọ nke ezinụlọ ọ bụla nke ndị Kraịst. Olee mgbe ị na-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ gị? Ọ bụrụ na a hapụrụ ya mgbe ọ bụla ohere dị ma ọ bụ mgbe ọ dapụtara e mee ya, mgbe ahụ o yikarịrị ka ọ ga-abụ ihe a na-adịghị emechi anya, ma ọ bụrụ na a na-eme ya ma ọlị. Imekọ ihe ọnụ n’ọmụmụ ihe ezinụlọ chọrọ usoro ihe omume e ji eme ihe mgbe nile, nke doro anya. Mgbe ahụ mmadụ nile na-ama ụbọchị na hour a tụrụ anya na ha ga-anọ ya inwe nnọkọrịta ime mmụọ nke ezinụlọ. Ihe karịrị 12,000 ndị òtù nke ezinụlọ Betel gburugburu ụwa maara na ọmụmụ ihe ezinụlọ ha bụ n’uhuruchi Monday. Lee ka o si bụrụ ihe magburu onwe ya nye ndị a nyere onwe ha n’afọ ofufo na Betel icheta na ha nile na-ekerịta otu ọmụmụ ihe ahụ mgbe ụbọchị na-agwụsị, n’agwaetiti nile nke Pacific na New Zealand, mgbe oge na-agakwa n’Australia, Japan, Taiwan, Hong Kong, o wee ruo Esia, Africa, na Europe, na n’ikpeazụ kọntinent nile nke America. Ọ bụ ezie na ọtụtụ puku kilomita na ọtụtụ asụsụ kewara ha, ọmụmụ ihe ezinụlọ nke a na-eme ka e nwee n’etiti ndị nọ n’ezinụlọ Betel mmetụta nke imekọ ihe ọnụ. N’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ala karị, ị pụrụ ịzụlite otu mmetụta ahụ site n’ọmụmụ ihe ezinụlọ gị.—1 Pita 2:17; 5:9.
7. Dị ka Pita kwuru, olee otú anyị kwesịrị isi lee okwu nke eziokwu ahụ anya?
7 Pita onyeozi dụrụ anyị ọdụ, sị: “Dị ka ụmụ a mụrụ ọhụrụ, ka agụụ mmiri ara nke okwu Chineke, nke aghụghọ na-adịghị ya, na-agụsi unu ike, ka unu wee were ya na-eto eto ruo nzọpụta; ọ bụrụ na unu deturu n’ire na Onyenwe anyị bụ onye nwere obi ọma.” (1 Pita 2:2, 3) Lee onyinyo mara mma Pita ji okwu ndị ahụ na-akpọlite! O jiri ngwaa Grik bụ́ e·pi·po·theʹsa·te mee ihe, bụ́ nke, dị ka akwụkwọ Linguistic Key to the Greek New Testament na-ekwu, sitere n’okwu pụtara “inwe agụụ siri ike maka, ịchọsi ike, inwe akpịrị.” Ọ na-enye echiche nke ọchịchọ siri oké ike. Ị̀ rịbawo ama otú nwa anụ a mụrụ ọhụrụ si achọsi ọnụ ara nne ya ike na otú obi si ajụrụ nwa mmadụ nke a mụrụ ọhụrụ mgbe ọ na-aṅụ nne ya ara? Anyị kwesịrị inwe otu ụdị ọchịchọ ahụ siri ike maka okwu eziokwu ahụ. Onye mmụta bụ́ onye Gris bụ́ William Barclay kwuru, sị: “Maka onye Kraịst nwere obi eziokwu, ịmụ okwu Chineke abụghị ihe ndọlị kama ihe obi ụtọ, n’ihi na ọ maara na n’ebe ahụ, obi ya ga-enweta ihe e ji azụ ahụ nke na-agụ ya agụụ.”
8. Olee ihe ịma aka nke na-eche onye isi ezinụlọ ihu n’iduzi ọmụmụ ihe ezinụlọ?
8 Ọmụmụ ihe ezinụlọ na-atụkwasị ibu ọrụ buru ibu n’ubu onye isi ezinụlọ. Ọ ga-ejide n’aka na ọmụmụ ihe ahụ dị mmadụ nile ụtọ nakwa na mmadụ nile pụrụ ikere òkè. O kwesịghị ịdị ụmụaka ka ọmụmụ ihe ahụ ọ bụ n’ezie maka ndị toro eto. Ọdịdị nke ọmụmụ ihe ahụ dị mkpa karịa ole ihe a tụlezuru. Mee ka Bible dịrị ndụ. Mgbe o kwesịrị ekwesị, nyere ụmụ gị aka iji uche ha hụ ebe na ihe ndị dị na Palestine ebe ihe ndị a na-atụle weere ọnọdụ. E kwesịrị ịgba mmadụ nile ume ime nnyocha onwe onye ha na iso ezinụlọ ahụ kerịta ya. N’ụzọ dị otú a ụmụaka kwa pụrụ ‘iso Jehova na-eto.’—1 Samuel 2:20, 21.
Imekọ Ihe Ọnụ n’Ikwusa Ozi Ọma
9. Olee otú a pụrụ isi mee ọrụ nkwusa ahụ ahụmahụ obi ụtọ ezinụlọ?
9 Jisọs sịrị: “A ghaghịkwa ibu ụzọ kwusaa ozi ọma nke m n’ihu mba nile.” (Mak 13:10) Okwu ndị ahụ na-enye onye Kraịst ọ bụla ji ọrụ ya kpọrọ ihe ọrụ—ikwusa ozi ọma, soro ndị ọzọ kerịta ozi ọma nke ịchịisi Alaeze Chineke. Imekọ nke a ọnụ dị ka ezinụlọ pụrụ ịbụ ahụmahụ na-agba ume ma na-enye ọṅụ. Ndị nne na nna na-eji ụzọ ụmụ ha si eche ozi ọma n’ihu mmadụ eme ọnụ. Otu di na nwunye nwere ụmụ atọ nọ n’agbata afọ 15 na 21 na-akọ na ha enwewo mgbe nile àgwà isoro ụmụ ha gaa ọrụ nkwusa ihu ọha kwa Wednesday mgbe a gbasasịrị akwụkwọ na n’ụtụtụ Saturday ọ bụla. Nna ahụ sịrị: “Anyị na-akụziri ha ihe oge ọ bụla. Anyị na-ejidekwa n’aka na ọ bụ ahụmahụ na-enye ọṅụ, nke na-agba ume.”
10. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi baara ụmụ ha uru n’ozi ahụ?
10 Ịrụkọ ọrụ ọnụ dị ka ezinụlọ n’ime nkwusa na izi ihe pụrụ nnọọ ịmịpụta mkpụrụ. Mgbe ụfọdụ ndị mmadụ na-azaghachi nke ọma karị n’ụzọ izi ozi ọma dị mfe nke obi eziokwu nke nwata. Mgbe ahụ, Mama ma ọ bụ Papa nọ ya inye aka n’ebe ọ dị mkpa. Ndị nne na nna pụrụ ijide n’aka na ụmụ ha nwetara ọzụzụ na-aga n’ihu wee si otú ahụ ghọọ ndị ozi ‘nke ihere na-apụghị ime ha, ndị na-ekwuzi okwu nke eziokwu ahụ.’ Imekọ nkwusa ọnụ n’ụzọ nke a na-enye ndị nne na nna ohere ileru àgwà, ịdị irè, na ezi akparamagwa ụmụ ha n’ozi anya. Site n’inwe usoro ihe omume a na-agbasochi anya, ha na-ahụ ọganihu nwa ahụ ma na-enye ọzụzụ na agbamume kwekọrọ ekwekọ iji gbaa okwukwe ya ume. N’otu oge ahụ, ụmụaka ahụ na-ahụ na ndị mụrụ ha bụ ezi ihe nlereanya n’ozi ahụ. N’oge ndị a dị oké egwu ma bụrụ nke ime ihe ike, ịrụ ọrụ dị ka ezinụlọ dị n’otu ma na-ahụ n’anya pụrụ ọbụna inye ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nchebe n’ógbè ebe mpụ jupụtara.—2 Timoti 2:15; Ndị Filipaị 3:16.
11. Gịnị pụrụ ibelata ịnụ ọkụ n’obi nwatakịrị maka eziokwu ahụ n’ụzọ dị mfe?
11 Ụmụaka na-ahụta n’ụzọ dị mfe ụdị ụkpụrụ abụọ ná ndị okenye. Ọ bụrụ na nne na nna adịghị egosi ezi ịhụnanya maka eziokwu ahụ na maka ozi ụlọ n’ụlọ, ọ ga-esi ike ịtụ anya ka ụmụaka na-anụ ọkụ n’obi. Otú a, nne ma ọ bụ nna nwere ahụ ike nke nanị ozi ubi ọ na-eje bụ ọmụmụ Bible a na-eduziri ụmụaka ahụ kwa izu pụrụ ịkwụ ụgwọ dị elu mgbe ndị a toro.—Ilu 22:6; Ndị Efesọs 6:4.
12. Olee otú ezinụlọ ụfọdụ pụrụ isi nweta ngọzi pụrụ iche n’aka Jehova?
12 Abamuru nke ‘ịbụ ndị zuru okè n’otu uche ahụ’ bụ na ma eleghị anya ezinụlọ ahụ pụrụ ịbịakọ ọnụ ka ma eleghị anya otu onye pụrụ ije ozi dị ka onye ozi ọsụ ụzọ oge nile n’ọgbakọ. Ọtụtụ ezinụlọ gburugburu ụwa na-eme nke a, mmadụ nile na-anatakwa ngọzi site n’ahụmahụ na ịdịwanye irè nke onye òtù ha bụ ọsụ ụzọ.—2 Ndị Kọrint 13:11; Ndị Filipaị 2:1-4.
Imekọ Ihe Ọnụ n’Idozi Nsogbu
13, 14. (a) Ọnọdụ ndị dị aṅaa pụrụ imetụta nkwekọrịta ezinụlọ? (b) Olee otú a pụrụ isi gbochie ọtụtụ nsogbu ezinụlọ?
13 N’oge ndị a siri ike nke “ndọlị” na “ihe ize ndụ,” anyị nile na-enwe nrụgide. (2 Timoti 3:1, Revised Standard Version; Phillips) E nwere nsogbu n’ụlọ ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, n’okporo ụzọ, na ọbụna n’ụlọ n’onwe ya. Ụfọdụ na-ata ahụhụ n’ihi ahụ esighị ike ma ọ bụ nsogbu mmetụta uche ndị na-adịte anya, nke mgbe ụfọdụ na-eduba n’ahụ mgbakasị na nghọtahie n’ime ezinụlọ. Olee otú a pụrụ isi hụ ọnọdụ ndị dị otú a? Site n’onye ọ bụla ịgawara onwe ya? Site ná mmadụ ịnọpụ iche ọbụna mgbe a na-ekerịta otu ụlọ ahụ? Ee e. Kama nke ahụ, anyị nwere mkpa ime ka a mara ihe ndị na-echekasị anyị ma chọọ enyemaka. Oleekwa ebe dị mma e nwere maka nke a karịa njikọ ezinụlọ na-ahụ n’anya?—1 Ndị Kọrint 16:14; 1 Pita 4:8.
14 Dị ka dọkịta ọ bụla maara, mgbochi ọrịa dị mma karịa ọgwụgwọ. Nke ahụ bụkwa eziokwu ná nsogbu ezinụlọ. Mkparịta ụka nke onye ọ bụla pụrụ itinye ọnụ na nke obi eziokwu pụrụ ọtụtụ mgbe igbochi nsogbu ka ha ghara ịdị njọ. Ọbụna ma nsogbu siri ike bilite, a pụrụ ịhụ maka ha na ọbụna dozie ha ma ọ bụrụ na ezinụlọ ahụ atụlekọọ ụkpụrụ Bible ndị o metụtara. Ọtụtụ mgbe a pụrụ ịgbanwe esemokwu ka ọ ghọọ mmekọrịta na-aga were were site n’itinye okwu ndị Pọl kwuru ná Ndị Kọlọsi 3:12-14 n’ọrụ: “Yikwasịnụ obi ebere, obi ọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi; na-anagiderịtanụ ibe unu, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, a sị na onye ọ bụla nwere ihe ịta onye ọ bụla ụta; . . . yikwasịnụ ịhụnanya, nke bụ ihe nkekọ nke izu okè.”
Imekọ Ihe Ọnụ n’Oge Ntụrụndụ
15, 16. (a) Àgwà dị aṅaa kwesịrị ime ka ezinụlọ ndị Kraịst dị iche? (b) Ụdị mmadụ ndị dị aṅaa ka okpukpe ụfọdụ na-ewepụta, n’ihi gịnịkwa?
15 Jehova bụ Chineke obi ụtọ, eziokwu ahụ bụkwa ozi obi ụtọ—nke olileanya maka ihe a kpọrọ mmadụ. Ọzọkwa, otu n’ime mkpụrụ nke mmụọ ahụ bụ ọṅụ. Ọṅụ nke a dị iche nke ukwuu site ná mkpali ọṅụ na-adị nwa oge nke onye egwuregwu nke meriri n’egwuregwu ịma aka. Ọ bụ mmetụta miri emi nke na-adịgide adịgide nke afọ ojuju nke na-ejupụta n’obi dị ka ihe sitere n’ịzụlite mmekọrịta chiri anya n’ebe Jehova nọ. Ọ bụ ọṅụ nke dabeere n’ụkpụrụ ime mmụọ na mmekọrịta ndị na-ewuli elu.—Ndị Galetia 5:22; 1 Timoti 1:11.
16 Ya mere, dị ka Ndịàmà Jehova bụ́ ndị Kraịst, anyị enweghị ihe mere anyị ga-eji nwee ihu gbachiri agbachi ma ọ bụ ghara inwe ihu ọchị. Okpukpe ụfọdụ na-ewepụta ndị dị otú ahụ n’ihi na ụdị okwukwe ha na-emesi ihe na-adịghị enye obi ụtọ ike. Nkụzi ha nile na-akpata ụdị ofufe nke ịtakpuchi ọnụ, nke enweghị ọṅụ, nke Bible na-akwadoghị, a hazighịkwa ya nke ọma. Ha adịghị ewepụta ezinụlọ ndị nwere obi ụtọ n’ije ozi Chineke. Jisọs hụrụ mkpa maka oge ntụrụndụ na ntụsara ahụ. N’otu oge, dị ka ihe atụ, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya òkù ‘ịbịa iche n’ebe bụ ọhịa, ka ha zuru ike nke nta.’—Mak 6:30-32; Abụ Ọma 126:1-3; Jeremaịa 30:18, 19.
17, 18. N’ụzọ ndị dị aṅaa kwesịrị ekwesị ka ezinụlọ ndị Kraịst pụrụ isi nwee oge ntụsara ahụ?
17 Ezinụlọ n’otu aka ahụ nwere mkpa oge ịtụsara ahụ. Otu onye mụrụ ụmụ kwuru banyere ụmụ ya, sị: “Anyị na-emekọ ọtụtụ ihe ọchị ọnụ—ịga ụsọ oké osimiri, ịgba bọl n’ama egwuregwu, ime nhazi ịga njem ntụrụndụ n’elu ugwu. Mgbe ụfọdụ, anyị na-enwekọ ‘ụbọchị ndị ọsụ ụzọ’ n’ozi; e mesịa anyị ejiri oriri pụrụ iche mee ememe ya, anyị pụkwara ọbụna inyerịta onwe anyị onyinye.”
18 Aro ndị ọzọ ndị nne na nna pụrụ ịtụle bụ ezinụlọ ịga mkpagharị n’ebe a na-edebe ụmụ anụ, ogige egwuregwu, ebe ndebe ihe mgbe ochie, na n’ebe ndị ọzọ na-akpali mmasị. Ime mkpagharị n’ime ọhịa, ikiri nnụnụ, na ịkọ ugbo bụ ihe omume ndị a pụrụ ikerịta n’ụzọ na-enye ọṅụ. Ndị nne na nna pụkwara ịgba ụmụ ha ume ịmụta ịkụ ma ọ bụ ịkpọ otu ngwá egwú ma ọ bụ ikere òkè n’otu ọrụ ntụrụ ndụ. N’ezie, ndị nne na nna nọ n’ezi nguzo ga-ewepụta oge isoro ụmụ ha gwuo egwu. Ọ bụrụ na ezinụlọ na-egwurikọ egwu, o yikarịrị ka ha ga-anọkọ ọnụ!
19. Omume dị aṅaa nke gbara ọhụrụ pụrụ imebi ezinụlọ?
19 Omume gbara ọhụrụ bụ ndị ntorobịa ịchọ ikewapụ onwe ha n’ebe ezinụlọ dị ma na-eme ihe masịrị ha mgbe a bịara n’ihe ntụsara ahụ. Ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe ọjọọ dị n’onye na-eto eto inwe ihe omume ntụrụndụ na-amasị ya ma ọ bụ ihe igbu oge na-amasịkarị mmadụ, ọ gaghị abụ ihe amamihe ikwere ka ihe mmasị ndị dị otú ahụ weta nkewapụ na-adịgide adịgide site ná ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ. Kama nke ahụ, anyị chọrọ itinye ụkpụrụ ahụ Pọl depụtara n’ọrụ: “Elela ihe nke aka unu anya, kama unu nile n’otu n’otu leekwa ihe nke mmadụ ibe unu anya.”—Ndị Filipaị 2:4.
20. Olee otú mgbakọ nta na nke ukwuu pụrụ isi bụrụ oge ọṅụ?
20 Lee ihe ọṅụ ọ bụụrụ anyị nile ịhụ ka ezinụlọ dị iche iche na-anọdụkọ oche ọnụ ná mgbakọ ukwu na mgbakọ nta dị iche iche! N’ụzọ dị otú ahụ ụmụ ndị toworo eto pụrụ ọtụtụ mgbe inyere ndị bụ nwata aka. Ndokwa dị otú ahụ na-egbochikwa ọchịchọ ndị ụfọdụ nọ n’oge uto ịgawara n’ìgwè jee n’oche azụ ma ghara ịdị na-egecha ntị n’usoro ihe omume mgbakọ. Ọbụna ịga na ịlata mgbakọ pụrụ inye ọṅụ mgbe a tụlekọrọ ọnụ dị ka ezinụlọ, ụzọ a ga-eso jee, ebe ndị a ga-ekiri n’ụzọ, na ebe a ga-anọ. Cheedị echiche oge na-akpali akpali ọ na-aghaghị ịbụwo n’ụbọchị Jisọs maka ezinụlọ dị iche iche imekọ njem ọnụ gaa Jerusalem!—Luk 2:41, 42.
Ngọzi Dị Iche Iche nke Imekọ Ihe Ọnụ
21. (a) Olee otú anyị pụrụ isi gbalịsie ike maka inweta ihe ịga nke ọma n’alụmdi na nwunye? (b) Olee aro ọma anọ e nwere maka alụmdi na nwunye na-adịte anya?
21 Alụmdi na nwunye ndị na-aga nke ọma na ezinụlọ ndị dị n’otu enwebeghị mgbe ọ dịrị mfe inweta, ha adịghịkwa adabata na mberede. Ụfọdụ na-ahụ ya dị ka ihe ka mfe ‘ịchịli aka elu,’ tọsaa alụmdi na nwunye ahụ n’ịgba alụkwaghịm, ma maliteghachi n’isi. Ma, otu nsogbu ndị ahụ na-apụtaghachikwa n’alụmdi na nwunye nke abụọ ma ọ bụ nke atọ. Azịza dị mma karị bụ nke ndị Kraịst: Gbalịsie ike maka ihe ịga nke ọma site n’itinye ụkpụrụ Bible ndị nke ịhụnanya na nkwanye ùgwù n’ọrụ. Ezinụlọ ndị dị n’otu dabeere ná mmụọ nke ikwenyere ibe, nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị. Otu onye ndụmọdụ alụmdi na nwunye nyere usoro ọrụ dị mfe iji mee ka alụmdi na nwunye dịtee anya. O dere, sị: “Ihe anọ dị oké mkpa a na-achọta n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ alụmdi na nwunye nile dị mma bụ ịdị njikere ịṅa ntị, ikike ịrịọ mgbaghara, ikike ịnọgide na-enye nkwado mmetụta uche, na ọchịchọ siri ike imetụ aka n’ịhụnanya.” Ihe ndị ahụ pụrụ n’ezie inyere alụmdi na nwunye aka ịdịte anya n’ihi na ha dabekwara n’ụkpụrụ dị mma nke Bible.—1 Ndị Kọrint 13:1-8; Ndị Efesọs 5:33; Jemes 1:19.
22. Olee uru ụfọdụ nke inwe ezinụlọ dị n’otu?
22 Ọ bụrụ na anyị agbasoo ndụmọdụ Bible, anyị ga-enwe ihe mgbakwasị ụkwụ siri ike maka ezinụlọ dị n’otu, ezinụlọ ndị dịkwa n’otu bụ ntọala nke ọgbakọ dị n’otu nke siri ike n’ụzọ ime mmụọ. Otú a, anyị ga-anata ngọzi bara ụba n’aka Jehova ka anyị ji ịdị n’otu na-enye ya otuto na-arị elu.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a “Ezinụlọ sitere n’okwu L[atin] familia, na m[bụ] ndị na-eje ozi na ndị ohu ná nnukwute ụlọ, e mesịa ụlọ ahụ n’onwe ya na onyenwenụ, nwanyị nwe ụlọ, ụmụaka—na ndị ọrụ.”—Origins—A Short Etymological Dictionary of Modern English, nke Eric Partridge dere.
Ị̀ Na-echeta?
◻ N’ihi gịnị ka o ji baa uru ka ezinụlọ na-emekọ ihe ọnụ?
◻ N’ihi gịnị ka ọmụmụ Bible ezinụlọ a na-enwechi anya ji dị mkpa?
◻ N’ihi gịnị ka o ji dị mma ka ndị nne na nna soro ụmụ ha na-ekere òkè n’ozi ubi?
◻ N’ihi gịnị ka o ji enye aka ịkparịta nsogbu ndị e nwere n’ime ezinụlọ?
◻ N’ihi gịnị ka ezinụlọ ndị Kraịst ga-eji ghara ịbụ nke ịgbachi ihu na enweghị ọṅụ?
[Foto dị na peeji nke 17]
Ezinụlọ gị ọ̀ na-erikọ nri ọnụ ọ dịkarịa ala otu ugbo n’ụbọchị?
[Foto dị na peeji nke 18]
Ezinụlọ ime njem ntụrụndụ kwesịrị ịbụ oge ntụsara ahụ na nke na-enye ọṅụ