Ọmụmụ Ihe Ezinụlọ nke Na-eweta Ọṅụ
“Sitekwa n’ihe ọmụma ka ime ụlọ ya nile na-ejupụta n’akụ̀ nile dị oké ọnụ ahịa dịkwa ụtọ,” ka Bible na-ekwu. (Ilu 24:4) Ihe ndị a dị oké ọnụ ahịa abụghị nanị akụ̀ a na-ahụ anya kama ọ gụnyere ezi ịhụnanya, egwu Chineke, na okwukwe siri ike. Ụdị àgwà ndị ahụ n’ezie na-eme ka e nwee ndụ ezinụlọ rijuru afọ. (Ilu 15:16, 17; 1 Pita 1:7) Otú ọ dị, iji nweta ha, ọ dị anyị mkpa iwebata ihe ọmụma Chineke n’ime ezinụlọ anyị.
ONYE isi ezinụlọ nwere ibu ọrụ nke ịkụbanye ihe ọmụma a n’ime ndị òtù ezinụlọ ya. (Deuterọnọmi 6:6, 7; Ndị Efesọs 5:25, 26; 6:4) Otu n’ime ụzọ kasị mma e ji eme nke a bụ site n’ọmụmụ ihe ezinụlọ a na-enwechi anya. Lee ka nke a pụrụ isi bụrụ ihe obi ụtọ nye ndị na-ekere òkè na ya mgbe e duziri ọmụmụ ihe ahụ n’ụzọ na-akụzi ihe na n’ụzọ a pụrụ ịnụ ụtọ ya! Mgbe ahụ, ka anyị tụlee ụfọdụ ihe ndị dị mkpa n’iduzi ọmụmụ ihe ezinụlọ dị irè.a
Ọmụmụ ihe ezinụlọ na-akasị adị irè mgbe a na-enwechi ya anya. A hapụrụ ya mgbe oge dapụtara ma ọ bụ mgbe ọ gbatara n’uche, o yikarịrị ka ọ ga-abụ ihe a na-adịghị enwechi anya ma ọ dịkarịsịa mma. Ya mere ị ghaghị ‘ịzụchapụta oge’ maka ọmụmụ ihe ahụ. (Ndị Efesọs 5:15-17) Ịhọpụta oge ga-adị mgbe nile nke ga-adịrị mmadụ nile mma pụrụ ịbụ ihe ịma aka. “O siiri anyị ike inwechi ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị anya,” ka otu onye isi ezinụlọ na-ekwu. “Anyị nwalere oge dị iche iche ruo mgbe anyị mesịrị n’ikpeazụ chọta oge ná ngwụsị uhuruchi nke kwesịrị anyị. Ugbu a a na-enwechi ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị anya.”
Ozugbo i nwere oge kwesịrị ekwesị, kpachara anya ka ị ghara ikwe ka ihe ndọpụ uche kpapụ ọmụmụ ihe ahụ. “Ọ bụrụ na ndị ọbịa abịa mgbe anyị na-enwe ọmụmụ ihe,” ka Maria,b dị afọ 33 ugbu a, na-echeta, “Papa ga-agwa ha ka ha chere ruo mgbe ọmụmụ ihe ahụ gasịrị. Banyekwara òkù fonu, nanị ihe ọ ga-eme bụ ịgwa onye ahụ na ya ga-akpọghachi mgbe e mesịrị.”
Otú ọ dị, nke a apụtaghị na a pụghị inwe ohere maka mgbanwe. Ọnọdụ mberede ma ọ bụ ihe a na-atụghị anya ha pụrụ ibilite, ọ pụkwara ịdị mkpa ịkagbu ma ọ bụ iyigharị ọmụmụ ihe ahụ mgbe ụfọdụ. (Eklisiastis 9:11) Ma kpachara anya ka ị ghara ikwe ka nke ọ bụla n’ime ndị a kpaghasịa ihe omume.—Ndị Filipaị 3:16.
Oge hà aṅaa ka ọmụmụ ihe kwesịrị ịdịru? Robert, onye zụliteworo otu nwa nwanyị na otu nwa nwoke n’ụzọ gara nke ọma, na-asị: “Ọmụmụ ihe anyị na-adịru otu hour. Mgbe ụmụaka ahụ ka na-eto eto, anyị gbalịrị ijide mmasị ha n’ime hour ahụ site n’ịtụle ihe ndị dị iche iche, dị ka paragraf ole na ole n’isiokwu dịịrị ọmụmụ n’Ụlọ Nche, akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a họpụtara na Bible, na akụkụ mbipụta ndị ọzọ.” Maria na-echeta: “Mgbe mụ na ụmụnne m nwanyị abụọ ka bụ ụmụntakịrị, ọmụmụ ihe anyị bụ ihe dị ka minit 20 ugboro abụọ ma ọ bụ atọ n’otu izu. Ka anyị na-eto, ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị kwa izu dịruru otu hour ma ọ bụ ihe dị ka ya.”
Gịnị Ka Anyị Kwesịrị Ịmụ?
Ịtụle ajụjụ a mgbe mmadụ nile zukọrọ maka ọmụmụ ihe ga-akpata nkụda mmụọ na ịtụfu oge bara uru maka ọmụmụ ihe. Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ, ụmụaka agaghị enwe ihe ọ bụla kpọmkwem ha ga-atụ anya ya, n’oge na-adịghịkwa anya ha agaghị enwekwa mmasị. N’ihi ya buru ụzọ họrọ otu n’ime mbipụta Society a ga-atụle.
“Ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” ewepụtawo uju nke mbipụta a ga-esi na ha mee nhọrọ. (Matiu 24:45-47) Ikekwe ị pụrụ iji akwụkwọ nke ezinụlọ gị na-amụbeghị mee ihe. Leekwa ihe obi ụtọ ọ bụ ịtụle akụkụ ndị a họpụtara site n’Insight on the Scriptures ma ọ bụrụ na mpịakọta ndị a dị n’asụsụ gị! Dị ka ihe atụ, ị pụrụ ịtụleghachi isiokwu banyere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị n’ime izu ndị bu Ememe Ncheta ahụ ụzọ. Ọtụtụ ezinụlọ na-erite uru n’ịkwadebe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche maka izu ahụ. Ma isiokwu ndị ọzọ dị n’Ụlọ Nche na-enyekwa ihe magburu onwe ya maka ọmụmụ ihe. Onye isi ezinụlọ ahụ, bụ́ onye maara mkpa ime mmụọ nke ezinụlọ ya, nọ n’ọnọdụ kasị mma ikpebi mbipụta e kwesịrị ịmụ.
“Anyị na-amụkarị mbipụta a họọrọ tupu oge eruo,” ka Maria na-echeta. “Ma mgbe ajụjụ bilitere ma ọ bụ ọnọdụ ebilite n’ụlọ akwụkwọ, mgbe ahụ anyị ga-agafe n’ihe ọmụma metụtara ya.” Nchegbu ndị pụrụ iche, dị ka nsogbu ndị ntorobịa na-eche ihu n’ụlọ akwụkwọ, iyi oge, ihe ndị a na-eme ma a gbasaa akwụkwọ, na ihe ndị yiri ha, na-ebilite. Mgbe nke a mere, họrọ isiokwu ma ọ bụ mbipụta ndị tụlere nsogbu ahụ e nwere mgbe ahụ. Ọ bụrụ na ị hụ ihe ọmụma ná mbipụta Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta! nke kasị ọhụrụ nke ị ga-enwe mmasị isoro ezinụlọ gị tụlee ozugbo, egbula oge idokwa nke ahụ. Otú ọ dị, i kwesịrị ịgwa ndị ezinụlọ gị banyere mgbanwe ahụ tupu oge eruo. Ma jide n’aka ịbịaghachi n’ihe ọmụmụ ahụ dị n’usoro ihe omume ozugbo e lebasịịrị mkpa ahụ anya.
Mee Ka Ọnọdụ Ya Dịrị Jụụ
A kasị amụta ihe n’okpuru ọnọdụ dị n’udo. (Jemes 3:18) N’ihi ya mee ka e nwee ọnọdụ ntụsara ahụ, ma bụrụ nke dị nkwanye ùgwù. Otu onye isi ezinụlọ na United States na-asị: “Ma ànyị na-amụ ihe na palọ ma ọ bụ n’ihu ụlọ, anyị na-agbalị ịnọtụ onwe anyị nso karịa ịgbasapụ n’ọnụ ụlọ sara mbara. Nye anyị, nke a na-eme ka e nwee mmetụta na-ekpo ọkụ.” Maria ji oké mmasị na-echeta, sị: “E nyere mụ na nwanne m nwanyị ohere ịhọrọ ebe anyị ga-enwe ọmụmụ ihe ahụ n’ime ụlọ n’izu ahụ. Nke ahụ mere ka ahụ ruo anyị ala.” Buru n’uche na ìhè kwesịrị ekwesị, nhazi oche kwesịrị ekwesị, ebe a na-atụsasịghị ihe aghara aghara na ebe mara mma na-atụnyecha ụtụ n’ịdị jụụ. Inwe oriri ntụrụndụ maka ezinụlọ ahụ mgbe e nwesịrị ọmụmụ ihe ahụ na-enyekwa aka ime ka uhuruchi ahụ bụrụ nke a nụrụ ụtọ ya.
Ọbụna ụfọdụ ezinụlọ na-ahọrọ ịgụnye ezinụlọ ndị ọzọ n’ọmụmụ ihe ha mgbe ụfọdụ, na-etinyekwu ihe ná mmasị nakwa ụdị azịza dị iche iche. Mgbe a kpọrọ ndị ọhụrụ òkù ikere òkè na ndokwa a, ha pụrụ irite uru site n’ịhụ onye isi ezinụlọ nweworo ahụmahụ ka ọ na-eduzi ọmụmụ ihe ezinụlọ.
Mee Ka Bible Dịrị Ndụ
Mee ka oge ọmụmụ ihe dị ụmụaka ahụ ụtọ, ha ga-atụsikwa anya ha ike. Ị pụrụ ime nke a site n’ịgba ụmụntakịrị ume ise ihe osise nke ihe megasịrị na Bible. Mgbe o kwesịrị ekwesị, hazie ka ụmụaka mee ihe omume na ihe nkiri Bible. N’ebe ụmụntakịrị nọ ọ dịghị mkpa ịrapagidesi ike n’usoro ajụjụ na azịza. Ịgụ na ịkọ akụkọ banyere ndị a kpọrọ aha ha na Bible bụ ụzọ dị ụtọ iji kụbanye ụkpụrụ Chineke. Robert, onye a kpọtụrụ aha na mbụ, na-echeta: “Mgbe ụfọdụ anyị ga-agụ akụkụ Bible dị iche iche, onye gụọ ibe ya agụọ, na-agụ ‘olu’ dị iche iche nke e kenyere onye ọ bụla.” A pụrụ ịgwa ụmụaka ka ha họrọ onye nke ha ga-achọ ime ka ya n’ihe ọgụgụ ahụ.
Iji map na chaatị eme ihe ga-enyere ụmụ toworo eto karị aka iji echiche ha hụ ebe na akụkụ ala ebe ihe omume ndị a na-atụle weere ọnọdụ. N’ụzọ doro anya, site n’ichepụtatụ ihe, a pụrụ ime ka ọmụmụ ihe ezinụlọ dị ụtọ ma dị n’ụdị n’ụdị. Agụụ Okwu Chineke ga na-agụkwa ụmụaka ahụ.—1 Pita 2:2, 3.
Nyere Mmadụ Nile Aka Ikere Òkè
Ka ụmụaka wee nụ ụtọ ọmụmụ ihe ahụ, ha aghaghịkwa inwe mmetụta nke ịbụ ndị ọmụmụ ihe ahụ metụtara. Otú ọ dị, ime ka ụmụaka nke afọ dị iche iche kere òkè pụrụ ịbụ ihe ịma aka. Ma otu ụkpụrụ Bible na-asị: “Onye bụ onye isi, ya were obi na-anụ ọkụ na-abụ isi.” (Ndị Rom 12:8) Ịnụ ọkụ n’obi na-enye aka, n’ihi na ịnụ ọkụ n’obi na-efe efe.
Ronald na-eme ka nwa ya nwanyị dị afọ ise, bụ́ Dina, tinye ọnụ site n’ime ka ọ gụọ isiokwu nta dị n’ihe ahụ a na-amụ na ịgwa ya ka o kwuo okwu n’ihe osise ya. Ka Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst na-abịaru nso n’afọ gara aga, o lekwasịrị anya n’ihe osise ndị kwesịrị ekwesị n’akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ.c O kwuru, sị: “Nke a nyeere ya aka ịghọta ịdị mkpa nke ihe omume ahụ.”
Maka nwa ya nwanyị gbara afọ iri, bụ́ Misha, Ronald mekwuru ihe ọzọ. “Misha enwewo ọganihu ruo n’ókè ọ pụrụ ịghọta ọ bụghị nanị ihe ihe osise ndị ahụ bụ kama ihe ha na-egosi,” ka Ronald na-ekwu. “Ya mere mgbe anyị na-atụle akwụkwọ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!,d anyị tụkwasịrị uche n’ihe ihe osise ndị ahụ pụtara, nke a enyewokwara ya aka.”
Ka ụmụaka na-etobanye n’afọ iri na ụma ha, gwa ha ka ha kwuo ụzọ a pụrụ isi tinye ihe ahụ a na-atụle n’ọrụ. Mgbe ajụjụ bilitere n’oge ọmụmụ ihe ahụ, kenye akụkụ ndị a ga-emere nnyocha. Robert mere nke ahụ mgbe nwa ya dị afọ 12, bụ́ Paul, jụrụ ajụjụ banyere òtù ụlọ akwụkwọ e guzobere ọhụrụ nke gụnyere egwuregwu Dungeons na Dragons. Paul na ndị ọzọ n’ezinụlọ ahụ chọrọ ihe ọmụma na-eji Watchtower Publications Index eme ihe, ha tụleghachikwara ya n’ọmụmụ ihe ezinụlọ ha. “N’ihi ya,” ka Robert na-ekwu, “Paul ghọtara ngwa ngwa na egwuregwu ahụ ezighị ezi maka ndị Kraịst.”
Robert kenyekwara ime nnyocha n’oge ndị ọzọ. Nwunye ya, bụ́ Nancy, na-echeta: “Mgbe anyị mere nnyocha banyere ndị ozi Jisọs, e kenyere onye nke ọ bụla n’ime anyị otu onyeozi kwa izu. Lee ka o si eme obi ụtọ ịhụ ka ụmụaka ahụ ji ịnụ ọkụ n’obi na-enye akụkọ ha n’ọmụmụ ihe ezinụlọ!” Ime nnyocha nke onwe ha na isoro ezinụlọ kerịta ihe ọmụma ahụ na-enyere ụmụaka aka isoro ‘Jehova na-eto.’—1 Samuel 2:20, 21.
Jụọ ajụjụ—ajụjụ njụta echiche nakwa nke nghụpụta obi—bụ ụzọ dị mma iji mee ka ụmụaka tinye ọnụ. Onye Nkụzi ahụ Kasị Mma, bụ́ Jisọs, jụrụ ajụjụ njụta echiche, dị ka, “Gịnị bụ uche gị?” (Matiu 17:25) “Mgbe onye ọ bụla n’ime anyị nwere ajụjụ, ọ dịghị mgbe ndị mụrụ anyị na-aza ya kpọmkwem,” ka Maria na-echeta. “Ha na-ajụ ajụjụ nghụpụta obi mgbe nile, na-enyere anyị aka ịtụgharị uche n’okwu ahụ.”
Na-ekwurịta Okwu —Akpasula Iwe!
A na-ewelitekwu ọṅụ nke ọmụmụ ihe ezinụlọ ma ọ bụrụ na mmadụ nile nọ ya pụrụ ikwu echiche na mmetụta ha n’atụghị egwu ịbụ ndị a kwara emo. Ma “ezi nkwurịta okwu n’oge ọmụmụ ihe ezinụlọ ga-ekwe omume nanị ma ọ bụrụ na ụzọ nkwurịta okwu ghere oghe n’oge ndị ọzọ,” ka otu nna na-ekwu. “I nweghị ike ịhapụ ya nanị maka oge ọmụmụ ihe.” N’ụzọ nile, zere okwu ndị a na-echeghị echiche kwuo ndị na-adụ adụ n’obi, ndị dị ka, ‘Ọ̀ gwụla? Echere m na ọ bụ ihe dị mkpa’; ‘Nke ahụ bụ ihe nzuzu’; ‘Gịnị ka a ga-atụ anya ya? Ị ka bụ nwatakịrị.’ (Ilu 12:18) Nwee ọmịiko na ebere n’ahụ ụmụ gị. (Abụ Ọma 103:13; Malakaị 3:17) Nwee obi ụtọ n’ebe ha nọ, kwadookwa ha ka ha na-agbalị itinye ihe ha na-amụta n’ọrụ.
Ọnọdụ nke ọmụmụ ihe ezinụlọ kwesịrị ịbụ ụdị nke ga-eme ka uche nwatakịrị na-anabata ntụziaka. “Mgbe ị malitere ịgbazi ụmụaka olu,” ka otu nna ụmụ anọ nweworo ihe ịga nke ọma na-akọwa, “ị na-enwe ihe yiri ndị na-eme isi ike.” N’ọnọdụ dị otú ahụ, ihe ọmụma ahụ nwere ike ọ gaghị abami n’ime. Ya mere zere ime oge ọmụmụ ihe ahụ oge inye ntaramahụhụ. Ọ bụrụ na ha dị mkpa, nye ndị a mgbe e mesịrị, na n’otu n’otu.
Mgbalị Ya Kwesịrị Ya
Iwulite ezinụlọ bara ọgaranya n’ụzọ ime mmụọ na-ewe oge na mgbalị. Ma ọbụ abụ ahụ na-ekwu, sị: “Lee, ihe nketa nke na-esi n’aka Jehova bịa ka ụmụ bụ: ụgwọ ọrụ Ọ na-akwụ ka mkpụrụ nke afọ bụ.” (Abụ Ọma 127:3) E nyekwara ndị nne na nna ibu ọrụ nke ‘ịzụpụta ụmụ n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.’ (Ndị Efesọs 6:4) N’ihi ya zụlite nkà iduzi ọmụmụ ihe ezinụlọ dị irè, dịkwa ụtọ. Mee ike gị nile inye “mmiri ara nke okwu Chineke, nke aghụghọ na-adịghị ya,” ka ụmụ gị nwee ike “na-eto eto ruo nzọpụta.”—1 Pita 2:2; Jọn 17:3.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụ ezie na ọtụtụ aro a tụrụ n’isiokwu a metụtara inyere ụmụaka aka n’ọmụmụ ihe ezinụlọ, echiche dị na ya metụtakwara ọmụmụ ihe ezinụlọ ebe ụmụ na-anọghị ya.
b A gbanwewo ụfọdụ n’ime aha ndị ahụ.
c Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
d Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.