Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/97 p. 2
  • Nzukọ Ije Ozi Maka July

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzukọ Ije Ozi Maka July
  • Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite July 7
  • Izu Na-amalite July 14
  • Izu Na-amalite July 21
  • Izu Na-amalite July 28
Ozi Alaeze Anyi—1997
km 7/97 p. 2

Nzukọ Ije Ozi Maka July

Izu Na-amalite July 7

Abụ 6

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Kwuo okwu n’akụkọ ozi ubi March maka mba a na maka ọgbakọ unu.

15 min: “A Na-enyeghachi Ikwesị Ntụkwasị Obi Ụgwọ Ọrụ.” Ajụjụ na azịza. Gụnye ihe atụ a kọrọ maka ya na Teta! nke January 22, 1993 (Bekee), peji nke 18-21.

20 min: “Nyere Ndị Ọzọ Aka Inweta Nkasi Obi.” Okwu a ga-eso ndị na-ege ntị tụlee. Mee otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ. Kpọọ ndị na-ege ntị ka ha kọọ ụzọ ndị ọzọ ha siworo jiri otu broshuọ ndị ahụ malite mkparịta ụka. Gbaa ume iji okwu ndị dị mfe, a họọrọ nke ọma akpali mmasị. (Lee Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ, peji nke 7, paragraf nke 9-11.) Kpọọ aha broshuọ ndị nke ọzọ a pụrụ inyefe, ndị ọgbakọ nwekwara.

Abụ 70 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite July 14

Abụ 5

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee Igbe Ajụjụ.

18 min: “Gbaa Àmà n’Ebe Ọ Bụla Ndị Mmadụ Nọ.” Okwu. Dị ka oge nyere ohere ya, a pụrụ ịkọ ahụmahụ ndị ọzọ sitere na 1997 Yearbook, peji nke 43-46.

15 min: Ndị Nne na Nna—Kụzierenụ Ụmụ Unu Ihe Site na Nwa Ọhụrụ. Onye okenye atụlee ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-egosi mkpa ọ dị ka ndị nne na nna kụziere ụmụ ha ihe site na nwa ọhụrụ. (Ilu 22:6; 2 Tim. 3:14, 15) Ụfọdụ ndị nne na nna na-eche na e kwesịghị inye ụmụaka mmụta Bible siri ike ruo mgbe ha ruru ogo ime mkpebi nke ha. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ ọtụtụ ụmụaka efuwo baa n’ime ụwa. Ntụziaka ime mmụọ kwesịrị ịmalite site na nwa ọhụrụ. (g97-IB 3/8 24-25; w88-IB 8/1 12-13) Gbaa di na nwunye na-egosi nchegbu maka ọnọdụ ime mmụọ nke ụmụ ha ajụjụ ọnụ. Gosi otú nna si ebute ụzọ ma na ma nne ma nna na-arụ ọrụ ha n’inye ụmụ ha usoro izi ihe chiri anya, nke e weturu anya ala na-eme. Di na nwunye akọọ ihe ha nọworo na-eme ná mgbalị izi ụmụ ha eziokwu ahụ, itinye aro ndị nzukọ a nyeworo banyere inwe usoro dị mma, nke dị irè maka izi ihe n’ụlọ n’ọrụ. Onye okenye emesie ike mkpa ọ dị itinye ihe Okwu Chineke na-agba ndị nne na nna ume ime n’ọrụ.—w85-IB 10/1 23; Efe. 6:1-4.

Abụ 71 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite July 21

Abụ 14

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Tụlee “Anyị Ga-amụ Akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ.”

13 min: “Ònye Ga-ejekwara Anyị?” Okwu na-akpali akpali. Gụnye agbamume maka ịsụ ụzọ oge nile na ahụmahụ dị n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke February 1997, paragraf nke 16-17. Ndị na-apụghị ịbụ ndị ọsụ ụzọ oge nile pụrụ ịchọ ime atụmatụ ọnwa (ndị) ha ga-asụ ụzọ inyeaka n’ime afọ ije ozi na-abịanụ.

20 min: Dị Njikere Ịgba Àmà Mberede. Kwa ụbọchị, ohere na-adapụtara anyị ịgbara ndị anyị na-ezute àmà. Mgbe ohere dapụtara, anyị pụrụ ịchọpụta na anyị ejighị Bible ma ọ bụ akwụkwọ iji mee ihe. Buru ụzọ mee atụmatụ. N’ụlọ, debe akwụkwọ ụfọdụ n’ebe aka ga-eru n’ebe dịdewere ọnụ ụzọ ebe ị na-ekele ndị ọbịa. Tinye ụdị akwụkwọ dị iche iche n’ime akpa ma ọ bụ pọọsụ, jidekwa ya ma ọ bụ debe ya n’ime ụgbọala gị, n’ebe ọrụ gị, ma ọ bụ n’ime table gị n’ụlọ akwụkwọ. Nwee ihe i ji mgbe ị banyere ụgbọ njem ọha na eze. Kwanye akwụkwọ ụfọdụ mgbe ị na-eme njem achụmnta ego, na-aga mgbakọ, na-aga obodo unu, ma ọ bụ na-aga ezumike. Tụlee aro ndị ọzọ dị n’Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ, peji nke 94-96, paragraf nke 11-16. Mee ihe ngosi dị mkpirikpi nke ụzọ dị iche iche isi jekwuru onye na-ere ahịa, onye ọrụ ibe mmadụ, nwa akwụkwọ ibe mmadụ, onye njem ọzọ, ma ọ bụ onye nọ ezumike.

Abụ 72 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite July 28

Abụ 15

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara mmadụ nile ka ha tinye akụkọ ozi ubi ha. Tụleghachi akwụkwọ a ga-enyefe n’August. Tinye uche n’iji nletaghachi n’August sochie broshuọ ọ bụla e tinyere na July, na-agbalị ịmalite ọmụmụ Bible. Site n’iji ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke March 1997, kọwapụta ụfọdụ n’ime ihe ndị dị mkpa maka nletaghachi dị irè. E kwesịrị ịmalite ọmụmụ ihe na broshuọ Na-achọ ma ọ bụ n’akwụkwọ Ihe Ọmụma.

15 min: Mkpa ọgbakọ. Ma ọ bụ, onye okenye ekwuo okwu n’isiokwu bụ́ “Jụ Akụkọ Ifo Nile,” nke dabeere n’Ụlọ Nche nke April 1, 1994, peji nke 29-31.

18 min: Jezuo Ozi Gị. Okwu onye nlekọta ije ozi ga-ekwu dabere n’akwụkwọ Ozi Anyị, peji nke 5-8. Mesie ike mkpa na ịdị ngwa nke ọrụ nkwusa ahụ, na-akpali mmadụ nile ijiri ibu ọrụ ha dị ka ndị ozi kpọrọ ihe.

Abụ 75 na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya