Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 9/1 p. 10-15
  • Ezinụlọ Ndị Kraịst Na-ebute Ihe Ime Mmụọ Ụzọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ezinụlọ Ndị Kraịst Na-ebute Ihe Ime Mmụọ Ụzọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Kraịst—Ihe Nlereanya Zuru Okè nke Onye Ji Ihe Ime Mmụọ Kpọrọ Ihe
  • Ihe Ize Ndụ Ndị A Ga-ezere
  • Omume Ka Okwu Ọnụ Ike
  • Nkwurịta Okwu Dị Irè Na-akwalite Ọnọdụ Ime Mmụọ
  • Ụzọ Dị Iche Iche Ndị Mmadụ Si Agbalị Igbo Mkpa Ime Mmụọ Ha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ị̀ Bụ Onye Anụ Ahụ́ Na-achị ka Ọ̀ Bụ Onye Mmụọ Nsọ Na-achị?
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
  • Jiri Ofufe Chineke Kpọrọkwuo Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Olee Otú Mmadụ Si Abụ Onye Ji Ihe Ime Mmụọ Kpọrọ Ihe n’Ezie?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 9/1 p. 10-15

Ezinụlọ Ndị Kraịst Na-ebute Ihe Ime Mmụọ Ụzọ

“Nwekọọnụ otu uche, unu nile, werenụ obi sorịta onwe unu hụkọọ ahụhụ, bụrụnụ ndị na-ahụ ụmụnna unu n’anya, ndị nwere obi ọmịiko, ndị nwere uche dị umeala.”—1 PITA 3:8.

1. Olee nhọrọ anyị nile nwere, oleekwa otú nhọrọ anyị pụrụ isi metụta ọdịnihu anyị?

LEE ka amaokwu dị n’elu si metụta ndokwa kasị ochie nke ihe a kpọrọ mmadụ—bụ́ ezinụlọ! Leekwa ka o si dị mkpa na ndị nne na nna ga-edu ndú n’akụkụ ndị a! Àgwà ha ndị dị mma na ndị na-adịghị mma ga-apụtakarị ìhè n’ime ụmụ ha. Ma, ohere ime nhọrọ ka na-adịrị onye nke ọ bụla nọ n’ezinụlọ. Dị ka ndị Kraịst, anyị pụrụ ịhọrọ ịbụ ndị mmụọ nsọ na-achị ma ọ bụ ndị anụ ahụ na-achị. Anyị pụrụ ịhọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ ma ọ bụ ihe na-adịghị atọ ya ụtọ. Nhọrọ ahụ pụrụ ịrụpụta ngọzi, bụ́ ndụ ebighị ebi na udo—ma ọ bụ nkọcha, bụ́ ọnwụ ebighị ebi.—Jenesis 4:1, 2; Ndị Rom 8:5-8; Ndị Galetia 5:19-23.

2. (a) Olee otú Pita si gosi nchegbu ya maka ezinụlọ? (b) Gịnị bụ ọnọdụ ime mmụọ? (Lee nkọwa ala ala peji.)

2 Okwu ndị onyeozi ahụ kwuru na 1 Pita isi nke 3, amaokwu nke 8, sochiri ozugbo mgbe ndụmọdụ ọma o nyeworo ndị nwunye na ndị bụ di gasịrị. Pita nwere mmasị n’ezie n’ọdịmma nke ezinụlọ ndị Kraịst. Ọ maara na ọnọdụ ime mmụọ siri ike bụ isi ihe dị n’ezinụlọ dị n’otu, nke na-ahụ n’anya. N’ihi ya, o gosiri n’amaokwu 7 na ọ bụrụ na e leghara ndụmọdụ o nyere ndị bụ di anya, ihe ọ ga-arụpụta bụ ihe mgbochi ime mmụọ n’etiti di ahụ na Jehova.a A pụrụ igbochi ekpere di ahụ ma o leghara mkpa nwunye ya anya ma ọ bụ jiri enweghị obi ọma mekpọọ ya ọnụ.

Kraịst—Ihe Nlereanya Zuru Okè nke Onye Ji Ihe Ime Mmụọ Kpọrọ Ihe

3. Olee otú Pọl si mee ka ihe nlereanya Kraịst maka ndị bụ di pụta ìhè?

3 Ọnọdụ ime mmụọ nke ezinụlọ dabeere n’ihe nlereanya dị mma. Mgbe di bụ onye ji ịbụ onye Kraịst kpọrọ ihe, ọ na-ebute ụzọ n’igosi ọdịdị ime mmụọ. Ma e nweghị di kwere ekwe, onye bụ nne na-agbalịkarị ibu ibu ọrụ ahụ. N’ọnọdụ nke ọ bụla, Jisọs Kraịst na-enye ihe atụ zuru okè a ga-agbaso. Àgwà ya, okwu ya, na echiche ya na-ewuli elu ma na-enye ume ndụ mgbe nile. Ọtụtụ mgbe, Pọl onyeozi dọọrọ uche ndị na-agụ akwụkwọ ya gaa n’ụkpụrụ ịhụnanya nke Kraịst. Dị ka ihe atụ, o kwuru, sị: “Di bụ isi nke nwunye, dị ka Kraịst anyị bụkwa isi nzukọ ya, ebe ya onwe ya bụ onye nzọpụta nke ahụ. Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu n’anya, dị ka Kraịst anyị hụkwara nzukọ ya n’anya, rarakwa onwe ya nye n’ihi ya.”—Ndị Efesọs 5:23, 25, 29; Matiu 11:28-30; Ndị Kọlọsi 3:19.

4. Ihe nlereanya dị aṅaa nke iji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe ka Jisọs guzobere?

4 Jisọs bụ ihe nlereanya pụrụ iche nke onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe na idu ndú e gosipụtara n’ịhụnanya, obi ọma, na ọmịiko. O ji onwe ya achụ àjà, ọ bụghị ịdị na-achọ ihe ụtọ nke onwe ya nanị. O nyere Nna ya otuto mgbe nile ma kwanyere ịbụ isi ya ùgwù. O ṅomitara Nna ya, ya mere ọ pụrụ ikwu, sị: “Mụ onwe m apụghị ime ihe ọ bụla n’onwe m: dị ka m na-anụ m na-ekpe: ikpe m zikwara ezi; n’ihi na etughị m ihe mụ onwe m na-achọ, kama ihe onye zitere m na-achọ.” “Ọ dịghịkwa ihe m na-eme n’onwe m, kama dị ka Nna m ziri m, otú a ka m na-ekwu ihe ndị a.”—Jọn 5:30; 8:28; 1 Ndị Kọrint 11:3.

5. N’inye ndị na-eso ụzọ ya ihe, ihe nlereanya dị aṅaa ka Jisọs setịpụụrụ ndị bụ di?

5 Gịnị ka nke a pụtara nye ndị bụ di? Ọ pụtara na ihe atụ ha ga-agbaso n’ihe nile bụ Kraịst, onye doro onwe ya mgbe nile n’okpuru Nna ya. Dị ka ihe atụ, dị ka Jehova nyere ụdị nile nke ndụ dị n’elu ụwa nri, otú ahụ ka Jisọs si nye ndị na-eso ụzọ ya nri. O lefurughị mkpa anụ ahụ ha ndị bụ isi anya. Ọrụ ebube ya ndị nke ịzụ 5,000 ndị ikom na 4,000 mmadụ bụ ihe nnwapụta nke nlekọta ya na echiche ya nke inwe ibu ọrụ. (Mak 6:35-44; 8:1-9) N’otu aka ahụ taa, ndị isi ezinụlọ ji ọrụ ha kpọrọ mkpa na-elekọta mkpa anụ ahụ nke ezinụlọ ha. Ma ibu ọrụ ahụ ọ̀ gwụla na nke ahụ?—1 Timoti 5:8.

6. (a) Mkpa ndị dị aṅaa dị mkpa nke ezinụlọ ka a na-aghaghị ịhụ maka ha? (b) Olee otú ndị bụ di na nna pụrụ isi gosi nghọta?

6 Ezinụlọ nwekwara mkpa ndị ọzọ ka mkpa, dị ka Jisọs gosipụtara. Ha nwere mkpa ime mmụọ na nke mmetụta uche. (Deuterọnọmi 8:3; Matiu 4:4) Anyị na ndị ọzọ na-emekọ ihe, ma n’ime ezinụlọ ma n’ọgbakọ. Anyị nwere mkpa ezi nduzi iji kwalie anyị ịdị na-ewuli elu. Na nke a ndị bụ di na nna nwere òkè dị ukwuu ikere—karịsịa ma ọ bụrụ na ha bụ ndị okenye ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi. Ndị nne ma ọ bụ nna ọ bụ nanị ha nwere mkpa otu àgwà ndị ahụ mgbe ha na-enyere ụmụ ha aka. Ndị nne na nna aghaghị ịghọta ọ bụghị nanị ihe ndị òtù ezinụlọ na-ekwu kamakwa ihe a na-ahapụ na-ekwughị ha. Nke ahụ chọrọ nghọta, oge, na ndidi. Ọ bụ otu ihe mere Pita pụrụ iji kwuo na ndị bụ di kwesịrị ịdị na-echebara nwunye ha echiche ma soro ha na-ebikọ n’ụzọ ihe ọmụma.—1 Timoti 3:4, 5, 12; 1 Pita 3:7.

Ihe Ize Ndụ Ndị A Ga-ezere

7, 8. (a) Gịnị ka a chọrọ ma ọ bụrụ na ezinụlọ ga-ezere ọdịda ime mmụọ? (b) Gịnị ka a chọrọ e wezụga mmalite dị mma n’ụzọ ndụ ndị Kraịst? (Matiu 24:13)

7 N’ihi gịnị ka ilebara ọnọdụ ime mmụọ ezinụlọ anya ji dị mkpa otú a? Iji maa atụ, anyị pụrụ ịjụ sị, N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa na onye na-anya ụgbọ mmiri ga-elebara akwụkwọ ntụzi ụzọ ya anya nke ọma mgbe ọ na-eduzi ụgbọ mmiri ụzọ gabiga mmiri ndị dị ize ndụ nwere ebe ndị na-emighị emi? N’August 1992, a kwọfere oké ụgbọ amara bụ́ Queen Elizabeth 2 (QE2) ebe ájá ala mmiri na nkume ndị dị aghụghọ jupụtara bụ́ ebe a sịrị na a na-enwekarị ihie ụzọ njem mmiri. Otu onye bi n’ebe ahụ kwuru, sị: “A chụwo ọtụtụ ndị na-akwọ ụgbọ mmiri n’ọrụ n’ihi ebe ahụ.” Ụgbọ QE2 ahụ kpụrụ ike n’elu mkputamkpu ájá dị n’okpuru mmiri. Ọ ghọrọ oké ihe ihie ụzọ. E bibiri otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ahụ ya, a ghaghịkwa ịkwụsị iji ụgbọ mmiri ahụ eme ihe ruo ọtụtụ izu iji dozie ya.

8 N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na “ọkwọ ụgbọ” ezinụlọ ejighị ezi nlezi anya tụlee akwụkwọ ntụzi ụzọ ya, bụ́ Okwu Chineke, ọ pụrụ ịdịrị ezinụlọ ya mfe inwe mmerụ ahụ ime mmụọ. Nye onye okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi, ihe ọ ga-akpata pụrụ ịbụ ntụfu nke ihe ùgwù dị iche iche n’ime ọgbakọ na ma eleghị anya mmebi dị oké njọ nye ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ. Ya mere, onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ilezi anya ka ọ ghara ịghọ onye onwe ya juru afọ n’ime mmụọ, na-echekwube nanị ezigbo àgwà ọmụmụ ihe na ịnụ ọkụ n’obi e nwere na mbụ. N’ụzọ ndụ ndị Kraịst anyị, nanị ịmalite nke ọma ezughị ezu; a ghaghị ịgazu njem ahụ nke ọma.—1 Ndị Kọrint 9:24-27; 1 Timoti 1:19.

9. (a) Ruo ókè hà aṅaa ka ọmụmụ ihe onwe onye dị mkpa? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa dabara adaba ka anyị pụrụ ịjụ onwe anyị?

9 Iji zere mmiri na-emighị emi, nkume, na mkputamkpu àjà n’ụzọ ime mmụọ, ọ dị anyị mkpa ịma ihe “akwụkwọ ntụzi ụzọ” anyị na-ekwu mgbe ọ bụla site n’ịmụchi Okwu Chineke anya. Anyị apụghị ịdabere nanị n’ọmụmụ ihe bụ isi nke webatara anyị n’eziokwu ahụ. Ume ime mmụọ anyị dabeere n’usoro ọmụmụ ihe na ije ozi a na-agbasochi anya, nke a haziri nke ọma. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị ji mbipụta nke a na-aga Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche nke ọgbakọ, anyị pụrụ ịjụ onwe anyị sị, ‘N’ezie, àmụwo m, ma ọ bụ ànyị amụwo dị ka ezinụlọ, isiokwu nke a, na-agụ akụkụ akwụkwọ nsọ nile ma na-atụgharị uche n’abamuru ha? Ka nanị ihe anyị mere ọ̀ bụ ịkanye akara n’azịza? Ọ̀ pụrụ ịbụ ma eleghị anya na anyị elegharawo ọbụna ịgụ isiokwu a anya tupu a na-aga nzukọ?’ Azịza ndị bụ eziokwu nye ajụjụ ndị a pụrụ inye ihe a ga-echebara echiche ma kpakee ọchịchọ imeziwanye ihe—ma nke ahụ dị mkpa.—Ndị Hibru 5:12-14.

10. N’ihi gịnị ka nnyocha onwe onye ji dị mkpa?

10 N’ihi gịnị ka nnyocha onwe onye dị otú a ji dị mkpa? N’ihi na anyị na-ebi n’ụwa nke mmụọ Setan na-achị, ụwa nke, n’ọtụtụ ụzọ dị aghụghọ, na-anwa ikpu okwukwe anyị na Chineke na nkwa ya nile ihu. Ọ bụ ụwa nke na-achọ ime ka anyị jiri ọrụ n’aka nke ukwuu nke na anyị enweghị oge ọ bụla ịhụ maka mkpa ime mmụọ. Ya mere anyị pụrụ ịjụ onwe anyị sị, ‘Ezinụlọ m ò siri ike n’ụzọ ime mmụọ? Dị ka nne ma ọ bụ nna, èsiruru m ike otú m kwesịrị? Dị ka ezinụlọ, ànyị na-azụlite ikike ime mmụọ ahụ na-akpali uche anyị nke na-enyere anyị aka ime mkpebi ndị dabeere n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe?’—Ndị Efesọs 4:23, 24.

11. N’ihi gịnị ka nzukọ ndị Kraịst ji baa uru n’ụzọ ime mmụọ? Nye ihe atụ.

11 Nzukọ nke ọ bụla anyị jere kwesịrị ime ka ọnọdụ ime mmụọ anyị sikwuo ike. Ọmarịcha hour ndị ahụ a nọrọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na-enye aka ime ka anyị nwee ume ọhụrụ mgbe anyị gbalịsịworo ọtụtụ hour ịnọgide ndụ n’ụwa Setan nke na-ebu iro gasịrị. Dị ka ihe atụ, lee ka o siworo bụrụ ihe na-enye ume ndụ ịmụ akwụkwọ ahụ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ! Nke a enyeworo anyị aka inweta nghọta ka mma banyere Jisọs, ndụ ya, na ozi ya. Anyị ejiwo nlezianya gụọ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a kpọtụrụ uche, mee nchọpụta onwe onye, wee si otú a mụta ihe dị ukwuu site n’ihe nlereanya Jisọs setịpụrụ.—Ndị Hibru 12:1-3; 1 Pita 2:21.

12. Olee otú ozi ubi si anwale ọnọdụ ime mmụọ anyị?

12 Ule dị mma nke ọnọdụ ime mmụọ anyị bụ ozi ndị Kraịst. Iji nọgide n’ịgba àmà anyị n’usoro na ịgba àmà mberede, ọtụtụ mgbe n’agbanyeghị ndị na-achọghị ịma ma ọ bụ ndị mmegide, nkwali ziri ezi, ịhụ Chineke n’anya na ịhụ agbata obi n’anya, dị anyị mkpa. Otú ọ dị, ọ dịghị onye ọ na-adị mma ka a jụ ya, nke ahụ pụkwara ime n’ozi ubi anyị. Ma anyị kwesịrị icheta na ọ bụ ozi ọma ka a na-ajụ, ọ bụghị anyị dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu. Jisọs sịrị: “Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, unu mara na ọ kpọwo mụ onwe m asị mgbe ọ ka akpọghị unu asị. Ọ bụrụ na unu sitere n’ụwa, ụwa ga-ahụ ihe nke aka ya n’anya: ma n’ihi na unu esiteghị n’ụwa, kama mụ onwe m họpụtara unu n’ime ụwa, n’ihi nke a ụwa na-akpọ unu asị. . . . Ma ihe ndị a nile ka ha ga-eme unu n’ihi aha m, n’ihi na ha amataghị onye zitere m.”—Jọn 15:18-21.

Omume Ka Okwu Ọnụ Ike

13. Olee otú otu onye pụrụ isi mebie ọnọdụ ime mmụọ ezinụlọ?

13 Gịnị na-eme n’ime ezinụlọ ma ọ bụrụ na mmadụ nile e wezụga otu onye na-akwanyere ịdị ọcha na ịdị ụtọ n’anya nke ụlọ ùgwù? N’ụbọchị mmiri na-ezo, mmadụ nile e wezụga onye ahụ na-echezọkarị ihe na-elezi anya ịghara ibubata ụrọ n’ime ụlọ. Akara ụkwụ ụrọ ụrọ jupụtara ebe nile na-enye ihe àmà nke elezighị anya onye ahụ, na-akpatara ndị ọzọ ọrụ ka ukwuu. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’iji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe. Nanị otu onye na-achọ ọdịmma onwe ya nanị ma ọ bụ na-adịghị elezi anya pụrụ imetọsị aha ọma nke ezinụlọ. Mmadụ nile n’ezinụlọ ahụ, ọ bụghị nanị nne na nna, kwesịrị ịgbalịsi ike igosipụta ọnọdụ echiche Kraịst. Lee ka o si bụrụ ihe na-enye ume ndụ mgbe mmadụ nile na-arụkọ ọrụ ọnụ n’olileanya nke ndụ ebighị ebi! Ebe ezinụlọ ahụ tụkwasịrị uche ha bụ n’ihe ime mmụọ (ma ọ bụghị ezi omume onwe onye). Ọ na-esi ike ịhụ ihe ọ bụla nke na-egosi elezighị anya n’ime mmụọ n’ezinụlọ dị otú ahụ.—Eklisiastis 7:16; 1 Pita 4:1, 2.

14. Ọnwụnwa ndị dị aṅaa nke ihe onwunwe ka Setan na-etinye n’ụzọ anyị?

14 Anyị nile nwere mkpa anụ ahụ ndị bụ isi bụ́ ndị a na-aghaghị imeju iji kwadoo ndụ anyị kwa ụbọchị. (Matiu 6:11, 30-32) Ma ọtụtụ mgbe ihe ndị anyị nwere mmasị na ha na-ekpuchi ihe ndị dị anyị mkpa. Dị ka ihe atụ, usoro ihe Setan na-enye anyị ụdị ngwongwo dị iche iche. Ọ bụrụ na anyị na-achọsi ike inwe ndị kasị ọhụrụ nke ihe ọ bụla, ọ dịghị mgbe afọ ga-eju anyị, ebe ọ bụ na ngwa ngwa ihe kasị ọhụrụ na-aghọ ihe ochie, ihe ọzọ kasị bụrụ ọgbara ọhụrụ na-apụtakwa. Ụwa azụmahịa eguzobewo usoro na-enweghị nkwụsị. Ọ na-adọrọ mmasị anyị ịnọgide na-achụ ego ka ukwuu iji mejuo ihe mmasị ndị na-arị elu. Nke a pụrụ iduba ‘n’ọtụtụ agụụ ihe ọjọọ nke uche na-adịghị n’ime ha,’ ma ọ bụ ‘n’obi dị elu nke dị nzuzu na nke dị ize ndụ.’ Ọ pụrụ ịkpata ndụ na-anọghị n’ezi nguzo nke oge na-adịwanye nta maka ihe omume ime mmụọ.—1 Timoti 6:9, 10; The Jerusalem Bible.

15. N’ụzọ dị aṅaa ka ihe nlereanya nke onye isi ezinụlọ si dị mkpa?

15 N’ebe a kwa, ihe nlereanya onye isi ezinụlọ ndị Kraịst dị mkpa nke ukwuu. Àgwà ya a haziri nke ọma n’ebe ibu ọrụ nke ụwa na nke ime mmụọ dị kwesịrị ịkpali ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ. Ọ ga-abụ ihe na-emerụ ahụ n’ezie ma ọ bụrụ na nna ahụ enye ntụziaka okwu ọnụ magburu onwe ya ma ghara ịdị na-ebi ndụ n’onwe ya n’ụzọ kwekọrọ n’okwu ya. Ụmụaka pụrụ ịhụta ngwa ngwa ụzọ ndụ nke soro okwu ọnụ m, esola omume mụ ahụ. N’otu aka ahụ, onye okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi nke na-agba ndị ọzọ ume n’ozi ụlọ n’ụlọ ma ọ na-esi ike ya isonyere ezinụlọ ya n’ọrụ ahụ ga-aghọ ngwa ngwa onye a na-agaghịkwa atụkwasị obi, ma n’ime ezinụlọ ma n’ọgbakọ.—1 Ndị Kọrint 15:58; tụlee Matiu 23:3.

16. Ajụjụ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ ịjụ onwe anyị?

16 N’ihi ya, anyị pụrụ irite uru n’inyocha ndụ anyị. Inweta ihe ịga nke ọma n’ụwa ọ̀ na-eme ka anyị jiri ọrụ n’aka nke ukwuu wee leghara ọganihu ime mmụọ anya? Ànyị na-agbago agbago n’ụwa ma na-ala azụ n’ọgbakọ? Cheta ndụmọdụ Pọl: “Okwu a kwesịrị ntụkwasị obi, ọ bụrụ na onye ọ bụla na-agbaso ọnọdụ onye na-elekọta nzukọ Kraịst anya, agụụ ọrụ ọma na-agụ ya.” (1 Timoti 3:1) Mmetụta nke inwe ibu ọrụ n’ọgbakọ na-egosipụta ọnọdụ ime mmụọ anyị karịa mbuli n’ọkwá n’ụlọ ọrụ. A ghaghị inwe nguzo e ji nlezianya mee ka a ghara ikwe ka ndị were anyị n’ọrụ wekọrọ anyị dị ka ànyị raara onwe anyị nye ha, ọ bụghị nye Jehova.—Matiu 6:24.

Nkwurịta Okwu Dị Irè Na-akwalite Ọnọdụ Ime Mmụọ

17. Gịnị na-etinye ihe n’ịzụlite ezigbo ịhụnanya n’ime ezinụlọ?

17 Ọtụtụ nde ebe obibi taa aghọwo nnọọ ebe ịrahụ ụra. N’ụzọ dị aṅaa? Ndị òtù ezinụlọ na-abịa nanị ihi ụra na iri ihe, mapụkwa ọzọ. Ọ na-esiri ha ike ịnọdu gburugburu table wee rikọọ nri ọnụ. E nweghị mmetụta nke ịbụ ndị otù ezinụlọ. Gịnị ka ọ na-arụpụta? Enweghị nkwurịta okwu, enweghị mkparịta ụka ọ bụla pụtara ìhè. Nke ahụ pụkwara ime ka ndị ọzọ ghara inwe mmasị n’ebe ibe ha nọ, ma eleghị anya ghara inwe ezi nchegbu ọ bụla. Mgbe anyị hụrịtara ibe anyị n’anya, anyị na-ewepụta oge ikwurịta okwu na ige ntị. Anyị na-agba ume, anyị na-enyekwa aka. Akụkụ nke a nke ọnọdụ ime mmụọ gụnyere nkwurịta okwu dị mkpa n’etiti ndị di na nwunye na n’etiti ndị nne na nna na ụmụ.b Ọ na-ewe oge na akọ ka anyị na-eme ka ibe anyị kerịta ọṅụ, ahụmahụ, na nsogbu anyị nile.—1 Ndị Kọrint 13:4-8; Jemes 1:19.

18. (a) Gịnị na-abụkarị ihe mgbochi bụ isi maka nkwurịta okwu? (b) N’elu gịnị ka a na-ewukwasị mkpakọrịta dị irè?

18 Ezi nkwurịta okwu na-ewe oge na mgbalị. Ọ pụtara isetịpụ oge iji kwurịta okwu ma ṅarịta ntị. Otu n’ime ihe mgbochi ndị kasị ibu na nke a bụ ngwá ọrụ ahụ na-erikpọ oge nke nwere ọnọdụ a na-asọpụrụ n’ọtụtụ ebe obibi—bụ́ TV. Nke a na-eweta ihe ịma aka—TV ọ̀ na-achịkwa gị, ka ị̀ na-achịkwa ya? Ịchịkwa TV chọrọ mkpebi siri ike—gụnyere ike nke uche ịgbanyụ ya. Ma ime otú ahụ ga-emeghe ụzọ ka anyị chee ibe anyị ntị dị ka ndị òtù ezinụlọ na dị ka ụmụnna nwoke na nwanyị ime mmụọ. Mmekọrịta ndị bara uru chọrọ ezi nkwurịta okwu, ịmụta ịghọta ibe anyị, mkpa na ọṅụ anyị, ịgwarịta ibe anyị ụzọ anyị si nwee ekele maka ihe obi ọma ndị e mewooro anyị. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, nkwurịta okwu dị mkpa na-egosi na anyị adịghị ewere ndị ọzọ dị ka ndị na-adịghị mkpa.—Ilu 31:28, 29.

19, 20. Ọ bụrụ na anyị na-eche maka mmadụ nile nọ n’ezinụlọ, gịnị ka anyị ga-eme?

19 Ya mere, ọ bụrụ na anyị na-eche banyere ibe anyị n’ime ọnọdụ ezinụlọ—nke ahụ gụnyekwara iche maka ndị òtù ezinụlọ bụ́ ndị na-ekweghị ekwe—anyị ga-eme ihe dị ukwuu maka iwulite na ijigide ọnọdụ ime mmụọ anyị. N’ọnọdụ n’ezinụlọ, anyị ga na-agbaso ndụmọdụ Pita, bụ́: “Ma n’ikpeazụ, nwekọọnụ otu uche, unu nile, werenụ obi sorịta onwe unu hụkọọ ahụhụ, bụrụnụ ndị na-ahụ ụmụnna unu n’anya, ndị nwere obi ọmịiko, ndị nwere uche dị umeala: ndị na-adịghị ewere ihe ọjọọ nyeghachi n’ọnọdụ ihe ọjọọ, ma ọ bụ nkwutọ n’ọnọdụ nkwutọ; ma kama nke ahụ bụrụnụ ndị na-agọzi; n’ihi na ihe e ji kpọọ unu bụ nke a, ka unu wee keta ngọzi.”—1 Pita 3:8, 9.

20 Anyị pụrụ inwe ngọzi Jehova ugbu a ma ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike ijigide ọnọdụ ime mmụọ anyị, nke a pụkwara ịrụ ọrụ maka anyị iketa ngọzi ya n’ọdịnihu mgbe anyị ga-anata onyinye nke ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. E nwere ihe ndị ọzọ anyị pụrụ ime dị ka ezinụlọ iji nyerịtara ibe anyị aka n’ime mmụọ. Isiokwu na-esonụ ga-atụle uru dị iche iche nke imekọ ihe ọnụ dị ka ezinụlọ.—Luk 23:43; Mkpughe 21:1-4.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a A kọwara ọnọdụ ime mmụọ dị ka “mmetụta ma ọ bụ nrapara n’ụkpụrụ okpukpe: ọdịdị ma ọ bụ ọnọdụ nke ịbụ onye mmụọ nsọ na-achị.” (Webster’s Ninth New Collegiate Dictionary) Onye mmụọ nsọ na-achị dị iche site n’onye anụ ahụ na-achị, bụ́ onye dị ka anụ ọhịa.—1 Ndị Kọrint 2:13-16; Ndị Galetia 5:16, 25; Jemes 3:14, 15; Jud 19.

b Maka aro ndị ọzọ ná nkwurịta okwu ezinụlọ, lee Ụlọ Nche nke September 1, 1991, peji nke 20-22.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Gịnị bụ ọnọdụ ime mmụọ?

◻ Olee otú onye isi ezinụlọ pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya Kraịst?

◻ Olee otú anyị pụrụ isi zere ihe iyi egwu nye ọnọdụ ime mmụọ anyị?

◻ Gịnị pụrụ imebi ọnọdụ ime mmụọ ezinụlọ?

◻ N’ihi gịnị ka nkwurịta okwu dị irè ji dị mkpa?

[Foto dị na peeji nke 12]

Ịnọ n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na-eme ka ime mmụọ ezinụlọ sikwuo ike

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya