Mee Ka Ndị Mmadụ Mara Banyere “Ìhè nke Ụwa”
1. Olee ìhè ukwu e buru amụma ya n’Okwu Chineke, oleekwa ihe omume ga-eme ka ndị mmadụ mara banyere ìhè a n’ụzọ pụrụ iche?
1 Site n’ọnụ Aịzaịa onye amụma, Jehova buru amụma, sị: “Ndị na-ejegharị n’ọchịchịrị hụrụ ìhè ukwu: ndị bi n’ala onyinyo ọnwụ, ìhè amụkwasịwo ha.” (Aịsa. 9:2) Ihe ndị Ọkpara Chineke bụ́ Jizọs Kraịst mere mere ka a hụ “ìhè ukwu” ahụ. Ọrụ nkwusa ya mgbe ọ nọ n’ụwa na ngọzi ndị si n’àjà mgbapụta ya pụta mere ka ndị nọ n’ọchịchịrị n’ụzọ ime mmụọ hụ ụzọ. Ìhè dị otú ahụ dị ụmụ mmadụ mkpa n’oge a gbara ọchịchịrị. Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị na-enye anyị ohere pụrụ iche iji mee ka ndị mmadụ mara banyere “ìhè nke ụwa.” (Jọn 8:12) N’afọ gara aga, ọtụtụ nde mmadụ gosipụtara okwukwe ruo n’ókè ụfọdụ site n’isonyere anyị n’irube isi n’iwu Jizọs nyere, nke bụ́: “Nọgidenụ na-eme nke a iji na-echeta m.” (Luk 22:19) Ka ihe omume a ga-eji echeta ọnwụ Jizọs n’afọ a na-eru nso, olee otú anyị pụrụ isi kere òkè n’ime ka ndị mmadụ mara banyere ìhè ukwu ahụ Jehova mere ka o gbukepụ?—Fil. 2:15.
2. Olee otú anyị pụrụ isi nwekwuo obi ekele maka àjà mgbapụta ahụ, oleekwa mmetụta ime otú ahụ ga-enwe n’ahụ́ anyị?
2 Nwee Obi Ekele: Oge a na-echeta ọnwụ Jizọs bụ oge kwesịrị ekwesị iji tụgharịa uche n’ịhụnanya dị ukwuu Jehova na Jizọs gosipụtara n’inye ihe a kpọrọ mmadụ ihe mgbapụta. (Jọn 3:16; 2 Kọr. 5:14, 15) Obi abụọ adịghị ya na ime otú ahụ ga-eme ka anyị nwekwuo obi ekele maka ihe omume a dị nsọ. Ndị ohu Chineke nile kwesịrị iwepụta oge iji gụọ ma tụgharịa uche n’ọgụgụ Bible pụrụ iche maka ihe omume ahụ e ji echeta ọnwụ Jizọs, bụ́ nke e depụtara n’Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị. Ịtụgharị uche n’àgwà Jehova ndị na-enweghị atụ, bụ́ ndị ihe mgbapụta ahụ o nyere mere ka a hụ nnọọ n’ụzọ magburu onwe ya, na-eme ka anyị jiri ọbụbụ ọ bụ Chineke anyị na-eme ọnụ. Ichebara uru ihe mgbapụta ahụ baara anyị nile n’otu n’otu echiche na-eme ka ịhụnanya anyị ji obi anyị nile hụ Chineke na Ọkpara ya sikwuo ike, ọ na-akpalikwa anyị ịdị na-agbalịsi ike ime uche Chineke.—Gal. 2:20.
3. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị nwere ekele maka ihe omume e ji echeta ọnwụ Jizọs?
3 Ọ bụrụ na anyị enwekwuo obi ekele n’ebe Jehova nọ n’ihi ndokwa o mere iji zọpụta anyị, ịnụ ọkụ n’obi anyị nwere maka ihe omume e ji echeta ọnwụ Jizọs ga-emetụta ndị anyị na-amụrụ Bible, ndị anyị na-agara nletaghachi, ndị ikwu anyị, ndị agbata obi anyị, ụmụ akwụkwọ ibe anyị, ndị ọrụ ibe anyị, na ndị ọzọ anyị kpọrọ ka ha bịa ihe omume a pụrụ iche. (Luk 6:45) N’ihi ya, gbalịsie ike ịkpọ ndị a nile òkù ma nye ha akwụkwọ ịkpọ òkù e biri ebi bụ́ nke ga na-echetara ha ya. Iji ghara ichefu onye ọ bụla, ụfọdụ achọpụtala na ọ na-abara ha uru idepụta aha ndị nile ha na-akpọkarị maka ihe omume a e ji echeta ọnwụ Jizọs. Kwa afọ, ha na-edenyekwa aha ndị ọhụrụ ha chọrọ ịkpọ òkù n’akwụkwọ ahụ. Ime ezi nhazi na ịgbalịsi ike ịkpọ ndị nwere mmasị òkù ga-abụ otu ụzọ magburu onwe ya isi gosi obi ekele anyị nwere n’ebe Jehova Chineke nọ “maka onyinye ya a na-apụghị ịkọwa akọwa nke ọ na-enye n’efu.”—2 Kọr. 9:15.
4. Gịnị pụrụ inyere anyị aka ijechikwu ozi ubi anya n’ọnwa March na April?
4 Ijechikwu Ozi Ubi Anya: Ì nwere ike ijechikwu ozi ubi anya n’ọnwa March na April? Ị ga-enwetarịrị ngọzi Chineke ma ị gbalịa ịgwa ndị ọzọ banyere “ozi ọma ahụ dị ebube banyere Kraịst.” Dị ka Isi Iyi nke ìhè ime mmụọ, Jehova enyela iwu, sị: “Ka ìhè nwupụta n’ọchịchịrị.” (2 Kọr. 4:4-6) Dị ka mkpa si dị, e wezụga ndokwa ọgbakọ nwerela enwe maka nzukọ ije ozi, ndị okenye ga-eme ndokwa ka e nwekwuo nzukọ ije ozi n’oge ndị ọzọ nakwa n’ebe ndị ọzọ. Ha kwesịkwara ibute ụzọ n’ịkwado ụmụnna ndị chọrọ ịnọte aka n’ozi ubi. Nke a pụrụ ịgụnye ịgba àmà okporo ámá n’isi ụtụtụ, ma ọ bụ ije ozi ụlọ n’ụlọ n’oge mgbede, bụ́ mgbe ọtụtụ mmadụ ga-anọ n’ụlọ. Iji nwee ike ịmụba òkè ị na-ekere n’ozi ubi, setịpụrụ onwe gị awa ole ị ga-enwetali, gbalịsiekwa ike inweta ya. Nye ọtụtụ ndị, inye Jehova ihe kasị mma ha nwere na-agụnye iwere ihe ùgwù nke ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.—Kọl. 3:23, 24.
5. Olee otú ọtụtụ ndị si na-erite uru ná mgbubi e gbubilatara awa ole a chọrọ n’aka ndị ọsụ ụzọ inyeaka?
5 Ị̀ Pụrụ Ịrụ Ọrụ Ọsụ Ụzọ Inyeaka? Ọ karịala afọ asaa e gbubilatara awa ole a chọrọ n’aka ndị ọsụ ụzọ inyeaka. Mgbanwe a e mere emeela ka o kwe ọtụtụ ndị ọzọ omume inweta ngọzi ndị na-abịa site n’ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Ị̀ rụtụla ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka? Ụfọdụ emewo ka ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ kwa afọ bụrụ ihe e ji mara ha. N’ọtụtụ ọgbakọ, ọtụtụ ndị nkwusa na-arụkọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka ọnụ, ọ na-aghọkwa ihe pụtara ìhè nke magburu onwe ya ọgbakọ ahụ mere n’afọ ahụ. Ì nwere ike ime nhazi iji rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’oge a a na-echeta ọnwụ Jizọs ma nweta ọṅụ n’ọnwa ahụ? Ọnwa April nwere ike ịbụrụ ụfọdụ ndị ọnwa kasị mma ime otú ahụ n’ihi na o nwere ngwụsị izu ise zuru ezu.
6. Olee ndokwa ndị na-enye obi ụtọ e merela?
6 Onye nlekọta sekit ọ̀ ga-eleta ọgbakọ unu n’ọnwa March ma ọ bụ April? Ya bụrụ otú ahụ, ị pụrụ inwetakwu ngọzi. Dị ka a mara n’ọkwa n’oge gara aga, n’afọ ije ozi nke 2006, ndị nile na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa onye nlekọta sekit na-eleta ọgbakọ ha ga-esonye n’akụkụ nke mbụ nke nzukọ onye nlekọta sekit ga-eso ndị ọsụ ụzọ nwee n’izu ahụ ọ na-eleta ọgbakọ unu. Obi abụọ adịghị ya na okwu ndị na-eme ka mmadụ gbasie ike n’ụzọ ime mmụọ, bụ́ ndị a ga-ekwu ná nzukọ a, ga-enyere ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ inyeaka aka ịgbalịsi ike ịghọ ndị ọsụ ụzọ oge nile. Tụkwasị na nke ahụ, n’ọnwa March, anyị ga-enwe obi ụtọ iji akwụkwọ ọhụrụ ahụ e ji eduzi ọmụmụ Bible bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nyere ndị mmadụ aka ịbata n’ìhè ime mmụọ. Gịnị ma i setịpụ ihe mgbaru ọsọ nke iji akwụkwọ ọhụrụ ahụ malite ọmụmụ Bible?
7, 8. (a) Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịkwadebe usoro ihe omume maka ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka? (b) Olee otú ndị ezinụlọ imekọ ihe ọnụ pụrụ isi nye aka, oleekwa otú ndị nile nọ n’ezinụlọ ahụ ga-esi rite uru?
7 Ka ị na-atụle banyere awa 50 ahụ a chọrọ n’aka ndị ọsụ ụzọ inyeaka, chọpụta usoro ihe omume nke ga-enye gị ohere igbukepụ ìhè nke eziokwu ahụ ruo ihe dị ka awa 12 kwa izu. Gị na ndị rụtụrụla ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka, nakwa ndị ọzọ, kwurịta ya. Nke a nwere ike ịgba ha ume isonyere gị. N’ihi ezi nhazi ha mere, ndị nkwusa e mere baptizim, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi, achọpụtala na o sighị oké ike iru ihe mgbaru ọsọ a kwesịrị ịja mma. Tinye ya n’ekpere. Ọ bụrụzie na ị ga-emeli ya, haziere onwe gị otú ị ga-esi mee ya, ma nụ ụtọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka!—Mal. 3:10.
8 Ọtụtụ ezinụlọ achọpụtala na site ná nkwado nke ndị òtù ezinụlọ ahụ nile, ọ pụrụ ikwe omume ka, ọ dịkarịa ala, otu onye n’ime ezinụlọ ahụ rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Otu ezinụlọ kpebiri na mmadụ ise e merela baptizim n’ụlọ ha ga-arụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Ụmụ ha abụọ a na-emebeghị baptizim gbalịsiri ike ijechikwu ozi ubi anya. Olee otú ezinụlọ ahụ si rite uru site ná mgbalị a ha tinyekwuru? Ha dere, sị: “Ọnwa ahụ bụ nnọọ ọnwa magburu onwe ya, anyị kwenyesikwara ike na nkekọ dị n’ezinụlọ anyị bịara chikwuo anya. Anyị na-ekele Jehova maka ngọzi ahụ magburu onwe ya!”
9. Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ìhè anyị nwuo n’oge a a na-echeta ọnwụ Jizọs?
9 Ihe omume pụrụ iche anyị ga-eme n’ọnwa March na April ọ̀ ga-abụ nke na-akpali akpali, ma dọtakwuo anyị nso n’ebe Nna anyị nke eluigwe nọ? Nke ahụ dabeere nnọọ ná mgbalị anyị na-eme ime ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke na Ọkpara ya nọ mikwuo emie nakwa ná mgbalị anyị na-eme ijechikwu ozi ubi anya. Ka anyị mee mkpebi yiri nke ọbụ abụ ahụ, bụ́ onye bụrụ, sị: “M ga-ewere ọnụ m kelee Jehova nke ukwuu; ee, n’etiti ọtụtụ mmadụ ka m ga-eto Ya.” (Ọma 109:30) Jehova ga-agọzi ozi anyị ga-eji ịnụ ọkụ n’obi jee n’oge a a na-echeta ọnwụ Jizọs. Ya mere, ka anyị kwe ka ìhè ukwu nwuo, ka ọtụtụ ndị ọzọ wee nwee ike isi n’ọchịchịrị pụta ma ‘nweta ìhè nke ndụ.’—Jọn 8:12.