ỊMALITE MKPARỊTA ỤKA
IHE ỌMỤMỤ NKE 1
Kwuo Ihe Ga-amasị Ndị Ọzọ
Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: ‘Ịhụnanya anaghị achọ ihe ga-abara naanị ya uru.’—1 Kọr. 13:4, 5.
Ihe Jizọs Mere
Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Jizọs?
2. Anyị na mmadụ nwere ike ịkparịta ụka nke ọma ma ọ bụrụ na anyị ejiri isiokwu masịrị ya malite.
Na-eme Ka Jizọs
3. Na-agbanwe otú i si ezi ozi ọma. Asịla na ị ga-ejirịrị isiokwu ị kwadebere malite ịgwa mmadụ okwu. Jiri ihe ndị mmadụ na-eche banyere ya taa malite mkparịta ụka. Jụọ onwe gị, sị:
‘Gịnị bụ okwu a kpụ n’ọnụ taa?’
‘Gịnị ka ndị agbata obi m, ndị ọrụ ibe m, ma ọ bụ ụmụ klas m na-ekwu gbasara ya?’
4. Na-eleru anya. Jụọ onwe gị, sị:
a. ‘Gịnị ka onye ahụ na-eme n’oge m hụrụ ya? Gịnị ka o nwere ike ịna-eche gbasara ya?’
b. ‘Gịnị ka uwe o yi, otú ọ dị n’anya, ma ọ bụ otú ụlọ ya dị na-egosi m gbasara ihe o kweere ma ọ bụ omenala ya?’
ch. ‘Oge a ọ̀ bụ oge dị mma ịgwa onye ahụ okwu?’
5. Gee ntị.
Ekwula ọtụtụ okwu.
Gbaa onye ahụ ume ka o kwuo obi ya. Mgbe ọ bụla ọ dabara adaba, jụọ ya ajụjụ.