Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 4/1 p. 6-8
  • Ezinụlọ—Ihe Dị Mmadụ Mkpa!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ezinụlọ—Ihe Dị Mmadụ Mkpa!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ebe Obibi Bụ Ebe Nchebe
  • Inyere Ezinụlọ Gị Aka Ịlanarị
  • Echiche Ziri Ezi Banyere Ego
  • Abamuru nke Mmụta Bible
  • È Nwere Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ?
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Ezinụlọ Ndị Kraịst Na-emekọ Ihe Ọnụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Na-amụchinụ Okwu Chineke Anya Dị Ka Ezinụlọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Nwee Ọṅụ ná Ndụ Ezinụlọ
    Nwee Ọṅụ ná Ndụ Ezinụlọ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 4/1 p. 6-8

Ezinụlọ—Ihe Dị Mmadụ Mkpa!

ANA-ASỊ na ọha mmadụ dịruru mma nanị dị ka ezinụlọ ndị mejupụtara ya dị. Akụkọ ihe mere eme na-egosi na ka ndokwa ezinụlọ na-adakpọ, ike nke ógbè na mba dị iche iche na-ebelata. Mgbe omume rụrụ arụ mebiri ezinụlọ na Gris oge ochie, ọdịnala ya dakpọsịrị, na-eme ka ọ dịrị ndị Rom mfe imeri ya. Alaeze Ukwu Rom nọgidere na-esi ike ruo ogologo oge ezinụlọ dị iche iche nọgidere na-adị ike. Ma ka ọtụtụ narị afọ gafere, ndụ ezinụlọ esikwaghị ike, ike nke alaeze ukwu ahụ belatakwara. “Nchebe na mbuli elu nke ezinụlọ na nke ndụ ezinụlọ bụ ihe gbara ọkpụrụkpụ mmepeanya na-eweta, na ihe mgbaru ọsọ nke ụlọ ọrụ nile,” ka Charles W. Eliot, onye bụbu onyeisi oche nke Mahadum Harvard kwuru.

Ee, ezinụlọ bụ ihe dị mmadụ mkpa. O nwere mmetụta kpọmkwem ná nguzosi ike nke ọha na eze na ọdịmma nke ụmụaka na ọgbọ ndị na-abịa n’ihu. Obi abụọ adịghị ya na e nwere nnọọ ọtụtụ ndị nne na-anọghị na di na-arụsi nnọọ ọrụ ike ịzụlite ezi ụmụaka, e kwesịkwara ịja ha mma maka ịrụsi ọrụ ike ha. Otú ọ dị, ihe ọmụmụ na-egosi na ọ na-akara nnọọ ụmụaka mma ma ọ bụrụ na ha bi n’ezinụlọ nwere ma nne ma nna.

Otu ihe ọmụmụ e mere n’Australia nke ihe karịrị ndị na-eto eto 2,100 chọpụtara na “ndị nọ n’afọ iri na ụma sitere n’ezinụlọ kpaghasịrị akpaghasị nwere nsogbu ahụ ike karị, yikarịa ka ha ga-egosipụta ihe àmà nke nsogbu uche, yikarịa ka ha ga-enwe nnọọ mmekọahụ karịa ụmụaka sitere n’ezinụlọ ndị dịkọrọ ọnụ.” Otu ihe ọmụmụ nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ihe Ndekọ Ahụ Ike na United States duziri kpughere na ụmụaka sitere n’ezinụlọ tisasirị etisasị “yikarịrị ka ha nwere ohere dị pasent 20-30 inwe ihe ọghọm, pasent 40-70 ịgụgharị otu klas n’ụlọ akwụkwọ, na pasent 70 ịbụ ndị o yikarịri ka a ga-achụ n’ụlọ akwụkwọ.” Otu onye na-akọwa ụkpụrụ ime ihe na-akọ na “ụmụaka sitere n’ezinụlọ nwere nanị nne ma ọ bụ nna yikarịrị nnọọ ka ha ga-etinye aka na mpụ karịa ndị na-etolite n’ezinụlọ zuru ezu.”

Ebe Obibi Bụ Ebe Nchebe

Ndokwa ezinụlọ na-enye mmadụ nile ebe obibi obi ụtọ, nke na-ewuli elu, na nke dị ụtọ. “Isi iyi kasị mkpa nke obi ụtọ na ahụ ịdị mma abụghị ọrụ, ihe dị iche iche, ihe omume ntụrụndụ ma ọ bụ ndị enyi kama ọ bụ ezinụlọ,” ka otu onye ọnụ na-eru n’okwu na Sweden na-azọrọ.

Bible na-egosi na ezinụlọ ọ bụla n’ụwa malitere site n’aka Onye Okike Ukwu nke ezinụlọ, bụ́ Jehova Chineke, n’ihi na ọ bụ ya guzobere ndokwa ezinụlọ. (Jenesis 1:27, 28; 2:23, 24; Ndị Efesọs 3:14, 15) Otú ọ dị, n’Akwụkwọ Nsọ sitere n’ike mmụọ nsọ, Pọl onyeozi buru amụma banyere ajọ mwakpo a ga-awakpo ezinụlọ, na-akpata ndakpọ nke omume ọma na ọha mmadụ na-anọghị n’ọgbakọ ndị Kraịst. O kwuru na a ga-eji eguzosighị ike n’ihe, ‘ihe mmadụ ibe atọghị ụtọ,’ na ekwenyeghịrị nne na nna, ọbụna n’etiti ndị “na-enwe ụdị nke nsọpụrụ Chineke,” kaa “mgbe ikpeazụ” akara. Ọ gbara ndị Kraịst ume ịgbakụta ndị dị otú ahụ azụ. Jisọs buru amụma na mmegide a ga-emegide eziokwu Chineke ga-ekewa ezinụlọ.—2 Timoti 3:1-5; Matiu 10:32-37.

Otú ọ dị, Chineke ahapụbeghị anyị n’enweghị enyemaka. N’Okwu ya, e nyere ọtụtụ ndụmọdụ metụtara mmekọrịta ezinụlọ. Ọ na-agwa anyị otú anyị pụrụ isi mee ka ezinụlọ gaa nke ọma na ime ebe obibi anyị ebe obi ụtọ bụ́ ebe onye òtù ọ bụla nke ezinụlọ nwere ihe ọ ga-emere ndị ọzọ.a—Ndị Efesọs 5:33; 6:1-4.

Ọ̀ pụrụ ikwe mee inweta mmekọrịta obi ụtọ dị otú ahụ n’ụbọchị ndị a a na-eyi ezinụlọ egwu n’ụzọ siri ike? Eenụ! Ị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ime ka ezinụlọ gị bụrụ ebe e nwere mmiri dị mma, dị ụtọ, nke na-enye ume ọhụrụ n’ime ụwa a nke siri ike, yiri ọzara. Ma nke a chọrọ ihe n’aka mmadụ nile nọ n’ime ezinụlọ. Ihe na-esonụ bụ aro ụfọdụ.

Inyere Ezinụlọ Gị Aka Ịlanarị

Otu n’ime ụzọ ndị kasị mma ezinụlọ pụrụ isi dịrị n’otu bụ site n’ịdị na-anọkọrịta ọnụ. Ndị òtù nile kwesịrị iji obi ha nile kerịta oge ntụrụndụ ha. Nke ahụ pụrụ ịpụta ịchụ àjà. Dị ka ihe atụ, unu ndị nọ n’afọ iri na ụma, pụrụ ịchụ usoro ihe omume TV ụfọdụ kasị amasị unu, egwuregwu, ma ọ bụ isoro ndị enyi mee mkpapụ n’àjà. Unu ndị bụ́ nna, bụ́ ndị bụ isi na-akpata nri, ejila oge ntụrụndụ mee ihe maka nanị ihe omume ntụrụndụ ma ọ bụ mmasị onwe onye ndị ọzọ. Soro ezinụlọ gị mee atụmatụ ihe omume dị iche iche, ikekwe otú a ga-esi jiri ngwụsị izu ma ọ bụ oge ezumike mekọọ ihe ọnụ. Otú ọ dị, mee atụmatụ ihe mmadụ nile ga-elepụ anya maka ya ma nụ ụtọ ya.

Ụmụaka chọrọ ihe karịrị ihe a na-akpọ oge dị mma, ya bụ, ọkara hour ma ọ bụ karịa e setịpụrụ isoro ụmụaka nọrịa site n’oge ruo n’oge. Ha chọrọ oge buru ibu. Otu onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’otu akwụkwọ akụkọ Sweden dere, sị: “N’afọ 15 m dị ka onye nta akụkọ, ezutewo m ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị na-eto eto na-enupụ isi . . . Otu ọnọdụ ha nile nwere bụ na e kpughere ha nye ụdị nzụlite nke oge dị mma: ‘Ndị mụrụ m enweghị ohere.’ ‘Ha anaghị ege ntị ma ọlị.’ ‘Nna m na-eme njem mgbe nile.’ . . . Dị ka nne ma ọ bụ nna ị pụrụ ịhọrọ mgbe nile otú oge gị na nwa gị ga-eji nọrịa ga-ahadebe. A ga-atụle nhọrọ gị mgbe afọ 15 gasịrị site na nwa afọ 15 obi tara mmiri.”

Echiche Ziri Ezi Banyere Ego

Ndị òtù nile nke ezinụlọ kwesịkwara ịzụlite echiche ziri ezi banyere ego. Ha kwesịrị ịdị njikere ịtụkọta ihe ha nwere ike ya iji kwụọ ego mmefu nke ezinụlọ. Ọtụtụ ndị inyom aghaghị inweta ọrụ iji kpata ihe e ji ebi ndụ, ma unu ndị bụ́ nwunye kwesịrị ịmara ihe ize ndụ na ọnwụnwa ndị unu pụrụ izute. Ụwa a na-agba gị ume ‘ijizu ikike gị mee ihe’ na “ime ihe ndị masịrị gị.” Ọ pụrụ ime gị ka ị ghọọ onye nweere onwe ya, na-enweghịkwa afọ ojuju n’ọrụ Chineke nyere gị dị ka nne na odozi ụlọ.—Taịtọs 2:4, 5.

Ọ bụrụ na unu ndị bụ́ nne pụrụ ịnọ n’ụlọ ma bụrụ ndị nduzi na enyi ụmụ unu, ọ ga-atụnye ụtụ n’ụzọ pụtara ìhè n’ezie n’iwulite nkekọ siri ike ndị ga-enye aka ijikọta ezinụlọ gị ọnụ n’agbanyeghị ihe isi ike nile. Nwanyị pụrụ ịtụnye ụtụ dị ukwuu n’ime ka ebe obibi bụrụ nke obi ụtọ, dị nchebe, na-akwalite ọganihu. “Ọ na-ewe otu narị ndị ikom ịma ụlọ ntu, ma otu nwanyị pụrụ ime ebe obibi,” ka otu onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị narị afọ nke 19 kwuru.

Ọ bụrụ na ndị nile nọ n’ezinụlọ ejikọta aka ọnụ ibi ndụ dị ka ego ezinụlọ ahụ na-akpata hà, ọ ga-eme ka ezinụlọ ahụ ghara inwe ọtụtụ nsogbu. Di na nwunye kwesịrị ikwekọrịta ibi ndụ dị mfe ma bute ọdịmma ime mmụọ ụzọ. Ụmụ kwesịrị ịmụta inwe afọ ojuju, ọ bụghị ịdị na-achọ ihe ndị atụmatụ mmefu ego ezinụlọ na-apụghị ịkwado. Lezie anya maka ihe na-agụ anya! Ọnwụnwa nke ịzụ ihe ndị ị na-enweghị ego ha, ịba n’ụgwọ, edugawo ọtụtụ ezinụlọ ná ndakpọ. Ọ pụrụ ịdị mma maka ịdị n’otu ezinụlọ ma ọ bụrụ na mmadụ nile atụkọta ego ha ọnụ iji gbakọta aka mee ihe—njem na-enye ume ọhụrụ, ngwá ọrụ bara uru ma na-enye ọṅụ maka ebe obibi, ma ọ bụ ụtụ iji kwadoo ọgbakọ ndị Kraịst.

Ụdị ọzọ nke “ụtụ” nye mmụọ nke obi ụtọ ezinụlọ nke ndị òtù nile nke ezinụlọ kwesịrị ịtụ bụ ikere òkè n’ọrụ nhicha na ndozi—ilekọta ụlọ, ubi, ụgbọala, na ihe ndị ọzọ. A pụrụ ikenye onye òtù ọ bụla nke ezinụlọ, ọbụna ụmụaka, akụkụ ụfọdụ nke otu ọrụ. Unu ndị bụ́ ụmụ, gbalịanụ ịghara ịla oge unu n’iyi. Kama nke ahụ, zụlitenụ mmụọ nke inyeaka na mgbakọta aka; nke a ga-arụpụta ezi ọbụbụenyi na mkpakọrịta, bụ́ nke na-ewulite ịdị n’otu ezinụlọ.

Abamuru nke Mmụta Bible

N’ezinụlọ ndị Kraịst dị n’otu, a na-emesikwa ịdị mkpa nke ọmụmụ Bible chiri anya ike. Ntụle nke akụkụ Bible kwa ụbọchị na ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ kwa izu na-enye ihe ndabere maka ezinụlọ dị n’otu. E kwesịrị ịtụlekọ eziokwu Bible na ụkpụrụ ndị bụ isi ọnụ n’ụzọ na-akpali obi nke ndị nile nọ n’ezinụlọ.

Oge ọmụmụ ihe ezinụlọ ndị dị otú ahụ kwesịrị ịbụ nke na-akụzi ihe ma n’otu oge ahụ dị ụtọ, na-agbakwa ume. Otu ezinụlọ nọ n’ebe ugwu nke Sweden na-agwakarị ụmụ ha ka ha detuo ajụjụ ndị bilitere n’izu. A na-atụlezi ajụjụ ndị a n’ọmụmụ Bible kwa izu. Ajụjụ ndị ahụ na-emikarị emi, na-akpalikwa iche echiche ma na-abụ ngosipụta nke ike iche echiche na nghọta nke ozizi Bible nke ụmụaka ahụ. Ụfọdụ ajụjụ ha bụ: “Jehova ọ̀ na-eme ka ihe nile na-eto mgbe nile, ka ò mere ya nanị otu ugbo?” “N’ihi gịnị ka Bible ji na-asị na Chineke kere mmadụ ‘n’onyinyo ya’ ebe ọ bụ na Chineke abụghị mmadụ?” “Oyi ọ̀ tụgbughị Adam na Iv n’oge oyi na Paradaịs ahụ ebe ọ bụ na ha gba ụkwụ ọtọ, ha eyighịkwa uwe ọ bụla?” “N’ihi gịnị ka ọnwa ji dị anyị mkpa n’abalị ebe ọ bụ na ọchịchịrị kwesịrị ịgba?” Ụmụaka ahụ etowo ugbu a, na-ejekwara Chineke ozi dị ka ndị ozi oge nile.

Mgbe unu na-edozi nsogbu ezinụlọ, unu ndị mụrụ ụmụ ga-eme nke ọma ịgbalị inwe echiche ziri ezi na ihu ọchị. Na-echebaranụ ndị ọzọ echiche ma na-eme mgbanwe, ma na-eguzosi ike, mgbe a bịara n’ihe banyere ịgbaso ụkpụrụ ndị dị mkpa. Mee ka ụmụaka hụ na ịhụnanya n’ebe Chineke na ụkpụrụ ya ziri ezi nọ na-achịkwa mkpebi gị nile. Ogige ụlọ akwụkwọ na-abụkarị nke jupụtara ná nrụgide ma na-akụda mmụọ, agbamume dị ukwuu dịkwa ụmụaka mkpa n’ebe obibi iji gbasoo mmetụta dị otú ahụ mgba.

Ndị mụrụ ụmụ, unu emela ka unu zuru okè. Kweta ihie ụzọ unu ma rịọ ụmụ unu mgbaghara mgbe ọ dị mkpa. Ndị na-eto eto, mgbe Mama na Papa kwetara ihe ha mehiere, hụkwuonụ ha n’anya.—Eklisiastis 7:16.

Ee, ezinụlọ dị n’otu na-eme ka e nwee ebe obibi nke udo, nke dị nchebe, na nke obi ụtọ. Onye Germany na-ede uri bụ́ Goethe kwuru n’otu mgbe, sị: “Ọ bụ ya kasị nwee obi ụtọ, eze ma ọ bụ onye nọ n’ọkwá dị ala, bụ́ onye na-enweta obi ụtọ ya n’ebe obibi.” Nye nne na nna na ụmụ ndị nwere ekele, e kwesịghị inwe ebe dị ka ebe obibi.

N’eziokwu, nrụgide nke ụwa nke anyị bi na ya na-eyi ezinụlọ egwu n’ụzọ siri ike taa. Ma ebe ọ bụ na ezinụlọ sitere n’aka Chineke, ọ ga-alanarị. Ezinụlọ gị ga-alanarị, gị onwe gị kwa ga-alanarị ma ọ bụrụ na ị gbasoo ụkpụrụ nduzi ezi omume Chineke maka ndụ ezinụlọ obi ụtọ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Maka inwetakwu ihe ọmụma n’isiokwu a, lee akwụkwọ ahụ dị peji 192 bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya