Rite Uru Site n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 1996—Akụkụ nke 3
1 Pọl onyeozi chọrọ ka ụmụnna ya kpee ekpere n’ihi ya ka o wee nwee ike inweta ikike iji nkwuwa okwu kwusaa ozi ọma ahụ. (Efe. 6:18-20) Anyị nwere ọchịchọ ịzụlite otu ikike ahụ. Iji mee nke ahụ, anyị nwere ekele n’enyemaka Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na-enye, nke a na-agba ndị ruru eru na-abịa nzukọ ume ka ha denye aha ha.
2 Dị ka ndị mmụta, anyị na-enweta ndụmọdụ onwe onye iji nyere anyị aka imeziwanye ikike ikwu okwu na izi ihe anyị. (Ilu 9:9) Anyị pụkwara irite uru site n’ịṅa ntị na ndụmọdụ ndị mmụta ndị ọzọ na-anata, na-etinye ihe ndị anyị na-amụta n’ọrụ n’onwe anyị. Mgbe anyị na-akwado ihe omume, anyị kwesịrị iji nlezianya gụọ ebe ihe omume ahụ si iji jide n’aka na nkọwa anyị nyere ya ziri ezi. Isi ihe dị iche iche na akụkụ akwụkwọ nsọ ndị anyị ji eme ihe kwesịrị ikwekọ ná mwulite nke isiokwu ahụ nile. Ọ bụrụ na ihe omume ahụ gụnyere onye ọzọ, e kwesịrị ịmụgharị ya n’ezi oge tupu e mee ya n’ụlọ akwụkwọ. Ka anyị na-enwe ọganihu, e kwesịrị ime mgbalị ikwu okwu n’ejighị ihe ndepụta, na-eji ndepụta isi ihe ekwu okwu kama iji ihe odide.
3 Ndị nile nwere ihe omume n’ụlọ akwụkwọ kwesịrị ịbịarute n’oge, nye onye nduzi ụlọ akwụkwọ mpempe akwụkwọ Ndụmọdụ Okwu ha, ma nọdụ ala n’ebe ihu ụlọ nzukọ. Ụmụnna nwanyị kwesịrị ime ka onye nduzi ụlọ akwụkwọ mara ihe ọnọdụ okwu ha ga-abụ tupu oge eruo, na ma hà ga-anọ ọdụ ma hà ga-eguzoro ọtọ maka ihe omume ha. Ijikọ aka n’ọrụ n’ụzọ ndị dị otú a na-atụnye ụtụ n’usoro ihe omume na-aga nke ọma, na-enyekwara ndị na-ahụ maka ikpo okwu aka ịkwadebe ihe nile tupu oge eruo.
4 Ịkwadebe Ihe Omume nke 2: Otu nzube nke ọgụgụ Bible bụ inyere onye mmụta aka imeziwanye ikike ịgụ ihe ya. Olee ụzọ kasị mma a pụrụ isi mezuo nke a? Ịgụ ihe omume ahụ ugboro ugboro n’olu dara ụda bụ ụzọ kasị mma isi mụta ya nke ọma. Iji nlezianya chebara ụzọ ziri ezi e si akpọpụta okwu echiche. Ọ bụrụ na okwu abụọ ndị nwere ihe dị iche iche ha pụtara nwere otu nsụpe, ịmata ihe ndị gbara ya gburugburu ga-enyere onye ahụ na-agụ ihe aka ịmara ụzọ mkpọpụta okwu ziri ezi.
5 Ụzọ ọzọ a pụrụ isi meziwanye mkpọpụta okwu bụ site n’ịgụrụ onye ọzọ ihe, onye na-akpọpụta okwu nke ọma, na-agwakwa ya ka ọ kwụsị gị ma gbazie gị olu mgbe nile ị kpọhiere ihe. Ọzọkwa, gee ndị maara agụ ihe nke ọma ntị nke ọma, cheekwa echiche mgbe ị na-ege ntị ka ha na-agụ ihe; rịba ama okwu ndị ha kpọrọ n’ụzọ dị iche n’otú i si akpọ ha. Detuo ha ma mụgharịa ha. N’oge na-adịghị anya gị onwe gị kwa ga na-akpọpụta okwu n’ụzọ ziri ezi.
6 Ndị mụrụ ụmụ pụrụ inyere ụmụ ha ndị na-eto eto aka ịkwadebe ihe omume ọgụgụ ihe ahụ. Nke a pụrụ ịgụnye ige ntị mgbe nwa ahụ na-amụgharị ihe, ma mgbe ahụ na-atụrụ ya aro ndị na-enye aka maka mmeziwanye ihe. Oge e kenyere maka ihe omume na-enye ohere maka okwu mmalite dị mkpirikpi na okwu mmechi kwesịrị ekwesị nke na-akọwapụta isi ihe dị iche iche. Otú a onye mmụta ahụ na-ewulite ikike ya nke ikwu okwu n’ejighị ihe ndepụta.
7 Onye ọbụ abụ ahụ rịọrọ n’ekpere, sị: “Onyenwe anyị, Ị ga-emeghe egbugbere ọnụ m abụọ; ọnụ m ga-egosikwa otuto Gị.” (Abụ Ọma 51:15) Ka òkè anyị na-ekere n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na-enyere anyị aka imeju otu ọchịchọ ahụ.