Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • be p. 62-p. 65 para. 4
  • Ụzọ Isi Mee Ka Nkà Inwe Mkparịta Ụka Ka Mma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụzọ Isi Mee Ka Nkà Inwe Mkparịta Ụka Ka Mma
  • Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Malite n’Ụlọ
  • Iso Onye Ị Na-amabughị Nwee Mkparịta Ụka
  • Ụzọ Isi Gaa n’Ihu ná Mkparịta Ụka
  • Mgbe Gị na Ndị Kwere Ekwe Ibe Gị Nọ
  • Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Ikwulite Ihe Ị Ga-eji Zie Mmadụ Ozi Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2014
  • Olee Otú M Ga-esi Mụtakwuo Otú E Si Akparịta Ụka nke Ọma?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Ì Kwesịrị Ịkwụsị Mkparịta Ụka Ahụ?
    Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, Mee Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
  • Kwuo Ihe Ga-amasị Ndị Ọzọ
    Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, Mee Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
be p. 62-p. 65 para. 4

Ụzọ Isi Mee Ka Nkà Inwe Mkparịta Ụka Ka Mma

Ọ̀ NA-ADỊRỊ gị mfe mgbe nile gị na ndị ọzọ ịkparịta ụka? Nye ọtụtụ ndị, nanị icheta inwe mkparịta ụka n’echiche, karịsịa ha na onye ha na-amaghị, na-akpatara ha nchegbu. Ndị dị otú ahụ nwere ike ịbụ ndị na-eme ihere. Ha pụrụ ịdị na-eche, sị: ‘Gịnị ka m ga-ekwu? Olee otú m pụrụ isi malite mkparịta ụka? Olee otú m pụrụ isi gaa n’ihu ná mkparịta ụka ahụ?’ Ndị na-adịghị eme ihere, ndị nwere omume enyi pụrụ inwe àgwà nke ekweghị ndị ọzọ tinye ọnụ. Ihe nwere ike ịbụ ihe ịma aka nye ha pụrụ ịbụ ime ka ndị ọzọ kwuo obi ha nakwa ịmụta ige ntị n’ihe a na-ekwu. Ya mere, ọ dị anyị nile mkpa, ma ànyị na-eme ihere ma ọ bụ na anyị adịghị eme, ịnọgide na-azụlite nkà inwe mkparịta ụka.

Malite n’Ụlọ

Iji mee ka nkà gị n’inwe mkparịta ụka ka mma, gịnị ma ị malite n’ụlọ? Mkparịta ụka na-ewuli elu pụrụ ịtụnye ụtụ dị ukwuu n’obi ụtọ ezinụlọ.

Ihe kasị mkpa n’inwe mkparịta ụka dị otú ahụ bụ ịdị na-echegburịta onwe anyị n’ụzọ miri emi banyere ibe anyị. (Deut. 6:6, 7; Ilu 4:1-4) Mgbe ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ anyị n’ahụ́, anyị na-ekwukọrịta okwu, anyị na-egekwa ntị mgbe onye nke ọzọ nwere ihe ọ chọrọ ikwu. Ihe ọzọ dị mkpa bụ inwe ihe bara uru ikwu. Ọ bụrụ na anyị nwere usoro nke ịgụ na ịmụ Bible n’onwe anyị mgbe nile, ihe anyị na ndị ọzọ pụrụ ikwurịta ga-adị ọtụtụ. Iji akwụkwọ nta bụ́ Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị na-eme ihe n’ụzọ amamihe pụrụ ịkpalite mkparịta ụka. N’ime ụbọchị, ikekwe anyị nwere ahụmahụ dị ụtọ n’ozi ubi. Anyị nwere ike ịgụ akwụkwọ nwere ihe mmụta n’ime ya ma ọ bụ ihe na-atọ ọchị. Anyị kwesịrị ime ka ọ mara anyị ahụ́ isoro ndị ọzọ kwurịta ihe ndị a n’oge ezinụlọ na-enwe mkparịta ụka na-ewuli elu. Nke a ga-enyekwara anyị aka iso ndị na-abụghị ndị ezinụlọ anyị nwee mkparịta ụka.

Iso Onye Ị Na-amabughị Nwee Mkparịta Ụka

Ọtụtụ ndị na-alatụ azụ n’iso onye ha na-amaghị nwee mkparịta ụka. Ma n’ihi ịhụnanya ha n’ebe Chineke na ndị agbata obi ha nọ, Ndịàmà Jehova na-etinyesi mgbalị ike ịmụta otú e si enwe mkparịta ụka ka ha wee soro ndị ọzọ kerịta eziokwu Bible. Gịnị pụrụ inyere gị aka imeziwanye ihe n’akụkụ a?

Ụkpụrụ ahụ a kọwapụtara ná Ndị Filipaị 2:4 bara uru. A na-agba anyị ume ilekwasị anya, “ọ bụghị n’igosi mmasị onwe onye nanị n’ihe ndị metụtara [anyị], kamakwa n’igosi mmasị onwe onye n’ihe ndị metụtara ndị ọzọ.” Si otú a lee ya anya: Ọ bụrụ na ị hụtụbeghị onye ahụ, ọ na-ewere gị dị ka onye ọ na-amabughị. Olee otú ị pụrụ isi mee ka ahụ́ ruo ya ala? Mmụmụ ọnụ ọchị obiọma na ekele dị ka enyi ga-enye aka. Ma e nwere ihe ndị ọzọ a ga-echebara echiche.

Ọ pụrụ ịbụ na ị dọpụwo uche ya n’ihe ọ na-eche. Ọ bụrụ na ị nwaa ime ka gị na ya kwurịta ihe i bu n’obi, n’ajụghị ase ihe o bu n’obi, ọ̀ ga-emeghachi omume n’ụzọ dị mma? Gịnị ka Jizọs mere mgbe ọ hụrụ otu nwanyị n’otu olulu mmiri dị na Sameria? Obi nwanyị ahụ dị n’isere mmiri. Jizọs gbakwasịrị ụkwụ na nke ahụ wee malite mkparịta ụka ya na ya, n’oge na-adịghịkwa anya o mere ka ọ ghọọ mkparịta ụka na-ekpo ọkụ n’ihe ime mmụọ.—Jọn 4:7-26.

Ọ bụrụ na anya na-eru gị ala, gị onwe gị kwa pụrụ ịchọpụta ihe ndị mmadụ pụrụ ịdị na-eche. Onye ahụ ò yiri onye obi dị ụtọ ka ọ̀ bụ onye iwe ji? Ọ̀ bụ onye kataworo ahụ́, ikekwe onye na-adịkwaghị ike? Ị̀ hụrụ ihe àmà na-egosi na e nwere ụmụaka n’ụlọ ahụ? Ò yiri ka onye ahụ o nwere ego ka ò yiri ka ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ iji nweta ihe ndị dị mkpa ná ndụ? Ihe ndị o ji chọọ ụlọ mma ma ọ bụ ọla ndị o yi hà na-egosi okpukpe ọ na-ekpe? Ọ bụrụ na ekele gị egosi na ị rịbara ihe ndị a ama, onye ahụ nwere ike iwere gị dị ka onye ya na ya nwekọrọ mmasị n’otu ihe.

Ọ bụrụ na ị hụghị onye nwe ụlọ ihu na ihu, ikekwe ọ bụ nanị olu ya ka ị na-anụ ka o si n’ime ụlọ na-agwa gị okwu, gịnị ka i nwere ike ikwubi? Ọ pụrụ ịbụ na onye ahụ na-atụ egwu. Ì nwere ike iji ihe ọmụma ahụ malite mkparịta ụka n’ọnụ ụzọ?

N’ebe ụfọdụ, ọ ga-ekwe omume ịdọba mmadụ ná mkparịta ụka site n’ịkọrọ ya banyere onwe gị—nzụlite gị, ihe mere i ji bịa n’ụlọ ya, ihe mere i ji kwere na Chineke, ihe mere i ji malite ịmụ Bible, na otú Bible siworo nyere gị aka. (Ọrụ 26:4-23) Otú ọ dị, ọ dị mkpa iji akọ na ebumnobi doro anya mee nke a. N’aka nke ọzọ, nke a nwere ike ịkpali onye ahụ ịkọrọ gị banyere onwe ya na otú o si ele ihe anya.

N’ọdịnala ụfọdụ, ọ bụ omenala bụ́ ile ndị a na-amabughị ọbịa. Ndị mmadụ nwere ike ha agaghị egbu oge ịsị gị bata bịa nọdụ ala. Ozugbo ị nọdụrụ ala, ọ bụrụ na i jiri olu ọma jụọ ase ezinụlọ ahụ ma ṅaa ntị n’ezie n’ihe a ga-aza gị, onye nwe ụlọ pụkwara n’otu aka ahụ ịṅa ntị n’ihe ị ga-ekwu. Ndị ọzọ na-egosikwa ọbụna mmasị ka ukwuu n’ebe ndị ọbịa nọ, n’ihi ya ekele a na-ebu ụzọ ekelerịta nwere ike ịdị ogologo. Ka ha na-eme nke ahụ, ha nwere ike ịchọpụta na ọnọdụ gị yiri nke ha. Nke a pụrụ iduga ná mkparịta ụka bara uru n’ihe ime mmụọ.

Gịnị ma ọ bụrụ na e nwere ọtụtụ ndị n’ógbè gị bụ́ ndị na-asụ asụsụ ndị dị iche na nke gị? Olee otú ị pụrụ isi soro ndị a kwurịta okwu? Ọ bụrụ na ị mụta ọbụna ekele ndị dị mfe n’ụfọdụ n’ime asụsụ ndị ahụ, ndị ahụ ga-amata na i nwere mmasị n’ebe ha nọ. Nke a pụrụ imeghe ụzọ maka inwekwu nkwurịta okwu.

Ụzọ Isi Gaa n’Ihu ná Mkparịta Ụka

Iji mee ka mkparịta ụka nọgide na-aga n’ihu, gosi mmasị n’echiche nke onye nke ọzọ. Gbaa ya ume ikwu ihe dị ya n’obi ma ọ bụrụ na ọ dị njikere ime otú ahụ. Ajụjụ ndị e ji nlezianya họrọ pụrụ inye aka. Ajụjụ ndị e ji amata echiche kasị mma n’ihi na ha na-emekarị ka a zaa ihe na-abụghị nanị ee ma ọ bụ ee e. Dị ka ihe atụ, mgbe ị hotasịrị otu nsogbu na-echegbu ndị nọ n’ógbè unu, i nwere ike ịjụ, sị: “Gịnị ka i chere kpatara ọnọdụ a? ma ọ bụ “Gịnị ka i chere ga-abụ ihe ngwọta ya?”

Mgbe ị jụrụ ajụjụ, gee ntị nke ọma n’azịza ya. Gosi ezi mmasị i nwere site n’ikwu otu okwu, ikwe n’isi, ma ọ bụ imegharị ahụ́. Anapụla mmadụ okwu n’ọnụ. Site n’ịdị njikere ịnabata echiche dị iche, chebara ihe a na-ekwu echiche. ‘Dị ngwa n’ịnụ ihe, ghara ịdị ngwa n’ikwu okwu.’ (Jems 1:19) Mgbe ị na-azaghachi, gosi na i gere ntị n’ezie n’ihe o kwuru.

Otú ọ dị, mata na ọ bụghị mmadụ nile ga-aza ajụjụ ndị ị ga-ajụ. Nzaghachi ụfọdụ ndị ga-enye nwere ike ịbụ nanị igbu iku anya ma ọ bụ ịmụmụ ọnụ ọchị. Ndị ọzọ pụrụ ịsị nanị ee ma ọ bụ ee e. Enwela ahụ́ mgbakasị. Nwee ndidi. Anwala ịmanye ya ka o sonye ná mkparịta ụka ahụ. Ọ bụrụ na onye ahụ dị njikere ige ntị, jiri ohere ahụ gwa ya ihe ndị na-ewuli elu sitere n’Akwụkwọ Nsọ. Ka oge na-aga, onye ahụ nwere ike ịmalite iwere gị dị ka enyi. Mgbe ahụ, ma eleghị anya, ọ ga-adị njikere ikwupụta ihe bụ́ echiche ya ngwa ngwa karị.

Ka gị na ndị mmadụ na-ekwurịta okwu, buru ọdịnihu n’obi. Ọ bụrụ na mmadụ ajụọ ọtụtụ ajụjụ, zaa ụfọdụ n’ime ha ma hapụ otu ma ọ bụ abụọ maka mgbe ọzọ unu ga-ekwurịta okwu. Gwa ya na ị ga-eme nnyocha, mgbe e mesịkwara, soro ya kwurịta ihe i metere ná nnyocha. Ọ bụrụ na ọ jụghị ajụjụ, i nwere ike iji ajụjụ i chere ga-amasị ya mechie mkparịta ụka unu. Kwe ya nkwa na unu ga-atụle ya ma ị bịa ọzọ. A pụrụ inweta ọtụtụ aro bnayere otú a pụrụ isi mee ya n’akwụkwọ Reasoning From the Scriptures, broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?, na mbipụta Ụlọ Nche na Teta! ndị kasị ọhụrụ.

Mgbe Gị na Ndị Kwere Ekwe Ibe Gị Nọ

Mgbe mbụ i zutere onye ọzọ bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ị̀ na-ebute ụzọ n’ime ka gị na ya mata? Ka ị̀ na-eguzoro nnọọ gbachie nkịtị? Ịhụnanya anyị nwere n’ebe ụmụnna anyị nọ kwesịrị ịkpali anyị ịchọ ịmata ndị ha bụ. (Jọn 13:35) Olee otú ị pụrụ isi malite? Ị pụrụ nanị ikwu aha gị ma jụọ onye ahụ aha ya. Ịjụ ya otú o si mata eziokwu ga-eduje, dị ka ọ na-adịkarị, ná mkparịta ụka na-akpali mmasị, ọ ga-enyekwara unu aka ịmata ibe unu. Ọ bụrụgodị na ihe ị na-ekwu eyighị ka ọ na-aga gị were were n’ọnụ, mgbalị gị na-egosi onye nke ọzọ na i nwere mmasị n’ebe ọ nọ, ọ bụkwa ya bụ ihe dị mkpa.

Gịnị pụrụ ịtụnye ụtụ n’iso onye gị na ya nọ n’ọgbakọ nwee mkparịta ụka dị mma? Gosi ezi mmasị n’ebe onye ahụ na ezinụlọ ya nọ. À ka gbasara nnọọ nzukọ agbasa? Kwuo okwu n’ihe ndị ị chọpụtara na ha bara uru. Nke a pụrụ ịbara unu abụọ uru. I nwere ike ikwu otu isi ihe masịrị gị nke sitere ná mbipụta Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta! kasị ọhụrụ. E kwesịghị ime nke a iji mee ngosi ma ọ bụ iji nwalee ihe ọmụma mmadụ nwere. Mee ya iji soro onye ọzọ kwurịta ihe kasị tọọ gị ụtọ. Unu pụrụ ikwurịta banyere ihe omume nke ọ pụrụ ịbụ na otu onye n’ime unu nwere n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ma kwurịta otú unu chere a pụrụ isi mee ya. Unu nwekwara ike ịkọrịta ahụmahụ ndị unu nwere n’ozi ubi.

N’ezie, mmasị anyị na-enwe n’ebe ndị mmadụ nọ na-edujekarị n’inwe mkparịta ụka banyere ndị mmadụ—ihe ndị ha na-ekwu ma na-eme. Ihe ndị na-atọ ọchị pụkwara iso n’okwu anyị na-ekwu. Ihe anyị na-ekwu ọ̀ ga-abụ ihe na-ewuli elu? Ọ bụrụ na anyị eburu ndụmọdụ nke Okwu Chineke n’obi ma bụrụ ndị ịhụnanya Chineke na-akpali, n’ezie okwu anyị ga na-ewuli elu.—Ilu 16:27, 28; Efe. 4:25, 29; 5:3, 4; Jems 1:26.

Tupu anyị agawa ozi ubi, anyị na-eme nkwadebe. Gịnị ma ọ bụrụ na ị kwadebe otu akụkọ dị ụtọ ị ga-akọrọ ndị enyi gị ma gị na ha kparịtawa ụka? Ka ị na-agụ ma na-anụ ihe ndị na-akpali mmasị, na-edetu isi ihe ndị ị ga-achọ iso ndị ọzọ kwurịta. Ka oge na-aga, ị ga-enwe ọtụtụ ihe ị ga-esi na ha họrọ. Ime nke a ga-eme ka i nwee ike ikwu okwu n’ihe ndị ọzọ n’abụghị nanị n’ihe a na-eme kwa ụbọchị ná ndụ. Karịsịa, ka okwu gị na-egosi otú Okwu Chineke si dị oké ọnụ ahịa nye gị!—Ọma 139:17.

IHE NDỊ E JI AMALITE MKPARỊTA ỤKA

  • Gbasoo omenala dị n’ógbè ahụ

  • Nye ịja mma sitere n’obi eziokwu

  • Kwuo otu isi ihe unu nwekọrọ mmasị na ya

  • Jụọ ajụjụ e ji amata echiche

ÀGWÀ NDỊ NA-ENYE AKA

  • Omume ihu ọchị

  • Ikpo ọkụ na obi eziokwu

  • Mmasị onwe onye kwesịrị ekwesị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya