Gbaa Àmà n’Ebe Ọ Bụla Ndị Mmadụ Nọ
1 N’ịmata òkè mmụọ Chineke na-ekere n’ozi ya, Pọl onyeozi kwuru, sị: “Chineke na-eme ka ọ na-aba ụba.” O kwetakwara, sị: “Anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.” (1 Kọr. 3:5-9) Nke a bụ ihe ùgwù magburu onwe ya. Olee ụzọ anyị pụrụ isi gosipụta n’ihu ọha na anyị nwere ekele ịbụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ? Site n’ikwusara ndị nile anyị na-ezute n’ọrụ ụlọ n’ụlọ na n’ebe ọ bụla ọzọ ozi ọma ahụ.
2 E nyere anyị iwu ‘ime ndị nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ.’ (Mat. 28:19) Ọ bụrụ na anyị ezute nanị mmadụ ole na ole mgbe anyị na-ekere òkè n’ozi, ike pụrụ ịgwụ anyị ngwa ngwa, anyị echeekwa na anyị rụzuru ihe dị ntakịrị. N’aka nke ọzọ, anyị na-enweta ọṅụ kasị ukwuu n’ozi anyị mgbe anyị nwere ike ịchọta ọtụtụ ndị mmadụ ma soro ha kparịta ụka. Nke a pụrụ ịbụ ihe ịma aka, ebe ọ bụ na ọ na-achọ anyị iwepụta onwe anyị iji gaa ebe ọ bụla ndị mmadụ nọ ka anyị wee nwee ike ịkpọtụrụ ha.
3 Ihe Atụ Ndị Dị Irè: Anyị pụrụ ịgbara ndị mmadụ àmà n’ahịa, n’ogige ntụrụndụ, n’ebe bọs na-akwụsị, na n’ọdụ ụgbọ njem. Mgbe ị nọ n’ụgbọ njem ọha na eze, ị̀ dị njikere ịgba àmà n’ụzọ? Ndịàmà abụọ nọ na bọs juru eju na-aga nzukọ maka ije ozi kwurịtara okwu banyere ihe osise nke Paradaịs n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, na-atụle nkwa Chineke maka ọdịnihu. Dị ka ha lere anya na ọ ga-eme, otu nwa okorobịa kwụ n’akụkụ gere ntị ma bụrụ onye ihe ọ nụrụ metụrụ n’obi. Tupu ọ hapụ bọs ahụ, ọ naara otu akwụkwọ ma rịọ ka mmadụ bịa n’ebe obibi ya.
4 Ọtụtụ ndị nkwusa enwetawo ọṅụ n’ịgba àmà mberede. Otu nwanna nwanyị gara n’ebe a na-azụ ahịa dị n’ógbè ha n’otu ehihie ma jekwuru ndị zụsịworo ahịa ma o yiri ka ọ dịghị ha ọsọ ọsọ. O tinyere akwụkwọ nile o ji n’akpa ya. Otu nwoke nke nọ na-echere n’ụgbọala ya nwere obi ụtọ ịnata magazin n’aka ya. Ọ gawo nzukọ na mbụ, mkparịta ụka ha kpalitekwara mmasị ya.
5 Ọ bụ ihe ùgwù ibuli aha Jehova elu. Site n’igosipụta ịnụ ọkụ n’obi anyị maka ọrụ ime nkwusa, anyị na-egosi na nzube nke ebere Chineke na-erughịrị mmadụ n’ebe anyị nọ efunahụbeghị anyị. N’ihi na “ugbu a bụ oge a na-anara mmadụ nke ọma” inyere ndị ọzọ aka, ka anyị gaa n’ebe ọ bụla ndị mmadụ nọ ma gbaara ha àmà banyere “ụbọchị nzọpụta” nke Jehova.—2 Kọr. 6:1, 2.