Gọzienụ Jehova “Kwa Ụbọchị”
1 Nkwa Eze Devid kwere Jehova dị n’Abụ Ọma 145:2: “Kwa ụbọchị ka m ga-agọzi Gị; m ga-etokwa aha Gị ruo mgbe nile ebighị ebi.” Anyị onwe anyị kwa nwere ihe mere anyị ga-eji gọzie ma too Nna anyị nke eluigwe! Ma olee otú anyị pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya Devid n’ibuli ọbụbụeze Jehova elu “kwa ụbọchị”?
2 Jiri Ekele Maka Jehova Mejuo Obi Anyị: Ịmụchi Okwu Chineke anya na-eme ka ekele anyị dịkwuo omimi maka ihe Jehova meworo, ihe ọ na-emere, na nke ọ ka ga-emere anyị. Ka anyị na-enwekwu ekele maka ihe omume ya ndị dị ebube, anyị ga-ahụ ka anyị onwe anyị na-ekwuwa ịdị mma ya. (Abụ Ọma 145:7) Anyị ga-eji ịnụ ọkụ n’obi too Jehova n’oge ọ bụla kwesịrị ekwesị.
3 Too Jehova ná Mkparịta Ụka Kwa Ụbọchị: Mgbe anyị so ndị agbata obi, ụmụ akwụkwọ ibe anyị, ndị ọrụ ibe anyị, na ndị ọzọ anyị na-ezute kwa ụbọchị na-akparịta ụka, anyị pụrụ ịchọta ohere dị iche iche iji soro ha kerịta olileanya anyị. Onye agbata obi pụrụ ikwupụta nchegbu banyere mpụ dị n’ógbè unu; nwa akwụkwọ ibe gị pụrụ inwe nchegbu banyere ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ omume rụrụ arụ; onye ọrụ ibe gị pụrụ ikwupụta otu echiche banyere okwu ụfọdụ nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Anyị pụrụ ịrụtụ aka n’ụkpụrụ na nkwa ndị dị n’Okwu Chineke ndị na-egosi ụzọ kwesịrị ekwesị ịgbaso ugbu a na ngwọta a ga-emesị nwee maka nsogbu ndị a. Okwu ndị dị otú ahụ e kwuru “na mgbe ya” pụrụ ịbụ ngọzi!—Ilu 15:23.
4 Na-ekwu Banyere Jehova Oge Nile: Onye nwere ekele dị omimi maka Jehova na-achọ isoro ndị ọzọ ruo n’ókè o kwere mee kerịta ozi ọma ahụ. (Abụ Ọma 40:8-10) N’akụkụ nke a anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị, ‘Àna m eme ihe nile ọnọdụ m nyere ohere ya?’ Ọtụtụ achọpụtawo na site n’iji ezi uche mezigharịa ihe ụfọdụ, ha enwewo ike ịghọ ndị ọsụ ụzọ oge nile. Ọ bụrụ na ọnọdụ dị ugbu a enyeghị ohere maka nke ahụ, ànyị pụrụ idebanye aha dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka? Ebe ọ bụ na oge Ememe Ncheta na-abịanụ bụ oge maka ihe omume sara mbara, ọnwa March na April ga-abụ oge mara mma iji mụbaa ozi anyị site n’ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.
5 Nyere Ndị Ọhụrụ Aka Isonyere Anyị n’Ịgọzi Jehova: Ememe Ncheta ọnwụ Jisọs na-echetara anyị mgbe nile ihe mere anyị ga-eji na-ekele Jehova, na-etokwa aha Ya. Nke a bụ oge dị mma karịsịa ịgba ndị anyị na-eduziri ọmụmụ Bible ume isonyere anyị n’ikwusa n’ihu ọha banyere ọbụbụeze Jehova. Gbaa ha ume iji ekpere tụgharịa uche n’ihe e dere na paragraf nke 7-9 na peji nke 173-175 n’akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Ọ bụrụ na ha ruru eru, ọ dịghị ihe mere ha ga-eji laa azụ nanị n’ihi na ha enweghị ahụmahụ. Ndị nkwusa ruru eru nọ ya igosi ha otú e si arụ ọrụ nkwusa Alaeze ahụ. Ọ bụrụ na ndị ọhụrụ pụrụ inwe nkwuwa okwu iji kwusaa ozi ọma ahụ, ha pụrụ inwe obi ike na Jehova ga-enyere ha aka.—Ọrụ 4:31; 1 Tesa. 2:2.
6 Anyị na-ewetara onwe anyị na ndị ọzọkwa uru ndị na-adịru ebighị ebi mgbe anyị na-anwa ịgọzi Jehova kwa ụbọchị.