Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Ikwulite Ihe Ị Ga-eji Zie Mmadụ Ozi Ọma
Ihe Mere O ji Dị Mkpa: Anyị gaa ozi ọma ụlọ n’ụlọ, anyị anaghị ahụ ọtụtụ ndị. Ma, anyị nwere ike ịhụ ha mgbe anyị bara ụgbọala, mgbe anyị gara ụlọ ọgwụ, mgbe anyị gara ụlọ akwụkwọ, mgbe anyị gara ọrụ ma ọ bụ mgbe anyị gara ebe ndị ọzọ. Ị manụ na Jehova chọrọ ka mmadụ niile nụ ozi ọma Alaeze ya. (1 Tim. 2:3, 4) N’ihi ya, anyị kwesịrị izi ha ozi ọma n’ebe ọ bụla anyị hụrụ ha. Ma, anyị ga-ebu ụzọ kwulite otu ihe ka anyị nwee ike izi ha ya.
Mee Ihe A n’Ọnwa A:
Kwa izu, gbalịa kwulite ihe ga-eme ka i zie mmadụ ozi ọma mgbe ị na-anọghị n’ozi ọma.