Jehova Bụ Onye A Ga-eto nke Ukwuu
A Ga-eme Ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị n’April 16
1 Anyị na-atụsikwu nnọọ anya ike ka anyị na-akpụdewe April 16, 2003. N’abalị ahụ, anyị ga-eme Ememe Ncheta ọnwụ Jizọs, na-esonyere ọtụtụ nde ndị anyị na ha na-efekọ ofufe gburugburu ụwa n’ito aha Jehova. Jehova kwesịrị ka anyị nye ya otuto anyị nile n’ihi ndokwa magburu onwe ya o mere maka ihe mgbapụta ahụ. Ọ ga-enye ihe nile a kpọrọ mmadụ na-erube isi ngọzi ndị dị ebube site na ya. Anyị ji obi anyị nile na-esonyere onye ọbụ abụ n’iti mkpu, sị: “Onye ukwu ka Jehova bụ, Ọ bụkwa onye a na-eto nke ukwuu.”—Ọma 145:3.
2 Ọ bụ oge iji tụgharịa uche n’ịdị mma Chineke nakwa n’ekele dị ukwuu anyị kwesịrị inye Jehova maka izite “Ọkpara ọ mụrụ nanị ya n’ime ụwa ka anyị nwee ike inweta ndụ site na ya.” (1 Jọn 4:9, 10) Iji nrubeisi na-eme Ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị na-emesi ya ike n’obi anyị na “Onye dị amara na onye nwere obi ebere ka Jehova bụ . . . Ọ dịkwa ukwuu n’ebere.” (Ọma 145:8) N’ezie, ihe mgbapụta ahụ bụ ngosipụta kasị ukwuu nke ịhụnanya Jehova n’ebe ihe nile a kpọrọ mmadụ nọ. (Jọn 3:16) Mgbe anyị tụgharịrị uche n’ịhụnanya Chineke ma chebara ụzọ ndụ nke iji ikwesị ntụkwasị obi guzosie ike n’ezi ihe nke Jizọs echiche, a na-akpali anyị ito Jehova. Ruo mgbe ebighị ebi, anyị ga na-eto ya n’ihi ịhụnanya ya a na-akparaghị ókè nke o gosipụtara n’ime ka o kwee anyị omume inweta ndụ ebighị ebi.—Ọma 145:1, 2.
3 Nyere Ndị Ọzọ Aka Ito Jehova: Inwe ekele maka onyinye ahụ kasịnụ Chineke nyere nke bụ́ ihe mgbapụta ahụ na-akpali anyị ịkpọ ndị ọzọ òkù isonyere anyị n’ito Jehova. E nyere onye ọbụ abụ ike mmụọ nsọ ide, sị: “Ncheta nke ịba ụba nke ịdị mma Gị ka ha ga-ekwuwa, ọ bụkwa ezi omume Gị ka ha ga-eti mkpu ọṅụ banyere ya.” (Ọma 145:7) N’afọ gara aga nanị, Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa tinyere ihe karịrị otu ijeri awa n’ọrụ ime nkwusa. Gịnị si ná mgbalị ha pụta? Kwa izu ná nkezi, e mere ihe karịrị mmadụ 5,100 baptizim ná ngosipụta nke nrara ha raara onwe ha nye Jehova. N’ihi ngụkọta ọnụ ọgụgụ mmadụ dị 15,597,746 bịara Ememe Ncheta ahụ, gụnyere ihe karịrị nde mmadụ 9 bụ́ ndị na-amalitebeghị ito Jehova dị ka ndị nkwusa nke ozi ọma ahụ, e nwere ohere dị ukwuu nke inwekwu mmụba! Dị ka ndị nkwusa Alaeze, anyị ji ihe ùgwù anyị nwere kpọrọ ihe, nke bụ́ ikwusa ozi ọma ahụ na ime ka ndị ọzọ tụgharịa obi ha gaa n’ebe Jehova na Ọkpara ya nọ, nakwa n’ebe Alaeze ahụ dị.
4 Ụzọ mara mma isi gbaa ndị ọzọ ume ịsọpụrụ Jehova bụ ịkpọ ha òkù ka ha sonyere anyị n’ime Ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Ì depụtawo aha ndị nile ị ga-achọ ịkpọ nakwa ndị ọzọ ọ pụrụ ịdị mkpa ka e chetaghachiri ụbọchị na awa a ga-eme ememe ahụ? Ị̀ kpọwo ndị nile aha ha dị n’ihe ndepụta gị òkù ịbịa? Ọ bụrụ na ị kpọbeghị ha, jiri ịdị uchu kpọọ ha òkù n’ime oge fọdụrụnụ. Nyere ha aka ịghọta nzube e ji na-eme ememe ahụ. N’ememe ahụ, dị njikere ikele ndị ọbịa. Mee ka ahụ́ ruo ha ala, mee ka ha na ndị ọzọ mata, jaakwa ha mma maka ịbịa.
5 Ịga Ememe Ncheta pụrụ ịkpali ndị ọhụrụ inwe ọganihu ime mmụọ. Otu onye a na-amụrụ Bible nke nwere nsogbu mkpaghasị uche mgbe ọdachi gasịrị, bụ́ nke na-eme ka o siere ya ike ịnọ ebe ìgwè mmadụ nọ, gara Ememe Ncheta ahụ. Mgbe a jụrụ ya ihe o chere banyere nzukọ ahụ, ọ sịrị: “Ọ bụ abalị kachasị nsọ, anọkwa m ebe ahụ.” Kemgbe ahụ, ọ malitewo ịga nzukọ.
6 Mgbe Ememe Ncheta Gasịrị: Olee ihe a pụrụ ime iji nyere ndị a nwere mmasị aka ịghọ ndị na-eto Jehova? Ndị okenye ga-arịba ndị ọhụrụ bịara Ememe Ncheta ahụ ama ma mee ndokwa ka ndị nkwusa ruru eru gaa leta ha ngwa ngwa e mesịrị iji tụleghachi ihe ndị na-akpali akpali ha nụrụ ma hụ. Ụfọdụ pụrụ ịchọ ka e duziere ha ọmụmụ Bible ebe obibi. E kwesịkwara ịkpọ ha òkù ịbịa nzukọ nile ọgbakọ na-enwe kwa izu, ebe ịbịachi ha anya pụrụ ime ka ihe ọmụma Bible ha nwere mụbaa.
7 A na-eme ndokwa iji gbaa ndị nile na-adịghị ejechi ozi anya na ndị na-adịghị ejekwa ozi ume ịbịachi nzukọ anya. Ọ bụrụ na ndị okenye agwa gị ka i nyere onye na-adịghị ejekwa ozi aka ịmaliteghachi ije ozi ubi, dị njikere inye aka. Igosi mmetụta ịhụnanya dị otú ahụ n’ebe ụmụnna anyị nọ kwekọrọ n’agbamume Pọl nyere: “Ọ bụrụhaala na anyị nwere oge dị mma maka ya, ka anyị na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ nile nọ, ma karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ.”—Gal. 6:10.
8 Ka anyị nile mee mgbalị pụrụ iche ịga Ememe Ncheta n’April 16. Anyị agaghị achọ ka oge a dị nsọ nke iji too Jehova kwaa anyị. Ee, si ugbu a ruo mgbe ebighị ebi, ka anyị na-eto Jehova maka oké ọrụ ya!—Ọma 145:21.