Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/09 p. 3
  • Na-eto Jehova Kwa Ụbọchị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-eto Jehova Kwa Ụbọchị
  • Ozi Alaeze Anyi—2009
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mgbakọ Distrikti Na-akpọ Òkù Na-akpali Akpali!—Jiri Ọṅụ Na-eto Jehova Site n’Ụbọchị Ruo n’Ụbọchị!
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Toonụ Jehova, Bụ́ Chineke Anyị!
    Bụkuo Jehova Abụ
  • Toonụ Jehova Chineke Anyị
    Jiri Ọṅụ Bụkuo Jehova Abụ
  • Ndị Na-eto Eto, Toonụ Jehova!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2009
km 7/09 p. 3

Na-eto Jehova Kwa Ụbọchị

1. Gịnị ka ndị ohu Chineke kpebiri ịna-eme, ọ̀ bụkwa maka gịnị?

1 Eze Devid kwuru na ya kpebisiri ike ịna-eto Jehova “ogologo ụbọchị dum,” ruokwa mgbe ebighị ebi. (Ọma 145:2, 7, 21) Anyị nwekwara ezi ihe mere anyị ga-eji na-eto Jehova kwa ụbọchị.—Ọma 37:10; 145:14, 18; 2 Pita 3:13.

2. Olee otú ezinụlọ ga-esi na-eto Jehova kwa ụbọchị?

2 N’Ụlọ Anyị: Anyị nwere akwụkwọ ndị bara uru na-enyere anyị aka ikwurịta banyere Chineke na Baịbụl mgbe anyị na-atụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị, mgbe anyị na-enwe Ofufe Ezinụlọ, na mgbe anyị na-akwadebe ọmụmụ ihe. Ọtụtụ ezinụlọ na-anọkọ ọnụ eri nri ọ dịkarịa ala otu ugbo n’ụbọchị. Ha na-eji oge nri ahụ tụsara ahụ́, kparịta ụka ma too Jehova. Mgbe ndị nne na nna kwulitere otu isiokwu n’oge nri ahụ, ọ na-enyere ha ezigbo aka ịzụlite ụmụ ha “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.”—Efe. 6:4; Diut. 6:5-7.

3. Olee otú anyị nwere ike isi too Jehova mgbe anyị na ụmụnna anyị nọ?

3 Anyị na Ụmụnna Anyị: Oge anyị nọ n’ozi ma ọ bụ n’ọmụmụ ihe bụ oge dị nnọọ mma anyị na ụmụnna anyị ga-eji na-eto Jehova. (Ilu 15:30; Fil. 4:8; Hib. 13:15) Ebe ọ bụ na anyị niile hụrụ Jehova n’anya, ọ ga-adịrị anyị mfe isi n’ala ala obi anyị gwa ibe anyị ihe ọma ndị Jehova meerela anyị.—Ọma 106:1.

4. E wezụga ịga ozi ọma n’ụlọ ndị mmadụ, olee ohere ndị ọzọ i nwere ike iji too Jehova?

4 Mgbe Anyị na Ndị Na-abụghị Ụmụnna Anyị Na-ekwurịta Okwu: Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị anyị niile ga-enwecha ohere ịga ozi ọma n’ụbọchị ọ bụla, ma anyị nwere ike jiri nkeji ole na ole gwa ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ, ụmụ akwụkwọ ibe anyị na ndị ọzọ nọ anyị nso okwu banyere Jehova na nzube ya. Mkparịta ụka ahụ nwere ike mee ka ndị nwere ezi obi nwee olileanya. (Ọma 27:14; 1 Pita 3:15) Mgbe otu nwanna nwaanyị ji ụgbọelu na-eme njem, o ziri otu n’ime ndị nọ n’ụgbọelu ahụ ozi ọma. Ihe nwanna ahụ gwara onye ahụ ruru ya n’obi ma gbaa ya ume, nke na o nyere nwanna nwaanyị ahụ adres ụlọ ya na nọmba fon ya ka ha abụọ nwee ike na-akparịta. Ka nsogbu ụwa na-akakwu njọ, ndị Jehova na-agakwuru ndị nwere mmasị ige ha ntị ma zie ha “ozi ọma nke ihe ka mma.” Ozi ọma a na-eme ka ndị mmadụ nwee olileanya, meekwa ka ha too Jehova.—Aịza. 52:7; Rom 15:11.

5. Olee ihe mere o ji agụ anyị agụụ ito Jehova, oleekwa ihe o nwere ike ịrụpụta?

5 Ọ ga-atọ Jehova ezigbo ụtọ ịnụ ka ndị ohu ya na-eto ya kwa ụbọchị! Otú ahụ ihe ndị Jehova kere eke anyị na-ahụ anya si eto Jehova, ọ bụkwa otú ahụ ka anyịnwa nwere ike ịna-eto Jehova n’ụlọ anyị, n’ọgbakọ, na mgbe anyị na ndị na-esowebeghị anyị na-eto Jehova na-ekwurịta okwu.—Ọma 19:1-4.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya