Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 7/1 p. 13-17
  • Na-amụchinụ Okwu Chineke Anya Dị Ka Ezinụlọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-amụchinụ Okwu Chineke Anya Dị Ka Ezinụlọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nzube Ndị A Ga-eburu n’Uche
  • Jirinụ Ngwá Ọrụ Ndị E Ji Akụzi Ihe Mee Ihe n’Ụzọ Amamihe
  • Meenụ Ka O Kwekọọ ná Mkpa nke Ezinụlọ Unu
  • Ụgwọ Ọrụ Ndị Na-esite n’Ịnọgidesi Ike
  • Ọmụmụ Ihe Ezinụlọ nke Na-eweta Ọṅụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Usoro Ihe Omume Ezinụlọ—Ọmụmụ Ihe Ezinụlọ
    Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Ibu Ibu Ọrụ Maka Nlekọta Ezinụlọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ezinụlọ, Toonụ Chineke Dị Ka Akụkụ nke Ọgbakọ Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 7/1 p. 13-17

Na-amụchinụ Okwu Chineke Anya Dị Ka Ezinụlọ

“Ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ okwu nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Chineke pụta.”—MATIU 4:4.

1. Gịnị ka Bible na-ekwu banyere ibu ọrụ ndị isi ezinụlọ ịkụziri ụmụ ha ụzọ nile nke Jehova?

JEHOVA CHINEKE nyere ndị isi ezinụlọ ihe ncheta ugboro ugboro banyere ibu ọrụ ha ịkụziri ụmụ ha ihe. Ntụziaka dị otú ahụ ga-akwadebe ụmụaka maka ndụ ha dị ugbu a, ọ pụkwara inye aka ịkwadebe ha maka ndụ nke na-abịanụ. Otu mmụọ ozi nke na-anọchite anya Chineke kọwaara Abraham ibu ọrụ ya ịkụziri ezinụlọ ya ihe ka ha wee “debe ụzọ Jehova.” (Jenesis 18:19) A gwara ndị nne na nna bụ́ ndị Israel ka ha kọwaara ụmụ ha otú Chineke si napụta Israel n’aka Ijipt na otú o si nye ha Iwu ya n’Ugwu Saịnaị, nke dị na Horeb. (Ọpụpụ 13:8, 9; Deuterọnọmi 4:9, 10; 11:18-21) A dụrụ ndị Kraịst bụ́ ndị isi ezinụlọ ọdụ ịzụpụta ụmụ ha “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Ọ bụrụgodị na ọ bụ nanị nne ma ọ bụ nna na-ejere Jehova ozi, o kwesịrị ịgbalịsi ike ịkụziri ụmụ ya ụzọ nile nke Jehova.—2 Timoti 1:5; 3:14, 15.

2. Ọmụmụ ihe ezinụlọ ọ̀ dị mkpa ma ọ bụrụ na e nweghị ụmụaka n’ụlọ? Kọwaa.

2 Nke a apụtaghị na ọ bụ nanị ezinụlọ ndị nwere ụmụaka ka ọ dịịrị ịmụ Okwu Chineke. Mgbe di na nwunye na-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ ọbụna ma a sị na ha enweghị ụmụaka, nke a na-egosipụta ezi ekele maka ihe ime mmụọ.—Ndị Efesọs 5:25, 26.

3. N’ihi gịnị ka inwechi ọmụmụ ihe ezinụlọ anya ji dị mkpa?

3 Iji rụzuo ihe kasị mma, ọ dị mkpa ka a na-enyechi ntụziaka anya, n’ikwekọ n’ihe mmụta Jehova kụziiri ụmụ Israel n’ọzara: “Ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ ihe nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta ka mmadụ ga-eji dị ndụ.” (Deuterọnọmi 8:3) Na-adabere n’ọnọdụ ndị ezinụlọ nọ na ha, ezinụlọ ụfọdụ pụrụ ime ndokwa ịdị na-amụ ihe kwa izu; ndị ọzọ pụrụ ịdị na-enwe nnọkọ ọmụmụ ihe ka mkpirikpi kwa ụbọchị. N’agbanyeghị ndokwa ọ bụla unu họọrọ, unu ekwela ka ọmụmụ ihe ahụ bụrụ ná ndapụta. ‘Zụchapụtaranụ ya oge.’ Ihe ọ bụla ọ na-efu iji wepụta oge dị otú ahụ abụghị ihe lara n’iyi. O metụtara ndụ ndị òtù ezinụlọ unu.—Ndị Efesọs 5:15-17; Ndị Filipaị 3:16.

Nzube Ndị A Ga-eburu n’Uche

4, 5. (a) Gịnị ka Jehova si n’ọnụ Mosis gwa ndị nne na nna dị ka nzube dị mkpa n’ịkụziri ụmụaka ihe? (b) Gịnị ka nke ahụ na-agụnye taa?

4 Mgbe unu na-eduzi ọmụmụ ihe ezinụlọ, ọ ga-arụpụta ezi ihe karị ma ọ bụrụ na unu eburu nzube ndị doro anya n’uche. Tụlee ihe ole na ole a pụrụ ime.

5 Mgbe ọ bụla unu na-amụ ihe, gbalịanụ ịkwalite ịhụnanya maka Jehova Chineke. Ka ụmụ Israel gbakọrọ n’ọzara nke Moab, tupu ha abanye n’Ala Nkwa ahụ, Mosis dọọrọ uche ha gaa n’ihe Jisọs Kraịst ga-emesị kọwaa dị ka “ihe dị ukwuu nke e nyere n’iwu n’ime iwu [ahụ].” Gịnị ka ọ bụ? “Ị ga-ewerekwa obi gị nile, werekwa mkpụrụ obi gị nile, werekwa ike gị nile, hụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya.” (Matiu 22:36, 37; Deuterọnọmi 6:5) Mosis gbara ụmụ Israel ume ịkụnye nke a n’obi ha na ịkụziri ya ụmụ ha. Nke ahụ ga-achọ ka a na-ekwughachi ya, na-adọrọ uche gaa n’ihe ndị mere a ga-eji hụ Jehova n’anya, ime ihe banyere àgwà na omume ndị pụrụ igbochi ngosipụta nke ịhụnanya dị otú ahụ, na igosipụta ịhụnanya maka Jehova ná ndụ ha. Ntụziaka dị otú ahụ ọ̀ dị ụmụ anyị mkpa? Ee! Enyemaka dịkwa ha mkpa iji ‘bie obi ha úgwù,’ ya bụ, iwepụ ihe ọ bụla nke ga-egbochi ha ịhụ Chineke n’anya. (Deuterọnọmi 10:12, 16; Jeremaịa 4:4) Ọchịchọ maka ihe nke ụwa nakwa maka ohere nke imikpu n’ihe omume ya dị iche iche pụrụ iso n’ime ihe mgbochi ndị dị otú ahụ. (1 Jọn 2:15, 16) Ịhụnanya maka Jehova aghaghị ịbụ nke nọ n’ọrụ, nke a na-egosipụta egosipụta, na-akpali anyị ime ihe ndị na-atọ Nna anyị nke eluigwe ụtọ. (1 Jọn 5:3) Ka ọmụmụ ihe ezinụlọ unu wee nwee abamuru ndị na-adịte anya, e kwesịrị iduzi nnọkọ nke ọ bụla n’ụzọ na-ewusi ịhụnanya a ike.

6. (a) Gịnị ka a chọrọ iji kụnye ezi ihe ọmụma? (b) Olee otú Akwụkwọ Nsọ si emesi ịdị mkpa nke ezi ihe ọmụma ike?

6 Kụnyenụ ezi ihe ọmụma nke ihe Chineke na-achọ. Gịnị ka nke ahụ na-agụnye? Ọ na-agụnye ihe karịrị inwe ike ịgụpụta azịza site na magazin ma ọ bụ akwụkwọ. Ọ na-achọkarị nkwurịta okwu iji jide n’aka na a ghọtara okwu na echiche ndị bụ́ isi nke ọma. Ezi ihe ọmụma bụ isi ihe dị mkpa n’iyikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ, n’ilekwasị anya n’ihe ndị dị mkpa n’ezie mgbe a na-edozi nsogbu ná ndụ, n’ihi ya kwa n’ime ihe na-atọ Chineke ụtọ n’ezie.—Ndị Filipaị 1:9-11; Ndị Kọlọsi 1:9, 10; 3:10.

7. (a) Ọ̀ bụ iji ajụjụ ndị dị aṅaa eme ihe pụrụ inyere ezinụlọ aka ịtụle ụzọ dị irè a pụrụ isi tinye ihe a na-amụ n’ọrụ? (b) Olee otú Akwụkwọ Nsọ si emesi uru nke ebumnobi dị otú ahụ ike?

7 Nyerenụ ha aka ịtụle ụzọ dị irè a pụrụ isi tinye ihe a na-amụ n’ọrụ. N’iburu nzube a n’uche, mgbe ọ bụla a na-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ, jụọnụ, sị: ‘Olee otú ihe ọmụmụ a kwesịrị isi metụta ndụ anyị? Ọ̀ chọrọ ka anyị mee mgbanwe ọ bụla n’ihe anyị na-eme ugbu a? N’ihi gịnị ka o ji kwesị ka anyị mee mgbanwe?’ (Ilu 2:10-15; 9:10; Aịsaịa 48:17, 18) Ileba anya nke ọma n’ụzọ dị irè a pụrụ isi tinye ihe a mụtara n’ọrụ pụrụ ịbụ akụkụ dị mkpa n’uto ime mmụọ nke ndị òtù ezinụlọ.

Jirinụ Ngwá Ọrụ Ndị E Ji Akụzi Ihe Mee Ihe n’Ụzọ Amamihe

8. Ngwá ọrụ ndị dị aṅaa maka ọmụmụ Bible ka òtù ohu ahụ wepụtaworo?

8 “Ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” ewepụtawo ngwá ọrụ bara ụba a pụrụ iji mụọ ihe. E nwere magazine Ụlọ Nche, bụ́ nke e ji amụ Bible, n’asụsụ 131. E nwere akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’asụsụ 153, broshuọ n’asụsụ 284, kaseti ndị a na-ege ege n’asụsụ 61, kaseti vidio n’asụsụ 41, ọbụnadị usoro ihe omume kọmpụta nke e ji enyocha Bible, n’asụsụ 9!—Matiu 24:45-47.

9. Olee otú anyị pụrụ isi tinye ndụmọdụ dị n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e zoro aka na ha na paragraf a n’orụ mgbe anyị na-enwe ọmụmụ ihe Ụlọ Nche nke ezinụlọ?

9 Ọtụtụ ezinụlọ na-eji oge ọmụmụ ihe ezinụlọ akwadebe maka Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche nke ọgbakọ. Lee ka nke ahụ pụrụ isi bụrụ ihe na-enye aka! Ụlọ Nche nwere nri ime mmụọ ndị bụ́ isi a kwadebere iji wulie ndị Jehova elu n’ụwa nile. Mgbe unu na-amụ Ụlọ Nche dị ka ezinụlọ, meenụ ihe karịrị ịgụpụta paragraf na ịza ajụjụ ndị e biri ebi. Chọsienụ nghọta ike. Wepụtanụ oge iji tụlee akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e zoro aka na ha bụ́ ndị a na-ehotaghị. Kpọọnụ ndị òtù ezinụlọ òkù ikwu otú akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ahụ si metụta ihe e kwuru na paragraf ahụ a na-atụle. Tinyenụ obi unu n’ihe a na-amụ.—Ilu 4:7, 23; Ọrụ 17:11.

10. Gịnị ka a pụrụ ime iji mee ka ụmụaka tinye ọnụ n’ọmụmụ ihe ahụ na iji mee ka ọ bụrụ oge na-enye ọṅụ nye ha?

10 Ọ bụrụ na unu nwere ụmụaka n’ezinụlọ unu, gịnị ka unu pụrụ ime iji mee ka ọmụmụ ihe unu ghara ịbụ nanị ihe ezinụlọ ji emezu iwu kama oge na-ewuli elu, nke na-akpali mmasị, na nke obi ụtọ? Gbalịanụ iji ụzọ kwesịrị ekwesị mee ka onye nke ọ bụla tinye ọnụ, ka uche ha wee dịrị n’ihe a na-amụ. N’ebe o kwere mee, meenụ ndokwa ka nke ọ bụla n’ime ụmụ unu nwee Bible nke ya na magazin a na-amụ. N’iṅomi ịhụnanya nke Jisọs gosipụtara, nne ma ọ bụ nna pụrụ ime ka obere nwa ya nọrọ ya nso, ikekwe na-ekonye nwa ahụ aka. (Tụlee Mak 10:13-16.) Onyeisi ezinụlọ pụrụ ịgwa onye na-eto eto ka ọ kọwaa ihe osise dị n’ihe ọmụmụ ahụ. Tupu oge eruo, a pụrụ ikenye obere nwa ịgụ otu akụkụ akwụkwọ nsọ. A pụrụ ikenye onye nke katụ mee okenye ikwu ohere ndị a pụrụ iji tinye ihe ahụ a na-amụ n’ọrụ n’ụzọ dị irè.

11. Olee ngwá ọrụ ndị ọzọ e wepụtarala maka izi ihe, n’ebe ndị e nwekwara ha, olee otú a pụrụ isi jiri ha mee ihe n’ụzọ bara uru n’ihe metụtara ọmụmụ ihe ezinụlọ?

11 Ọ bụ ezie na unu pụrụ ịdị na-eji Ụlọ Nche eme ihe dị ka ihe ndabere maka nkwurịta okwu unu, unu echezọla ngwá ọrụ ndị ọzọ e ji amụ ihe bụ́ ndị dị n’ọtụtụ asụsụ. Ọ bụrụ na a chọrọ ihe ọmụma banyere ebe e si nweta otu okwu Bible ma ọ bụ nkọwa ya, a pụrụ ịchọta ya n’Insight on the Scriptures. A pụrụ inweta azịza nye ajụjụ ndị ọzọ site n’ile na Watch Tower Publications Index ma ọ bụ site n’iji usoro ime nnyocha kọmputa nke Society wepụtara mee ihe. Ịmụta iji ngwá ọrụ ndị a eme ihe, ma ọ bụrụ na e nwere ha n’asụsụ unu, pụrụ ịbụ akụkụ bara uru nke ọmụmụ ihe ezinụlọ. Ná nzube nke ịkpali mmasị nke ụmụaka, unu pụkwara iji ụfọdụ n’ime oge ọmụmụ ihe unu kirie otu akụkụ nke otu n’ime vidio Society bụ́ ndị na-akụzi ihe ma ọ bụ gee otu akụkụ nke ihe nkiri dị na kaseti a na-ege ege ma kwurịtazie banyere ya. Iji ngwá ọrụ ndị a e ji amụ ihe na-eme ihe nke ọma pụrụ inye aka ime ka ọmụmụ ihe ezinụlọ unu dị ụtọ ma baara ezinụlọ unu dum uru.

Meenụ Ka O Kwekọọ ná Mkpa nke Ezinụlọ Unu

12. Olee otú ọmụmụ ihe ezinụlọ pụrụ isi rụọ ọrụ n’igbo mkpa ezinụlọ ndị chọrọ ime ihe ngwa ngwa?

12 Ọ pụrụ ịbụ na ezinụlọ unu na-amụkarị isiokwu Ụlọ Nche dịịrị ọmụmụ maka izu ahụ. Marakwanụ nsogbu na echiche ezinụlọ unu nwere n’oge ahụ. Ọ bụrụ na nne adịghị arụ ọrụ ego, ọ pụrụ inwe ike iso ụmụ ya na-anọkọ kwa ụbọchị mgbe ha lọtara akwụkwọ. A pụrụ ime ihe banyere ọnọdụ ụfọdụ mgbe ahụ; ndị ọzọ pụrụ ịdị mkpa ka e lebakwuoro ha anya. Mgbe ezinụlọ nwere mkpa ndị chọrọ ka e lebara ha anya ngwa ngwa, unu elegharala ha anya. (Ilu 27:12) Ha pụrụ ịgụnye ọ bụghị nanị nsogbu ndị a na-enwe n’ụlọ akwụkwọ kamakwa ọnọdụ ndị ọzọ. Họrọnụ ihe ọmụmụ kwesịrị ekwesị, tupu oge eruokwa, meenụ ka ezinụlọ mara ihe a ga-amụ.

13. N’ihi gịnị ka nkwurịta okwu ezinụlọ banyere ụzọ e si anagide ịda ogbenye pụrụ iji baa uru?

13 Dị ka ihe atụ, ịda ogbenye na-akpa akụkụ dị ukwuu nke ụwa aka ọjọọ; ya mere n’ọtụtụ ebe, ọ pụrụ ịdị mkpa ikwurịta otú a pụrụ isi nagide ya. Ọmụmụ ihe ezinụlọ nke hiwere isi n’ihe ndị na-eme eme nakwa n’ụkpụrụ Bible ọ̀ ga-abara ezinụlọ unu uru?—Ilu 21:5; Eklisiastis 9:11; Ndị Hibru 13:5, 6, 18.

14. Olee ọnọdụ ndị pụrụ ime ka ezinụlọ ikwurịta ihe bụ echiche Jehova banyere ime ihe ike, agha, na nnọpụiche ndị Kraịst bụrụ nke e kwuru n’oge ya?

14 Ime ihe ike bụ ihe ọzọ kwesịrị ka e kwurịta. Ọ dị anyị nile mkpa ịbụ ndị a kụbanyesiri echiche Jehova ike n’uche na n’obi anyị. (Jenesis 6:13; Abụ Ọma 11:5) Ọmụmụ ihe ezinụlọ nke metụtara isiokwu a pụrụ ịbụ ohere dị mma maka ikwurịta otú a pụrụ isi na-emeso ndị ọchọ okwu ihe n’ụlọ akwụkwọ, ma à ga-anara ọzụzụ n’ịgba karat, na otú a ga-esi họrọ ntụrụndụ kwesịrị ekwesị. Ọgụ ihe ike aghọọla ihe a na-ahụkarị; ma ọ́ bụghị agha obodo, esemokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ nke agbụrụ, ọ bụrụ agha òtù ndị omempụ, na-eti ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mba nile ihe otiti. N’ihi ya, ọ pụrụ ịdị ezinụlọ unu mkpa ikwurịta banyere ịnọgide na-enwe àgwà ndị Kraịst mgbe ìgwè ndị na-alụrịta agha gbara ha gburugburu.—Aịsaịa 2:2-4; Jọn 17:16.

15. Olee otú e kwesịrị isi nye ụmụaka ntụziaka banyere mmekọahụ na alụmdi na nwunye?

15 Ka ụmụaka na-etolite, ntụziaka kwesịrị afọ ndụ ha banyere mmekọahụ na alụmdi na nwunye, dị ha mkpa. N’ọtụtụ ebe, ihe ka ọtụtụ ná ndị nne na nna adịghị eso ụmụ ha ekwurịta banyere mmekọahụ ma ọlị. Ụmụaka na-amaghị nke a na-akọ pụrụ inweta echiche gbagọrọ agbagọ site n’aka ndị ntorobịa ndị ọzọ, ọ pụkwara ịkpata ọdachi. Ọ́ gaghị aka mma iṅomi Jehova, bụ́ onye na-enye ndụmọdụ doro anya ma dị mma banyere okwu a n’ime Bible? Ndụmọdụ Chineke ga-enyere ụmụ anyị aka ịnọgide na-enwe ùgwù onwe onye na imeso ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha ihe n’ụzọ nkwanye ùgwù. (Ilu 5:18-20; Ndị Kọlọsi 3:5; 1 Ndị Tesalọnaịka 4:3-8) Ọ bụrụgodị na unu ekwurịtaworị ihe ndị a, unu alala azụ ikwughachi ha. Ka ọnọdụ ndị ọhụrụ na-ebilite, ọ na-adị mkpa ikwughachi ihe.

16. (a) Olee mgbe ezinụlọ dị iche iche ji enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ? (b) Olee otú unu siworo merie ihe mgbochi iji na-enwechi ọmụmụ ihe ezinụlọ anya?

16 Olee mgbe a pụrụ inwe ọmụmụ ihe ezinụlọ? N’iṅomi ezinụlọ Betel ndị e nwere gburugburu ụwa, ọtụtụ ezinụlọ na-edokwa ọmụmụ ihe ezinụlọ ha n’uhuruchi Monday. Ndị ọzọ na-eme ya mgbe dị iche. N’Argentina otu ezinụlọ dị mmadụ 11, nke gụnyere ụmụaka 9, na-eteta ụra n’elekere anya ise nke ụtụtụ kwa ụbọchị iji nwee ọmụmụ ihe ezinụlọ ha. N’ihi ndokwa ọrụ dịgasị iche, ọ dịghị mgbe ọzọ ha pụrụ ime ya. Ọ dịghị mfe, ma ọ kụnyere ịdị mkpa nke ọmụmụ ihe ezinụlọ n’uche na n’obi ụmụaka ahụ. Na Philippines, otu onye okenye so nwunye ya na ụmụ ha atọ na-enwechi ọmụmụ ihe ezinụlọ anya ka ụmụaka ahụ nọ na-etolite. N’ime izu, nne na nna ahụ na-esokwa nke ọ bụla n’ime ụmụ ha na-amụ ihe ka nke ọ bụla n’ime ha wee mee ka eziokwu ahụ bụrụ nke ya. Na United States, otu nwanna nwanyị nke di ya na-abụghị Onyeàmà na-eji ụkwụ kpọrọ ụmụ ya gaa n’ebe ha ga-anọ banye bọs ụlọ akwụkwọ kwa ụtụtụ. Ka ha na-echere bọs, ha na-eji ihe dị ka minit iri na-agụ ma na-ekwurịta ihe ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ kwesịrị ekwesị, mgbe ahụkwa nwanyị ahụ na-ekpe ekpere dị mkpirikpi tupu ụmụ ya abanye bọs. Na Democratic Republic of Congo, otu nwanyị nke di ya na-ekweghị ekwe gbahapụrụ ezinụlọ ha aghaghị itinye mgbalị siri ike n’ịmụ ihe n’ihi ịbụ onye nwere agụmakwụkwọ dị nta. Nwa ya nwoke nke toworo eto na-enye aka site n’ileta ezinụlọ ahụ kwa izu iji duzie ọmụmụ ihe nke na-agụnye nne ya na ụmụnne ya ndị nwoke ọ tọrọ. Nne ha na-esetịpụ ezi ihe nlereanya site ná nkwadebe ọ na-eji ịdị uchu eme. È nwere ọnọdụ ụfọdụ na-eme ka inwechi ọmụmụ ihe ezinụlọ anya na-esiri ezinụlọ unu ike? Ike agwụla unu. Chọsienụ ngọzi Jehova ike ná mgbalị ndị unu na-eme iji na-enwechi ọmụmụ Bible anya.—Mak 11:23, 24.

Ụgwọ Ọrụ Ndị Na-esite n’Ịnọgidesi Ike

17. (a) Gịnị ka a chọrọ iji na-enwechi ọmụmụ ihe ezinụlọ anya? (b) Olee ahụmahụ na-egosi uru nke ezinụlọ ịnarachi ntụziaka anya n’ụzọ nke Jehova, bara?

17 Ọ dị mkpa ime atụmatụ. A chọrọ nnọgidesi ike. Ma uru ndị a na-enweta site n’inwechi ọmụmụ ihe ezinụlọ anya kwesịrị ya. (Ilu 22:6; 3 Jọn 4) Franz na Hilda, bụ́ ndị nọ na Germany, zụlitere ezinụlọ nwere ụmụ 11. Ọtụtụ afọ mgbe e mesịrị, nwa ha nwanyị bụ́ Magdalena kwuru, sị: “Ihe m weere dị ka ihe kasị mkpa taa bụ na ọ dịghị ụbọchị gaferenụ nke a na-enyeghị anyị ntụziaka ime mmụọ.” Mgbe mmụọ ịhụ mba n’anya biiri ọkụ n’okpuru ọchịchị Adolf Hitler, nna Magdalena ji Bible kwadebe ezinụlọ ya maka ule ndị ọ maara na ha na-abịa. Ka oge na-aga, a nwụchiri ndị nke obere so n’ezinụlọ ahụ ma kpọga ha n’ogige mgbazi; e jidere ndị ọzọ so n’ezinụlọ ahụ ma tụba ha n’ụlọ mkpọrọ na n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche. E gburu ụfọdụ egbu. Ha nile jigidesiri okwukwe ha ike—ọ bụghị nanị n’oge ajọ mkpagbu ahụ kamakwa, n’afọ ndị sochirinụ, maka ndị nke lanarịrịnụ.

18. Olee otú e siworo kwụghachi ndị na-azụ ụmụ nanị ha ụgwọ ọrụ maka mgbalị ha?

18 N’otu aka ahụ, ọtụtụ ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ, nakwa ndị ha na ndị òtù ọlụlụ ha na-adịghị ekpe otu okpukpe, enyewo ụmụ ha ntụziaka Bible n’ụzọ chiri anya. N’India, otu nwanyị di ya nwụrụ, bụ́ onye nanị ya na-azụ ụmụ, rụsiri ọrụ ike iji kụnye ịhụnanya maka Jehova n’ime ụmụ ya abụọ. Otú ọ dị, obi gbawara ya mgbe nwa ya nwoke kwụsịrị iso ndị Jehova na-akpakọrịta. Ọ rịọrọ Jehova ka ọ gbaghara ya maka ebe ọ bụla ọ dara n’ọzụzụ o nyere nwa ya nwoke. Ma nwa ya nwoke ahụ echezọchabeghị ihe ọ mụtara. Mgbe ihe karịrị afọ iri gasịrị, ọ lọghachiri, nwee ọganihu ime mmụọ dị mma, ma ghọọ okenye ọgbakọ. Ugbu a, ya na nwunye ya na-eje ozi dị ka ndị ozi ọsụ ụzọ oge nile. Lee ekele ndị nne na nna ahụ nwere bụ́ ndị buuru ndụmọdụ ahụ sitere n’aka Jehova na nzukọ ya n’uche nke bụ́ inyechi ntụziaka Bible anya n’ime ezinụlọ! Ùnu na-etinye ndụmọdụ ahụ n’ọrụ n’ime ezinụlọ unu?

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

◻ N’ihi gịnị ka inwechi ọmụmụ ihe ezinụlọ anya ji dị mkpa?

◻ Gịnị kwesịrị ịbụ nzube anyị mgbe ọ bụla anyị na-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ?

◻ Ngwá ọrụ ndị dị aṅaa maka izi ihe ka e wepụtawooro anyị?

◻ Olee otú a pụrụ isi mee ka ọmụmụ ihe kwekọọ ná mkpa ezinụlọ?

[Foto dị na peeji nke 15]

Inwe nzube ndị doro anya ga-eme ka ọmụmụ ihe ezinụlọ unu ka mma

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya