Ihe Ga-enyere Ezinụlọ Ọ Bụla Aka
1. Olee otú Ụbọchị Izu Ike si baara ezinụlọ ọ bụla n’Izrel uru?
1 Jehova gwara ezinụlọ ọ bụla n’Izrel ka ha na-edebe Ụbọchị Izu Ike n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya. Idebe ya bakwaara ha ezigbo uru. N’ụbọchị ahụ, ndị Izrel na-ezuru ike n’ọrụ ha, nwee ohere ichebara ịdị mma Jehova echiche, na ichebara otú ha na Jehova ga-esi dịkwuo ná mma echiche. Ndị nne na nna na-eji oge ahụ akụziri ụmụ ha Iwu Jehova. (Diut. 6:6, 7) N’izu ọ bụla, Ụbọchị Izu Ike na-abụ ụbọchị ndị Jehova na-akacha enwe ohere eleba anya ná mmekọrịta ha na Jehova.
2. Gịnị ka Ụbọchị Izu Ike na-akụziri anyị banyere Jehova?
2 Ọ bụ eziokwu na Jehova achọghịzi ka ezinụlọ ọ bụla na-edebe Ụbọchị Izu Ike, e nwere ihe iwu ahụ na-agwa anyị banyere Chineke. Ihe ọ na-agwa anyị bụ na kemgbe ụwa, Chineke chọrọ ka ndị ya na-eleba anya n’ihe ndị ga-eme ka ha na ya dịkwuo ná mma. (Aịza. 48:17, 18) Taa, otu ụzọ Jehova si egosi na ọ chọrọ ka anyị na-eleba anya n’adịm ná mma anyị na ya bụ na o mere ka e nwee mgbede Ezinụlọ Ji Efe Ofufe.
3. Gịnị mere e ji wepụta mgbede Ezinụlọ Ji Efe Ofufe?
3 Gịnị Mere E Ji Wepụta Mgbede Ezinụlọ Ji Efe Ofufe? Na Jenụwarị 2009 ka e bidoro inwekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na Nzukọ Ije Ozi ọnụ. Otu n’ime ihe mere e ji mee mgbanwe a bụ ka ezinụlọ ọ bụla nwee ike iji otu mgbede n’izu na-enwe ofufe ezinụlọ, bụ́ nke ga-eme ka okwukwe ha sikwuo ike. A gbara ezinụlọ ọ bụla ume ka ha jiri mgbede ahụ anyị jibu enwe ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ na-enwe ofufe ezinụlọ, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee. Ná mgbede ahụ, ha ga-atụsara ahụ́ nwee ọmụmụ Baịbụl ezinụlọ ma leba anya ná mkpa ndị e nwere n’ezinụlọ ha.
4. Ọ̀ bụ iwu na a ga-eji naanị otu awa na-enwe ofufe ezinụlọ? Kọwaa.
4 Mgbe ahụ anyị na-enwe Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, anyị na-ewepụta oge anyị ji ejikere, oge anyị ga-eji jeruo ebe a na-enwe ya ma lọta, na oge maka ihe ndị ọzọ. Ihe ndị a niile na-ewe ọtụtụ n’ime anyị ihe karịrị otu awa ahụ e ji enwe ọmụmụ ihe ahụ. Ugbu a a gbanwerela otú ọmụmụ ihe anyị si adị, anyị niile n’ezinụlọ anyị kwesịrị ijizi mgbede ahụ efekọ Jehova ọnụ. N’ihi ya, anyị ekwesịghị iche na oge Ofufe Ezinụlọ anyị ga-abụ naanị otu awa. Kama, anyị kwesịrị iburu n’uche ihe bụ́ mkpa ezinụlọ anyị na otú ezinụlọ anyị dị ma wepụta oge ga-ezuru anyị.
5. Ọ̀ bụ iwu na ezinụlọ ga-eji oge niile ha ji enwe ofufe ezinụlọ mụkọọ ihe ọnụ? Kọwaa.
5 Ọ̀ Bụ Iwu na Ezinụlọ Ga-eji Oge Ahụ Niile Nọkọta Ọnụ Mụọ Ihe? Ọ bụrụ na ezinụlọ, ma ndị nke nwere ụmụaka ma ndị nke na-enweghị ụmụaka, ana-amụkọ Akwụkwọ Nsọ ọnụ, ha ga na-agbarịta ibe ha ume. (Rom 1:12) Ọ na-emekwa ka ezinụlọ ahụ dị n’otu. N’ihi ya, ihe a ga-akacha eji oge Ofufe Ezinụlọ eme bụ ịnọkọ ọnụ mụọ Akwụkwọ Nsọ. Ma onye ọ bụla n’ezinụlọ nwekwara ike iwepụta oge n’oge ahụ nwee ọmụmụ ihe nke onwe ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ha niile n’ezinụlọ amụkọchaa ihe ọnụ, onye ọ bụla nwere ike ịnọkwa ebe ahụ mụwa ihe n’onwe ya. Ihe ha nwere ike ime n’oge ahụ bụ ịkwadebe ihe ndị fọrọnụ a ga-amụ n’ọmụmụ ihe ma ọ bụ ịgụ magazin. Ụfọdụ ezinụlọ na-ekpebi na ha agaghị agbanye tiivi ha ná mgbede ahụ.
6. Olee otú e nwere ike isi na-amụ ihe n’oge ofufe ezinụlọ?
6 Olee Otú E Nwere Ike Isi Na-amụ Ihe n’Oge Ofufe Ezinụlọ? Ọ bụghị iwu na ọ ga-abụ n’ụdị ajụjụ na azịza mgbe niile. Iji hụ na Ofufe Ezinụlọ ha anaghị agwụ ike, ihe ọtụtụ ezinụlọ na-eme bụ ime ihe yiri ihe anyị na-eme n’ọmụmụ ihe anyị na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị n’etiti izu. Ha na-ekewa ihe ndị ha ga-eme obere obere ma nwee ụzọ dị iche iche ha si atụle ya. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịgụkọ Baịbụl ọnụ, kwadebe ihe ụfọdụ a ga-amụ n’ọmụmụ ihe ma mee ihe ngosi otú e nwere ike isi zie ozi ọma. A tụrụ aro ihe ndị ọzọ e nwere ike ime na peeji nke isii.
7. Olee ihe ndị nne na nna ga-agbalị ịhụ na ha mere n’oge ha na-enwe ofufe ezinụlọ?
7 Olee Ihe Ndị Nne na Nna Ga-agbalị Ịhụ na Ha Mere n’Oge Ha Na-enwe Ofufe Ezinụlọ? Ndị ezinụlọ unu ga-aka amụta ihe ma ọ bụrụ na ahụ́ ruru ha ala, ha amarakwa na a hụrụ ha n’anya. Unu nwedịrị ike ịnọ n’èzí mụọ ihe mgbe ụfọdụ ma ọ bụrụ na èzí ga-adịrị unu mma. Ọ dịghị njọ ma unu mụtụ ihe, unu akwụsịtụ zuo ike. Ezinụlọ ụfọdụ na-enwedị ihe ụfọdụ ha ji emegharị ọnụ ma ha mụchaa ihe. Ndị nne na nna ekwesịghị iji oge Ofufe Ezinụlọ ha mere oge ha ji abara ụmụ ha mba ma ọ bụ apịa ha ụtarị maka ihe ọjọọ ha mere. Ma ha nwere ike iwepụtatụ oge n’oge ahụ, jiri ya leba anya ná nsogbu ụfọdụ e nwere n’ezinụlọ ha. Ma o nwere ike ịkacha mma ka ha na nwa ha mere ihe ụfọdụ na-adịghị mma kwurịta ya n’oge ọzọ n’izu ahụ mgbe naanị ha na nwa ahụ nọ, ka ha ghara imenye nwa ahụ ihere n’ihu ụmụnne ya. Mgbede Ezinụlọ Ji Efe Ofufe ekwesịghị ịdị ka ebe a na-eru uju, kama o kwesịrị igosi na ọ bụ oge e ji efe Chineke anyị bụ́ onye obi ụtọ.—1 Tim. 1:11.
8, 9. Olee otú ndị isi ezinụlọ ga-esi akwadebe maka ofufe ezinụlọ ha?
8 Olee Otú Onyeisi Ezinụlọ Nwere Ike Isi Kwadebe? Ọ ga-akacha abara ndị ezinụlọ uru ma ọ bụrụ na onyeisi ezinụlọ eburu ụzọ kwadebe ihe ha ga-atụle n’Ofufe Ezinụlọ n’izu ọ bụla, nakwa otú ka mma ha ga-esi atụle ya. (Ilu 21:5) Ọ ga-adị mma ma onyeisi ezinụlọ jụọ nwunye ya ihe o chere ha nwere ike ịtụle. (Ilu 15:22) Ndị isi ezinụlọ, ọ́ gaghị adị mma ma unu nọtụ unu agwa ụmụ unu ka ha tụọ aro ihe ụfọdụ unu nwere ike ịtụle? Ọ bụrụ na unu emee nke a, unu ga-amata ihe ndị bụ́ mkpa ha na ihe ndị na-amasị ha.
9 Ọ bụghị izu ọ bụla ka ọ dị mkpa na onyeisi ezinụlọ ga-ewepụta nnukwu oge kwadebe ihe ezinụlọ ya ga-amụ. E nwere ike inwe ihe ụfọdụ unu na-eme kwa izu na-amasị ndị ezinụlọ gị, n’ihi ya, ọ bụghị iwu na ihe niile onyeisi ezinụlọ ga-akwadebe maka izu ọ bụla ga-abụ ihe ọhụrụ. Ọ ga-aba uru ma onyeisi ezinụlọ bido ịkwadebe ihe ha ga-atụle n’oge ọzọ ozugbo e mechara ofufe ezinụlọ nke izu ọ bụla, n’ihi na mkpa ime mmụọ nke ezinụlọ ya ka dị ya n’obi mgbe ahụ. Ụfọdụ ndị isi ezinụlọ na-edepụta ihe ndị ha ga-eme n’ofufe ezinụlọ ha ma mapawa ya n’ihu friji ha ma ọ bụkwanụ n’ebe ọzọ ndị ezinụlọ ha ga-ahụ ya. Nke a ga-eme ka ndị ezinụlọ ha tụwa anya ofufe ezinụlọ ọzọ ha ga-enwe ma nyekwa ha ohere ịkwadebe ihe ndị a ga-eme ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa.
10. Gịnị ka ndị naanị ha bi nwere ike ime ná mgbede ahụ Ezinụlọ Ji Efe Ofufe?
10 Gịnị Ka M Ga-eme ma Ọ Bụrụ Naanị M Nọ? Ndị bi naanị ha nwere ike iji mgbede ahụ e ji enwe Ofufe Ezinụlọ nwee ọmụmụ ihe nke onwe ha. Ihe ndị kwesịrị iso n’ihe mmadụ ga-eme mgbe ọ na-enwe ọmụmụ ihe nke onwe ya bụ ịgụ Baịbụl, ịkwadebe ihe ndị a ga-amụ n’ọmụmụ ihe, na ịgụ Ụlọ Nche na Teta! E wezụga nke ahụ, ụfọdụ ndị nkwusa na-emekwa nchọnchọ n’otu isiokwu masịrị ha. Mgbe ụfọdụ, ha nwere ike ịgwa onye nkwusa ọzọ ma ọ bụ otu ezinụlọ ka ha bịa sonyere ha n’oge ahụ iji gbarịta ibe ha ume.
11, 12. Olee uru ụfọdụ dị n’inwechi Ofufe Ezinụlọ anya?
11 Olee Uru Inwechi Ofufe Ezinụlọ Anya Bara? Ndị ji obi ha niile na-efe Jehova na-abịaru ya nso. Ihe ọzọkwa bụ na ezinụlọ ndị na-amụkọ Okwu Chineke ọnụ na-adị n’otu. Otu di na nwunye kwuru uru ịmụkọ Okwu Chineke ọnụ na-abara ha. Ha sịrị: “Anyị bụ ndị ọsụ ụzọ oge niile, anyị enweghịkwa ụmụaka. Ma anyị na-atụsi anya mgbede anyị ji enwe Ofufe Ezinụlọ ike. Ọ na-eme ka anyị abụọ dịkwuo ná mma, na-emekwa ka anyị bịarukwuo Nna anyị nke eluigwe nso. Ugbu a, anyị teta ụra n’ụbọchị anyị ji enwe Ofufe Ezinụlọ, ihe otu onye na-agwa ibe ya bụ: ‘Mgbede taa ga-atọgbu onwe ya! Taa bụ Ofufe Ezinụlọ anyị.’”
12 Ndokwa a e mere ka e nwee mgbede ezinụlọ ji efe ofufe na-enyekwara ezinụlọ ndị nwere ọtụtụ ihe ha na-arụ aka. Otu nne naanị ya na-azụ ụmụ ya abụọ, onye bụ́kwa ọsụ ụzọ oge niile, sịrị: “Na mbụ, anyị anaghị enwechi ọmụmụ ihe ezinụlọ anya. N’ihi ọtụtụ ihe ndị m na-eme n’ụbọchị nke na-eme ka ike na-agwụ m, anyị na-enwe ya naanị mgbe ọ dapụtara. Amaghị m ihe m ga-eme ka anyị nwee ike na-enwechi ya anya. N’ihi ya, ana m edetara unu akwụkwọ ozi a iji kelee unu nke ukwuu maka iwepụta mgbede Ezinụlọ Ji Efe Ofufe. Kemgbe e wepụtara ya, anyị na-enwechizi ọmụmụ ihe ezinụlọ anya, ọ na-abakwara anyị ọtụtụ uru.”
13. Gịnị na-ekpebi otú uru ezinụlọ gị ga-erite n’ofufe ezinụlọ ga-aharu?
13 Mgbede Ezinụlọ Ji Efe Ofufe dị ka Ụbọchị Izu Ike ahụ Jehova gwara ndị Izrel ka ha na-edebe. Ọ bụ onyinye Nna anyị nke eluigwe nyere ezinụlọ niile ka o nyere ha aka. (Jems 1:17) Ọ bụ otú ezinụlọ ọ bụla n’Izrel si were Ụbọchị Izu Ike na-ekpebi otú ha na Jehova ga-adịru ná mma. Otú ahụ ka ọ dịkwa mgbede a e wepụtara maka ofufe ezinụlọ. Ezinụlọ anyị ga-erite nnukwu uru ma ọ bụrụ na anyị ana-enwechi ya anya. (2 Kọr. 9:6; Gal. 6:7, 8; Kọl. 3:23, 24) Ọ bụrụ na anyị na-enwechi ofufe ezinụlọ anya, ezinụlọ anyị ga-enwe ike ikwu ụdị ihe otu ọbụ abụ kwuru. Ọ sịrị: “Ma mụ onwe m, ịbịaru Chineke nso dị m mma. Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ka m ji mere ebe mgbaba.”—Ọma 73:28.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]
Mgbede Ezinụlọ Ji Efe Ofufe ekwesịghị ịdị ka ebe a na-eru uju, kama o kwesịrị igosi na ọ bụ oge e ji efe Chineke anyị bụ́ onye obi ụtọ
[Igbe dị na peeji nke 6]
CHEKWAA YA
Ụfọdụ Ihe Ndị Unu Nwere Ike Ikwurịta ná Mgbede Ezinụlọ Ji Efe Ofufe
Baịbụl:
• Unu niile gụkọọ ebe ụfọdụ a ga-agụ n’ọgụgụ Baịbụl dịịrị izu. Ọ bụrụ na ebe a ga-agụ bụ ebe a kọrọ akụkọ ndị mmadụ, ihe unu nwere ike ime bụ, otu onye na-agụpụta okwu onye dere akụkọ ahụ, ndị ọzọ ana-agụpụta ihe ndị a kọrọ akụkọ ha n’ebe ahụ unu na-agụ kwuru.
• Jirinụ ihe unu gụrụ mee ihe nkiri.
• Tupu ụbọchị unu ga-enwe ofufe ezinụlọ, gwa onye ọ bụla n’ezinụlọ unu ka ọ gụọ isiakwụkwọ Baịbụl ndị unu ga-agụ ma detuo otu ajụjụ ma ọ bụ ajụjụ abụọ n’ihe ọ gụtara. Unu niile mekọzie nchọnchọ ọnụ n’ajụjụ nke onye ọ bụla dere.
• N’izu ọ bụla, dee otu amaokwu Baịbụl n’ihu otu mpempe akwụkwọ, dezie ihe ebe ahụ kwuru n’azụ mpempe akwụkwọ ahụ. Gbalịzienụ buru ihe amaokwu Baịbụl ahụ kwuru n’isi ma kọwaa ya. Ka oge na-aga, unu ga-enwe ọtụtụ n’ime ha. Wekọtanụ mpempe akwụkwọ ahụ niile ma tụlekọtanụ ha n’izu ọ bụla iji mara amaokwu Baịbụl ole unu ga-echetali.
Ọmụmụ Ihe:
• Kwadebenụ ụfọdụ ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe.
• Mụọnụ abụ Alaeze ndị a ga-abụ n’ọmụmụ ihe n’izu ọzọ.
• Ọ bụrụ na e nwere onye ezinụlọ unu nwere ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ma ọ bụ onye ga-eme ihe ngosi ná Nzukọ Ije Ozi, unu tụlee otú o nwere ike isi mee ya. Ma ọ bụkwanụ gwa onye ahụ ka o gosi unu otú ọ ga-esi eme ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.
Mkpa Ndị Unu Nwere n’Ezinụlọ:
• Tụleenụ otu isiokwu dị n’akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ ma ọ bụ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ.
• Meenụ ihe ngosi otú nwa akwụkwọ nwere ike isi merie nsogbu bịara ya n’ụlọ akwụkwọ.
• Họrọnụ otu n’ime nsogbu ndị ụmụ unu na-enwe n’ụlọ akwụkwọ ma gwa ụmụ unu ka ha mee nchọnchọ na ya. Ha mechaa ya, ụmụaka emee ka hà bụ ndị nne na nna, ebe ndị mụrụ ha ga-eme ka hà bụ ụmụaka ma jụọ ha ajụjụ ha ga-eji ihe ha metara na nchọnchọ ahụ zaa.
Ozi Ọma:
• Mụọnụ otú unu ga-esi ezi ozi ọma ná ngwụcha izu ahụ.
• Kwurịtanụ otú unu ga-esi gakwuo ozi ọma n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs ma ọ bụ n’oge ezumike ụmụ akwụkwọ.
• Welite ajụjụ dị iche iche ndị mmadụ na-ajụkarị n’ozi ọma ma nye onye ọ bụla n’ezinụlọ unu nkeji ole na ole ka o jiri mee nchọnchọ ma chọpụta otú ọ ga-esi zaa ajụjụ ndị ahụ. Mezienụ ihe ngosi otú a ga-esi aza ya.
Ihe Ndị Ọzọ Unu Nwere Ike Ime:
• Gụọnụ otu isiokwu dị na magazin anyị ndị ọhụrụ.
• Tupu ụbọchị unu ga-enwe ofufe ezinụlọ, gwa onye ọ bụla n’ezinụlọ unu ka ọ gụọ otu isiokwu masịrị ya na magazin anyị ndị ọhụrụ. Ụbọchị ahụ ruo, onye nke ọ bụla ga-akọzi ihe ọ gụtara.
• Mgbe ụfọdụ, gwa otu onye nkwusa ma ọ bụ di na nwunye ka ha bịa sonyere unu mgbe unu na-enwe Ofufe Ezinụlọ. I nwekwara ike ịgwa ha ka ha kọọrọ unu otú ha si ghọọ Ndịàmà Jehova ma ọ bụ ihe ụfọdụ mere mgbe ha nọ ozi ọma.
• Unu lee otu vidio anyị ma kwuo ihe ndị unu mụtara.
• Tụleenụ isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị” ma ọ bụ “Ihe Ezinụlọ Ga-atụle,” bụ́ ndị na-agba na Teta!
• Tụleenụ isiokwu bụ́ “Kụziere Ụmụ Gị Ihe” ma ọ bụ “Maka Ndị Na-eto Eto,” bụ́ ndị na-agba n’Ụlọ Nche.
• Gụọnụ ihe dị n’akwụkwọ anyị bụ́ Yearbook ma ọ bụ akwụkwọ ọhụrụ e wepụtara ná mgbakọ ikpeazụ unu gara ma kọwaa ihe unu gụtara.
• Unu lọta mgbakọ, tụleenụ ihe ndị unu mụtara.
• Wepụtanụ oge lee ihe ụfọdụ Jehova kere ma kwurịta ihe ihe ndị ahụ na-akụziri anyị banyere Jehova.
• Rụkọọnụ otu ihe ọnụ. O nwere ike bụrụ iji katọn rụọ ụgbọ Noa, ise map ma ọ bụ chaatị.